Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
21. Ndagwurugwu Jezreel


21. Ndagwurugwu Jezreel

E legide anya mpaghara ọdịda-anyanwụ site n’elu Ugwu Tabo rute otu ebe nke ndagwurugwu Jezreel. Na-agbanyeghị na, kwa mgbe ka e chere na Ndagwurugwu Jezreel bụ otu nnukwu ndagwurugwu, ezie ọ bụ otu usoro ndagwurugwu nile nke na-ejikọta mbara ala nke Akọ na ndagwurugwu Jọdan na mpaghara nke Oke Osimiri Galili. Ndagwurugwu nke Megido, maka ịma atụ, dị n’ebe mpaghara ọdịda-anyanwụ nke ndagwurugwu a. Ndagwurugwu Jezreel bụụrụ isi ụzọ nke na-agafe Ala Nsọ ahụ n’agbata oke Osimiri Meditarenia na mpaghara ọdịda-anyanwụ na Ndagwurugwu Jodan na mpaghara Ọwụwa-anyanwụ.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Ụzọ ụgbọ-ala ahụ dị mma na-ejikọta Ijipt na Mesopotamia sitere na ndagwurugwu a gafee, na a lụrụ ọtụtụ agha n’ebea (Ndikp. 1:22–27; 5:19; 2 Ndez. 23:29–30). Oke agha ikpe-azụ n’ala a ga-eji agha Ha-Magedọn malite, nke a ga-alụ mkpirisi oge tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye-nzọpụta; o weere aha ya site na Har Me-giddon ma-ọbụ Ugwu Megido (Ezik. 38; Joel 3:9–14; Zek. 14:2–5; Mkpu. 16:14–16).

Foto, oyiyi
foto 21

21. Ndagwurugwu Jezreel Mba nile ga-ezukọta n’ebea n’agha ahụ nke Ha-Magedọn (hụ Zek. 11–14; Mkpu. 16:14–21).

Bipụta