Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
4. Kedesh-banea


4. Kedesh-banea

Nkea bụ ilepụ anya elu elu mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke oke ndagwurugwu ọzara ahụ (nke a kpọkwara otu ndagwurugwu miri-eme dị mkpafa) ebe Kedesh-banea dị. Iyi ahụ nke na-asọ n’ebea n’oge udummiri na-eme ka ebe a nwee mmiri na-adị nke ọma na bụrụ ebe na-amịta mkpụrụ n’ime ọzara nke Zin.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Nkea bụ ebe dị kpọm kwem ka ebe Moses sitere ziga ndịkom 12 inyopụta banyere ala nke Kenean (Ọnọgụ. 13:17–30). Ọ rụrụ ọrụ dịka ebe izu-ike mgbado ukwu maka ndị Israel ruo afọ 38 nke ọ fọdụrụ obere ka o bụrụ afọ dị 40 nke mkpagharị ha n’ime ọzara (Deut. 2:14). Miriam nwụrụ na e liri ya n’ebea (Ọnọgụ. 20:1). Nkea bụụrụ ebe nnupụ isi Kora mere, ntamu nke ndị mmadụ ahụ, na ịma ifuru nke mkpan’aka Erọn (Ọnọgụ. 16–17). Na nso ebea ka Moses tiri nkume ihe na mmiri wee pụta (Ọnọgụ. 20:7–11).

Foto, oyiyi
foto 4

4. Kedesh-Banea Ebea a maara dịka Kedesh-banea kwesịrị ịbụ ebe ndị Israel nọdụrụ n’ebe izu-ike n’ime oge nke dị ukwuu nke iri afo anọ ha n’ime ọzara.

Bipụta