23. Oke Osimiri Galili na Ugwu nke Nkwupụta ịdị-ngozi-nile
E legide anya na ndịda-ọdịda-anyanwụ ofe njikọ elu ele nke ọdịda-anyanwụ nke Oke Osimiri Galili, otu ọdọ-mmiri na e siteghị na mmiri oke osimiri Taiberịas dị na nsọtụ agịga nke akụkụ mmiri ahụ na mpaghara nsọtụ aka-ekpe nke foto ahụ. Ugwu ahụ dị n’etiti iru-ala ahụ bụ ọnọdụ ebe nke Ugwu nkwupụta ịdị ngọzi nile. Kapanaum dị na mpaghara aka-ekpe, ma a pụta na foto ahụ.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-nzọpụta rụrụ ọrụ ije ozi ya n’ọnọdụ anụ arụ na-anwụ anwụ ebe ọ dị ukwuu na mpaghara a. N’ebea ka ọ kpọrọ na chie Ndị-ozi Iri na abụọ echichi (Mat. 4:18–22; 10:1–4; Mak 1:16–20; 2:13–14; 3:7, 13–19; Luk 5:1–11), kụziri Okwu Chukwu e kwuru n’elu Ugwu (Mat. 5–7), na kuziri ihe n’akụkọ ilu nile (Mat. 13:1–52; Mak 4:1–34). Ọrụ-ebube nile ọ rụrụ gụnyere ndị a na-eso: ọ gwọrọ onye ekpenta (Mat. 8:1–4); mee ka ebili mmiri dajụọ (Mat. 8:23–27); chụpụ otụ igwe mụọ ọjọọ nile site n’ime otu nwa okorọbịa ndị banyere mgbe ahụ n’ime igwe ézì nke gbara ọsọ baa n’ime oke osimiri (Mak 5:1–15); kulitere nwa-ada Jeaịrọs site na ndị nwụrụ anwụ (Mat. 9:18–19, 23–26; Mak 5:22–24, 35–43); nyere ndị dị 5,000 na 4,000 nrị ha rijuru afọ (Mat. 14:14–21; 15:32–38); nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha tụba ihe ha ji egbu-azụ, site na nkea ha gbutere ọtụtụ azụ (Luk 5:1–6); gwọrọ ọtụtụ ndị mmadụ (Mat. 15:29–31; Mak 3:7–12); na pụtara ìhè mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe (Mak 14:27–28; 16:7; Jọn 21:1–23).