UsORO OGE NA EBE NILE NAIHE-OMUME NILE NKE AKỤKỌ NZUKỌ-NSỌ.
1805, Disemba 23
Joseph Smith (1805–44) ka a mụrụ nye Joseph Smith Ukwu, na Lucy Mack Smith, n’ime Sharon, Vermont (hụ A—JS 1:3).
1820, Gboo na Mmalite-udummiri
Onye-amụma Joseph Smith natara Ọ̀hụ̀ nke Mbụ n’ime otu ọgba osisi dị na Obodo ndị mepere emepe nke Palmyra na Manchester, New York, n’ebe dị nso n’ebe obibi ya (hụ A—JS 1:15–17).
1823, Septemba 21–22
Otu Mụọ-ozi Moronaị letara Joseph Smith na gwa ya banyere akụkọ ndekọta Akwụkwọ nke Mọmọn. Joseph hụrụ epekele ọla-edo ndị ahụ e liri n’otu ugwu dị nso (Kumora) (hụ A—JS 1:27–54).
1827, Septemba 22
Joseph Smith nwetara epekele ọla-edo nile ahụ site n’aka Moronaị n’Ugwu Kumora (hụ A—JS 1:59).
1829, Mee 15
Jọn O Me Baptism nyefere Ọkwa nchụ-aja nke Erọn n’elu Joseph Smith na Oliver Cowdery na Harmony, Pennsylvania (hụ OznỌd. 13; A—JS 1:71–72).
1829, Mee
Joseph Smith na Oliver Cowdery natara Ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek site n’aka Pịta, Jemes, na Jọn n’ebe dị Osimiri Susquehanna nso n’agbata Harmony, Pennsylvania, na Colesville, New York (hụ OznỌd. 128:20).
1829, Jun
Ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn ka e mezuru. Ndị aka-ebe mmadụ Atọ na Ndị aka-ebe mmadụ Asatọ ka e gosiri epekele ọla-edo nile ahụ (hụ 2 Nif. 11:3; 27:12–13; OznỌd. 17).
1830, Maach 26
Akwụkwọ nke Mọmọn ndị mbụ e bipụtara ka e mere ka ha rute aka, na Palmyra New York.
1830, Epril 6
A haziri Nzukọ-nsọ ahụ na Obodo mepere emepe Fayette, New York.
1830, Septemba—Ọktoba
Ndị mgbasa ozi-ọma mbụ ka a kpọrọ ikwusara ndị Leman ozi-ọma (Ndị ime obodo Amerika) (hụ OznỌd. 28; 30; 32).
1830, Disemba—Jenuarị 1831
E nyere Ndị-nsọ iwu ka ha kpokọta na Ohio (hụ OznỌd. 37; 38:31–32).
1831, Julaị 20
E kpugheere Onye-amụma Joseph Smith ebe a ga-ewu Zaịọn (Jerusalem Ọhụrụ ahụ) na Independence, Missouri (hụ OznỌd. 57; Ndep. Ok 1:10).
1833, Maach 18
Sydney Rigdon na Frederick G. Williams ka e dopụrụ iche dịka ndị ndụmọdụ n’Isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ (hụ OznỌd. 81 isi okwu) na nye ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ikpe-azụ a (hụ isi okwu OznỌd. 90 ama-okwu; nke 6).
1833, Novemba 7
Ndị-nsọ malitere ịgbalaga site n’aka ndị na-agba aghara na Ógbè Jackson, Missouri n’ofe Osimiri Missouri na baa n’ime Ógbè Clay.
1834, Mee 5
Onye-isi Nduzi Joseph Smith hapụrụ Kirtland, Ohio, gawa Missouri dịka onye- ndu nke Ebe izu-ike nke Zaịọn iwetere Ndị-nsọ a chụpụrụ site na Ógbè Jackson enyem-aka.
1835, Februarị 14
Otu Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ka a haziri, na Kirtland, Ohio (hụ OznỌd. 107:23–24).
1835, Februarị 28
Nhazi nke Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Mbụ nke ndị Iri Asaa ahụ ka a malitere na Kirtland, Ohio.
1835, Ọugọst 17
A nabatara Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile dịka ọkọlọtọ nlere anya nke Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio.
1836, Maach 27
Temple nke Kirtland ka a rara nye Chineke (hụ OznỌd. 109).
1836, Epril 3
Jisus Kraịst pụtakwutere Joseph Smith na Oliver Cowdery n’ime Temple nke Kirtland. Moses, Elaias, na Elaịja pụtara nyefee kwa ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja (hụ OznỌd. 110).
1837, Julaị 19
Heber C. Kimball na mmadụ isii ndị ọzọ rutere na Liverpool, England, na njem mgbasa ozi-ọma nke mbụ nke Nzukọ-nsọ na mba ndị ofesi.
