Ọgbakọ Zuru ọha
Mmeri nke Olileanya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


13:31

Mmeri nke Olileanya

Okwukwe bụ onyinye dị ndụ, onyinye nke na-eto dị ka anyị na-abawanye okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị n’ofe gburugburu ụwa, dị ka anyị na amalite n’oge nke a pụrụ ezigbo iche nke ọgbakọ zuru ọha, anya nke eluigwe ahaghị ilekwasị anyị n’ezie. Anyị ga-anụ olu nke Onyenwe anyị site n’ọnụ ndị odibo Ya; anyị ga-enweta mmetụta ”odudu, ntuziaka, na nkasi obi” nke Mmụọ Nsọ, ma okwukwe anyị ga-enweta mgbam ume.

Afọ atọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson malitere ọgbakọ zuru ọha site n’okwu ndị a: “Mkpughe n’enweghị ntụpọ maka ajụjụ ndị nọ niime obi unu ga-eme ọgbakọ nke a abụrụ ịgba na ihe agaghị echefu echefu. Ọ bụrụ na ị ka achọbeghị maka ije ozi nke Mmụọ Nsọ inyere gị aka ịnụta ihe Onyenwe anyị ga-achọ ka ị nụ niime mkpụrụ ụbọchị abụọ ndị a, ana m akpọku gị ime otu a ugbua. Biko meenụ ọgbakọ nke a oge iri oriri n’ozi niile sitere n’ọnụ Onyenwe anyị site na ụmụ odibo Ya.”

Akwụkwọ nsọ na-ejikọ mkpụrụokwu atọ a ọnụ n’ụzọ siri ike: okwukwe, olileanya, afọ ọma. Onyinye nke olileanya bụ onyinye dị nsọ nke ego apụghị ịzụta sitere n’aka Chineke.

Mkpụrụokwu ahụ olileanya bụ ihe ejiri mee ọtụtụ ihe anyị chọrọ ka o mee. Iji maa atụ, “Atụrụ m anya na mmiri agaghị ezo,” ma ọ bụ “Atụrụ m anya na otu egwuregwu anyị ga-emeri.” Nzube m bụ ikwu okwu banyere olileanya anyị niile dị nsọ ma dị ebighị ebi hiwere isi na Jizọs Kraịst na ozi ọma ahụ eweghachitere, na “ihe ndị anyị ji obisi ike na-atụanya banyere … ngọzi niile nke ezi omume ekwere na nkwa.”

Olileanya Anyị maka Ndụ ebighị ebi

Olileanya anyị maka ndụ ebighị ebi bụ ihe ekwere nkwa ya site na amara nke Kraịst na nhọrọ niile nke onwe anyị, na-enye anyị ohere inwete ngọzi ahụ dị ịrịba ama nke ịlaghachi n’ebe obibi anyị n’eluigwe na ibi ruo ebighị ebi n’udo na ańụrị anyị na Nna nke Eluigwe, Ọkpara Ọ Hụrụ naanya, ezi na ụlọ anyị kwesịrị ntụkwasị obi na ndị enyi dị oke ọnụ ahịa, na ndịikom na ndịinyom ezi omume sitere na kọntinent niile na narị afọ niile.

N’elu ụwa anyị na-enweta nhụmiihe ọńụ na mwute dị ka anyị na-agabiga nnwale ma nweta ọdịmma. Mmeri anyị na-abịa site n’okwukwe na Jizọs Kraịst dị ka anyị na-enwe mmeri megide mmehie, ihe isi ike, ọnwụnwa, na mmegbu anyị niile, ma ihe aka mgba niile nke ndụ nke a a pụrụ ịnwụ anwụ.

Dị ka anyị na agba okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst ume, anyị na-ahụ gafee ịgba mbọ anyị niile ruo na ngọzi niile na nkwa niile nke ebighị ebi. Dị ka ihe nke mmụke ya na-eto eto, olileanya na-enye ihe n’ụwa gbara ọchịchịrị, ma anyị ahụ ọdịniihu anyị dị ebube.

Olileanya Na-abịa site n’aka Chineke

Kemgbe mmalite, Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ọ Hụrụ naanya n’oke ọnụnụ ọkụ n’obi agọziwo ndị ezi omume site na onyinye nke olileanya dị oke ọnụ ahịa.

