3. Ụlọ Osisi nke Joseph Smith Ukwu
Nnọchi anya nke ebe-obibi Joseph Smith Ukwu, nke e wuru na ọnọdụ ụlọ osisi izizi ahụ dị nso na Palmyra, New York. Ọ bụ ezi na ụlọ Smith wuru nke izizi ahụ bụ otu ụlọ-elu na ọkara ebe-obibi e jiri osisi egbuturu egbutu wuo na-eteghị anya na mgbe ha rutere Palmyra.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-amụma Joseph Smith mụrụ ihe ọmụmụ Bible n’ime ụlọ a mgbe ọ gbara mbọ ịmata nzukọ-nsọ nke ziri ezi (A—JS 1:11–13). Moronaị pụtakwutere Joseph Smith na gwa ya banyere epekele nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn (A—JS 1:30–47).