Joseph Smith—Matiu
Otu nhọta sitere na ntụgharị asụsụ nke Bible dịka e kpugheere ya Joseph Smith Onye-amụma n’afọ 1831: Matiu 23:39 na isi nke 24.
Isi 1
Jisus eburu-ụzọ kwupụta mbibi nke Jerusalem nke gaje ịdị n’oge dị nso—O wee na-ekwukwa maka ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Ọkpara nke Mmadụ, na mbibi nke ndị ajọọ mmadụ.
1 N’ihi na-asị m unu, na unu agaghị ahụ m site ugbụ a gawa na mara na a bụ m ya onye nke ndị amụma deworo maka ya, ruo mgbe unu ga-asị: Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha nke Onye-nwe, n’igwe ojii nile nke elu-igwe, na ndị mụọ-ozi nile dị nsọ tinyere ya. Mgbe ahụ ka ndị na-eso-ụzọ ya ghọtara na ọ na-abịa ọzọ n’ụwa, mgbe e nyesịworo ya ebube na kpube ya okpu-eze n’aka-nri nke Chineke.
2 Na Jisus we si na temple pụọ; na ndị na-eso-ụzọ ya wee bịakwute ya, maka ị nụrụ ya, na-asị: Nna-ukwu, gosi anyị banyere owuwu ụlọ nile nke temple, dịka ị kwuworo sị—A ga-akwatu ha, na hapụrụ unu ya ka ọ tọgbọrọ n’efu.
3 Jisus wee sị kwa ha: Unu ahụghị ihe ndị a nile, ọ bụ na unu aghọtaghị kwa ha? N’ezie asị m unu, a gaghị ahapụ n’ebe a, n’elu temple nke a, otu nkume n’elu ibe ya nke na-agaghị akwatu.
4 Na Jisus wee hapụ ha, na wee rigoro n’elu Ugwu ukwu nke Olive. Na ọ na-anọdụ n’elu Ugwu ukwu Olive, ndị na-eso-ụzọ ahụ wee bịakwute ya iche, na-asị: Gwa anyị olee mgbe ihe ndị a nile ga-abụ nke I kwuworo gbasara mbibi nke temple, na ndị Juu; na gịnị ga-abụ ihe iriba-ama nke ọbịbịa gị, na nke ọgwụgwụ nke ụwa, ma-ọbụ mbibi nke ndị ajọọ mmadụ, nke bụ ọgwụgwụ nke ụwa?
5 Na Jisus wee zaa, sị kwa ha: Lezie nụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu;
6 N’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, na-asị—Mụ onwe m bụ Kraịst—ha ga kwa eduhie ọtụtụ;
7 Mgbe ahụ ka ha ga-arara unu nye ka a kpagbue unu, ha ga-egbukwa unu, mba nile ga-akpọ kwa unu asị n’ihi aha m;
8 Na mgbe ahụ otutu ka a ga-emejo, na ga-arara kwa ibe ha nye, na ga-akpọ ibe ha asị;
9 Ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-ebili kwa, na ga-eduhie ọtụtụ mmadụ;
10 Na n’ihi n’oke-ajọọ-omume ga-aba ụba, ịhụnanya nke ọtụtụ ga-ajụ oyi;
11 Mana onye na-anọgidesi ike na e merighị ya, onye ahụ kwa ka a ga-azọpụta.
12 Ya mere, mgbe unu, ga-ahụ ihe-arụ nke ịtọgbọrọ n’efu, nke Daniel onye-amụma kwuwororị, gbasara mbibi nke Jerusalem, mgbe ahụ unu ga-eguzo n’ime ebe ahụ dị nsọ; onye ọbụla na-agụ, ya ghọta.
13 Mgbe ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga n’ugwu ukwu nile;
14 Ka onye ahụ nke nọ n’elu ụlọ gbalaga, na ghara ịlọta iwepụ ihe ọbụla ezi site n’ụlọ ya;
15 Onye nọ n’ubi ya ghara ịlaghachi azụ ka o were uwe ya nile;
16 Na ahụhụ ga-adịrị ha bụ ndị dị ime, na ndị na-enye nwa ara n’ụbọchị ndị ahụ;
17 Ya mere, kpeerenụ Onye-nwe ka mgbapụ unu ghara ịbụ na mgbe oyi, ma-ọbụ n’Ụbọchị Izu-ike;
18 N’ihi na mgbe ahụ, n’ụbọchị ndị ahụ, ka nnukwu mkpagbu ga-adị n’arụ ndị Juu, na n’arụ ndị nile bi na Jerusalem, ụdị nke na e zitabeghị mbụ n’elu Israel, site na Chineke, ke mgbe mmalite nke ala-eze ha ruo oge nke a; é-è, ma-ọbụghị na a ga-ezite ya ọzọ n’elu Israel ruo mgbe nile.
