Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Foto nile nke Ebe nile nke Akụkọ Nzukọ-nsọ


Foto nile nke Ebe nile nke Akụkọ Nzukọ-nsọ

Foto nile ndịa nke ebe nile nke akụkọ Nzukọ-nsọ dị mkpa na-egosipụta ala nile ebe Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ gboo jere njem, ebe ndị-amụma nke ọhụrụ biworo ndụ, kụziri ihe, na ebe ọtụtụ ihe-omume nke akwụkwọ-nsọ nile mere. Iji nyere gị aka iwere foto nile ahụ mee ihe ka mma n’ọmụmụ ihe gị, foto nke ọbụla ka mkpirisi nkọwa nke ọma na-eso. Ọnụ-ọgụgụ nke nkọwa-nke-ọma ahụ na isi-ọkwu ahụ na-adakọrịta ha na foto ahụ na-enwe otu ọnụ-ọgụgụ na isi-ọkwu. Nkeji isi-ọkwu mbụ n’akwụkwọ nke na-eso isi-ọkwu nke nkọwa-nke-ọma ahụ na-akọwa usoro nke ihe nile gbasara foto ahụ, tinyere ihe nile dị mkpa ile anya na ọtụtụ mgbe mpaghara onye-ose foto chere iru. Ihe-omume nile dị mkpa nke akwụkwọ-nsọ sitere n’ebe ahụ ka e depụtara mgbe ahụ, ha na ntụnye nile nke akwụkwọ-nsọ otu ọ ga-abụ na i nwere ike imata ebe ị ga-agụ karịa banyere ihe omume nile ndị ahụ.

Bipụta