Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 128


Nkeji 128

Akwụkwọ-ozi sitere n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Nzukọ-nsọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, na-enwe ntụzi-aka ndị-ọzọ gbasara baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, enyere ụbọchị ya na Nauvoo, Illinois, 6 Septemba 1842 (History of the Church, 5:148–153).

1–5, Ndị ndekọta akụkọ amata na ndị ndekọta akụkọ ọha ahagh-imesi-ike na baptism ndị a maka ndị nwụrụ-anwụ bụ ezi a; 6–9, Akụkọ ndekọta ha dị-ire ka edere ya n’ụwa ma n’elu-igwe; 10–14, Ebe ewuru maka baptism bụ ihe pụtara ìhè nke ala-ili; 15–17, Elaija weghachiri ike nke gbasara baptism maka ndị nwụrụ-anwụ; 18–21, Ọtụghe-ụzọ nile, ike nile, na ikike nile nke ọgbọ ndị gara-aga ka eweghachiri; 22–25, Ozi nile nke-ọn̄ụ na nke dị-ebube ka e kwupụtara maka ndị dị-ndụ na ndị-nwụrụ-anwụ.

1 Dịka m dere nye unu n’akwụkwọ ozi m tutu mụ ahapụ ebe m, na a ga m edere unu akwụkwọ-ozi site n’oge ruo n’oge na nye unu ozi gbasara ọtụtụ isi-okwu nile, ugbụ a ka m malite ọzọ isi-ọkwu nke baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, n’ihi isi-ọkwu ahụ dịka ọ na-ejụpụta uche m, ma rụgidere onwe ya na mmetụta m karịchasịa, ke mgbe ndị iro m na-achụgharị m.

2 E dewo m mkpụrụ okwu ole na ole nke mkpughe nye unu gbasara onye ndekọta-akụkọ. Enwewo m ntule-uche ndị ọzọ gbasara okwu nke a, nke m na-emesi ike ugbua. Nke bụ, e kwupụtara ya na akwụkwọ ozi m nke ochie na a ga-enwe onye ndekọta-akụkọ, onye ga-ahụ n’anya, na kwa jiri ntị ya nile nụrụ, ka ọ nwe-ike mee akụkọ ndekọta nke ezi-okwu n’iru Onye-nwe.

3 Ugbu a, gbasara okwu nke a, ọ ga-ara-ahụ ukwuu ka otu onye ndekọta-akụkọ nọrọ mgbe nile, na rụọ ọrụ nile ahụ. Iji-gbochie ihe aram-ahụ nke a, a ga-enwe ike nwee onye ndekọta-akụkọ ahọpụtara na ngalaba otu ndị ụka ọbụla nke obodo-ukwu ahụ, onye nke tozuru-etozu maka idekọta usoro e ji nwee nzukọ zuru-oke; na ka ọ na-akpọ ihe aha na di-nkenke n’idetu ihe emere mesie ike n’akụkọ ndekọta ya na ya jiri anya ya nile hụrụ, na nụrụ na ntị ya abuọ, nye ụbọchị, na aha nile, na ihe ndị-ọzọ, na akụkọ nke ihe nile emere; na-akpọ aha madụ atọ nọ kwa ebe ahụ, ọ bụrụ na onwere onye nọ ya, onye nwere ike mgbe ọbụla a kpọrọ ya imesi nke a ike, ka na-ọnụ mmadụ abụọ ma-ọbụ ndị aka-ebe atọ a ga-ehiwe okwu ọbụla.

