Ọgbakọ Zuru ọha
Hụ Onye agbataobi Gị n’anya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


10:43

Hụ Onye agbataobi Gị n’anya

Ọmịiko bụ ejiri mara Kraịst. Ọ bụ ihe eji ama ịhụnaanya maka ndị ọzọ ma ọ naghị akpa oke.

N’ụtụtụ nke a, ana m akpọku unu ịbịa soro m na njem nke Afrịịka. Unu agaghị ahụ ọdụm, zebra, ma ọ bụ enyi ọbụla mana ikekwe, mgbe njem bịara na ngwụcha, unu ga-ahụ otu puku kwuru puku nke ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazụ a si na-aza oku n’ụzọ pụrụ iche nye nnukwu iwu nsọ nke abụọ nke Jizọs Kraịst “ịhụ onye agbataobi gị naanya” (Mark 12:31).

Chegodụ echiche nwa ntakịrị oge, ime ime obodo, unyi uhie nke Afrịịka. Unu ga-ahụta site na ala ọkpọrọ na-ekpo ọkụ nke mmiri ezobeghị nke ukwuu ihe ruru ọtụtụ afọ. Igwe anụ ole ma ole nke kụfere ụzọ gị kacha bụrụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ karịa uru ma bụrụ ihe a na-edugharị site n’aka ndị ọchị nnama Karamajong kpuchiri onwe ha na blanket ndị, yi sandal n’ụkwụ ha, na-adọgaje na olileanya nke ịchọta ebe ahịhịa na mmiri nọ.

Dị ka ị na-anyagharị ụgbọala n’ụzọ ugwu ugwu na-adịghị larịị ahụ, ị ga-ahụ otu dị iche iche nke ọmarịcha ụmụaka ma na-eche ihe mere ha na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ. Ụmụntakịrị ndị ahụ na-amụ amụ ma fee aka, ma gị efere ha aka na-anya mmiri na ọnụ ọchị. Pesentị iri itolu na abụọ nke ụmụntakịrị kachasị nta ị na-ahụ na njem nke a bi n’ụkọ nri ma mkpụrụ obi gị na-asụ ude site na nnukwu mgbu.

Niihu ihu, ị na-ahụ onye nne bu ite mmiri galọn ise o buziri nke ọma n’elu isi ya na ọzọ o sekpụ n’aka ya. Ọ nọchiri anya otu onye niime ndị otu ezi na ụlọ abụọ nọ na mpaghara ebe a ebe ndịinyom, ndị nta na ndị okenye na-aga ije ihe karịrị nkeji iri atọ ụzọ ọbụla, ụbọchị ọbụla, ruo n’ebe esi enweta mmiri maka ezi na ụlọ ha Ikuku nke iru uju na-ezu gị ahụ.

Onyeinyom nke Afrịịka bu mmiri nisi.

Awa abụọ ga-agafe ma gị erute ebe ndo a bọchara abọcha nọpụrụ iche ebe mmadụ na-ebighị. Ebe nzukọ ahụ abụghị obosara ọnụ ụlọ ma ọ bụ ọbụna ụlọikwuu mana kama, n’okpuru nnukwu osisi ole ma ole na-enye nchekwa site n’oke anwụ. Niime ebe nke a, ị ga-ahụta na enweghị mmiri na-agba agba, enweghị ọkụ latriik, enweghị ebe mkposhi a na-agbanye mmiri ya asọpụ. Ilegharịa anya gburugburu ma ị ga-ahụ na ị nọ n’etiti ndị hụrụ Chineke naanya ma ozugbo ị ga-enweta mmetụta ịhụnaanya nke Chineke nwere maka ha. Ha agbakọwo ịnata enyemaka na olileanya, ma ị bịaruwo ike ya.

