24. Kapanaum
Kapanaum dị n’elu elu akụkụ mmiri nke Oke Osimiri Galili, bụụrụ etiti nke nkwusa ozi-ọma Galili nke Jisus (Mat. 9:1–2; Mak 2:1–5). Etiti ebe igbu azụ na ịzụ ahịa a na-enweta ihe a chọrọ, na ebe dị mkpa, ọ bụụrụ ebe obibi nye ndị Jentaịlụ dịka kwa ndị Juu. Ọnụ-ọgụgụ nke obodo ahụ na narị afọ nke mbụ a karịghị ndị mmadụ dị 1,000. Kapanaum ka e tinyere na ngalaba ụzọ nile nke ụzọ ịzụ-ahịa dị mkpa, nwere ala nile na-erupụta ihe nke ọma na-agba ya okirikiri. Ndị-agha Rom rụrụ ụlọ ịsa-arụ nile na ihe nile nke e ji echekwa ihe n’ebea, nke nyere aka na obibi ndụ a haziri ahazi nwere ụlọ ọha nile a rụziri arụzi. Na-agbanyeghị ọtụtụ ọrụ-ebube nile a rụrụ ebea, ndị mmadụ ahụ jụrụ nkwusa ozi-ọma Onye-nzọpụta. N’ihi nke a Jisus kọchara nnukwu obodo ahụ (Mat. 11:20, 23–24). N’oge na-eteghị anya Kapanaum dabara na mbibi na na-anọgide na-enweghi onye bi n’ime ya.
Ihe Omume nile dị Mkpa: A maara Kapanaum dịka “nnukwu obodo nke Onye-nzọpụta ahụ” (Mat. 9:1–2; Mak 2:1–5). Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ-ebube n’ebe ọnọdụ a. Dịka ịma-atụ, Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị mmadụ (Mak 1:32–34), tinyere nwa odibo nke onye na-achịkọta otu narị ndi-agha (Luk 7:1–10), Ọgọ nwanyị nke Pịta (Mak 1:21, 29–31), Onye akụkụ arụ ya nwụrụ anwụ onye e budara akwa ndina ya site n’elu ụlọ (Mak 2:1–12), na nwoke ahu nwere aka kpọnwụrụ akpọnwụ (Mat. 12:9–13). N’ebea Jisus chụpụ kwara ọtụtụ mụọ ọjọọ nile (Mak 1:21–28, 32–34), kulitere nwa nwanyị nke Jeaịrọs site na ndị nwụrụ anwụ (Mak 5:22–24, 35–43), na kwuru Okwu Chukwu nke achịcha nke ndụ n’ime ụlọ-nzukọ dị na Kapanaum (Jọn 6:24–59). Onye-nzọpụta duziri Pịta ụzọ ka o gbute otu azụ site n’Oke osimiri Galili, meghee ọnụ ya, na chọta mkpụrụ ego nke ọ ga-eji kwụọ ụtụ-isi (Mat. 17:24–27).