Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
31. Efesọs


31. Efesọs

Ọdịda mbibi nile nke ebe a na-anọ eme ihe egwuregwu ndị Grik dị n’Efesọs, ebe Onye-ozi Pọl kwusara ozi-ọma. N’ime oge nile nke Testament Ọhụrụ, Efesọs nwere ezi aha gazuo n’ụwa nile a maara ama n’ihi ọmarịcha temple ya e wuru na nnukwu ugwu nke chi-arụsị-nwanyị ndị Rom Daiana. Efesọs, nke nọ n’ọdịda-mbibi ugbua, bụụrụ n’otu oge isi obodo nke nkewa nnukwu obodo ndị Rom nke Esịa na nnukwu etiti ebe ịzụ-ahịa. Ndị ọkpụ-ụzụ-ọlaọcha nke nnukwu obodo ahụ mere ka o too eto bụ nnọgide ịzụ-ahịa nke ire onyinyo nke Daịana.

Ihe Omume nile dị Mkpa: Onye-ozi Pọl letara Efesọs na nso nke ọgwụgwụ nke njem mgbasa ozi-ọma ya nke ugboro abụọ (Ọlndoz. 18:18–19). Na njem nke atọ ya ọ nọrọ n’ime nnukwu obodo ahụ afọ abụọ. A manyere ya amanye ka ọ pụọ n’ihi ọgba aghara nke ndị ahụ na-akpụ-ụzụ ọla-ọcha kpatara, ndị na-ada n’ahịa ha mgbe Pọl kwusara ozi-ọma megide ofufe nke chị ụgha nwanyị Daiana (Ọlndoz. 19:1, 10, 23–41; 20:1). Ebe ahụ a na-anọ eme ihe egwuregwu nke Efesọs bụụrụ nke bukarịsịrị n’ibu nke ndị Grik wuworo na ọnọdụ ebe Pọl na ndị nsiso ya nile chere ndị ahụ na-agba aghara iru (Ọlndoz. 19:29–31). Pọl degaara ndị otu Nzukọ-nsọ nọ n’Efesọs otu akwụkwọ-ozi n’ime oge ndọkpụ n’agha ya na Rom. Otu n’ime ngalaba asaa nke Nzukọ-nsọ dị n’ime Esia bụ nke e zigaara akwụkwọ nke Mkpughe dị n’ime Efesọs (Mkpu. 1:10–11; 2:1).

Foto, oyiyi
foto 31

31. Efesọs N’ebea Pọl kwusara ozi-ọma megide ife-arụsị ofufe na kpasuru ndị okpụ-ụzụ ọla-ọcha iwe, ndị nwetara obibi ha site n’ire onyinyo nile nke chi-nwanyị Daịana (hụ Ọlndoz. 19:24–41).

Bipụta