32. Ibe ala mmiri gbara okirikiri nke Patmọs
Otu ibe ala mmiri gbara okirikiri dị n’ime Oke Osimiri Aegean ebe a chụpụrụ Jọn gaa na ya (Mkpu. 1:9). Dịka ọdịnala siri dị, ọ rụrụ ọrụ n’ebe ahụ n’ime ebe nile e si egwute okwute mable.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Jọn hụrụ nnukwu ọhụ ahụ a maara dịka Apọkalips (akwụkwọ nke Mkpughe). Onye-nwe gwara ya ka o zigara ya Nzuko asaa dị n’ime Esia (Mkpu. 1:11).