Isi 32
Alma wee kụziere ndị ogbenye ndị mkpagbu ha nile meworo obi umeala—Okwukwe bụ olile-anya n’ihe nke ana-ahụbeghị anya nke bụ ezi-okwu—Alma wee gbaa ama na ndị mụọ-ozi na-akụziri ndịkom, ndịnyom, na ụmụ-ntakịrị ihe—Alma wee tụnyere okwu ahụ mkpụrụ-akụkụ—A ga-akụrịrị ya ma zụọ ya—Mgbe ahụ ọ ga-eto ghọọ osisi site na nke a ga-esi ghọta mkpuru-osisi nke ndụ-ebighi-ebi. Ihe dịka n’afọ 74 tutu amụọ Kraịst.
1 Ma o wee ruo na ha gagharịrị, ma malite ikwusa okwu nke Chineke ahụ nye ndị ahụ, na-abanye n’ime ụlọ-nzukọ ha nile, na n’ime ụlọ ha nile; e, ma ọbụna ha kwusara okwu ahụ n’okporo-ụzọ ha nile.
2 Ma o wee ruo na mgbe a rụsiworo nnukwu ọrụ n’etiti ha, ha malitere inweta ihe ha bu n’obi n’etiti òtù ndị ogbenye nke ndị ahụ; n’ihi na lee, a chụpụrụ ha site n’ụlọ-nzukọ nile n’ihi adịghị mma n’anya nke uwe ha—
3 Ya mere ekweghị ka ha bata n’ime ụlọ-nzukọ ha nile ife Chineke, ebe e weere ha dịka iru-inyi; ya mere ha dara ogbenye; e, ụmụnne ha weere ha dịka afụrụ-uzuzu; ya mere ha dara ogbenye n’ihe nile nke ụwa; na kwa ha dara ogbenye n’ime obi.
4 Ugbua, dịka Alma na-akụzi ma na-agwa ndị ahụ okwu n’elu ugwu Onaịda, nnukwu igwe-mmadụ bịakwutere ya, ndị bụ ndị ahụ nke anyị na-ekwu rịị maka ha, ndị nke dara ogbenye n’ime obi, n’ihi ịda ogbenye ha n’ihe nile nke ụwa.
5 Ma ha bịakwutere Alma; ma onye ahụ nke pụtakarịrị n’iru n’etiti ha sịrị ya: Lee, gịnị ka ụmụnne m nwoke a ga-eme, n’ihi na ndị nile na elelị ha n’ihi ịda ogbenye ha, e, ma nke kachasị nke site na ndị nchụ-aja anyị nile; n’ihi na ha achụpụwo anyị site n’ụlọ-nzukọ anyị nile nke anyị rụsịrị ọrụ ike iwu jiri aka nke anyị nile; ma ha achụpụwo anyị n’ihi ịda ogbenye karịrị akarị anyị; ma anyị enweghị ebe ọbụla anyị ga-efe Chineke anyị; ma lee, gịnị ka anyị ga-eme?
6 Ma ugbua mgbe Alma nụrụ nke a, ọ tụgharịrị ya, chee ya iru otu mgbe ahụ, ma ọ hụrụ n’oke ọn̄ụ; n’ihi na ọ hụrụ na mkpagbu ha nile n’ezi-okwu emewo ha obi umeala, ma na ha dị na njikere ịnụ okwu ahụ.
7 Ya mere o kwughịkwa okwu ọzọ nye igwe-mmadụ ndị ọzọ ahụ; kama o setịpụrụ aka ya, ma tikuo ndị nile ahụ ọ hụrụ, ndị chegharịrị n’ezie, ma sị ha:
8 A hụrụ m na unu wedatara obi ala; ma ọbụrụ otu ahụ, ngọzi na-adịrị unu.
9 Lee nwanne unu nwoke asịwo, Gịnị ka anyị ga-eme?—n’ihi na achụpụwo anyị site n’ụlọ-nzukọ anyị nile, nke mere na anyị enweghịkwa ike ife Chineke anyị.
