Ọgbakọ Zuru ọha
Ike nke Ike Ime Mmụọ Ji Na-abịa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


17:18

Ike nke Ike Ime Mmụọ Ji Na-abịa

Ọ ga-amasị m ịtụpụta kpọm kwem ụzọ ihe omume ise anyị nwere ike iwere iji nyere anyị aka jigide ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, a hụrụ m unu naanya. Ohere ịgwa unu okwu taa na-amasị m. Ekpere m kwa ụbọchị bụ ka unu nwee nchekwa sita na ajọọ mmeso nke onye iro ma nwee ume ịdị na-aganiihu emeri ihe aka mgba niile unu na-ezute.

Ụfọdụ nnwale bụ ibu arọ dịịrị onwe dị oke omimi nke onye ọbụla ọzọ na-enweghị ike ịhụ. Ndị ọzọ na-apụta ihe n’elu nkwago ụwa. Ọgụ eji ngwa agha alụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Europe bụ otu niime ndị a. Agawo m Ukraine na Russia ọtụtụ mgbe. A hụrụ m ala ndị ahụ, ndị dị iche iche, na asụsụ ha naanya. Ana m ebe akwa ma na-ekpe ekpere maka ndị niile bụ ndị o metụtara site na-agha nke a. Nzukọ nsọ na-eme ihe niile anyị nwere iji nyere ndị na-ata ahụhụ ma na-agba mbọ ịnya ndụ aka. Anyị na-akpọku onye ọbụla ka a gaaniihu n’ibu ọnụ na ikpe ekpere maka ndị niile a na-emerụ ahụ site na nnukwu ọdachi nke a. Agha bụ oke ihe dị egwu na-emebi ihe niile Onyenwe anyị Jizọs Kraist kuziri ma guzoro na ya.

O nweghị onye ọbụla niime anyị nwere ike ịchịkwata mba niile ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-eme ma ọbụnadị ndị otu ezi na ụlọ nke onwe anyị. Mana anyị n’otu n’otu nwere ike ịchịkwata onwe anyị. Oku m na-akpọ taa, ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ ka akwụsị esemokwu niile ahụ na-ere ọkụ niime obi unu, ebe obibi unu, na niime ndụ unu. Lienụ ihe ọbụla na ihe niile na-eme ka inwee agụụ imerụ ndị ọzọ ahụ—amaghị ma ihe ndị ahụ na-eme ka inwe agụụ ọ bụ iwe, ire nkọ, ma ọ bụ mkpọrọm asị maka onye mere gị ihe ọjọọ. Onye Nzọpụta nyere anyị iwu ịtụgharị akụkụ nti nke ọzọ,1 iji hụ ndị iro anyị naanya, na ikpere ndị na-emegbu anyị ekpere.2

O nwere ike ị bụ ihe mgbu rara ezigbo ahụ ịhapụ iwe na-eme nnọọ ka ihe ziri ezi. O nwere ike yie ihe na-ekweghị omume ịgbaghara ndị ahụ bụ ndị ihe omume mmebi ha na-emerụ ndị enweghị ụta ahụ Ma dị ka ọ dị, Onye Nzọpụta dọrọ anyị aka na ntị ị “gbaghara mmadụ niile.”3

Anyị bụ ndị na-eso Onyeisi Udo. Ma ugbu a karịsịa oge niile, anyị chọrọ udo nke naanị Ya nwere ike iweta. Olee otu anyị nwere ike isi atụanya udo ịdị n’ụwa mgbe anyị na-anaghị, n’otu n’otu achọ udo na nkwekọrịta? Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ama m na ihe m na-atụnye uche adịghị mfe. Mana ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraist kwesịrị ihiwe ọmụmaatụ ahụ nke ndị ụwa niile ga-eso. Ana m arịọ unu ka unu mee ihe niile unu nwere ike ime iji kwụsị esemokwu nke onwe nke na-ere oke ọkụ n’obi unu na niime ndụ unu ugbu a.