Mgbe a pụsịrị n’ogige ahụ, Adam na Iv ka onye mmụọ ozi kuziiri ihe banyere nkwa nke Jizọs Kraịst. Onyinye nke olileanya nyere amamiihe na ndụ ha. Adam wee maa ọkwa, “Anya m emeghewo, ma na ndụ nke a aga m enwe ọńụ.” Iv kwuru maka “ọńụ nke mgbapụta [ha], na ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye ndị niile na-erube isi.”

Dị nnọọ ka Mmụọ Nsọ weteere Adam olileanya, ike nke Mmụọ nke Onyenwe anyị na-enye ndị kwesịrị ntụkwasị obi amamiihe taa, na-enye ihe n’ịdị ire nke ndụ ebighị ebi.

Onye Nzọpụta na-ezitere anyị Onye Nkasi obi, Mmụọ Nsọ, onye nsiso na-eweta okwukwe, olileanya anyị, na udo, “ọ bụghị ka ụwa si enye.”

“N’ụwa,” Onye Nzọpụta kwuru, “unu ga-enwe mkpagbu: mana nwee nụ ańụrị [nweenụ ihe nke olileanya]; E meriwo m ụwa.”

N’oge niile nke ihe isi ike, anyị na-ahọrọ ịtụkwasị Onyenwe anyị obi n’okwukwe. Anyị ji nwayọ na-arịọ, “Ọ bụghị uche m, mana nke gị ga-eme.” Anyị na-enweta mmetụta nkwado nke Onyenwe anyị maka ịdị nwayọọ n’ịdị njikere anyị, ma anyị na-eche udo ekwere na nkwa nke Onyenwe anyị ga-ezite n’oge nke Ọ họrọworo.

Pọl Onyeozi kuziri, “Chineke nke olileanya [ga] emejuputa unu na … ọńụ na udo … , nke ga-eme ka unu wee juputa n’olileanya,” “na-ańụrị ọńụ n’olileanya; ndidi niime mkpagbu;” “site n’ike nke Mmụọ Nsọ.”

Ihe ọmụmụ nke Olileanya.

Onye amụma Moronaị maara na mbụ na mbụ gbasara inwe olileanya niime Kraịst n’oge mkpagbu. Ọ kọwara ọnọdụ ya dị oke mwute:

“Anọ m naanị m. … E nweghị m … ebe m ga-aga.”

“Anaghị m eme onwe m ka amata m … n’ụjọ ma ha ga-ebibi m.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, n’awa nke ọchịchịrị na owu ọmụma nke a, Moronaị dedatara okwu olileanya niile nke nna ya:

“Ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe ọ ga-enwerịrị olileanya; niihi na ma enweghị okwukwe enweghị ike inwe olileanya ọbụla.”

“Gịnị ka ọ bụ nke unu ga-enwe olileanya ya? … Unu ga-enwe olileanya site nʼaja mgbaghara mmehie nke Kraịst na ike nke mbilite nʼọnwụ ya, ịkpọlite unu inwe ndụ ebighị ebi.”

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, olileanya bụ onyinye dị ndụ, onyinye nke na-eto dị ka anyị na-abawanye okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst. “Okwukwe bụ ụmị nke ihe niile atụrụanya maka ha.” Anyị na-ewu ụmị nke a—ọkpụrụkpụ aka ebe niile banyere okwukwe anyị—site n’ekpere, ọgbụgba ndụ niile nke tempụl, idobe iwu nsọ niile, na-anọgide na-eri oriri na akwụkwọ nsọ na okwu niile nke ndị amụma ụbọchị taa, na-eri oriri nsọ, na-ejere ndị ọzọ ozi, ma na-efe ofufe izu ụka niile anyị na Ndị nsọ ibe anyị.

Ụlọ nke Olileanya

Iji mesie olileanya anyị ike n’oge ajọọ omume na-abawanye, Onyenwe anyị enyewo onye amụma Ya ntuziaka ka o mee ka tempụl Ya juputa n’elu ụwa niile.

Dị ka anyị na-abanye n’ụlọ Onyenwe anyị, anyị na-enweta mmetụta Mmụọ nke Chineke, na-enyocha olileanya anyị.

Tempụl na-agba ama banyere ili ahụ tọgbọrọ n’efu ma na ndụ gafere akwa mkpuchi na-aganiihu maka onye niile.

Maka ndị ahụ na-enweghị onye nsiso nke ebighị ebi, emume nsọ niile n’eji ike na-eme ka amata na onye ezi omume ọbụla ga-anata ngọzi niile ekwere na nkwa.