10 Lee asị m unu, unu chere na unu enweghị ike ife Chineke ma ọbụghị nanị n’ime ụlọ-nzukọ unu nile?
11 Ma nke ka nke, aga m ajụ, unu chere na unu agaghị eferịrị Chineke nanị otu ugbọrọ n’otu izu-ụka?
12 Asị m unu, ọ dị mma na a chụpụrụ unu site n’ime ụlọ-nzukọ unu nile, ka unu wee dị obi umeala, ma na ka unu wee-mụta amamihe; n’ihi na ọ dị mkpa na unu ga-amụta amamihe; n’ihi na ọ bụ n’ihi na achụpụrụ unu, na ụmụnne unu nwoke leliri unu n’ihi ịda ogbenye unu karịrị akarị, ka e jiri weta unu na mwedata ala nke obi; n’ihi na e wedatara unu inwe obị umeala n’ihi na ọ dị mkpa.
13 Ma ugbua, n’ihi na a manyere unu amanye inwe obi umeala ngọzi na-adịri unu; n’ihi na mmadụ mgbe ụfọdụ, ọbụrụ na a manye ya inwe obi umeala, na-achọ nchegharị; ma ugbua, n’ezie, onye ọbụla nke chegharịrị ga-achọta ebere; ma onye nke chọtara ebere ma nagide ruo ọgwụgwụ onye ahụ ka a ga-azọpụta.
14 Ma ugbua, dịka m gwara unu, na n’ihi na amanyere unu amanye inwe obi umeala unu nwere ngọzi, unu echeghị na ha nwere ngọzi karịa bụ ndị n’ezie nwere obi umeala n’onwe ha n’ihi okwu ahụ?
15 E, onye nke nwere obi umeala n’onwe ya n’ezie, ma chegharịa site na mmehie ya nile, ma nagide ruo ọgwụgwụ, onye ahụ ka a ga agọzi—e, nwe ngọzi karịrị nke onye amanyere amanye inwe obi umeala n’ihi ịda ogbenye ha karịrị akarị.
16 Ya mere, ngọzi na-adịrị ndị na-enwe obi umeala na-abụghị na amanyere ha amanye inwe obi umeala; ma-ọbụ n’okwu ọzọ, ngọzi na-adịrị onye ahụ kwere n’okwu nke Chineke, ma e mee ya baptism na-enweghị ekwe-ekwe nke obi, e, na-ewetaghị ya ịmata okwu ahụ, ma-ọbụ ọbụna imanye ya ịmata, tutu ha ga-ekwere.
17 E, enwere ọtụtụ ndị na-asị: Ọbụrụ na i ga-egosị anyị ihe iriba-ama sitere n’elu-igwe, mgbe ahụ anyị ga-amata n’ezie; mgbe ahụ anyị ga-ekwere.
18 Ugbua a na m ajụ, nke a ọ bụ okwukwe? Lee, asị m unu, E-e; n’ihi na ọbụrụ na mmadụ mara otu ihe o nweghị ihe ga-akpatara ya ikwere, n’ihi na ọ matawo ya.
19 Ma ugbua, lee otu ọbụbụ-ọnụ ya siri karịa bụ onye matara uche nke Chineke ma ọ naghị eme ya, karịa onye nke na-ekwere nanị, ma-ọbụ nanị nwere ihe mere o jiri kwere, ma daba n’ime njehie?
20 Ugbua n’ihe nke a unu ga-ekpebirịrị. Lee, asị m unu, na ọ dị n’otu aka ọbụna dịka ọ dị na nke ọzọ; ma ọ ga-adịrị onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị.
21 Ma ugbua dịka m kwuru gbasara okwukwe—okwukwe abụghị inwe mmata zuru-oke nke ihe nile; ya mere ọbụrụ na unu nwere okwukwe unu ga enwe olile-anya ihe nile ndị a na-ahụbeghị, ndị bụ ezi-okwu.
22 Ma ugbua, lee, a sị m unu, ma ọ ga-adị m mma ma a sị na unu ga-echeta, na Chineke na-emere ndị nile kwere n’aha ya ebere; ya mere ọ na-achọ, na nke mbụ, na unu ga-ekwere, e, ọbụna n’okwu ya.
23 Ma ugbua, ọ na-ezisa okwu ya site na ndị mụọ-ozi nye ndị nwoke, e, ọbụghị nanị ndị nwoke ma ndị nwanyị kwa. Ugbua nke a abụghị ihe nile; Ụmụntakịrị na-enweta okwu nile a na-enye ha ọtụtụ oge, nke na-agbagwọjụ ndị amamihe na ndị nwere mmụta anya.