Ka m kpọsie oku ime ihe nke a ike site na-ịkpa nkata n’otu ihe mbu nuuche nke echetaara m na nso nso a mgbe m na-ekiri egwuregwu basketbọl.

Niime egwuregwu ahụ, ọkara nke mbụ bụụra agha seesaw, ihu na azụ. Emesịa, n’oge tịkọm tịkọm ise nke ikpeazụ nke ọkara nke mbụ, onye nche nke otu otu mere ọmarịcha three-point shot. Site na naanị otu tịkọm fọdụrụ, ndị otu egwuruegwu ya zooro pass na-abata ma mee basket ọzọ na buzzer! Ya mere ndị otu egwuruegwu ahụ banyere ọnụụlọ njikwa ma bu ụzọ nwee point anọ, site n’ike na-abịa na-ekwo ekwo doro anya. Ha weere ike ahụ na-abịa banye n’ọkara nke abụọ ma merie n’egwuregwu ahụ.

Ike na-abịa abịa bụ echiche siri ike. Anyị niile enwetawo nhụmiihe ya n’otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ—na-ịmaatụ, niime ụgbọ ala na-agbasi ike ma ọ bụ site na-enweghị nkwekọrịta dabara na-ịrụ ụka n’otu ntabi anya.

Ya mere ana m ajụ, “Gịnị nwere ike kpalie ike na-abịa abịa nke ime mmụọ? Anyị a hụwo ọtụtụ ihe ịmaatụ banyere ike na-abịa abịa ma nke na-enye aka na ma nke na-anaghị enye aka. Anyị ma ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraist ndị a tọghatara ma ha etoo n’okwukwe ha. Mana anyị makwa ndị bụ ndị dị nkọ kwere ekwe na mbụ mesịa dapụrụ. Ike na-abịa abịa nwere ike ifegharị ụzọ ọbụla.

Enwetụbeghị mgbe anyị chọrọ ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka karịa ka anyị chọrọ ya ugbu a, iji megide ma kwụsị ọsọ nke ihe ọjọọ na ihe ịrịba ama niile kacha njọ ana ahụta ugbu a ji na-esiwanye ike. Ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka ga-enyere anyị aka ịdị na-aganiihu n’etiti ụjọ na amaghị ka esi kwụrụ nke ọrịa mkpochapụ, tsunamis, mgbawa ugwu, na ndị ọgụ obi tara mmiri butere. Ike na-abịa abịa nke ime mmụọ nwere ike nyere anyị aka guzogide ajọọ mbuso agha nke onye iro na-anaghị akwụsị akwụsị ma nyụọ ka ọkụ mbọ ya ihichapụ ntọala nke ime mmụọ nke onwe anyị.

Ọtụtụ ejiri mara nwere ike ịkpake ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka. Nrube isi, ịhụnaanya, ịdị umeala n’obi, ozi, na afọ ojuju4 bụ ma ole ma ole.

Ụbọchị taa, ọ ga-amasị m ịtụpụta kpọm kwem ụzọ ihe omume ise anyị nwere ike iwere iji nyere anyị aka jigide ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka.

Nke mbụ: Banye n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma nọrọ ebe ahụ.

Mgbe na-adịghị anya, a rọrọ m otu nrọ doro anya niime nke m zutere otu nnukwu igwe mmadụ. Ha jụrụ m ọtụtụ ajụjụ, nke a kachasị jụọ niime ha bụ ihe gbasara ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ na gịnị mere o ji dị oke mkpa.

Niime nrọ m, a kọwara m na anyị na-aba nụzọ ọgbụgba ndụ site na-ime baptizim na anyị na Chineke ime ọgbụgba ndụ nke mbụ.5 Oge ọbụla anyị riri oriri nsọ, anyị na-ekwe nkwa ọzọ i wekwasị onwe anyị aha nke Onye Nzọpụta, i cheta Ya, na idebe iwu nsọ Ya niile.6 Na nzaghachi, Chineke na-amasi anyị obi ike na anyị mgbe niile nwee Mmụọ nke Onyenwe anyị ịnọnyere anyị.

