Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
13. Ụlọ Ebe-obibi dị na Nauvoo


13. Ụlọ Ebe-obibi dị na Nauvoo

Joseph Smith na ezi na ụlọ ya banyere n’Ụlọ Ebe-obibi dị na Nauvoo n’Ọugọst 1843. N’ikpeazụ a gbakwụnyere otu aka-ụlọ n’akụkụ ọwụwa-anyanwụ nke ụlọ ahụ maka inweta ọnụ ụlọ dị 22 ma a gbakọọ ha. Malite na Jenuarị 1844, Ebenezer Robinson lekọtara ụlọ ahụ dịka ụlọ-oriri ndị ije, na Onye-amụma lekọtara 6 n’ime ọnụ-ụlọ nile ahụ n’ihi ezi na ụlọ ya. Ụlọ ahụ rụrụ ọrụ dịka ebe etiti ibikọ ndụ ọnụ nke ndị otu mmekọrịta nke Nauvoo. Ndị dị mkpa a maara ama ka Onye-amụma nabatara n’ebe a.

Ihe Omume ndị dị Mkpa: Na 27 Jun 1844 Onye-amụma Joseph na nwanne ya nwoke Hyrum ka a gbara égbè na gbuo na Carthage, Illinois, na arụ ha ka e butara n’ụlọ a idina n’ụdị ichere tutu ruo olili ha. E liri ha n’otu obere ala ili-ozu nke ezi na ụlọ nanị a gafee Okporo-ụzọ ahụ, n’ọdịda-anyanwụ nke ebe-obibi ụlọ-osisi ochie ahụ nke Joseph biiri n’ime ya mgbe ọ biara nke mbụ na Nauvoo. Emma Smith biri n’Ụlọ Ebe-obibi ahụ ruo 1871. Mgbe ahụ ya akwabanye n’ime Ụlọ Nauvoo, ebe ọ nwụrụ n’afọ 1879.

Foto, oyiyi
foto 13

13. Ụlọ Ebe-obibi dị na Nauvoo Ebe-obibi ezi na ụlọ Onye-amụma Joseph Smith malite na 1843. N’ụbọchị ndị gboo nke Nzukọ-nsọ, nkea bụụrụ etiti ebe ibikọ ndụ-ọnụ n’etiti Ndị-nsọ.

Bipụta