Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map 12: Jerusalem n’oge nke Jisus


Map 12

Jerusalem n’oge nke Jisus

Foto, oyiyi
Map Bible nsọ 12

N

Ọtụghe-ụzọ nke Map 12

Nnukwu obodo ahụ n’oge Jisus

Ebe nile e wuru mgbidi n’ikpe-azụ

Uzọ gara Samerịa

Bezeta (New City)

Gọlgọta

Ili Ogige-ubi

Ọdọ mmiri nta Betesda

Ọnụ-ụzọ ama azụ

Ebe a rụsiri ike Antonia

Ọdọ mmiri nta nke Israel

Ogige-ubi Getsemane

Ọnụ-ụzọ ama Susa

Ọnụ-ụzọ ama Atụrụ

Ọnụ-ụzọ Solomọn

Temple

Ugwu Olives

Àkwà mmiri

Ọnụ-ụzọ ama Ọma

Ụzọ gara Emeus na Jọpa

Odo mmiri nta nke Tọwa

Ụzọ gara Betani na Jeriko

Elu-akụkụ Temple

Obi-eze Hasmonia

Ọnụ-ụzọ nke ndi eze

Ụzọ mmiri a rụrụ-arụ

Obi-eze Herọd

Nzọ-ụkwụ e si arigo Temple

Isi mmiri Gaịhon

Ọdọ mmiri nta agwọ

Nnukwu-obodo elu elu

Ụzọ mmiri a rụrụ-aru

Ụlọ Kaịfas

Ụzọ-mmiri nke Hezekaịa

Ndagwungwu Hinọm

Ọnụ-ụzọ ama mmiri

Ndagwurugwu Kidrọn

Nnukwu-obodo ala ala

Ọdọ mmiri nta nke Sailoam

Ọnụ-ụzọ ama mmiri

Ụzọ gara Betlehem na Hebrọn

Isi mmiri En-rogel

Ụzọ gara Oke-osimiri Nwụrụ Anwu

Mita nile

0 100 200 300 400

A B C D

1 2 3 4 5 6 7 8

●1

●2

●3

●4

●5

●6

●7

●8

●9

●10

●11

●12

●13

●14

●15

●16

●17

●18

  1. Gọlgọta Ọnọdụ ebe kwere omume ịbụ maka mkpọgide n’obe nke Jisus (Mat. 27:33–37).

  2. Ili Ogige Ubi E liri Jisus (Jọn 19:38–42). Kraịst ahụ nke biliworo n’ọnwụ pụtara ìhè nye Meri Magdalin n’ime ogige ubi ahụ (Jọn 20:1–17).

  3. Ebe a rụsiri ike Antonia Ikekwe e boro Jisus ebubo, ma ya ikpe, mee akaja na pia ya ụtarị n’ọnọdụ ebe a (Jọn 18:28–19:16). E jidere Pọl, na ọ kọgharịrị akụkọ nke mgbanwe ya (Ọlndoz. 21:31–22:21).

  4. Ọdọ-mmiri nta nke Betesda Jisus gwọrọ otu onye na abaghị uru na ụbọchị izu-ike (Jọn 5:2–9).

  5. Temple Gebriel kwere Zakaraịa nkwa na Elizabet ga-amụ otu nwa nwoke (Luk 1:5–25). Akwa mkpuchi nke temple ka a dọwara n’ọnwụ nke Onye-nzọpụta (Mat. 27:51).

  6. Ọnụ-ụzọ Solomon Jisus mara-ọkwa na ya bụ Ọkpara nke Chineke. Ndị Juu chọrọ ịtụ ya nkume (Jọn 10:22–39). Pịta kwusara ozi-ọma nchegharị mgbe ọ gwọsịrị otu nwoke dara ngwọrọ (Ọlndoz. 3:11–26).

  7. Ọnụ ụzọ ama Ọma Pịta na Jọn gwọrọ otu onye ngwọrụ (Ọlndoz. 3:1–10).

  8. Elu akụkụ nke Temple Setan nwara Jisus ọnwụnwa (Mat. 4:5–7). (E nwere ebe ọdịnala abụọ dị maka ihe omume a.)

  9. Ugwu dị Nsọ (e gosighị ebe ọ dị).

    1. N’ọdịnala ndị mmadụ kwere na ebea ka Abraham rụrụ otu ebe ịchụ-aja maka ichu-aja nke Aịsak (Jen. 22:9–14).

    2. Solomon rụrụ temple ahụ (1 Ndez. 6:1–10; 2 Ihem. 3:1).

    3. Ndị Babịlọn bibiri temple ahụ n’afọ dịka 587 Tutu a mụọ Kraịst (2 Ndez. 25:8–9).

    4. Zerubabel rụgharịrị temple ahụ n’afọ dịka 515 tutu a mụọ Kraịst (Ezra 3:8–10; 5:2; 6:14–16).

    5. Herọd mere ka ebe ịzụ-ahịa nke temple ahụ dị mbara karịa na rụgharịrị temple ahụ malite n’afo 17 tutu a mụọ Kraịst. E kụtara Jisus gosi ya dịka nwa a mụrụ ọhụrụ (Luk 2:22–39).

