Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
17. Ugwu Geraizim na Ugwu Ebal


17. Ugwu Geraizim na Ugwu Ebal

E legide anya mpaghara Ọdịda-anyanwụ, na aka-ekpe ka Ugwu Geraizim dị na n’aka nri, Ugwu Ebal. E sere foto Nablus ọhụrụ n’ebe a. Nnukwu obodo ochie nke Shekem dị n’agbata Ugwu abụọ ndịa n’ime ndagwurugwu dị na ndịda (nwa obere gaa n’aka nri nke foto ahụ).

Ihe Omume nile dị Mkpa: Abraham rụrụ ụlọ-ikwuu ya na Shekem (Jen. 12:6–7). Jekọb rụrụ ụlọ-ikwuu ebe a na zụọ otu mpekere ala (Jen. 33:18–20). Ugwu Geraịzim bụụrụ ugwu nke ngozi ebe Ugwu Ebal bụụrụ Ugwu nke ịbụ-ọnụ (Deut. 27–28). Na Ugwu Ebal, Joshua wuru ihe ncheta nke nwere iwu nke Moses na mgbe ahụ gụpụtaara ndị Israel iwu ahụ (Josh. 8:30–35). Ọkpụkpụ nile nke Josef ka e liri na Shekem (Josh. 24:32).

Foto, oyiyi
foto 17

17. Ugwu Geraịzim na Ugwu Ebal Ugwu abụọ ndịa na-elefe nnukwu obodo ochie nke Shekem anya, ebe e liri ọkpụkpụ nile nke Josef (hụ Josh. 24:32).

Bipụta