Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
6. Ụlọ Osisi nke Peter Whitmer Ukwu


6. Ụlọ Osisi nke Peter Whitmer Ukwu

Ụlọ osisi a rụgharịrị a rụgharị nke Peter Whitmer Ukwu, e wuru n’elu ọnọdụ nke ntọ-ala nke ebe-obibi izizi ahụ na Fayette, New York.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Joseph Smith mezuru ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’ebe a na ngwucha Jun 1829. N’ime ọhịa dị nso n’ebe obibi a, ndị Aka-ebe Atọ hụrụ mụọ-ozi Moronaị na epekele Ọla-edo nile ahu. Igba-ama ha ka e bipụtara ugbua n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn ọbụla. Na 6 Epril 1830, ihe dịka ndị mmadụ 60 zukọtara na ebe obibi Peter Whitmer ahụ ìgba aka-ebe nke nhazi nke Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst. Nzụkọ mbụ nile na ọgbakọ nile nke Nzukọ-nsọ nta ahụ ka e mere n’ebe a. Iri abụọ n’ime mkpughe nile dị n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile ka a natara n’ebe obibi Peter Whitmer.

Foto, oyiyi
foto 6

6. Ụlọ-osisi Peter Whitmer Ukwu Nnọchite anya nke a ka Nzukọ-nsọ wuru n’elu ebe a haziri Nzukọ-nsọ na 6 Epril 1830.

Bipụta