4 Mgbe ahụ, ka e nwee onye ndekọta-akụkọ zuru-oha, onye a ga-enyefe akụkọ e dere-ede ndị ọzọ ndị a, e jikọrọ ya na asambo ha tinyere-aka ha na ya, na emesi-ike na akụkọ edere-ede ahụ bụ ezi a. Mgbe ahụ onye ndekọta akụkọ zuru-ọha ga-edeba akụkọ edere-ede ahụ na-akwụkwọ zuru-ọha nzukọ-nsọ, ya na asambo nile na ndị nile na-agba aka-ebe, gbakwunye okwu nke ya na ya n’ezie kwenyere n’okwu dị na akụkọ edere-ede ndị a bụ ezie, site n’ihe ọ ma maka omume na nhọpụta nke ndị nwoke ndịa site na nzukọ-nsọ. Na mgbe e mere nke a na akwụkwọ nzukọ-nsọ zuru-ọha, ndekọ-akụkọ aha ga-ezi-ezi n’ịdị-nsọ, na aga-emesi emume-nsọ ahụ ike dịka a ga-asị na ọ hụrụ ya n’anya ya abụọ na nụrụ ya na ntị ya abụọ, na detuo ya na-akwụkwọ nzukọ-nsọ zuru-ọha.

5 Unu ga-eche usoro ihe nile nke a na ọ bụ ihe pụrụ iche; mana ka m gwa unu na ọ bụ nanị aziza nye uche nke Chineke, site na isonye usoro emume-nsọ na nkwado nke ahụ Onye-nwe kwadoro tutu a tọọ ntọ-ala nke ụwa, maka nzọpụta nke ndị nwụrụ-anwụ ndị ga-anwụ n’enweghị ọmụma ihe nke ozi-ọma.

6 Na ọzọ, a chọrọ m ka unu cheta na Jọn Onye mkpughe nọrọ n’echiche maka isi-ọkwu nke a gbasara ndị nwụrụ-anwụ, mgbe o kwuru dịka unu ga-ahụ edere na Mkpughe 20:12M’wee hụ ndị nwụrụ-anwụ nile, ndị nta na ndị ukwu, ka ha na-eguzo n’iru Chineke; ewee saghee akwụkwọ nile; asaghere kwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ, ewee kpee ndị nwụrụ-anwụ ikpe site n’ihe ndị ahụ edere n’ime akwụkwọ nile ahụ, dịka ọrụ ha nile siri dị.

7 Unu ga-achọpụta na nn̄omi okwu nke a na a saghere akwụkwọ ahụ nile na a saghe kwara akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ, mana ekpere ndị nwụrụ-anwụ ikpe site n’ihe ndị ahụ edere n’ime akwụkwọ nile ahụ, dịka ọrụ ha nile siri dị, n’ihi nke a akwụkwọ nile e kwuru maka ha ga-abụrịrị akwụkwọ nile nke nwere akụkọ-ndekọta nke ọrụ ha nile, ma na-ekwu maka akụkọ e dere-ede nke edotara n’ụwa. Na akwụkwọ ahụ nke bụ akwụkwọ nke ndụ bụ akụkọ-ndekọta ahụ nke edotara n’elu-igwe, ụkpụrụ ahụ n’ekwekọrịta na ozizi ahụ nke e nyere unu n’iwu na mkpughe nke nọ n’akwụkwọ-ozi nke m dere nye unu tutu mụ ahapụ ụlọ m—ka n’ime ihe edere-ede unu nile ka ọ bụrụ ihe edeturu n’elu-igwe.

8 Ugbụ a, ụdị emume-nsọ nke a jupụtara na ike nke ọkwa nchụ-aja site na mkpughe nke Jisus Kraịst, nke site na ya ekwere ka ihe ọbụla unu kechiri n’ụwa ga-abụ ihe e kechiri n’elu-igwe, na ihe ọbụla unu tọpụrụ n’ụwa ga-abụ ihe a tọpụrụ n’elu-igwe. Ma-ọbụ, n’okwu ndị ọzọ, na-ile ntụgharị asụsụ ahụ anya n’ụzọ ọzọ, ihe obụla unu dekoro n’ụwa ga-abụ ihe e dekọrọ n’elu-igwe, na ihe ọbụla unu n’edekọghị n’ụwa a gaghị edeko ya n’elu-igwe; n’ihi site n’akwụkwọ nile ka a ga-ekpe ndị nwụrụ-anwụ unu ikpe, dịka ọrụ nke ha nile siri dị, na ha na onwe ha meworo emume-nsọ nile n’onwe ha, ma-ọbụ site n’aka ndị nke ha nọchitara anya ha, dịka emume-nsọ ahụ siri dị bụ nke Chineke kwadoro maka nzọpụta ha site na tutu atọọ ntọ-ala nke ụwa, dịka akụkọ-ndekọta nile nke ha dotara gbasara ndị ha nwụrụ-anwụ.