Ụdị ahụ bụụrụ njem nke Nwanne nwanyị Ardern na mụ onwe m, nakwa Nwanne nwanyị Camille Johnson, Onyeisi Zuruọha Otu Enyem aka onye so anyị na di ya, Doug, na Nwanne nwanyị Sharon Eubank, onye ntuziaka nke Ozi maka Ọdịmma ụmụ mmadụ nke Nzukọ nsọ, mgbe anyị megara njem na Uganda, obodo nwere nde ụmụ mmadụ 47 na Mpaghara Nzukọ nsọ dị na Central Afrịịka. N’ụbọchị ahụ, n’okpuru ndo nke ọtụtụ osisi, anyị letara otu arụmarụ atụmatụ ahụike niime obodo nke Ndị Ozi maka Ọdịmma ụmụ mmadụ nke Nzukọ nsọ, UNICEF, na Mpaghara Ụlọ Ọrụ Ahụike nke Uganda gbakọtara aka na-arụ. Ndị a bụ otu ndị otu kwesịrị ntụkwasị obi, ndị a kpachaara anya họrọ iji hụ na ego ndị atụkọtara nye maka ọdịmma nke ndị otu Nzukọ nsọ bụ ihe a kpachapụrụ anya tinye n’ọrụ.

Nwa Afrịịka na-anata nlekọta.

Ebe ọ na-agbawa obi ịhụ ụmụntakịrị na-enweghị ihe ahụ chọrọ na ndapụta nke ụkwara nta, akụm, na oke ọnyụnyụ akwụsịghị akwụsị, onye ọbụla niime anyị bịara nwee mbawanye okwukwe maka echi ga-aka mma maka ndị ahụ anyị zutere.

Nne na-enye nwa ya nri.

Olileanya ahụ bịara, na mpaghara, site na obi ọma nke ndị otu Nzukọ nsọ site na gburugburu ụwa ndị nyere oge na ego na mbọ ọdịmma ụmụ mmadụ nke Nzukọ nsọ. Mgbe m hụrụ ndị ọrịa na ndị nwere mkpagbu na-enweta enyem aka na mbuli elu, e hudatara m isi n’obi ekele. N’oge ahụ, a ghọtara m nke ọma ihe ọ pụtara site n’aka Eze ndị eze, onye sịrị:

“Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze akwadoro maka unu … :

“Ma a nọọrọ m na-agụụ, ma gị enye m nri: akpịrị kpọrọ m nkụ, ma gị enye m mmiri: a bụụrụ m onye ezi, ma gị akpọbata m n’ime” (Matiu 25:34–35).

Arịrịọ nke Onye Nzọpụta anyị bụ “Ikwe ka ìhè unu si otu a n’enwu n’ihu ụmụ mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu ma nye Nna unu nke bi n’eluigwe otuto” (Matiu 5:16; leekwa amaokwu 14–15). Na nsụkọ nke ụwa ebe ahụ dị anya, ọrụ ọma unu nyere ihe na ndụ ma mee ibu nke ndị ahụ nọ n’oke mkpa adị mfe, ma Chineke weere otuto.

N’ụbọchị ekpom okụ ahụ dị uzuzu, ọ dịịrị m ka unu nwere ike ịnụ ekpere nke inye otuto na afọ ojuju enyere Chineke. Ha ga-achọ ka m gwa unu na-asụsụ ala Karamajong ebe a mụrụ ha, “Alakara.” I meela.

Nje m anyị chetaara m banyere nkọnilu nke ezigbo Onye Samerịa, onye njem ya dubara ya na ụzọ dị uzuzu, na-adịghị ka nke m kọwara, ụzọ sitere na Jerusalem gawa Jeriko. “Ije ozi nlekọta nke Onye Samerịa nke a na-akuziri anyị ihe ọ pụtara “ịhụ onye agbataobi gị naanya.”

Ọ hụrụ “otu nwoke a maara amara … [onye nke] dabara n’etiti ndị ohi, ndị yipụrụ ya uwe ya, ma merụọ ya ahụ, ma pụọ, hapụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma” (Luk 10:30). Onye Samerịa ahụ nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ” (Luk 10:33).