1838, Epril 26
Aha nke Nzukọ-nsọ ka e gosiri site na mkpughe (hụ OznỌd. 115:4).
1838, Disemba 1
Onye-amụma Joseph Smith na ndị ọzọ ka a tụrụ mkpọrọ n’Ụlọ Mkpọrọ Liberty, Liberty, Ógbè Clay, Missouri (hu OznỌd. 121–123).
1840, Ọugọst 15
Onye-amụma Joseph Smith kwupụtara baptism maka ndị nwụrụ anwụ n’ọha.
1841, Ọktoba 24
Okenye Orson Hyde rara Ala Nsọ nye Chineke maka nlọghachi nke ụmụ nke Abraham (hụ OznỌd. 68:1–3; 124:128–129).
1842, Maach 17
Otu Enyem-aka ndịnyom ka a haziri, na Nauvoo, Illinois.
1842, May 4
E nyere onyinye-nsọ nile juru eju nke mbụ nke temple.
1844, Jun 27
Joseph Smith na Hyrum Smith ka e gburu n’ihi ihe ha kweere n’ime Ụlọ Mkpọrọ Carthage (hụ OznỌd. 135).
1846, Februarị 4
Ndị-nsọ nke Nauvoo malitere igafe Osimiri Mississippi ịgawa ọdịda-anyanwụ. Ụfọdụ Ndị-nsọ nke ọwụwa-anyanwụ gbara ụgbọ mmiri site n’Obodo New York gawa California n’ụgbọ mmiri Brooklyn.
1846, Julaị 16
Ìgwè otu puku ndị-agha Mọmọn ka e tinyere n’ìgwè ndị agha nke U.S. n’ime Iowa.
1847, Epril
Ọgbakọ ndị bu ụzọ nke Onye-isi Nduzi Brigham Young hapụrụ Winter Quarters na njem ịga ọdịda-anyanwụ ahụ (hụ OznỌd. 136).
1847, Julaị 24
Onye-isi Nduzi Brigham Young batara na Ndagwurugwu Salt Lake.
1847, Disemba 27
Ọgbakọ ntụgharịkọta uche nke Nzukọ-nsọ kwadoro Onye-isi Nduzi Brigham Young, Okenye Heber C. Kimball, na Okenye Willard Richards dịka Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ.
1848, Mee—Jun
Ụkpara dị n’ime Ndagwurugwu Salt Lake bibiri ihe a kụrụ n’ubi. A zọpụtara ala-ubi nile site na mbibi kpam kpam mgbe nnụnụ mmiri richapụrụ ụkpara ndị ahụ.
1849, Disemba 9
Richard Ballantyne haziri Sọnde Skuul.
1850, Jun 15
Deseret News malitere ibipụta akwụkwọ na Salt Lake City.
1856, Ọktoba
Ụgbọ-ala aka nile nke ọgbakọ Willie na Martin ka oke ikuku akụ-mmiri gboo gbochibidoro. Ndị otu ndọpụta sitere na Ndagwurugwu Salt Lake chọtara ha.
1867, Disemba 8
A hazigharịrị Otu Enyem-aka n’okpuru ntụzi-aka nke Onye-isi Nduzi Brigham Young.
1869, Novemba 28
Otu Mbelata nke Ụmụ-ada ka a haziri, mbu-ụzọ nke Usoro e ji eme ihe nke Ụmụ-agbọghọbịa.
1875, Jun 10
Otu Mmekọrịta Ịdị-mma nke Ụmụ okorọbịa ka a haziri, mbu-ụzọ nke usoro e ji eme ihe nke Ụmụ-okorọbịa.
1877, Epril 6
Temple nke St. George ka a rara nye Chineke. Onye-isi Nduzi Brigham Young natara mkpughe idozi n’usoro nhazi nke ọkwa nchụ-aja na stek nile nke Zaịọn.
1878, Ọugọst 25
Aurelia Spencer Rogers mere nnọkọ nke mbụ nke Praịmarị na Farmington, Utah.
1880, Ọktoba 10
John Taylor ka a kwadoro dịka Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ. Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa ka a nabatara dịka otu ọkọlọtọ nlere-anya.
1883, Epril 14
Mkpughe e nyere Onye-isi Nduzi John Taylor maka nhazi nke Ndị Iri Asaa nile.
1889, Epril 7
Wilford Woodruff ka a kwadoro dịka Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1890, Ọktoba 6
“Akwụkwọ Ngosipụta Uche” ka a kwadoro na ọgbakọ ntụgharịkọta uche ọha, na-ekwupụta nkwụsị nke omume alụlụ ọtụtụ ndịnyom (hụ IỌỤ—1).
1893, Epril 6
Onye-isi Nduzi Wilford Woodruff raara Temple nke Salt Lake nye Chineke, na iri-afọ anọ mgbe a na-arụ ya.