Emesịa anyị na-emekwa ọgbụgba ndụ ndị ọzọ agbakwunyere na tempụl, ebe anyị na-anata ọbụna nkwa ndị karịrị akarị. Emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile na-enye anyị ohere iji nwete ike si na chi. Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ naanị ụzọ nke na-eduba n’inwe mbuli elu na ndụ ebighị ebi.

Niime nrọ m, otu nwanyị jụrụ olee otu ndị mebiworo ọgbụgba ndụ ha ga-esi alaghachite azụ n’ụzọ ahụ. Azịza m nye ajụjụ ya na-eduba na ntụnye uche m nke abụọ:

Chọpụta ọńụ nke nchegharị kwa ụbọchị.

Kedụ ụdị mkpa nchegharị dị? Alma kụziri na anyị agaghị ekwusa ozi ọma ọbụla ma ọ bụghị nchegharị na okwukwe n’Onyenwe anyị.”7 Nchegharị bụ ihe a chọrọ n’aka onye ọ bụla ruru ogo inye nkọwapụta nke chọrọ ebube dị ebighị ebi.8 Enweghị ndị a gụpụrụ. N’otu mkpughe e nyere Onye amụma Josef Smit, Onyenwe anyị nyere ndị ndu Nzukọ nsọ oke ntaram ahụhụ maka a kụzighịrị ụmụ ha ozi ọma.9 Inwe nchegharị bụ ọtụghe nye ọganiihu. Okwukwe na-enweghị ntụpọ na-eme ka anyị na-aganiihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ.

Biko atụla ụjọ ma ọ bụ dọlaa azụ inwe nchegharị. Setan na-enwe ańụrị n’oke nchekasị nke obi gị. Gbuo ya mkpụmkpụ. Wezuga mmetụta ya n’ụzọ ndụ gị. Malite n’ụbọchị taa inweta nhụmiihe ọńụ nke iwezuga mmadụ anụ ahụ.10 Onye Nzọpụta hụrụ anyị naanya mgbe niile mana kachasị mgbe anyị chegharịrị. O kwere nkwa na na-agbanyeghị na ugwu ukwu niile ga-apụ, ma ugwu nta ka a ga-ewepụ … obi ọma m agaghị apụ n’ebe ị nọ.”11

Ọ bụrụ na i chere na ị kpafuwo n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ gatee aka ma ọ bụ ogologo oge ma nwekwaghị ụzọ ịlọghachị, nke ahụ abụghị nnọọ eziokwu.12 Biko kpọtụrụ bishọp gị ma ọ bụ onyeisi ngalaba nta gị. Ọ bụ onye nnọchi anya nke Onyenwe anyị ma ọ ga-enyere gị aka nwete nhụmiihe nke ọńụ na nnwere onwe nke nchegharị.

Ugbu a, okwu maka mkpachapụ anya: Ịlọghachi n’ụzọ ọgbụgba ndụ a pụtaghị na ndụ ga-adị mfe. Ụzọ nke a siri ike ma mgbe ụfọdụ ga-adị ka ugwu kpọnyere ọnụ n’ala n’ịrịgo. Nnyigoro elu nke a, ka osila dị, ka e mere iji nwalee ma kụziere anyị ihe, ịńụcha ọdịdị chi anyị, ma nyere anyị aka ịghọ Ndị nsọ. Ọ bụ naanị ụzọ nke na-eduba na mbuli elu. Otu onye amụma14 kọwara “ọnọdụ an̄ụrị a gọziri agọzi nke ndị ahụ na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke. N’ihi na lee, agọziri ha n’ihe niile ma n’ihe nke ahụ ma nke mmụọ; ma ọbụrụ na ha a nọgide n’okwukwe ruo n’ọgwụgwụ a ga-anabata ha n’ime eluigwe … [ma] binyere Chineke n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ.”15

Ịga n’ụzọ ọgbụgba ndụ, tinyere nchegharị kwa ụbọchị, na-akpake ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka.