9 Ọ ga-adị nye ndị ụfọdụ na ọ bụ ozizi n’enweghi-egwu ka anyị na-ekwu maka ya, ike nke na-edekọta akụkọ ma-ọbụ kechie n’ụwa na kechie n’elu-igwe. Otu o sila dị, n’oge nile nke ụwa, mgbe ọbụla Onye-nwe nyeworo ogbo a kara-aka nke ọkwa nchụ-aja n’aka otu nwoke site na mkpughe n’ezie, ma-ọbụ otu ndị nwoke ọbụla, ike a ka a na enyekwa. Ya mere, ihe ọbụla ndị ahụ mere n’ikike, n’aha nke Onye-nwe, na mee ya n’ezie na n’okwukwe, na dote ezi akụkọ-ndekọta kwesịrị ntụkwasị-obi nke ya a buworịị iwu n’ụwa na n’elu-igwe, na o nweghị kwa nhichapụ, dịka iwu-ọkụ nile nke Jehova ukwu ahụ. Nke a bụ okwu kwesịrị ntụkwasị-obi. Onye pụrụ ịnụ ya?

10 Ma ọzọ, n’ihi ihe ịma-atụ tulee, Matiu 16:18, 19: Ma mụ onwe m sị kwa gị, na gị onwe-gị bụ Pịta, na n’elu-oke nkume a ka m ga-ewu nzukọ-nsọ m, na ọnụ-ụzọ nile nke ala-mụọ agaghị emegide ya. Na a ga m enye kwa gị ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze nke elu-igwe: na ihe ọbụla ị ga-eke agbụ n’ụwa a ga-eke ya n’elu-igwe; na ihe ọbụla ị ga-atọpụ kwa agbụ n’ụwa a ga-atọpụ kwa ya n’elu-igwe.

11 Ụgbu a nnukwu na ọke ihe nzuzo nke okwu a nile na oke idi mma ya nile nke asụrụ na okwu ọzọ dịka nke isi-ọkwu a nile nke nọ n’iru anyị, nọ n’inweta ike nile nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ. N’ihi onye ahụ nke e nyere ọtụghe-ụzọ a nile enweghi nsogbu n’inweta ọmụma-ihe nke ihe nile gbasara nzọpụta ahụ nke ụmụ nke mmadụ nile, ma ndị nwụrụ-anwụ ma ndị dị ndụ.

12 N’ime nke a bụ otutu na nnukwu-ugwụ, na anwụghi-anwụ na ndụ ebighi-ebi—Emume-nsọ ahụ nke baptism site na mmiri, nke a ga-emikpụ na ya n’ọnọdụ ịzaghachi n’ọdịdị nke onye nwụrụ-anwụ, ka otu ụkpụrụ nwee nkwekọrịta ya na ọzọ; imikpu n’ime mmiri na pụta site na mmiri dị n’ụdị nke mbili-n’ọnwụ nke ndị mwụrụ-anwụ ịpụta site n’ili nile ya mere, e hiwere emume-nsọ nke a ka o nwee mmekọrịta ya na baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, nke bụ n’ụdị nke ndị nwụrụ-anwụ.