Enwere olileanya a na-enye nsọpụrụ mgbe di na nwunye nta gbisara n’ofe ebe nchụaja maka nrachi, na-abụghị nnọọ maka nwa mgbe nta mana maka mgbe ebighị ebi.

Enwere olileanya dị oke ukwuu maka anyị niime nkwa niile e mere nye ndị agbụrụ anyị, na-agbanyeghị ihe ọbụla bụ ọnọdụ ha ụgbụa.

Enweghị ihe mgbu, enweghị ọrịa, enweghị mmegbu, enweghị ntaram ahụhụ, enweghị ihe ọbụla nwere ike ikpuchi olileanya anyị dị ka anyị na-ekwenye ma jidesie aka ike na ọgbụgba ndụ niile nke anyị na Chineke n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ ụlọ nke ihe, ụlọ nke olileanya.

Mgbe Etufuru Olileanya

Anyị na-akwa akwa dị mwute mgbe anyị na-ahụ obi ọjọọ na ịda mba niime ndị ahụ na-enweghị olileanya na Kraịst.

Na nso nso a ahụtara site n’ebe dị anya di na nwunye ndị otu mgbe nweburu okwukwe na Kraịst ma mesịa kpebie ịhapụ nkwenye ha. Ha mere nke ọma naanya ndị ụwa, ma ha nwetara obi ụtọ na ikike mmụọ nchepụta ezi echiche ha na ọjụjụ nke okwukwe ha.

O yiri ka ihe niile dị mma tutu ruo mgbe di ya, ka dị be nta ma nwee ume, na mberede dara ọrịa ma nwụọ. Dị ka chi jiri ehihe jie, ha ekpuchiwo ihe nke Ọkpara ahụ, ma rịzọọtụ ya bụ chi jiri ehihe jie nke olileanya. Nwunye ya, na-enweghị nkweta ya, ugbua dịrị ka onye ụwa ya gwụrụ, na-enweghị nkwado jọgburu onwe ya, na-enweghị ike ịkasi ụmụ ya obi. Ọgụgụ isi ya agwawo ya na ndụ ya zuru oke nke ọma tutu n’otu ntabi anya o nweghị ike ịhụ ọdịniihu ọbụla. Ịda mba ya wetere ọchịchịrị na mgbagwoju anya.

Olileanya niime Ọdachi Na-Agbawa obi

Ka m gosi ndịiche ịda mba ya na-egbu mgbu ya na olileanya niime Kraịst nke ezi na ụlọ nke ọzọ n’oge obi mgbawa.

Iri afọ abụọ na otu gara aga nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ nke nwa nwanne m Ben Andersen na nwunye ya, Robbie, ka ebuuru n’ụgbọ elu gbaa ọsọ ndụ site n’ogige ndị na-akọ ugbo na Idaho ruo Salt Lake City. Erutere m n’ụlọ ọgwụ ahụ, ma Ben kọwara oke nsogbu ndị na-eyi egwu na ndụ n’obi nke nwa ọhụrụ ha. Anyị bikwasịrị aka anyị n’elu ntakịrị isi nke Trey. Onyenwe anyị gọziri ya ịdị ndụ gaaniihu.

Awara Trey obi n’izu ụka mbụ nke ndụ ya, ma ọtụtụ ịwa ahụ sochiri. Ka afọ na-aga, ọ bịara doo anya na Trey ga-enwe nhoghara obi. Na-agbanyeghị na ihe omume niile nke anụ ahụ ya adịchaghị ka esi chọọ, okwukwe ya bawanyere, O dere, “Enwetụbeghị mgbe ebere onwe m mere m niihi na amaara m mgbe niile mkpa ọ dị inwe okwukwe na Jizọs Kraịst na ama nke atụmatụ nke nzọpụta.”

Trey Andersen

Trey tinyere na-ekwe ntị ya nńomi nke a amaara nke ọma sitere n’aka Onyeisi Nelson: “Ọńụ ahụ anyị na-enwe nwere ntakịrị ihe iji tụnyere ọnọdụ niile nke ndụ anyị ma o nwee ihe niile iji tụnyere olileanya nke ndụ anyị.”

Trey Andersen

Trey dere: “Kemgbe niile anọ m na-atụanya ije ozi mishọn n’uju, mana … ndị dọkịta m ekweghị m jee mishọn tutu ruo opekata mpe otu afọ nhoghara m gachara. … Etinyewo m okwukwe m na Jizọs Kraist.”