Ntụnye uche m nke atọ: Mụọ ihe gbasara Chineke na ka O si arụ ọrụ.

Otu n’ime aka mgba anyị ndị kachasị taa bụ ịchọpụta ihe dị iche n’etiti eziokwu niile nke Chineke na adịgboloja nke Setan. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị ji dọọ anyị aka na ntị i “kpe ekpere oge niile, … ka [anyị] nwee ike merie Setan, ma … gbanarị aka nke ndị odibo Setan ndị na-akwado ọrụ ya.”16

Moses nyere otu ọmụmaatụ nke esi ahụzi nke ọma ihe dị iche n’etiti Chineke na Setan. Mgbe Setan bịara na-anwa ya ọnwụnwa, Moses chọpụtara aghụghọ ahụ niihi na ọ kpago nkata ihu na ihu ya na Chineke. Moses ghọtara ọsịsọ onye Setan bụ ma nye ya iwu ka ọ pụọ.17 Mgbe Setan tachiri obi ya, Moses maara otu esi akpọku Chineke maka enyem aka. Moses natara ume si na chi ma baara onye iro mba ọzọ, na-asị, “Si ebe m nọ pụọ, Setan, n’ihi na otu Chineke nke a naanị ka m ga-efe ofufe.”18

Anyị kwesịrị ịgbasoro ọmụmaatụ ahụ. Wezuga mmetụta Setan n’ụzọ ndụ gị. Biko esokwala ya gbada “n’olulu nke nhuju anya na ahụhụ na-enweghị nsọtụ ya.”19

N’ọsọ dị egwu, ama nke na-azụghị azụ kwa ụbọchị “site n’okwu dị mma nke Chineke”20 nwere ike tirisie. N’ụzọ dị otu a, ajụire nke atụmatụ Setan doro anya: anyị ga-achọ nhụmiihe niile kwa ụbọchị na-efe Onyenwe anyị ofufe ma na-amụ ozi ọma Ya. Ana m arịọ unu ka unu kwe ka Chineke merie n’ime ndụ unu. Nye Ya ezigbo ohere gị. Dị ka ị na-eme nke a, hụta ihe ga-eme na ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-enye aka nke gị.

Ntụnye uche nke 4: Chọọ ma tụọ anya ọrụ ebube niile.

Moronaị nyere anyị mmasi obi ike na “Chineke akwụsịbeghị ịbụ Chineke nke ọrụ ebube niile.”21 Akwụkwọ ọbụla nke akwụkwọ nsọ gosipụtara otu ịdị njikere Onyenwe anyị dị n’itinye ọnụ na ndụ ndị ahụ nke kwere na Ya.22 O kewara Oke Osimiri Uhie maka Moses, nyere Niphaị aka nwetakwa epekele bras niile, ma weghachite Nzukọ nsọ Ya site n’aka Onye amụma Josef Smit. Nke ọbụla niime ọrụ ebube ndị a weere oge ma nwere ike gaghị adị nnọọ kpọm kwem ka ihe ndị ahụ arịọburu Onyenwe anyị na mbụ.

N’otu aka ahụkwa, Onyenwe anyị ga-agọzi unu site n’ọrụ ebube niile ma ọ bụrụ naunu e kwere na Ya, “na-enweghị obi abụọ niihe ọbụla.”23 Rụọ ọrụ nke ime mmụọ ịchọ ọrụ ebube niile. Jiri ekpere rịọ Chineke inyere gị aka tinye ụdị okwukwe ahụ n’ọrụ. Ana m ekwe nkwa na i nwere ike nwee nhụmiihe maka onwe gị na Jizọs Kraist “na-enye onye dara mba ike; ma ndị ahụ na-enweghị ike ọ na-amụba ume ha.”24 Ihe ole ma ole ga-eme ka ike na-abịa abịa nke ime mmụọ na-aga ọsịsọ karịa ịmata na Onyenwe anyị na-enyere gị aka ibuli ugwu ukwu nọ niime ndụ gị.