13 Ya mere, ebe ahụ e wuru maka baptism ka e hiwere dịka n’ụdị nke ili, ma e nyere iwu ka ọ nọrọ n’okpuru ebe ndị dị ndụ na-abịakọta mgbe nile, igosipụta ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ na ka ihe nile nwee ụdị ha, na ka ha dakọrịta otu na ibe ya—nke ahụ bụ nke ụwa na-ekwekọrịta na nke elu-igwe, dịka Pọl kwuworo, 1 Ndị Kọrịnt 15:46, 47, na 48:

14 Otu o sila dị nke ahụ adịghị mbụ bụ nke mụọ, mana nke ahụ dị n’ụdị okike, ma emesịa nke ahụ bụ nke mụọ. Nwoke mbụ ahụ bụ nke ụwa, anụ arụ, nwoke nke abụọ bụ Onye-nwe sitere n’elu-igwe. Dịka nke ụwa, otu a ka ha dị bụ nke ụwa, ma dịka nke elu-igwe, otu a ka ha dị kwa ndị bụ ndị elu-igwe. Na dịka akụkọ-ndepụta nile n’ụwa gbasara ndị unu nwụrụ-anwụ, ndị e depụtara n’ezi-okwu, otu a kwa ka akụkọ ndepụta ahụ dị n’elu-igwe. Nke a, ya mere, bụ ike nrachi na nkekọ, na, n’otu ụzọ na nghọta okwu ahụ, ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ, nke jikọrọ n’ọtụghe-ụzọ nke ịmata-ihe.

15 Na ugbua, ụmụnne m nwoke m hụrụ n’anya na ụmụnne m nwanyị, ka m mesie obi unu ike n’ihe ndịa bụ ụkpụrụ nile gbasara ndị nwụrụ-anwụ na ndị dị ndụ nke n’agaghị akpọ ihe efu, dịka ihe metụtara nzọpụta anyị. N’ihi nzọpụta ha dị mkpa ma baa-uru nye nzọpụta nke anyị, dịka Pọl kwuru gbasara ndị nna-ochie—na ha, asị na anyị anọghị ya a gaghị—a bụ ndị e mere ka ha zuo-oke—ma-ọbụ anyị inwe-ike ma ndị anyị nwụrụ-anwụ anọghị ịbụ ndị a ga-eme ka anyị zuo-oke.

16 Ma ugbụ a gbasara baptism maka ndị nwụrụ-anwụ, e nye m unu nn̄omi, okwu ọzọ nke Pọl, 1 Ndị Kọrịnt 15:29: N’ihi na asị n’ọdịghị otu a gịnị ka ha ga-eme bụ ndị a na-eme baptism n’ọnọdụ ndị nwụrụ-anwụ, ọbụrụ na e meghị ka ndị nwurụ-anwụ si n’ọnwụ bilie ma-oli? Ọ bụ gịnị mere a na-eme ha baptism n’ọnọdụ ndị nwụrụ-anwụ?

17 Na ọzọ, gbasara nn̄omi okwu nke a, aga m enye unu otu nn̄omi okwu sitere n’aka otu n’ime ndị-amụma, onye jiri anya ya rụgide na mwetaghachi nke ọkwa nchụ-aja, ebube nile a ga-ekpughe n’ụbọchị nile ndị ikpeazụ, na n’ụzọ pụrụ-iche isi-ọkwu nke a kachasị ebube bụ nke ozi-ọma mgbe nile na-adigide, n’ịkpọ ya aha, baptism ahụ maka ndị nwụrụ-anwụ, n’ihi Malakaị na-asi, isi nke ikpeazụ ama okwu nke ise na isii: Lee, mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja onye-amụma tutu oke ụbọchị ahụ dị egwu nke Onye-nwe a bịa: Ma ọ ga-eme kwa ka obi ndị bụ nna chigharikute ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharikute kwa ndị bụ nna ha, adịghị ama-ama m bịa were nkọcha mekpaa ụwa arụ.