Ọmịiko bụ ejiri mara Kraịst. Ọ bụ ihe eji ama ịhụnaanya maka ndị ọzọ ma ọ naghị akpa oke. Jizọs, Onye Nzọpụta nke ụwa, bụ nchịkọta nke ọmịiko Mgbe anyị na-agụta na “Jizọs kwara akwa” (Jọn 11:35,anyị bụ ndị aka ebe, dị ka ọ dị Meri na Mata, banyere ọmịiko Ya, nke kpataara Ya nke mbụ ịsụ ude na mmụọ ma nwee mkpagbu (lee Jọn 11:33). Na-ọmụmaatụ nke ọmịiko nke Kraịst dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn, Jizọs bịakwutere igwe mmadụ ahụ ma sị:

Unu nwere ndị dara ngwọrọ, ma-ọbụ kpuru-isi, ma-ọbụ ndị na anaghị a ga ije, … ma-ọbụ ndị ntị chiri, ma-ọbụ ndị nwere nsogbu n’ụdị ọbụla? Kpọta nụ ha ebe a ma aga m agwọ ha, n’ihi na enwere m ọmịiko n’ebe unu nọ. …

“… Ma ọ gwọrọ ha onye ọbụla” (3 Nifaị 17:7, 9

Na-agbanyeghị mbọ anyị niile, mụ na gị agaghị agwọ onye niile, mana onye ọbụla niime anyị nwere ike ị bụ onye nwere ike ime ihe pụrụ iche maka ịdị mma na ndụ nke onye ọzọ. Ọ bụụrụ naanị otu nwata nwoke, nwata nwoke na-adịghị ihe dị mkpa, onye nyere ogbe achịcha ise na azụ abụọ nke nyere puku ise nri. Anyị nwere ike jụọ maka onyinye anyị, dị ka Andru onye na-eso ụzọ mere banyere achịcha na azụ ndị ahụ, “Gịnị ka ha bụ n’etiti ọtụtụ mmadụ karịrị akarị?” (Jọn 6:9). Ana m amasi unu obi ike: o zuru oke inye ma ọ bụ ime ihe i nwere ike ime ma emesịa ikwe ka Kraịst mejupụta mbọ gị.

Niihi nke a, Okenye Jeffery R. Holland kpọkuru anyị, “ọgaranya ma ọ bụ ogbenye, … ‘ime ihe anyị nwere ike ime’ mgbe ndị ọzọ nọ na mkpa.” O mechara gbaa ama, dịka m na-eme, na Chineke “ga-enyere unu aka ma duo unu na omume niile nke ọmịiko [unu] nke ị bụ ndị na-eso ụzọ” (“Ọ Bụ Na Anyị Niile Abụghị Ndị Arịrịọ?,” Liahona, Nov. 2014, 41).

N’ala ebe ahụ dị anya, n’ụbọchị ahụ na-adịghị nchefu, e guzooro m oge ahụ ma guzoro ugbua dị ka onye aka ebe nke ọmịiko ahụ na-akpake mkpụrụ obi ma na-agbanwe ndụ nke ndị otu Nzukọ nsọ, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye.

Nkọnilu nke ezigbo Onye Samerịa ahụ na-aganiihu dị ka o kechiri mmerụ ahụ niile [nke nwoke ahụ] … ma lekọta ya” (Luk 10:34). Mbọ niile nke Ọdịmma ụmụ mmadụ nke Nzukọ nsọ anyị na-ahụta anyị ọsịsọ ịza oku maka ọghọm eke na ikekọta mmerụ ahụ nke ndị ụwa na-abawanye banyere ọrịa, agụụ, ọnwụ nke ụmụaka, erighị ihe ahụ chọrọ, nvukesị, na mmerụ ahụ ndị na-anaghị ahụkarị ọtụtụ mgbe nke gbasara obi ịda mba, ndakpọ olileanya, na obi nkoropụ.

