Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Map 13: Njem Mgbasa Ozi-ọma nile nke Onye-ozi Pọl


Map 13

Njem Mgbasa Ozi-Ọma nile nke Onye-ozi PỌl

Foto, oyiyi
Map Bible nsọ 13

N

Ọtụghe-ụzọ nke Map 13

Njem nke mbụ

Njem nke abụọ

Njem nke atọ

Njem ịga Rom

Itali

Oke Osimiri Ojii

Rom

Masedonia

Pọntọs

Ụlọ-nri Atọ

Bitaịnaịa

Nzukọ ikpe nke Apịọs

Tesalonaịka

Filipaị

Potioli

Troas

Biria

Galesia

Samothrace

Misia

Esia

Pegamọm

Kapadosia

Antịọk

Laidia

Frigia

Smaiana

Aikonịọm

Tasọs

Kaịọs

Efesọs

Pisidia

Laịstra

Atens

Kọrint

Leodisia

Regium

Akaịa

Militọs

Pamfilia

Deb

Laisia

Pega

Antịọk

Patmọs

Silisia

Saịracus

Maịra

Snidọs

Rodes

Saịprọs

Salamis

Melita (Malta)

Kret

Pafọs

Saịdọn

Siria

Taịa

Fair Havens

Fonisia

Damaskọs

Tolemaia

Oke Osimiri Mediterenia

Siseria

Samerịa

Jọpa

Jerusalem

Geza

Saịrin

Aleksandria

Ijipt

Libya

Kilomita nile

0 100 200 300 400

A B C D E F G H

1 2 3 4

●1

●2

●3

●4

●5

●6

●7

●8

●9

●10

●11

●12

●13

●14

●15

●16

●17

●18

●19

●20

●21

●22

●23

●24

●25

●26

●27

  1. Geza Filip kwusara ozi-ọma nke Kraịst na mere otu nwoke bụ ọnọzi onye Etiopịa baptism n’ụzọ ya ịga Geza (Ọlndoz. 8:26–39).

  2. Jerusalem Hụ map 12 maka ihe omume nile n’ime Jerusalem.

  3. Jọpa Pịta natara otu òhù na Chineke na-enye ndị Jentaịlụ onyinye nke ncheghari (Ọlndoz. 10; 11:5–18). Pịta kulitere Tabita site na ndị nwụrụ anwụ (Ọlndoz. 9:36–42).

  4. Samerịa Filip kwusara ozi-ọma na Samerịa (Ọlndoz. 8:5–13), na Pịta na Jọn n’ikpe-azụ kụziri ihe n’ebea (Ọlndoz. 8:14–25). Mgbe ha nyefesịrị onyinye nke Mụọ Nsọ, Saịmọn onye na-eme mgbasị chọrọ ịzụta onyinye a site n’aka ha (Ọlndoz. 8:9–24).

  5. Siseria N’ebea mgbe otu Mụọ-ozi kwusasịrị ozi-ọma nye otu ọchị-agha nke otu narị ndị agha a kpọrọ aha ya Kọniliọs, Pịta kwere ya ka e mee ya baptism (Ọlndoz. 10). N’ebea Pọl mere mgbochi ya n’iru Agripa (Ọlndoz. 25–26; hụ kwa A—JS 1:24–25).

  6. Damaskọs Jisus pụtara ìhè nye Sọl (Ọlndoz. 9:1–7). Mgbe Ananaias weghachisiri ịhụ-ụzọ Sọl, e mere Sọl baptism na ọ malitere nkwusa ozi-ọma ya (Ọlndoz. 9:10–27).

  7. Antịọk (n’ime Siria) N’ebea ndị na-eso ụzọ ka a kpọrọ Ndị-otu-Kraịst nke mbụ (Ọlndoz. 11:26). Agabọs buru amụma ụnwụ (Ọlndoz. 11:27–28). Oke nghọtahie bilitere na Antịọk gbasara ibi-úgwù (Ọlndoz. 14:26–28; 15:1–9). Na Antịọk Pọl malitere mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ ya na Saịlas, Banabas, na Judas Basabas (Ọlndoz. 15:22, 30, 35).

