Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map nile na Ntụ-aka n’Usoro nke aha nile nke Ebe


Map nile na Ntụ-aka n’Usoro nke aha nile nke Ebe

Map nile ndia na-eso pụrụ inyere gị aka ịghọta akụkọ gboo nke Nzụkọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ ụbọchị-ikpeazụ nke ọma Karịa, na akwụkwọ-nsọ nile e kpughere site n’aka Onye-amụma Joseph Smith na ndị nọchiri ya. Site na-imara maka ọmụmụ gbasara ala na omume ya nke ala nile a kpara nkátá ha n’ime akwụkwọ-nsọ nile, ị pụrụ ịghọta ihe omume nile nke akwụkwọ-nsọ nke ọma karịa.

  1. Elu elu Ọwụwa Anyanwụ United States

  2. Palmyra-Manchester, 1820–1831

  3. Ebe New York, Pensylvania, na Ohio nke USA

  4. Kirtland, Ohio, 1830–1838

  5. Ebe Missouri, Illinois, na Iowa nke USA

  6. Njem Mpaghara Ọdịda Anyanwụ nke Nzukọ-nsọ

  7. Map nke Ụwa

Ntụ-aka n’usoro a bịị dịị nke aha nile-nke-ebe pụrụ inyere gị aka ịchọta otu ebe ọbụla na map ahụ nile. Ndedata ọbụla gụnyere ọnụ-ọgụgụ nke map ahụ nke ntụnyere usoro map nile nwere akụkụ anọ ha otu nke ngwakọta otu mkpuru okwu-ọnụ ọgụgụ mejupụtara ya sochiri. Maka ịma-atụ, nchọta nke Ebe arụsiri ike Hall ka e nyere dịka 6:B1; nke ahụ bụ, map nke 6, ihe nwere akụkụ anọ B1. I pụrụ ịchọta ụdị ihe nwere akụkụ anọ nile ahụ na map nke ọbụla site na-ịtụnyere nchịkwa nile ahụ dị n’ọnụ ọnụ na akụkụ nke map ahụ. Aha nile nke ebe nile nke na-adị n’usoro ka e depụtara n’akara mkpuchi; maka ịma-atụ, Council bluffs (Kanesville).

Nke na-eso bụ otu ọtụghe-ụzọ nke ịghọta akara nile di iche iche na ụdị iru mkpụrụ okwu mbipụta akwụkwọ e jiri mee ihe na map nile ahụ. Na-itinyere ya, map ọbụla n’onwe ya pụrụ inwe ọtụghe-ụzọ nile tinyere nkọwa nile nke ntụkwasị akara gbasara map nke ahụ.

Otu kpọm dị ọbara ọbara nọchitere anya otu nnukwu obodo ma-ọbụ otu obodo. Otu ahịrị nwere ike oge ụfọdụ rụọ aka site na kpọm ahụ ruo na aha nke nnukwu obodo ahụ ma-ọbụ ebe ọ dị.

Oke Osimiri Ukwu Atlantik

Iru Mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri mee ka a mata ebe nile nke ọmụmụ ala na omume ya nile, ndị dịka oke osimiri ukwu nile, oke osimiri nile, ọdọ mmiri nile, osimiri nile ugwu ukwu nile, ọzara nile, ndagwurugwu nile, ọzala nile, na ala nile mmiri gbara gburu gburu.

Palmyra

Iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri maka nnukwu obodo nile, na obodo nile.

New York

Iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri maka nkewapụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ka ịdị nta, dị ka ebe nile, na steeti nile nke U.S. na ọchịchị obodo nile.

Canada

Iru mkpụrụ mbipụta akwụkwọ a ka e jiri maka nkewapụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka ịdị ukwuu dị ka mba nile, ala nile na Kọntinenti nile.