Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Foto nile nke Ọnọdụ nile nke Bible nsọ


Foto nile nke Ọnọdụ nile nke Akwụkwọ-nsọ

Foto ndịa nke ọnọdụ nile dị mkpa bụ dịka ihe ịma-atụ nke ala nile ebe Jisus jere ije, ebe ndị-amụma nke bible biri ndụ na kụzie ihe, na ebe ihe omume nile nke akwụkwọ-nso mere. Inyere gị aka iwere foto ndị ahụ mee ihe dị mma karịa n’ọmụmụ ihe gị, mkpirisi nkọwa nke ọma na-eso foto nke ọbụla. Ọnụ ọgụgụ na isi-ọkwu nke nkọwa nke ọma ahụ ha ọnụ-ọgụgụ na isi-ọkwu nke foto ahụ na-abụ otu ihe. Nkeji isi-ọkwu mbụ na-eso isi-ọkwu nke nkọwa nke ọma ahụ na-akọwa usoro nke foto ahụ, tinyere ihe nile dị mkpa n’ile-anya na ọtụtụ mgbe mpaghara onye ose-foto chere iru. Ihe omume nile dị mkpa nke akwụkwọ-nsọ sitere n’ebe ahụ ka e depụtara mgbe ahụ, ha na ntụnye nile nke akwụkwọ-nsọ otu ọ ga-abụ na i nwere ike ịmata ebe ị ga-agụ karịa banyere ihe omume nile ndị ahụ.

Bipụta