Ntụnye uche nke 5: Kwụsị esemokwu niime ndụ nke onwe gị.

Ana m akpọgharị oku m ọzọ ịkwụsị esemokwu niile niime ndụ unu. Tinye n’ọrụ obi umeala, mgbam ume, na ume a chọrọ ma iji gbaghara ma chọọ mgbaghara. Onyenwe anyị ekwewo nkwa na “ọ bụrụ na [anyị] a gbaghara ndị ọzọ mmejọ ha, Nna [anyị] nke eluigwe gakwa agbaghara [anyị].”25

Izu ụka abụọ site n’ụbọchị taa anyị ga-eme mmemme Ista. Site n’oge ahụ ruo ugbua, ana m akpọkụ unu ka unu chọọ ụzọ kwụsị esemokwu nke onwe nke na-anyịda unu. Enwere ike inwe ụzọ kacha daba iji nye Jizọs Kraist ekele maka Aja mgbaghara mmehie Ya? Ọ bụrụ na mgbaghara mmehie oge ugbu a yiri ihe na-ekweghị omume, rịọ maka ike site na ọbara mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist iji nyere gị aka. Ka ị na-eme otu ahụ, ana m ekwe nkwa udo nke onwe na nnuputa nke ike na-abịa abịa nke ime mmụọ.

Mgbe Onye Nzọpụta chụrụ aja mgbaghara mmehie maka mmadụ niile, O meghere ụzọ ka ndị ahụ ga-eso Ya wee nwete ike nke ọgwụgwọ, ikwụdosi ike, na mgbapụta. Ohere niile nke ime mmụọ ndịa nọ maka mmadụ niile na-achọ ịnụ olu Ya ma soro Ya.

Ezi ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, na-ekele niile dị m n’obi, ana m arịọsi unu ike ka unu banye n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma nọrọ ebe ahụ. Nwete nhụmiihe ọńụ nke inwe nchegharị kwa ụbọchị. Mụọ ihe gbasara Chineke na otu O si arụ ọrụ. Chọọ ma tụọ anya ọrụ ebube niile. Gbasie mbọ ike ịkwụsị esemokwu niime ndụ gị.

Dị ka ị na-etinye ebum n’obi ndị a n’ọrụ, ana m ekwe gị nkwa ike iji aganiihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ jiri ike na-abịa abịa bara ụbara, na-agbanyeghị ọgbachi ọbụla ndị ị na-ezute Ma ana m ekwe unu nkwa ume kacha ukwuu iji gbanarị ọnwụnwa, nwee udo nke obi kacha ukwuu na nnwere onwe site n’ụjọ, na ịdị n’otu kacha ukwuu niime ezi na ulọ unu.

Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ! Ọ dị ndụ! Ọ hụrụ anyị n’anya ma Ọ ga-enyere anyị aka. Nke a ka m na-agba ama n’aha dị nsọ nke Onye Mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee 3 Nịfaị 12:39

  2. Lee 3 Nịfaị 12:44

  3. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:10; lee kwa amaokwu 9

  4. Dị ka Pọl Onyeozi kwuru, “Niime ihe niile nye ekele” (Ndị Tesolonịka 5:18). Otu niime ajụire maka enweghị olileanya, obi ịda mba, na ịda mba nke ime mmụọ akachasị mara bụ obi ekele. Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị nke anyị nwere ike iji nye Chineke ekele? Kelee Ya maka mma nke ụwa nke a, maka Mweghachite nke ozi ọma, na maka ụzọ ndị na-apụghị ịgụta ọnụ Ya na Ọkpara Ya mere ka ike ha dịịrị anyị ebe a n’elu ụwa nke a. Kelee Ha maka akwụkwọ nsọ, maka ndị mmụọ ozi nke na-aza arịrịọ anyị na-arịọ Chineke maka enyem aka, maka mkpughe, na maka ndị ezi na ụlọ dị ebighị ebi. Ma nke kachasị nke, kelee Chineke maka onyinye nke Ọkpara Ya na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist, nke mere ka okwe anyị omume imejuputa ozi niile bụ nke e jiri zite anyị n’ụwa.

