Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
8. Ebe-obibi John Johnson


8. Ebe-obibi John Johnson

Ebe-obibi nke John na Alice Johnson ka e tinyere na Hiram, Ohio. Ọnụ ụlọ a dị na ala nke abụọ n’elu ụlọ-elu.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-amụma Joseph Smith na nwunye ya, Emma, biri n’ebe-obibi a. Joseph na Sidney Rigdon natara ọ̀hụ̀ ahụ dị ịtụ n’anya nke ogo nile nke ebube n’iru otutu ndị ọzọ na 16 Februarị 1832 (OznỌd. 76). Onye-amụma Joseph rụkwara ọrụ n’elu Ntụgharị-asụsụ nke Bible nke Joseph Smith mere (NAJS) n’ebe obibi a. Na 24 Maach 1832, mgbe Joseph na Emma na-ebi n’ebe a, otu ndị gọnarịrị okwukwe ji egbe na-agba aghara na ndị-mmegide Mọmọn tiri Joseph na Sidney ihe nke ukwu, wụzuo ha agba ojii na ábụ́bà ọkụkọ n’arụ ha nile.

foto 8

8. Ebe-obibi John Johnson Mgbe ha nọ n’ime ụlọ a na-arụ ọrụ nke ntụgharị asụsụ nke Bible, Onye-amụma Joseph Smith na Sidney Rigdon natara mkpughe ahụ e dekọtara ugbua n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 76, ya na mkpughe nile ndị ọzọ.