24 Ma ugbua, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya, dịka unu chọworo ịmata site n’ọnụ m ihe unu ga-eme n’ihi a na akpagbụ unu ma chụpụ unu—ugbua achọghị m na unu ga eche na m bu n’obi ikpe unu ikpe nanị dịka ihe ahụ nke bụ ezi-okwu—
25 N’ihi na-ebughị m n’obi na unu, unu nile ka amanyeworo amanye iwedata onwe unu ala; n’ihi na e kwere m n’ezie na enwere ụfọdụ n’etiti unu ndị ga ewedata onwe ha ala, ka ha nọrọ n’ụdị ọnọdụ ọbụla nile ha nwere ike ịnọ.
26 Ugbua, dịka m kwuru gbasara okwukwe—na ọbụghị mmatazu—ọbụna otu ahụ ka ọ dị n’okwu m nile. Unu enweghị ike ịmata maka ịbụ ezi-okwu ha na mbụ, ruo izu oke, ihe ọbụla karịrị okwukwe bụ ịmatazu ihe.
27 Mana lee, ọbụrụ na unu ga-eteta ma kpọte ike nke mụọ unu nile, ọbụna ruo nʼime ihe nchọpụta n’okwu m nile, ma jiri otu mpekele okwukwe, e, ọbụna ọbụrụ na unu enweghị ike ime ihe na-akarịghị ịchọ ikwere, ka ọchịchọ nke a rụọ ọrụ n’ime unu, ọbụna ruo mgbe unu ga-ekwere n’ụdị nke unu ga-enwe ike nye ọnọdụ maka otu akụkụ nke okwu m nile.
28 Ugbua, anyị ga-atụnyere okwu ahụ nye otu mkpụrụ-akụkụ. Ugbua, ọbụrụ na unu nye ọnọdụ, ka e wee kunye otu mkpụrụ-akụkụ n’obi unu, lee, ọbụrụ na ọ bụ ezi mkpụrụ-akụkụ ma-ọbụ mkpụrụ-akụkụ dị-nma, ọbụrụ na unu atufughị ya site n’ekweghị-ekwe unu, na unu ga-ajụ Mụọ nke Onye-nwe, lee, ọ ga-amalite ikolite n’ime obi unu nile; ma mgbe unu ga-enweta mmegharị arụ nkolite ndị a nile, unu ga-amalite ikwu n’ime onwe unu—Ọ ga-abụrịrị na nke a bụ mkpụrụ-akụkụ dị mma, ma-ọbụ na okwu ahụ dị mma, n’ihi na ọ malitewo ime ka mkpụrụ-obi m buwanye ibu; e, ọ malitewo ime ka nghọta m nwee mgba-ama, e, ọ malitewo ịtọ m ụtọ.
29 Ugbua lee, nke a ọ gaghị eme ka okwukwe unu bawanye? Asị m unu, E; otu o sila dị o torubeghị n’ịmatazu ihe.
30 Mana lee, dịka mkpụrụ-akụkụ ahụ na-ekolite, ma na-epupụta, ma malite ito, mgbe ahụ Ị ga ekwurịrị na mkpụrụ-akụkụ ahụ dị mma; n’ihi na lee ọ na-ekolite, ma na-epupụta, ma na-amalite ito. Ma ugbua, lee, nke a ọ gaghị eme ka okwukwe unu sie ike? E, ọ ga-eme ka okwukwe unu sie ike: n’ihi na unu ga-asi a matara m na nke a bụ mkpụrụ-osisi dị mma; n’ihi na lee o pupụtawo ma malite ito.
31 Ma ugbua, lee, unu matara nke ọma na nke a bụ mkpụrụ-akụkụ dị mma? Asị m unu, E, n’ihi na mkpụrụ-akụkụ ọbụla na-amịpụta n’ụdị nke onwe ya.
32 Ya mere, ọbụrụ na mkpụrụ-akụkụ na-eto eto ọ dị mma, mana ọbụrụ na ọ naghị eto, lee ọdịghị mma, ya mere a na-atụfu ya.
33 Ma ugbua, lee, n’ihi na unu anwalewo ihe-omume eji achọpụta ezi-okwu ahụ, ma kụọ mkpụrụ-akụkụ ahụ, ma o kolitere ma pupụta, ma malite ito, unu ga-amatarịrị na mkpụrụ-akụkụ ahụ dị mma.