1898, Septemba 13
Lorenzo Snow ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1899, Mee 17
Onye-isi Nduzi Lorenzo Snow natara mkpughe na St. George nke kwalitere mụọ ya ikwusị okwu ịkwụ otu-ụzọ n’ụzọ iri ike (hụ OznỌd. 119).
1901, Ọktoba 17
Joseph F. Smith ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1918, Ọktoba 3
Onye-isi Nduzi Joseph F. Smith natara ọhụ nke mgbapụta nke ndị nwụrụ anwụ (hụ OznỌd. 138).
1918, Novemba 23
Heber J. Grant ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1936, Epril
Usoro e ji eme ihe Nchedo nke Nzukọ-nsọ ka e hiwere maka inyere ndị ogbenye aka n’oge Nnukwu Ọdịda nke akụ na ụba, ọ ghọrọ usoro e ji eme ihe ọdịmma nke Nzukọ-nsọ. Usoro a e ji eme ihe a topụtara site n’otu mkpughe Onye-isi Nduzi Heber J. Grant natara na mbụ.
1941, Epril 6
Ndị enyem-aka nye Ndi-ozi Iri na abụọ ka a kpọrọ nke mbụ.
1945, Mee 21
George Albert Smith ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1951, Epril 9
David O. McKay ka a kwadoro dịka Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1961, Septemba 30
Okenye Harold B. Lee, n’okpuru ntụzi-aka Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, kwupụtara na usoro nile e ji eme ihe nke Nzukọ-nsọ ga na-emetukọta site n’ọkwa nchụ-aja ime ka ezi na ụlọ na ndị mmadụ n’onwe ha dị ike.
1964, Ọktoba
Idobe nnọkọ anyasị n’ebe-obibi ezi na ụlọ ka e kwusigharịrị ike.
1970, Jenuarị 23
Joseph Fielding Smith ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1971, Jenuarị
Akwụkwọ akụkọ magazin ọhụrụ nile nke Nzukọ-nsọ—Ensign, New Era, na Friend—malitere ọrụ-mbipụta akwụkwọ.
1972, Julaị 7
Harold B. Lee ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1973, Disemba 30
Spencer W. Kimball ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1975, Ọktoba 3
Onye-isi Nduzi Spencer W. Kimball kwupụtara nhazigharị nke Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Mbụ nke ndị Iri Asaa.
1976, Epril 3
Mkpughe abụọ ka a gbakwunyere na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa. N’afọ 1981, a kwadoro ha ịghọ OznỌd. 137 na 138.
1978, Septemba 30
Nzukọ-nsọ kwadoro mkpughe na-enye ndị nwoke ọbụla tozuru oke ọkwa nchụ-aja na-atuleghị agbụrụ ma-ọbụ ọcha elu-arụ (hụ IỌỤ—2).
1979, Ọugọst
Ụdịdị mbipụta nke Bible King James nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ (NỤI) nwere nnyem-aka ọmụmụ-ihe ka e bipụtara.
1981, Septemba
Ụdịdị mbipụta ọhụrụ nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, Ọla-pel nke Oke Ọnụ-ahịa ka e bipụtara n’asụsụ Bekee.
1984, Jun
Otu Ndị-isi nduzi nke Mpaghara nile ka e tinyere n’ọkwa, nke nwere ndị otu a kpọrọ sitere na Iri Asaa nile.
1985, Novemba 10
Ezra Taft Benson ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1989, Epril 1
Otu Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Abụọ nke ndị Iri Asaa ahụ ka a hazigharịrị.
1994, Jun 5
Howard W. Hunter ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1995, Maach 12
Gordon B. Hinckley ghọrọ Onye-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.
1995, Epril 1
Ọnọdụ nke onye nnochite anya nke mpaghara ka a kwụsịrị A mara-ọkwa nke ọnọdụ onye-ndu ọhụrụ nke a ga-amara dịka Onye ji Ikike nke Ebe.
1995, Septemba 23
“Ezi na ụlọ: Otu Ima-ọkwa nye Ụwa” nke sitere na aka Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na Kansụl Ndi-ozi Iri na abụọ ka e bipụtara n’akwụkwọ.
1997, Epril 5
Ndị nile ji Ikike nke Mpaghara ka a ga-echi echichi Iri Asaa nile. Otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Atọ, nke Anọ, na nke Ise ndị Iri Asaa ka a mara ọkwa maka ya.
1997, Ọktoba 4
Onye-isi Nduzi Hinckley mara-ọkwa nke iwu temple nile dị obere karịa.
1997, Novemba
Ndị-otu Nzukọ-nsọ rutere nde iri.
1998, Epril
Onye-isi Nduzi Hinckley mara-ọkwa nlekwasị anya nke inwe temple dị 100 n’ọrụ n’afọ 2000.