Trey nwere obi ụtọ mgbe anabatara ya na-ịgụ naanị ihe gbasara mgbakọ na mwepụ egọ na BYU ịmalite na simesta nke a, mana ọbụna karịa nwee obi ụtọ na ngwụcha Julaị mgbe ọ natara oku ekwe ntị ọ na-atụanya ya ịbịa n’ụlọ ọgwụ maka nhoghara obi ya.

“Otu afọ,” Trey kwuru, “ma aga m aga mishọn m,”

Enwere nnukwu ihe ndị atụrụ anya ha mgbe ọ banyere n’ọnụ ụlọ ịwa ahụ. Ka osila dị, n’oge ọwụwa ahụ ahụ enwere ọtụtụ ihe mgbagwoju anya na-agwụ ike, ma Trey enweghị mgbe o tetara ọzọ.

Nne ya, Robbie, kwuru: “Fraịde abụworịị ụbọchị kachasị agbawa obi … na-anwa nnọọ itinyecha uche anyị na ya. … Amụwo m anya oge agaa nọrọ nnọọ na-eche maka ihe niile. … Mana Satọde, etetara m n’obi juputara n’ọńụ. Ọ bụghị nnọọ naanị udo; ọ bụghị ngọpụ. Enwere m ọńụ maka nwa m nwoke, ma enwere m ọńụ dị ka nne ya. … Ben ebuwo m rịị ụzọ teta, ma mgbe anyị mechara nweta ohere ikwu okwu, Ben etetawo nweekwa otu ụdị mmetụta ahụ.”

Robbie na Ben Andersen

Ben kọwara: ”O doro m anya na mkpụrụ obi dị ka Chineke kuziiri m ihe site na Mmụọ Nsọ Ya. Etetara m na elekere anya 4 nke ụtụtụ ma juputa n’udo na ọńụ nke ọnụ apụghị ịkọwa. Kedụ ka nke a sị wee kwe ọmume? … Ọnwụ Trey na-egbu mgbu nke ukwuu, ma ana m eche maka ya nke ukwuu. Mana Onyenwe anyị anaghị ahapụ inye anyị nkasi obi. … Ana m atụanya nzukọta ọzọ juru n’ọńụ.”

Nkwa nke Olileanya

Trey dere na jonal ya mkpụrụokwu ndị a sitere n’okwu nke Onyeisi Nelson kwuru n’ọgbakọ zuru ọha: “Oyighị ka ihe kwere omume inwe mmetụta ọńụ mgbe nwa gị na-ata ahụhụ site n’ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ ma ọ bụ mgbe ọrụ gị kwụsịrị ma ọ bụ mgbe di ma ọ bụ nwunye gị mere omume ọjọọ megide gị. Otu ọ dị nke ahụ bụ kpọm kwem ọńụ nke Onye Nzọpụta na-enye Ọńụ Ya na-adịgide, na-amasi anyị obi ike na ‘mkpagbu anyị niile ga-abụ mana nwa mgbe nta’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:7] a aga edo ya nsọ maka uru anyị.”

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, udo ahụ unu na-achọ nwere ike gaghị abịa ọsịsọ ọsịsọ dị ka unu si chọọ, mana ana m ekwe unu nkwa na dị ka unu na-atụkwasị obi niime Onyenwe anyị udo Ya ga-abịa.

Ka anyị zụọ okwukwe anyị dị oke ọnụ ahịa, na-enu aganiihu jiri ihe olileanya zuru oke. Ana m agba ama na olileanya anyị bụ Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Site na Ya, nrọ ezi omume anyị niile ka aga emezu. Ọ bụ Chineke olileanya—mmeri nke Olileanya. Ọ dị ndụ ma Ọ hụrụ gị naanya. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell N. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ-nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” LiahonaMe 2018, 96.

  2. Russell M. Nelson, “Eziokwu Na-enweghị Ntụpọ, Ozizi Na-enweghị Ntụpọ, na Mkpughe Na-enweghị Ntụpọ,” LiahonaNov. 2021, 6–7.

  3. Ị hụtawo niime akwụkwọ nsọ na olileanya na-ara ahụ iguzoro naanị ya? Olileanya bụ ihe ana ejikọ ya na okwukwe ọtụtụ mgbe. Okwukwe na olileanya bụ ihe ana ahụkarị jikọtara ọnụ ya na afọ ọma Gịnị mere? Niihi na olileanya dị oke mkpa nye okwukwe; okwukwe dị oke mkpa nye olileanya; okwukwe na olileanya bụ ihe ndị dị oke mkpa nye afọ ọma (lee 1 Ndị Korịnt 13:13, Alma 7:24, Eta 12:28, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:5). Ha na-akwado onye na ibe ya dị ka ụkwụ ndị nọ na oche ụkwụ atọ. Ha atọ metụtara Onye Mgbapụta anyị.

