20. Jopa
E legide anya elu elu mpaghara ọdịda-anyanwụ ofe nnukwu obodo ọdọ-ụgbọ-mmiri nke Jopa.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Jona gara Jopa iwere ụgbọ mmiri gaa Tashish (Jona 1:1–3). Jopa bụụrụ ọdọ-ụgbọ-mmiri ebe Solomon na n’ikpeazụ Zerubabel jiri mee ihe mgbe ha wetara osisi sitere na ọhịa Cedar nke Lebanon iji wuo temple ha nile (2 Ihem. 2:16; Ezra 3:7). N’ebea ka Pịta kulitere Tabita, onye a maakwara dịka Dọkas bịaghachi azụ na ndụ (Ọlndoz. 9:36–43). Pịta hụkwara ọhụ nke anụmanụ nile dị ọcha na ndị na-adịghị ọcha, nke kpugheere ya mkpa ọ dị ịmalite nkwusa-ozi-ọma ahụ n’etiti ndị Jentaịlụ (Ọlndoz. 10). Orson Hyde rutere ebea ịrara Ala Nsọ ahụ nye Chineke na 1841.