5. Osimiri Susquehanna
Foto nke a na-egosi Osimiri Susquehanna n’Obodo mepere emepe nke Harmony, Pennsylvania.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Joseph Smith nta bịara na Harmony nke mbụ n’afọ 1825 ịchọ ọrụ. Ya na nna ya nwetara ụlọ na nso ebe a n’ime ebe obibi nke Isaac Hale, ebe Joseph zutere Emma Hale nke mbụ, nwunye ya n’ọdịniru (A—JS 1:56–57). Joseph na Emma lụrụ alụlụ na 18 Jenuarị 1827. Onye-amụma ahụ natara epekele ọla-edo nile na 22 Septemba 1827 na Manchester, New York, ma na-eteghị anya mgbe nke a gasịrị, ya na Emma soro gaa Harmony, ebe ọ malitere ịtụgharị asụsụ epekele nile ahụ n’ebe obibi nta ha dị nso n’osimiri ahụ. N’oge mgbe ha na atụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Joseph na Oliver Cowdery chọrọ imata karịa banyere baptism, na jere ije gaa n’osimiri ahụ ikpe ekpere nye Onye-nwe gbasara isi-ọkwu ahụ. N’ịza ekpere a, Jọn O Me Baptism pụtara ìhè na 15 Mee 1829 (A—JS 1:66–74; OznỌd. 13). O nyefere Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn n’elu Joseph na Oliver. Mgbe ahụ ha banyere n’ime osimiri a merịta kwa onwe ha baptism n’ihi nsachapụ mmehie nile. Jọn O Me Baptism nyere Joseph na Oliver ntụzi-aka ka ha chie onye na ibe ya echichi n’Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn. Ngwa ngwa nkea gasịrị, Pịta, Jemes, na Jọn pụtara ìhè n’akụkụ nke osimiri a na nyefee n’elu Joseph na Oliver Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek (OznỌd. 27:12–13; 128:20).