19 Ihe nile nke dakwasịworo ha bụ nanị mmalite iru uju nile nke ga abịakwasị ha.
20 Na ewezuga na a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirisi, a gaghị enwe otu n’anụ arụ ha nke a zọpụtara, mana n’ihi ndị a họpụtara dịka ọgbụgba-ndụ ahụ, a ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirisi.
21 Lee, ihe ndị a nile ka m kwuworo nye unu banyere ndị Juu; na ọzọ mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ nke ga-abịakwasị Jerusalem gasịrị, ọbụrụ na onye ọbụla ga-asị unu, Lee ebe a ka Kraịst nọ, ma-ọbụ n’ebe ahụ, unu ekwela;
22 N’ihi n’ụbọchị ndị ahụ Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, ha gakwa egosi nnukwu ihe iriba-ama nile na ihe ebube nile nke ga-adị ukwuu na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-eduhie ọbụna ndị a họpụtara, ndị bụ ndị a họpụtara dịka ọgbụgba-ndụ ahụ siri dị.
23 Lee, a na m ekwu ihe ndị a nile nye unu n’ihi ndị a họpụtaworo; na unu kwa ga-anụ maka agha nile, na asịrị nile nke agha nile; hụ na unu esogbughị onwe unu, n’ihi na ihe dum m gwaworo unu garịrị apụta; mana ọgwụgwụ ahụ a ka erughị.
24 Lee, agwawo m unu mgbe ha na-emebeghị;
25 Ya mere, ọbụrụ na ha ga-asị unu: Lee ọ nọ n’ime ọzara; unu agapụla: Lee ọ nọ n’ime ụlọ nzuzo; unu ekwela;
26 N’ihi dịka ìhè nke ụtụtụ na-apụta site n’ọwụwa anyanwụ, na na-amụke ọbụna ruo n’ọdịda anyanwụ, na na-ekpuchi ụwa dum, ótú ahụ kwa ka ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ ga-adị.
27 Na ugbua ana m atụrụ unu otu ilu. Lee ebe ọbụla ozu dị, n’ebe ahụ ka ugo nile na ezukọta ọnụ; otu ahụ kwa ka ndị nke m a họpụtaworo ka a ga-ekpokọta site n’akụkụ anọ nile nke ụwa.
28 Na ha gaje ịnụ maka agha nile, na asịrị nke agha nile.
29 Lee ana m ekwu n’ihi ndị nke m a họpụtaworo, n’ihi na mba ga-ebili imegide mba ọzọ, na ala-eze imegide ala-eze ọzọ; a ga-enwe ụnwụ nile, na ajọọ ọrịa nile, na ala-ọma jijiji nile n’ebe dị iche iche.
30 Ọzọ kwa, n’ihi na oke ajọọ-omume ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị mmadụ ga-ajụ oyi; mana onye nke ekwensu na-agaghị emeri, onye ahụ kwa ka a ga-azọpụta.
31 Ọzọ kwa, Ozi-ọma nke a nke Ala-eze ka a ga-ekwusa n’ime ụwa nile, maka aka-ebe nye mba nile, na mgbe-ahụ ka ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, ma-ọbụ mbibi nke ndị ajọọ mmadụ;
32 Ọzọ kwa ihe-arụ ahụ nke ịtọgbọrọ n’efu, nke Daniel onye-amụma kwuworo maka ya, ka a ga-emezu.
33 Na ngwa ngwa mgbe mkpagbu ahụ nke ụbọchị nile ndị ahụ gasịrị; anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè nke ya, kpakpando nile ga-ada kwa site n’elu-igwe, a ga-eme kwa ka ike nile nke elu-igwe maa jijiji.
34 N’ezie, asị m unu, ọgbọ nke a, nke a ga-egosipụta ihe ndị a, a gaghị agabiga ruo mgbe ihe nile m gwaworo unu ga-emezu.
35 Na-agbanyeghị, ụbọchị nile ahụ ga-abịa, na elu-igwe na ụwa ga-agabiga; ma okwu m nile agaghị agabiga, mana ha nile ka a ga-emezurịrị.