  8. Tasọs Obodo ebe obibi Pọl; Ndị Ụmụnna zigara Pọl n’ebea iji chekwaa ndụ ya (Ọlndoz. 9:29–30).

  9. Saịprọs Mgbe a kpagbusịrị ha, ụfọdụ Ndị-nsọ gbalagara n’ibe ala nke a mmiri gbara okirikiri (Ọlndoz. 11:19). Pọl sitere na Saịprọs gaa njem mgbasa ozi-ọma ya nke mbụ (Ọlndoz. 13:4–5), dịka Banabas na Mak mere n’ikpe-azụ (Ọlndoz. 15:39).

  10. Pafọs Pọl kọchara otu onye na-eme mgbasị n’ebea (Ọlndoz. 13:6–11).

  11. Dabe Pọl na Banabas kwusara ozi-ọma ahụ n’ime nnukwu obodo a (Ọlndoz. 14:6–7, 20–21).

  12. Laịstra Mgbe Pọl gwọrọ otu onye ngwọrọ, ya na Banabas ka e kelere dịka chi nile. A tụrụ Pọl nkume na chee na ọ nwụrụ anwụ kama dịkwara ndụ ọzọ na gara n’iru na-ekwusa ozi-ọma (Ọlndoz. 14:6–21). Ebe obibi Timọti (Ọlndoz. 16:1–3).

  13. Aịkonịọm Na mgbasa ozi-ọma ha nke mbụ, Pọl na Banabas kwusara ozi-ọma n’ebea na a majara ha jiri ịtụ nkume (Ọlndoz. 13:51–14:7).

  14. Leodisia na Kọlọsị Leodisia bụ otu n’ime ngalaba nke Nzukọ-nsọ nke Pọl letara na natara leta nile site n’aka ha (Ndị-Kọl. 4:16). Ọ bụ kwa otu n’ime nnukwu obodo asaa e depụtara n’ime akwụkwọ Mkpughe (ndị nke ọzọ bụ Efesọs, Smịama, Pagamọs, Taịataịra, Sadis, na Filadelfịa, hụ Mkpu. 1:11). Kọlọsị dị kilomita 18 na mpaghara Ọwụwa-anyanwụ nke Leodisia. Pọl degaara Ndị-nsọ ndị bi n’ebea akwụkwọ.

  15. Antiọk (n’ime Pisidia) Na mgbasa ozi-ọma ha nke mbụ, Pọl na Banabas kụziere ndị Juu na Kraịst sitere na mkpụrụ nke Devid bịa. Pọl wetaara Israel ozi-ọma ahụ, mgbe ahụ nye ndị Jentaịlụ. Pọl na Banabas ka a kpagburu na chụpụrụ (Ọlndoz. 13:14–50).

  16. Militọs Mgbe ọ nọ n’ebea na mgbasa ozi-ọma ya nke atọ, Pọl dọrọ ndị okenye nke Nzukọ-nsọ aka na ntị na “agụ ndị jọgburu onwe ha” ga-abata n’etiti igwe atụrụ ahụ (Ọlndoz. 20:29–31).

  17. Patmọs Jọn bụụrụ onye mkpọrọ n’ibe ala a mmiri gbara okirikiri mgbe ọ natara ọ̀hù nile ahụ dị n’akwụkwọ nke Mkpughe (Mkpu. 1:9).

  18. Efesọs Apọlọs kwusara ozi-ọma n’ebea jiri ike (Ọlndoz. 18:24–28). Pọl na mgbasa-ozi-ọma ya nke atọ kụziri ihe na Efesọs ruo afọ abụọ, na-agbanwe ọtụtụ mmadụ (Ọlndoz. 19:10, 18). N’ebea o nyere onyinye nke Mụọ-Nsọ site na-ibikwasị aka nile (Ọlndoz. 19:1–7), na rụrụ oru-ebube nile tinyere ịchụpụ mụọ-ọjọọ nile (Ọlndoz. 19:8–21). N’ebea ndị na-efe Daiana ofufe palitere ọgba-aghara megide Pọl (Ọlndoz. 19:22–41). Akụkụ nke akwụkwọ Mkpughe ka e degaara Nzukọ-nsọ ahụ dị na Efesos (Mkpu. 1:11).