18 Ọ ga-abụ na e nyewo m ntụgharị nke a nkọwa dịkarịrị mfe, mana ọ di mfe kwesịrị ebum n’uche m otu ọ dị. O zuru-oke ka a mara nke a na-aga e mekpa ụwa arụ jiri nkọcha ewezuga ma e nwere ihe njikọ ụdị ọbụla ma-ọbụ nke ọzọ n’etiti ndị nna na ụmụ ha, n’elu ụfọdụ isi-ọkwu ma-ọbụ ọzọ—ma lee gịnị bụ isi-ọkwu ahụ? Ọ bụ ime baptism maka ndị nwụrụ-anwụ. N’ihi anyị ma ha anọghi ya agaghị etozu-oke; ma-ọbụ ha nwere-ike ma anyị anọghị bụrụ ndị e mere ka ha zuo-oke. Ma-ọbụ ha nwere-ike ma-ọbụ anyị itozu-oke ma ndị ahụ nwụrụ-anwụ n’ime ozi-ọma anọghi ya kwa; n’ihi ọ dị mkpa na-ịkpọbata ọgbọ ozuzu oge nile akara aka, nke na-anabata ugbụ a, nke ahụ bụ otu na zuo-oke na njikọ tozuru-oke, na njikọ-otu-ebe nke ọgbọ a kara aka nile, na ọtụghe-ụzọ nile, na ike nile na ebube nile ga-adi, na ekpughere site n’ụbọchị nke Adam ọbụna rụọ n’oge ugbua. Na ọbụghị nani nke a, mana ihe ndị ahụ nile n’ekpugheghị site na ntọ-ala nke ụwa, mana e zoro ya, site na ndị amamihe na ndị na-akpachapụ-anya, ka a ga-ekpughe nye ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-an̄ụ ara na nke a, ọgbọ ozuzu oge nile akara-aka.

19 Ụgbu a, gịnị ka a na-anụ n’ozi-ọma nke anyị natara? Olu nke obi-ụtọ! Olu nke ebere sitere n’elu-igwe; na olu nke ezi-okwu site n’ụwa; ozi nile nke obi-ụtọ maka ndị nwụrụ-anwụ; olu nke obi-ụtọ maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ; ozi nile nke obi-ụtọ nke oke ọn̄ụ. Olee otu ịma-mma ya siri dị n’elu-ugwu nile bụ ụkwụ nile nke ndị ahụ na-eweta ozi nile nke obi-ụtọ nke ihe-ọma nile, na nke na-asị Zaịọn: Lee, Chineke gị na-achị! Dịka igirigi nile nke Kamel, otu a ka mmụta-ihe nke Chineke ga-adasa n’elu ha!

20 Na ọzọ, gịnị ka anyị nụrụ? Ozi nile nke obi-ụtọ sitere na Kumora! Moronaị, otu mụọ ozi sitere n’elu-igwe, na-ama ọkwa mmezu nke ndị amụma—akwụkwọ ahụ nke a ga-ekpughe. Olu nke Onye-nwe n’ọzara nke Fayette, ógbè Seneca, na-ama ọkwa mmadụ atọ aka-ebe ahụ na-agba ama nke akwụkwọ ahụ! Olu nke Maikel n’ọwa Osimiri nile nke Susquehanna, mgbe ọ na-achọpụta ekwensu mgbe ọ biara dịka mụọ-ozi nke ìhè! Olú nke Pịta, Jemes, na Jọn n’ọzara n’agbata Harmony, ógbè Susquehanna, na Colesville, ógbè Broome, na Osimiri Susquehanna, na-ama ọkwa onwe ha dịka ndị ji ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ, na nke ọgbọ nke ozuzu oge nile akara aka!

21 Na ọzọ, olu nke Chineke n’ime ụlọ nke agadi Nna Whitmer na Fayette, ógbè Seneca, na n’ọge nile, na n’ebe nile site na njem nile na mkpagbu nile nke Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a! Na olu nke Maikel, onye isi mụọ-ozi ahụ, olu nke Gebriel, na nke Rafel, na mụọ-ozi dị-iche iche, site na Maikel ma-ọbụ Adam gbada ruo na-oge ugbua, ha nile na-ama ọkwa ọgbọ a kara aka nke oge ha, oke ruru ha, ọtụghe-ụzọ ha nile, ugwụ ha, ụdị eze na ebube ha, ike nke ọkwa nchụ-aja ha; na nye ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a ntakịrị n’ebe ahụ; na-enye anyị nkasi-obi site n’izipụta nke ahụ ga-abịa, na-emesi olile-anya anyi ike!