Ezigbo Onye Samerịa ahụ mesịrị “wepụta pence abụọ, ma nye ha onye na-elekọta ndị ọbịa, ma sị ya, Lekọta ya” (Luk 10:35). Di ka ndị Nzukọ nsọ, anyị nwere afọ ojuju isoro gbakọọ aka anyị na ndị ọzọ “na-elekọta ndị ọbịa” ma ọ bụ ndị otu ndị ọzọ ụdị dị ka Ozi Enyem aka niile nke ndị Catholic, UNICEF, na Red Cross/Red Crescent, iji nye aka anyị na ịgba mbọ niile nke ọdịmma ụmụ mmadụ. Anyị nwekwara afọ ojuju maka “pence abụọ” unu ma ọ bụ euro abụọ unu, ma ọ bụ shiling abụọ unu, nke na-enye aka ime ka ibu nke ọtụtụ ndị karịrị akarị na gburugburu ụwa na-ebu dị mfe. Ọ ga-ara ahụ unu ịmata ndị na-anata oge unu, dollars, na dime niile unu, mana ọmịiko anaghị achọ ka anyị mata ha, ọ chọrọ naanị anyị ịhụ ha naanya.

I meela, Onyeisi Nelson, maka ichetara anyị na “mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya jiri obi anyị niile, Ọ na-atụgharị obi anyị nye maka ọdịmma nke ndị ọzọ” (“Nnukwu Iwu Nsọ Nke Abụọ,” Liahona, Nov. 2019, 97). Ana m agba ama na onye ọbụla niime anyị ga-enwe mbawanye nke ọńụ, udo, obi umeala, na ịhụnaanya dị ka anyị na-aza oku nke Onyeisi Nelson ịtụgharị obi anyị nye maka ọdịmma nke ndị ọzọ na arịrịọ nke Josef Smith “inye ndị agụrụ na-agụ nri, yiwe ndị gba ọtọ uwe, nwetara ndị isimkpe ihe, hichaa anya mmiri nke nwa na-enweghị nne na nna, ma kasie ndị nọ na mkpagbu obi, ma ọ bụ na Nzukọ nsọ nke a, ma ọ bụ ebe ọzọ, ma ọ bụ na-anọghị na nzukọ nsọ ọbụla ma ọlị, ebe ọbụla [anyị hụrụ] ha” (“Editor’s Reply to a Letter from Richard Savary,” Times and Seasons, Mar. 15, 1842, 732).

Okenye Arden na Onyeisi Camille N. Johnson ha na ụmụntakịrị Afrịịka.

Ọnwa ndị ahụ niile gara aga, anyị chọtara ndị agụrụ na-agụ na ndị nwere mkpagbu n’ebe uzuzu dị larịị ma kpọọ nkụ ma bụrụ ndị ama nye anya arịrịọ ha maka enyem aka. N’ụzọ nke anyị, anyị sụrụ ude niime mmụọ ma nwee mwute (lee Jọn 11:33), ma otu ọ dị mmetụta ndị ahụ belatara dị ka anyị hụrụ ọmịiko nke ndị otu Nzukọ nsọ nọ n’ọrụ dị ka enyere ndị agụrụ na-agụ nri, elekọtara ndị isimkpe, ma ndị nwere mkpagbu ka a kasiri obi ma hichaa anya mmiri ha.

Ka anyị nọgide ruo ebighị ebi na-achọ maka ọdịmma nke ndị ọzọ ma gosị n’okwu na omume na anyị “dị na njikere iburịta ibu onye na ibe ya” (Mozaya 18:8), na “ikechikọta ndị obi tiwara etiwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:42), na idobe iwu nsọ dị ukwuu nke abụọ nke Kraịst “ịhụ onye agbataobi gị naanya” (Mak 12:31). N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.