Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
15. Jeriko


15. Jeriko

Foto a na-egosi osisi na Jeriko nke ụbọchị ugbua. Na mgbe ochie ọ bụụrụ nnukwu obodo e wuru mgbidi gburu gburu n’ime ndagwurugwu nke Osimiri Jọdan, mita 252 n’okpuru elu oke osimiri. Ọ bụ ebe ịrụ-ọrụ-ubi na-erupụta ihe, ebe osisi nkwu nile n’agụ oge na osisi epe nile na-adịgide. N’azụ-ala ahụ ka Ugwu ọdịnala nke Ọnwụnwa dị (Mat. 4:1–11).

Ihe Omume nile dị Mkpa: Na nso ebea, ka Joshua na ụmụ Israel gafere Osimiri Jọdan nke mbụ, na-ịbata n’ime ala ekwere na nkwa (Josh. 2:1–3; 3:14–16). Onye-nwe na-ịrụ ọrụ ebube kpatara ka mgbidi ahụ nile daa n’iru ndị-agha nile nke Israel (Josh. 6; hụ kwa Ndị-Hib. 11:30). Joshua tụkwasịrị nkọcha n’elu nnukwu obodo ahụ (Josh. 6:26), nke e mezuru (1 Ndez. 16:34). Elaisha gwọrọ mmiri nile nke Jeriko (2 Ndez. 2:18–22). Onye-nzọpụta gafere site n’ebea na nleta ya nke Jerusalem nke ikpe-azụ, gwọrọ onye-isi. Batimiọs na nọnyeere Zakịọs, onye ọna-ụtụ (Mak 10:46–52; Luk 18:35–43; 19:1–10). Ụzọ ahụ gara Jeriko site na Jerusalem pụtara n’akụkọ ilu nke ezi onye Sameria (Luk 10:30–37).

Foto, oyiyi
foto 15

15. Jeriko Nke a bụụrụ nnukwu obodo nke mbụ Joshua dokpụụrụ n’agha (hụ Josh. 6:2–20); Jeriko bụ otu n’ime nnukwu obodo kachasị ochie n’elu ụwa.

Bipụta