34 Ma ugbua, lee, ọmụma-ihe unu o zuru oke? E, ọmụma-ihe unu ezuwo oke n’ihe ahụ, ma okwukwe unu adịghị arụ ọrụ; ma nke a n’ihi na unu matara na okwu ahụ ekolitewo mkpụrụ-obi unu nile, ma unu matakwara na o pulitawo, na nghọta unu malitere inweta mgba-ama, ma echiche unu malitere ịsa mbara.
35 O mgbe ahụ, nke a ọ bụghị ihe mere eme? Asị m unu, E, n’ihi na ọ bụ ìhè; ma ihe ọbụla bụ ìhè, dị mma, n’ihi na ọ na-egosị ihe dị iche, ya mere unu ga-amata na ọ dị mma; ma ugbua lee, mgbe unu detuworo ìhè a ọnụ ọmụma-ihe unu ozuwo oke?
36 Lee asị m unu, E-e; ọbụghị ma unu ga-edebe okwukwe unu n’akụkụ, n’ihi na unu etinyewo okwukwe unu n’ọrụ n’ịkụ mkpụrụ-akụkụ ahụ ka unu wee nwale ihe omume ahụ eji achọpụta ezi-okwu ịmata ma mkpụrụ-akụkụ ahụ ọ dị mma.
37 Ma lee, dịka osisi ahụ malitere ito, unu ga-asị: Ka anyị zụọ ya na nnukwu mkpachapụ-anya, ka o wee nweta mgbọrọgwụ, ka o wee tolite, ma wepụta mkpụrụ nye anyị. Ma ugbua lee, ọbụrụ na unu zụọ ya na nnukwu mkpachapụ-anya ọ ga-enweta mgbọrọgwụ, ma tolite, ma wepụta mkpụrụ.
38 Mana ọbụrụ na unu lelịa osisi ahụ, ma ghara iche uche maka ọzụzụ ya, lee ọ gaghị enweta mgbọrọgwụ ọbụla; ma mgbe okpom ọkụ nke anyanwụ ahụ bịara ma chanwụọ ya, n’ihi na o nweghị mgbọrọgwụ ọ kpọnwụọ, ma unu ga efopụ ya ma tufuo ya.
39 Ugbua, nke a abụghị n’ihi na mkpụrụ-akụkụ ahụ adịghị mma, ọbụghị ma-ọbụ n’ihi na mkpụrụ-akụkụ ya agaghị agụ agụụ; kama ọ bụ n’ihi na ala unu enweghị ike imịta mkpụrụ; ma unu achọghị ịzụ osisi ahụ, ya mere unu enweghị ike inweta mkpụrụ ahụ ga-esite na ya.
40 Ma otu a, ọbụrụ na unu agaghị azụ okwu ahụ, na-elepụ anya n’iru jiri anya nke okwukwe na-ele mkpụrụ dị ya, unu enweghị ike ịghọta mkpụrụ nke osisi ahụ nke osisi nke ndụ.
41 Mana ọbụrụ na unu ga-azụ okwu ahụ, e, zụọ osisi ahụ dịka ọ na-amalite ito, site n’okwukwe unu jiri nnukwu mgbalị, ma jiri ndidi, na-elekwasị anya na mkpụrụ ga esite na ya, ọ ga-enweta mgbọrọgwụ; ma lee ọ ga-abụ osisi n’epulite ruo na ndụ mgbe nile na-adigide.
42 Ma n’ihi mgbalị unu na okwukwe unu na ndidi unu n’okwu ahụ n’ịzụ ya, ka o wee nweta mgbọrọgwụ n’ime unu, lee, emesịa unu ga-aghọta mkpụrụ ga-esite na ya, nke kachasị ịdị oke ọnụ ahịa, nke dị ụtọ karịa ihe nile na-atọ ụtọ, na nke dị ọcha karịa ihe nile dị ọcha, e, na enweghị ntụpọ karịa ihe nile nke na-enweghị ntụpọ; ma unu ga-eri-oriri n’elu mkpụrụ nke a ọbụna ruo mgbe afọ unu juru, nke bụ na agụụ agaghị agụ unu, ọbụghị ma akpịrị ọ ga-akpọ unu nkụ.
43 Mgbe ahụ, ụmụnne m nwoke, unu ga aghọrọ ụgwọ ọrụ nile nke okwukwe unu, na mgbalị unu, na ndidi, na ogologo-ntachị-obi, na-echere ka osisi ahụ wepụta mkpụrụ nye unu.