36 Na dịka m kwuworo na mbụ, mgbe oke mkpagbu nke ụbọchị nile ndị ahụ gasịrị, na a ga-eme ka ike nile nke elu-igwe maa jijiji, mgbe ahụ ka ihe iriba-ama nke Ọkpara nke Mmadụ ga-apụta ìhè n’elu-igwe, mgbe ahụ kwa ka agbụrụ nile nke ụwa ga-eru uju, ha ga kwa ahụ Ọkpara nke Mmadụ ka ọ na-abịa n’igwe-ojii nile nke elu-igwe, jiri ike na nnukwu ebube;
37 Na onye nke kpadokọlitere okwu m dịka akụ, a gaghị eduhie ya, n’ihi na Ọkpara nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-eziga ndị mụọ-ozi ya n’iru ya jiri ụda opi, ha ga-akpọkọta kwa n’otu ndị nke ya a họpụtara nke fọdụrụ site n’ifufe anọ nile, site n’otu nsọtụ elu-igwe ruo na nke ọzọ.
38 Ugbua mụta nụ ilu nke osisi fig—Mgbe ngalaba ya nile ka dị nro, ọ na-amalite kwa iwepụta akwụkwọ ndụ, gị mata n’oge okpom-ọkụ adịwo nso;
39 Otu ahụ kwa, ndị nke m a hopụtaworo, mgbe ha ga-ahụ ihe ndị a nile, ha ga-amata na ọ nọ nso, ọbụna n’ọnụ ụzọ nile;
40 Mana banyere ụbọchị ahụ, na awa, ọdịghị onye ọbụla matara; e e, mụọ-ozi nile nke Chineke n’elu-igwe a mataghị, kama Nna m nanị matara.
41 Mana dịka ọ dịịrị n’ụbọchị nile nke Noa, otu ahụ ka ọ ga-adị kwa n’ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ;
42 N’ihi na ọ ga-adịrị ha, dịka ọ dịịrị n’ụbọchị nile ahụ nke dịịrị tutu idè mmiri ahụ; n’ihi ruo ụbọchị ahụ mgbe Noa banyere n’ime ụgbọ ha naara eri-ihe na-an̄ụkwa ihe on̄ụn̄ụ, na-alụ nwunye, na-enye kwa n’ọlụlụ di;
43 Ha amaghị kwa ruo mgbe ídè mmiri ahụ bịara, kpọrọ kwa ha nile pụọ; otu ahụ kwa ka ọbịbịa Ọkpara nke Mmadụ ga-adị.
44 Mgbe ahụ ka a ga-emezu nke ahụ e deworo, na n’ụbọchị nile nke ikpe-azụ, mmadụ abụọ ga-anọ n’ime ubi, a ga-ewere otu, hapụ kwa nke ọzọ.
45 Mmadụ abụọ ga na-egwe nri na nkume-igwe-nri, a ga-ewere otu, hapụkwa nke ọzọ;
46 Ihe m kwuru nye otu mmadụ ka m kwuru nye kwa mmadụ nile; ya mere, na-eche nụ nche n’ihi na unu amataghị oge awa Onye-nwe unu na-abịa.
47 Mana unu mara nke a, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ matararịị n’oge nche mgbe onye-ori ga-abịa, ọ gaararị na-eche nche, o gaaraghị ekwe ka e gbukapụ ụlọ ya, mana ọ gaara a nọ na njikere.
48 Ya mere nọdụkwa nụ na njikere, n’ihi n’oge awa ahụ nke unu na-echeghị, ka Ọkpara nke Mmadụ na-abịa.
49 Onye, kwa, bụ nwa-odibo ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche, nke onye-nwe ya mere onye-isi n’ezi na ụlọ ya, inye ha nri n’oge ya?
50 Ngọzi na-adịrị nwa-odibo ahụ onye mgbe onye-nwe ya ga-abịa, ọ ga-achọta ya ka ọ na-eme otu ahụ; na n’ezie asị m unu, ọ ga-eme ya onye-ọchịchị n’ihe nile o nwere.
51 Mana ọbụrụ na nwa-odibo ọjọọ ahụ ga-asị n’ime obi ya: Onye-nwe m na-egbu oge nke ọbịbịa ya,
52 Na ga-amalite iti ndị-odibo ibe ya ihe, na-esoro ndị na-an̄ụbiga mmanya oke na-eri na an̄ụkwa;
53 Onye-nwe nke nwa-odibo ahụ ga-abịa n’otu ụbọchị mgbe na ọ leghị anya ya, na n’oge awa nke na ọ mataghị.
54 Ọ ga-egbubi kwa ya mkpirisi abụọ, ga-enye kwa ya òkè ya n’etiti ndị iru-abụọ; ebe ahụ ka ịkwa akwa na ịta ikikere-eze ga-adị.
55 Otu a kwa ka ọgwụgwụ nke ndị ajọọ mmadụ ga-esi bịa, dịka ibu amụma nke Moses siri dị, na-asị: A ga-ebepụ ha site n’etiti ndị mmadụ ahụ; mana ọgwụgwụ nke ụwa a ka erubeghị, kama ga-abịarịrị.