Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
15. Temple Nauvoo


15. Temple Nauvoo

Temple Nauvoo nke a e n̄omiri ihe ntụ skelu ka e tinyere n’ebe e wuru temple nke izizi ahụ. E wuru temple ahụ jiri nkume lime ọcha dịtụ ojii sitere n’ime obodo ahụ. Ụlọ ahụ ka a tụrụ 39 mita n’ogologo, na 27 mita na mbara. Elu nke ụlọ-elu tọwa ya dị 48 mita n’elu ala. Ndị-otu Nzukọ-nsọ chụrụ aja nile dị ukwuu iwu temple ọma nke a, na-amalite ọrụ n’afọ 1841. Ụfọdụ rụrụ ọrụ maka ọtụtụ ọnwa n’ụlọ ahụ; ndị ọzọ chụrụ-aja nke ego ha, Na-agbanyeghị na a rụchaghị ya n’uju, temple ahụ ka ndị-otu na-abịa maka emume-nsọ nile jupụtara ọnụ n’ọnwa nile tutu mgbapụ ha gaa ọdịda-anyanwụ. Mgbe ọtụtụ Ndị-nsọ hapụrụ Nauvoo na mmalite Udu-mmiri nke 1846 n’ihi mbá ihe-ike nke ndị na-agba aghara, otu ndị-ọrụ dị iche nọdụrụ n’azụ iwucha temple ahụ. Na 30 Epril 1846, Ndi-okenye Orson Hyde na Wilford Woodruff na ihe dịka 20 ndị-ọzọ raara ụlọ Onye-nwe nke a nye Chineke. A hapụrụ temple ahụ na Septemba mgbe a chụpụrụ ndị Otu Nzukọ-nsọ site na Nauvoo; ndi-ọgụ ndị na-agba aghara metọrọ na merụrụ ịdị nsọ nke ụlọ ahụ. Ọkụ bibiri ya n’Ọktoba 1848.

Ihe Omume nile dị Mkpa: E mere Ntụgharịkọta uche zuru ọha n’ime ụlọ ọgbakọ nke temple ahụ na 5 Ọktoba 1845. Ọrụ onyinye dị nsọ malitere na 10 Disemba 1845 na gara n’iru ruo 7 Februarị 1846. Ihe karịrị Ndị-nsọ Ụbọchụ-ikpeazụ dị 5,500 natara onyinye dị nsọ ha, e mekwara ọtụtụ baptism maka ndị nwụrụ anwụ, na emume nrachi nile.

Foto, oyiyi
foto 15

15. Temple Nauvoo Ụdị nke a na-egosi ịdị-mma izizi nke ihe owuwu ahụ tutu ndị iro nzukọ-nsọ agbaa ya ọkụ na 1848.

Bipụta