2. Ugwu Saịnaị (Horeb) na Ọzara Saịnaị
Ugwu ukwu nile pụtara ìhè bụ Ugwu nke Jebel Musa (Ugwu nke Moses). E nwere ọtụtụ ọnọdụ kwesịrị ịbụ maka Ugwu Saịnaị. Otu n’ime nke a nakweere karịa bụ ebe e tinyere Jebel Musa.
Ihe Omume nile dị Mkpa: Chineke pụtara ìhè nye Moses na nye ya Iwu-nsọ Iri ahụ (Ọpụ. 19–20). Moses, Erọn, abụọ n’ime ụmụ ndịkom nke Erọn, na 70 ndị okenye hụrụ na mekọrịtara ha na Chineke (Ọpụ. 24:9–12). Chineke nyere Moses ntụzi-aka maka iwu ụlọ-ofufe (Ọpụ. 25–28; 30–31). Ndị Israel kpọrọ isi ala nye otu nwa ehi ọla-edo nke ha kwagidere Erọn ka o mee (Ọpụ. 32:1–8). Elaịja gbagara n’ala a site na Ndagwurugwu Jezreel, ebe Eze nwanyị Jezebel biiri (1 Ndez. 19:1–18). Nkea bụ kwa ebe Elaịja na Chineke kwuru okwu (1 Ndez. 19:8–19).