Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
12. Ụlọ Mkpọrọ Liberty


12. Ụlọ Mkpọrọ Liberty

Otu ụlọ mkpọrọ nta e tinyere na Liberty, Missouri. Joseph Smith na ụmụnna ise ndị ọzọ ka e jidere dịka ndị mkpọrọ n’ime mgbidi ya dị ntụ rula anọ n’agbidigbi site na 1 Disemba 1838 ruo 6 Epril 1839. (Sidney Rigdon ka Steti Missouri hapụrụ n’ọgwụgwụ nke Februarị.) N’otu ebe ka e debere ha n’ime ụlọ dị ala dị n’okpụrụ nke ụlọ ahụ, ha rahụrụ ụra n’elu okwute jụrụ oyi, n’ala ụlọ ahịhịa juru nke nwere ntakịrị ìhè na mgbochi na-ezughị oke site n’oyi nke oge-oyi.

Ihe Omume dị Mkpa: Onye-amụma Joseph na-arịọ arịrịọ n’ihi Puku nile nke Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-achụpụ site na Missouri, natara ọzịza nye ekpere ya, nke o dere n’ime leta nye Ndị-nsọ ahụ a chụpụrụ (OznỌd. 121–123).

Foto, oyiyi
foto 12

12. Ụlọ Mkpọrọ Liberty Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị-ezi n’ebe a (1838–1839), Onye-amụma Joseph Smith natara mkpughe ahụ e dekọtara ugbua n’ime Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121–123.

Bipụta