10. Ndagwurugwu nke Adam-ondi-Ahman
Na-ilegide anya mpaghara ọwụwa-anyanwụ ofe ndagwurugwu nke Adam-ondi-Ahman, otu ndagwurugwu mara mma dara jụụ dị na elu-elu nke ọdịda-anyanwụ Missouri dị nso n’onumara Gallatin.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Afọ atọ tutu ya anwụọ, Adam kpọbatara ụmụ ụmụ ya ndị ezi-omume n’ime ndagwurugwu a na nye n’elu ha ngọzi ikpe-azụ ya (OznỌd. 107:53–56). Na afọ 1838 Adam-ondi-Ahman bụụrụ ebe e tinyere otu ọnọdụ-obibi nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a dị agbata 500 na 1,000. Ndị-nsọ hapụrụ ọnọdụ-obibi a mgbe a chụpụrụ ha site na Missouri. Tutu ọbịbịa Kraịst nke Ugbo-abụọ n’ebube, Adam na ụmụ ụmụ ya ndị ezi-omume, nke gụnyere Ndị-nsọ nke Ọgbọ A kara-aka nile, ga-ezukọta ọzọ n’ime ndagwurugwu a izute Onye-nzọpụta (Dan. 7:9–10, 13–14; OznỌd. 27; 107:53–57; 116:1).