Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
1. Osimiri Naịl na Ijipt


1. Osimiri Naịl na Ijipt

Osisi na-eto n’ogologo akụkụ nile nke Osimiri Naịl. A gafee ya bụ ebe ọzara nile dị nke kpuchiri ebe karichara n’Ijipt.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Ala ahụ ka onye chọpụtara ya bụ Ijiptus (Abr. 1:23–25). Abraham gara n’Ijipt (Jen. 12:10–20; Abr. 2:21–25). E rere Josef baa n’ime Ijipt, ọ ghọrọ onye-ọchịchị, na zọpụtara ezi na ụlọ ya site n’ụnwụ (Jen. 37; 39–46). Ụmụ ụmụ Jekọb biri n’Ijipt (Jen. 47; Ọpụ. 1; 12:40). Ada Fero chọtara nwanta ahụ bụ Moses n’ime osimiri na lekọta ya anya (Ọpụ. 2:1–10). Moses duru ndị Israel pụta site n’Ijipt (Ọpụ. 3–14). Meri, Josef na Jisus gara n’Ijipt maka obere oge ịgbapụ site n’aka Herọd (Mat. 2:13–15, 19–21). N’ụbọchị ndị ikpe-azụ, ndị Ijipt ga-amata Onye-nwe, na Onye-nwe ga-agọzi Ijipt (Aịsa. 19:20–25). (Hụ Nduzi gaa n’Akwụkwọ-nsọ nile, “Ijipt.”)

Foto, oyiyi
foto 1

1. Osimiri Naịl na Ijipt Na otu ebe dị otua, Nne Moses zoro nwa ya nwoke a mụrụ ọhụrụ. Ada-nwanyị Fero chọtara ya na zụrụ ya n’obi ikpe nile nke eze n’Ijipt.

Bipụta