  5. Maka ịghọta ụzọ nke ọgbụgba ndụ, ọ dị mkpa ịghọta na ọgbụgba ndụ gụnyere mkpebi aka abụọ dị n’etiti Chineke na otu niime ụmụ Ya. Niime otu ọgbụgba ndụ, Chineke na-ehiwe ụkpụrụ ha, ma anyị e kwenye na ụkpụrụ ndị ahụ. Na mgbanwe, Chineke na-ekwe anyị nkwa. Ọtụtụ ọgbụgba ndụ na enwe nsotara site na akara ndị anya na-ahụ—ma ọ bụ emume nsọ niile dị nsọ—niime nke anyị na-eso ihe anyị na ndị aka ebe nọ ebe ahụ. Na ịmaatụ, baptizim bụ otu akara nye Onyenwe anyị na onye ahụ a na-eme baptizim emewo ọgbụgba ndụ idebe iwu nsọ niile nke Chineke.

  6. Lee Moronaị 4:3; 5:2; Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 20:77, 79

  7. Mosiah 18:20

  8. Lee Moses 6:50, 57

  9. See Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:40–48

  10. Lee Mosaia 3:19

  11. Aịzaya 54:10nkwusi ike agbakwunyere; leekwa 3 Nifaị 22:10 Obi ọma bụ ihe atụgharịrị asụsụ ya site n’ihe a kpọrọ hesed, mkpụrụ okwu dị ike nwere mpụtara dị omimi nke gụnyechara obi ọma, ebere, ịhụnaanya ọgbụgba ndụ, na ọtụtụ ndị ọzọ.

  12. O kwere omume ime nkwụghachi ụgwọ maka ụfọdụ mmehie mana ọ bụghị ndị ọzọ. Ọ bụrụ na otu onye akparịa ma ọ bụ buso onye ọzọ ọgụ, ma ọ bụ ọ bụrụ na mmadụ ewepụ ndụ onye ọzọ, enweghị ike eme nkwụghachi ụgwọ n’uju. Onye mehiere n’ọnọdụ ndị ahụ nwere ike ime naanị ihe dị ukwuu, ma ihe nnukwu fọdụrụ ka a hapụrụ ijide n’ụgwọ. Niihi ịdị njikere nke Onyenwe anyị ịgbaghara nke fọdụrụ n’oge ya, anyị nwere ike bịakwute Ya na-agbanyeghị otu ọha anya anyị kpafuworo si dị. Mgbe anyị chegharịrị site n’obi anyị niile, Ọ ga-agbaghara anyị. Nke ọbụla fọdụrụ eji ụgwọ ya n’etiti mmehie anyị na ike anyị ime nkwụghachi ụgwọ n’uju ka e nwere ike ịkwụ naanị site n’itinye Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist n’ọrụ, onye nwere ike nye onyinye nke ebere. Ịdị na njikere Ya ịgbaghara ụgwọ anyị jifọrọ bụ onyinye na-enweghị atụ.

  13. Lee 2 Nifaị 31:18–20

  14. Eze Benjamin onye amụma nke ndị Nifaị.

  15. Mosaịa 2:41

  16. Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 10:5; nkwusi ike agbakwunyere.

  17. Lee Moses 1:16; leekwa amaokwu 1: 1– 20

  18. Moses 1:20

  19. Helaman 5:12

  20. Moronaị 6:4

  21. Mọmọn 9:15; leekwa amaokwu 19.

  22. Jọn Onyeozi mara ọkwa na ya deturu ọrụ ebube niile nke Onye Nzọpụta ka ọ bụrụ “na [anyị] ga-enwe ike kwere na Jizọs bụ Kraịst ahụ” (Jọn 20:31).

  23. Mọmọn 9:21

  24. Aịzaya 40:29

  25. Matiu 6:14