Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
18. Dotan dị na Samerịa


18. Dotan dị na Samerịa

Mpaghara a nke Ala Nsọ ka ihe e ji mara ya bụ njikọ ala nile na ndagwurugwu nile. Ọ bụ ala iri ahịhịa dị mma nke anụmanụ. Mgbe ndị Israel haziri ala, mpaghara nke a ka e nyere Manase.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Na Ndagwurugwu Dotan ka e rere Josef baa n’ime Ijipt (Jen. 37:12–28). Obadaịa zọpụtara otu narị ndị-amụma site na-izobe ha n’ime ọgba nile mgbe Jezebel gbara mbọ igbu ndị-amụma nke Israel (1 Ndez. 18:13). Igwe ndị-agha Siria gbara Elaisha na odibo ya okirikiri, bụ ndị Onye-nwe zọpụtara site n’ụzọ ọrụ-ebube (2 Ndez. 6:13–23).

Foto, oyiyi
foto 18

18. Dotan di na Samerịa N’ime ndagwurugwu a na-erupụta ihe nke ọma ka ụmụnne Josef ndị nwoke bịara ilekọta igwe ewu na atụrụ nile mgbe ha rere nwanne ha nwoke nye usuu ndị-ahịa Midian na Ishmael.

Bipụta