    6. Na mgbe ọ dị afọ 12, Jisus kuziri ihe na temple ahụ (Luk 2:41–50).

    7. Jisus mere ka temple ahụ dị ọcha (Mat. 21:12–16; Jọn 2:13–17).

    8. Jisus kụziri ihe na temple n’ọtụtụ oge mmemme (Mat. 21:23–23:39; Jọn 7:14–8:59).

    9. Ndị Rom n’okpuru Taịtọs bibiri temple ahụ n’afo 70 ka a mụsịrị Kraịst.

  10. Ogige Ubi Getsemane Jisus tara ahụhụ, a raara ya nye, na e jidere ya (Mat. 26:36–46; Luk 22:39–54).

  11. Ugwu Olive

    1. Jisus bu ụzọ kwupụta mbibi nke Jerusalem na temple ahụ. O kwukwara maka Ọbịbịa nke Ugboro abụọ (Mat. 24:3–25:46; hụ kwa JS—Mat).

    2. Site n’ebea ka Jisus rigooro n’elu-igwe (Ọlndoz. 1:9–12).

    3. Na Ọktoba 24, 1841 Onye okenye Orson Hyde raara Ala-Nsọ ahụ nye Chineke maka nlọghachi nke ụmụ Abraham.

  12. Isi mmiri Gaihọn E tere Solomon mmanụ ịbụ eze (1 Ndez. 1:38–39). Hezekaia mere ka e gwụọ ụzọ-mmiri iji weta mmiri site n’isi mmiri ahụ baa n’ime nnukwu obodo ahụ (2 Ihem. 32:30).

  13. Ọnụ-ụzọ ama Mmiri Ezra gụrụ na kọwara iwu Moses nye ndị mmadụ ahụ (Neh. 8:1–8).

  14. Ndagwurugwu Hinọm Chi-ụgha nke Molek ka ndị mmadụ ahụ kpọrọ isi ala nye, nke gụnyere iji nwantakịrị chụọ-aja (2 Ndez. 23:10; 2 Ihem. 28:3).

  15. Ụlọ Kaiafas A kpọtara Jisus n’iru Kaiafas (Mat. 26:57–68). Pịta gọrọ agọ na ya maara Jisus (Mat. 26:69–75).

  16. Ọnụ Ụlọ dị N’elu Ebe ọdịnala ahụ ebe Jisus riri oriri ngabiga ahụ na hiwere oriri-nsọ ahụ (Mat. 26:20–30). Ọ sachara ụkwụ nke Ndị-ozi Iri na abụọ ahụ (Jọn 13:4–17) na kuziere ha ihe (Jọn 13:18–17:26).

  17. Obi-eze Herọd A kpọgara Kraịst n’iru Herọd ikekwe na ebe a (Luk 23:7–11).

  18. Jerusalem (ebe nile na-egosighị)

    1. Melkizedek chiri ọchịchị dịka eze nke Salem (Jen. 14:18).

    2. Eze Devid dọtara nnukwu obodo ahụ site n’aka ndị Jebus (2 Sam. 5:7; 1 Ihem. 11:4–7).

    3. Ndị Babilọn bibiri nnukwu obodo ahụ n’afọ dịka 587 Tutu a mụọ Kraịst (2 Ndez. 25:1–11).

    4. Mụọ Nsọ mejuputara ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị Pentikọst (Ọlndoz. 2:1–4).

    5. E jidere Pịta na Jọn na kpụta ha n’iru kansụl ahụ (Ọlndoz. 4:1–23).

    6. Ananaias na Safira gwara Onye-nwe okwu asi na nwụọ (Ọlndoz. 5:1–10).

    7. E jidere Pịta na Jọn, kama otu mụọ-ozi napụtara ha site n’ụlọ-mkpọrọ (Ọlndoz. 5:17–20).

    8. Ndị-ozi họọrọ ndịkom asaa maka inyere ha aka (Ọlndoz. 6:1–6).

    9. Igba-ama Stifen nye ndị Juu ka a jụrụ aju, na a tụgburu ya n’okwute (Ọlndoz. 6:8–7:60).

    10. E gburu Jemes n’ihi okwukwe ya (Ọlndoz. 12:1–2).

    11. Otu mụọ-ozi mere ka Pịta nwere onwe ya site n’ụlọ-mkpọrọ (Ọlndoz. 12:5–11).

    12. Ndị-ozi kpebiri ihe gbasara ibi-úgwù (Ọlndoz. 15:5–29).

    13. Ndị Rom n’okpuru Taịtọs bibiri nnukwu obodo ahụ na afọ 70 ka a mụsịrị Kraịst.

Bipụta