22 Ụmụnna m, anyị agaghị a ga-n’iru n’ihe kpatara ihe ukwu dị otu a? Gaa n’iru ọbụghị azụ, nwee nụ ume ụmụnne; gaa n’iru, n’iru ruo na-mmeri! Ka obi unu nile n̄ụrịa, na nwee nnukwu obi-ụtọ ka ụwa nile jupụta na mkpu nke ikwe ukwe. Ka ndị nwụrụ-anwụ kwepụta ukwe nile nke otuto ebighi-ebi nye Eze Imanuel, onye echiri-echichi, tutu ụwa a dị, nke ahụ nke ga-enyere anyị-aka i gbapụta ha site na ụlọ-mkpọrọ ha, n’ihi ndị mkpọrọ ga-enwere onwe ha.

23 Ka ugwụ nile tie-mkpu ọn̄ụ, na unu ndagwurugwụ tisie mkpu ike, na unu oke osimiri nile na ala-kpọrọ nkụ nile kọwaa ọrụ-ebube nile nke Eze Ebighi-ebi unu! Ma unu mmiri nile, na mmiri-iyi nile, na mmiri nta nile, jiri oke ọn̄ụ wụda. Ka ọhịa nile na osisi nile nke ọhịa too Onye-nwe, na unu oke nkume nile siri ike kwaa-akwa ọn̄ụ! Na ka anyanwụ, ọnwa na kpakpando ụtụtụ nile bụkọọ-abụ, na ka ụmụ-ndịkom Chineke nile tie mkpu ọn̄ụ! Na ka ihe nile ekere-eke mgbe ebighi-ebi maa ọkwa aha ya ruo mgbe nile na mgbe nile! Na ọzọ a sị m, olee otu idi-ebube nke olu anyị nụrụ site n’elu-igwe dị, nke na-ama-ọkwa na-nti anyị nile, ebube, na nzọpụta, na nnukwu-ugwụ, na anwụghị-anwụ, na ndụ ebighi-ebi, ala-eze nile, ala ọkpara-eze nile, na ike nile!

24 Lee, nnukwu ụbọchị nke Onye-nwe dịkwa nso; na onye nwere ike ịnagide ụbọchị ọbibịa ya, na onye ga-eguzo mgbe ọ ga-apụta ìhè? N’ihi na ọ dịka ọkụ onye-mmezi-ọla, na dịka ncha onye-mmezi-akwa, na ọ ga-anọdụ dịka onye mmezi na onye-nsacha nke ọla-ọcha, na ọ ga-asacha ụmụ nwoke nile nke Livaị, na sachaa ha dịka ọla-edo na ọla-ọcha, ka ha wee nye Onye-nwe onyinye n’ezi-omume. Ya mere, ka anyị, dịka nzukọ-nsọ na otu ndị, na dịka Ndị-nsọ nke Ụbọchị-Ikpeazụ a, nye Onye-nwe onyinye n’ezi omume, na ka anyị nye na temple nsọ ya, mgbe ewusiri ya, akwụkwọ jikọrọ ndekọta nile nke ndị anyị nwụrụ anwụ, nke ga-etozu-oke nke nnabata nile.

25 Ụmụnne m ndị nwoke, e nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwuru unu n’isi-ọkwu nke a, mana a ga m emechi ugbụ a, na gaa n’iru n’isi okwu ahụ n’oge-ọzọ. A bụ m, dịka mgbe nile, nwa-odibo unu dị-umeala, na enyị na-adighi agharịpụ.

Joseph Smith.