    Okwukwe [gbara mgbọrọgwụ niime] Jizọs Kraịst. Olileanya gbakwasịrị ụkwụ na aja mgbaghara mmehie ya. Afọ ọma ka ana egosịpụta niime ‘ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ’ (lee Moronaị 7:47). Njiri mara atọ ndị a gwakọtara ọnụ dị ka eriri ndị dị niime kebụl ma nwere ike gaghị enwe mmata ọdịiche kpọm kwem. N’ukwu, ha na-aghọ ihe njikọta anyị nye alaeze selestịal” (Russell M. Nelson, “A More Excellent HopeBrigham Young University devotional, Jan. 8, 1995], speeches.byu.edu).

  4. Isiokwu niile nke Ozi ọma, “olileanya,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  5. ”Ya mere, onye ọbụla nke kwere na Chineke ga-enwe ike jiri obisike nwee olileanya maka ụwa nke ka mma, … ọbụna ọnọdụ nʼaka nri nke Chineke, bụ olileanya nke na-abịa site nʼokwukwe, na-eme ndabere nye mkpụrụ obi nke ụmụ mmadụ, [na-eme] ka ha kwusie ike ma guzogide” (Eta 12:4).

  6. Okenye Dieter F. Uchtdorf kwuru: Kwee ka m nakwere na obi ịda mba na ima aka niile siri ike nke echiche na mmetụta uche dị irè, ma azịza ya abụghị nnọọ naanị, ‘Gbaa mbọ ịnwe ańụrị karịa.’ Ebumnuche m taa abụghị ibelata ma ọ bụ akpọghị ihe niile gbasara ahụike nke uche ihe. Ọ bụrụ na ị na-ezute ụdị ima aka ndị a, eso m gị eru uju, ma eguzo m gị n’akụkụ. Maka ụfọdụ ndị mmadụ, ịchọta ọńụ nwere ike gụnye ịchọta enyemaka site n’aka ndị ọkachamara ahụike nke uche ndị nyefere ndụ ha na-ịrụ ọrụ nka ha dị oke mkpa. Anyị kwesịrị ịnye ekele maka ụdị enyemaka dị otu a” (“Ọńụ Kacha Ukwuu,” LiahonaMe 2024, 66).

  7. Nna anyị nke Eluigwe amawo ọkwa na ọrụ na ebube Ya bụ iweta na mmezu ndụ ebighị ebi anyị (lee Moses 1:39).

  8. (Lee Moses 5.

  9. Moses5:10.

  10. Moses5:11.

  11. Lee Moses 5:9.

  12. Jọn 14:27.

  13. Jọn16:33.

  14. Lee Luk 22:42.

  15. Ndị Rom 15:13.

  16. Ndị Rom 12:12.

  17. Ndị Rom 15:13.

  18. Mọmọn 8:5.

  19. Moronaị 1:1.

  20. Moronaị 7:42.

  21. Moronaị 7:41.

  22. Ndị Hibru 11:1. Na ntụgharị asụsụ nke Josef Smith ana agụ, Okwukwe bụ mmasi obi ike nke ihe niile atụrụanya ya, aka ebe nke ihe niile na-anaghị ahụ anya” (niime ihe agbakwunyere na Baịbụlụ). Anyị na-ahụ mmasi obi ike nke okwukwe anyị niime ngọzi niile na-abịara ndị ahụ na-edobe ọgbụgba ndụ niile ha meworo ha na Onyenwe anyị.

  23. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82.

  24. Okwu nke Robbie Andersen nyere n’olili nke nwa ya nwoke, Trey Andersen, Ọgọst 12, 2024. Awara Trey ahụ na Julaị 31, 2024. Ọ hapụrụ ndụ nke a na Ọgọst 3, 2024.

  25. Okwu nke Ben Andersen nyere n’olili nke nwa ya nwoke, Trey Andersen, Ọgọst 12, 2024.

  26. Lee Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” 82.

  27. Lee 2 Nifaị 31:20. Olileanya nke Nefi na-ekwu maka ya zuru oke ma na-enye ihe niihi na ọ gbakwasịrị ụkwụ na Kraịst. O zuru oke, ma Aja mgbaghara mmehie Ya, nke na-enye ihe olileanya nke a, zukwara oke.