Nkeji 25
Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania, Julaị 1830 (History of the Church, 1:103–104). (Lee isi-okwu nke Nkeji 24.) Mkpughe nke a gosipụtara uche nke Onye-nwe nye Emma Smith, nwunye Onye-amụma.
1–6, Emma Smith, agbọghọbịa ahọpụtara, ka akpọrọ, ka onye aka ma kasie di ya obi; 7–11, A kpọkwara ya ide, ịkọwadaru akwụkwọ-nsọ nile ala; ma ị họpụta abụ nile; 12–14, Abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye Onye-nwe; 15–16, Ụkpụrụ ọma nile nke irube isi dị na mkpughe nke a bu ihe a ga-atụnyere mmadụ nile.
1 N̄aa-ntị n’olu nke Onye-nwe Chineke gị, mgbe m na-ekwuru gị okwu, Emma Smith, nwa m nwanyị, n’ihi n’ezie a sị m gị, ndị nile ahụ natara ozi-ọma m bụ ụmụ m nwoke na ụmụ m nwanyị n’ala eze m.
2 Mkpughe ka m n’enye gị gbasara uche m; ma ọbụrụ na ikwesị ntụkwasị-obi ma jee-ije n’ụzọ ezigbo-omume n’iru m, a ga m echekwa ndụ gị, ma ị ga-anata ihe nketa na Zaịọn.
3 Lee, a gbagharawo gị mmehie gị nile, ma ị bụ nwagbọghọ ahọpụtara, onye m kpọworo.
4 Atamula n’ihi ihe nile na ị hụbeghị, maka ha ka ejichiri site na gị nakwa site n’ụwa, nke bụ amamihe n’ime m n’oge na-abịa.
5 Ma ọkwa-ọrụ nke ọkpụkpọ gị ga-abụ nke nkasi-obi nye odibo m, Joseph Smith, nta di gị, na mkpagbu ya nile, jiri ọkwụ nkasi-obi na mụọ nke ịdị-nwayọ.
6 Ma ị ga-eje gị na ya n’oge ọ na-aga, ma dịrịkwa ya dịka onye ode-akwụkwọ, mgbe n’onweghị onye ga-abụ onye ode-akwụkwọ nye ya, ka m ziga nwa ọdịbọ m, Oliver Cowdery, ebe ọbụla m chọrọ.
7 Ma a ga-echi gị echichi n’aka ya ka ịkọwadaruo akwụkwọ nsọ nile ala ma ka ị gbaa Nzukọ-nsọ ume, dịka a ga-esi enye gị ya site na Mụọ m.
8 N’ihi ọ ga-ebịkwasị gị aka n’isi, ma ị ga-anata Mụọ Nsọ, ma oge gị ka a ga-enye ihe odide, na ị mụta nnukwu ihe.
9 Ma ikwesịghị ịtụ ụjọ n’ihi na di gị ga-akwado gị nime Nzukọ-nsọ; n’ihi ọkpụkpọ ya bụ nye ha, ka ihe nile bụrụ ihe ekpụghere nye ha, ihe ọbụla m chọrọ dịka okwukwe ha siri dị.
10 Ma n’ezie a sị m gị na ị ga-atọgbọ iche ihe nile nke ụwa nke a, ma chọọ ihe nile nke ka mma.
11 Ma a ga-enye gị, kwa, ịhọpụta abụ-nsọ nile, dịka a ga-enye gị ha, nke mara mma nye m nke a ga-enwe na Nzukọ-nsọ m.
12 N’ihi na mkpuru-obi m na-enwe mmasị n’abụ nke obi, e abụ nke onye ezi-omume bụ ekpere nye m, ma a ga-eji ngọzi a wụsara n’isi ha aza ya.
13 Ya mere bulite obi gị elu ma n̄ụrịa, ma rapara na ọgbụgba ndụ nile nke i meworo.
14 Gaa n’iru na mụọ nke ịdị nwayọ ma kpachara anya maka mpako. Ka obi gị n̄ụrịa na di gị, na ebube nke ga-abịakwasị ya.
15 Debe iwu-nsọ m nile esepụghị-aka, ma okpu nke ezi-omume ka ị ga-anata. Ma m’ọbụghị ma i mere nke a, ị gaghị abịa ebe m nọ.
16 Ma n’ezie, n’ezie, a si m gị, na nke a bụ olu m nye mmadụ nile. Amen.