  19. Troas Mgbe Pọl nọ n’ebea na njem mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ, ọ hụrụ otu òhù nke otu nwoke nọ na Masedonia na-arịọ maka enyem-aka (Ọlndoz. 16:9–12). Mgbe ọ nọ n’ebea na mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro atọ, o kulitere Yutikọs site na ndị nwụrụ anwụ (Ọlndoz. 20:6–12).

  20. Filipaị Pọl, Saịlas, na Timọti gbanwere otu nwanyị a kpọrọ aha ya Lidia, chụpụrụ otu mụọ ọjọọ, na e tiri ha ihe (Ọlndoz. 16:11–23). Ha natara enyem-aka dị nsọ ịgbanarị mkpọrọ (Ọlndoz. 16:23–26).

  21. Atens Pọl mgbe ọ nọ na mgbasa ozi-ọma ya nke Ugboro abụọ na Atens, kwusara ozi-ọma n’Ugwu Mas (Areọpagọs) banyere “Chi nke na-amaghị ama” (Ọlndoz. 17:22–34).

  22. Kọrịnt Pọl gara Kọrịnt na mgbasa ozi-ọma ya nke Ugboro abụọ ebe ọ nọdụrụ ya na Akwila na Prisila. O kwusara ozi-ọma n’ebea na mere ọtụtụ mmadụ baptism (Ọlndoz. 18:1–18). Site na Kọrịnt, Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi ya.

  23. Tesalonaịka Pọl kwusara ozi-ọma n’ebea n’oge njem mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ. Ndị otu mgbasa ozi-ọma ya hapụrụ gaa Beria mgbe ndị Juu majara ọdị mma ha (Ọlndoz. 17:1–10).

  24. Berìa Pọl, Saịlas, na Timọti chọtara mkpụrụ-obi nile a maara n’ihi omume ọma, ha ga-akụziri ihe n’oge njem mgbasa ozi-ọma Pọl nke ugboro abụọ. Ndị Juu sitere na Tesalonaika soro kpagbuo ha (Ọlndoz. 17:10–13).

  25. Masedonia Pọl kụziri ihe n’ebea na njem ya nke ugboro abụọ na nke atọ (Ọlndoz. 16:9–40; 19:21). Pọl jara mmepụ-aka nke Ndị-nsọ Masedonịa mma ndị nyere ya na Ndị-nsọ bụ ogbenye nọ na Jerusalem ihe (Ndị-Rom 15:26; 2 Ndị-Kọ 8:1–5; 11:9).

  26. Melita Ụgbọ-mmiri Pọl kpuru n’ibe ala a mmiri gbara okirikiri n’ụzọ ya ịga Rom (Ọlndoz. 26:32; 27:1, 41–44). Agwọ tara ya emerụghị ya arụ na gwọrọ ọtụtụ ndị arụ na-adịghị ike na Melita Ọlndoz. 28:1–9).

  27. Rom Pọl kwusara ozi-ọma n’ebea maka afọ abụọ n’okpuru mmachibido ịpụ-ezi nke onye e jidere ejide (Ọlndoz. 28:16–31). O dekwara akwụkwọ-ozi nile ma-ọbụ leta nile, nye ndị Efesos, ndị Filipaị, na ndi Kọlọsị na nye Timọti na Faịlimọn mgbe ọ nọ na mkpọrọ na Rom, Pịta dere akwụkwọ ozi ya nke mbụ site na “Babịlọn” nke bụụrụ ikekwe na Rọm, ngwa ngwa mkpagbu nile nke Nero megide Ndị-otu-Kraịst gasịrị n’afọ 64 ka a mụsịrị Kraịst. E kwenyere n’ọha na e gburu Pịta na Pọl n’ihi okwukwe ha n’ebea.

Bipụta