Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
28. Dan


28. Dan

Nnukwu obodo ochie nke a ka a naara akpọ Leshem (Josh. 19:47) ma-ọbụ Laịsh (Ndikp. 18:7, 14) tutu ndị Israel e merie ala ahụ. Isi mmiri nile dị n’ọnọdụ ebe a, tinyere isi mmiri nile dị na Siseria Filipai, bụ isi mmalite nile nke Osimiri Jọdan.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Abraham dọpụtara Lọt (Jen. 14:13–16). Agbụrụ Dan dọkpụụrụ ebe ahụ n’agha na kpọọ ya aha Dan (Josh. 19:47–48). Jeroboam wulitere otu nwa-ehi ọla-edo nke nyere aka na ọdịda nke agbụrụ iri ndị elu elu ahụ (1 Ndez. 12:26–33). Dan bụụrụ nnukwu obodo nke Israel kachasị ịdị na nsọtụ elu-elu—nke mere na akwụkwọ-nsọ nile na-atụnyere ala nke Israel “Site na Bia-sheba wee ruo ọbụna na Dan” (2 Ihem. 30:5; Bia-sheba bụụrụ nnukwu obodo nke kachasị ịdị na ala ala). (Hụ Ndụzi gaa n’Akwụkwọ-nsọ nsọ nile, “Dan”.)

Foto, oyiyi
foto 28

28. Dan Nnukwu obodo Testament Ochie nke dịịrị n’ebe a na mbụ ribara ama oke-ala kachasị n’elu elu nke Israel.

Bipụta