Okwu niile nke Kraịst na Mmụọ Nsọ Ga-edu Anyị ruo Eziokwu
Ịmara atụmatụ ịrịba ama nke a ga-enyere anyị aka mara anyị bụ ụmụ Chineke ma anyị nwere ike ịdịrịzi ka Ya.
Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe. Anyị bụ ụmụ Ya nke mmụọ, ma ekere anyị n’oyiyi nke Ya. Ya mere, onye ọbụla niime anyị, dị ka nwa Chineke, nwere ike mmepụta sinachi idiri ka nwa Ya.
Anyị na Ya biiri dị ka mmụọ tupu anyị abịa n’ụwa. Nna nke Eluigwe, dị ka nne na nna ime mmụọ anyị, hụrụ anyị naanyana-achọ nke kachasị mma maka anyị, ma kwadooro anyị otu atụmatụ iji nata ngọzi Ya niile kacha ibe ya, nke na-apụghị ịnwụ anwụ na ndụ ebighị ebi. Dị ka otu atụmatụ ahụ siri dị, anyị dị ka ụmụ nke mmụọ, ka a ga-enye ohere nhọrọ ịhọrọ atụmatụ Ya. Site n’ịbịa n’ụwa, anyị ga-apụ nihu nke Chineke, chefuo ndụ tupu ndụ anụ ahụ anyị, nata ahụ nke anụ ahụ na ọkpụkpụ, nwete nhụmiihe nke onwe, ma nwee okwukwe. Jiri anụ ahụ na ọkpụkpụ anyị niile, dị ka ụmụ mmadụ eke, anyị ga-adaba n’ọnwụnwa, ruo unyi ma nọrọ ebe dị anya site n’ebe Chineke nọ, ma gaghị enwe ike ịlaghachi nihu Ya dị nsọ. Niihi ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe maka anyị na-enweghị atụ, o zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, ịbụ Onye Nzọpụta anyị. Site n’aja Ya, Aja mgbaghara mmehie, Jizọs Kraịst mere ka ịgbapụta anyị site na njọ anyị kwe omume ma bilite n’ọnwụ ma nata ndụ ebighị ebi.
Obi juputara m na nnukwu ekele maka eziokwu ndị dị ebube—ihe anyị na-akpọ atụmatụ nzọpụta nke Nna, atụmatụ ebere Ya, ma ọ bụ nnukwu atụmatụ nke obi ụtọ Ya. Ị na-amụ eziokwu ndị a dị mkpa enyewooro m aka mara ezi njirimara m na ngọzi niile dị ukwuu nke mbuli elu na ndụ ebighị ebi Chineke kwadowooro anyị. Onye amụma Nifaị kuziiri anyị ụzọ ya: “Ya mere, … n’eri nụ oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; niihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile unu kwesịrị ime.” Ọ gbakwunyere, “Ọ bụrụ unu ga-abata site n’ụzọ ahụ, ma nata Mmụọ Nsọ ahụ, ọ ga-egosị unu ihe niile unu kwesịrị ime.” Taa ọ ga-amasị m ikesa otu mkpụrụokwu niile nke Kraịst na Mmụọ Nsọ si nyeere m aka chọta udo na-enye eziokwu ndị a dị mkpa na afọ iri na ụma m.
Okwu niile nke Kraịst Ga-agwa Unu Ihe Niile Unu Kwesịrị Ime
Dị nnọ ka Nifaị kwuru na mmepe amaokwu nke akwụkwọ nke 1 Nifaị, “ndị nne na nna dị mma mụkwara” m. Etolitere m na Nagano, Japan, nebe obibi ebe ime ihe n’eziokwu, nrụsi ọrụ ike, na ịdị umeala n’obi ka agbara ume nke ukwuu na nkwekọrụta nye omenaala ochie niile ka esooro kpọmkwem. Nna m bụụrụ ezigbo onye okpukpere chi. E lere m ya anya ka ọ na-ekpe ekpere nihu ebe nchụaja nke Shinto na Buddhist ụtụtụ niile na abalị niile. Ọbụna agbanyeghị amaghị m onye ọ na-ekpe ekpere nye na ihe ọ na-ekpe maka ya, e kwere m na ụmụ ihe dị ka ike ma ọ bụ Chineke adịghị ahụ anya “ga-adị ike ịzọpụta” ma ọ bụ nyere anyị aka ọ bụrụ ma anyị jiri obi anyị ji kpee ekpere.
Dị ka ndị ọzọ gbara afọ iri na ụma, enwetere m ọtụtụ ihe isi ike. A gbara m lịka lịka, na-eche na ndụ adịchaghị mma ma na enwere ọtụtụ nke a na nke ahụ. Ọ dịịrị m ka m furu efu, na-enweghị uche nke nduzi niime ndụ m. Ndụ yiri ka ihe na-agafe agafe niihi na ọ ga-akwụsị mgbe m nwụrụ. Ndụ na-amaghị atụmatụ nzọpụta na-agbagwoju anya.
Na-eteghị anya m malitere ịmụ Ingish n’ụlọakwụkwọ high nta, ụmụakwụkwọ niile dị niime ụlọakwụkwọ anyị natara otu cọpị nke Testament Ọhụrụ. Agbanyeghị anyị ka malitere ọmụmụ ihe anyị nke Inglish, onye nkuzi anyị gwara anyị na anyị ga-amụ Inglish site n’ịgụ ya. E mepere m ya ma nyochagharịa ọdịnaaya niile Okwu niile dị niime Testament Ọhụrụ naara ara m ezigbo ahụ. Okwu ndị nke nọ n’asụsụ Japan rakwara m ahụ. Kosiladị, uche m ruru na okwu niile na ajụjụ ndị edepụtara nke mkpụrụ obi nke agụnyeworo nnọọ tupu ederede nke baịbụl dị niime Baịbụl Gideon—ajụjụ niile banyere inwe mmetụta ịnọ naanị, na-enweghị obisike, inwe mgbagwoju anya, ịgabiga mnwale niile nke ndụ, ma gaa niihu. Ihe ọbụla dị niime ndepụta ahụ ka nrụtụ aka nye amaokwu niile na peeji niile dị niime Testament Ọhụrụ sotere. A dọọrọ uche m karịsịa n’okwu ahụ “Mgbe ike gwụrụ gị.” Nrụtụ aka ahụ duuru m imepe Matiu 11:28-30, ebe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya:
“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.
“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; niihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: ma mkpụrụ obi unu ga-enweta ezumiike.
“Niihi na yok nke m adịghị egbu mgbu, ma ibu m dịkwa mfe.”
Nke a bụ oge nke mbụ m chetere ịgụ okwu nke Jizọs Kraịst niile. Ọbụladị aghọtaghị m okwu niile o kwuru, okwu Ya niile nyere m nkasị obi, bulie mkpụrụ obi m, na nye m olile anya. Ka m na-agụtukwu okwu Ya niile, ka ọ na-adị m ka ịnwa ezigbo omume nke okwu Ya niile. Enwetụbeghị m ụdị mmetụta dị ka nke ụbọchị ahụ. Ọ dịịrị m ka ahụrụ m naanya. Ọ dịrị m ka Jizọs Kraịst bụ onye m maara.
Dị ka m garaniihu na-amụ ihe, ọ dịịrị dị ka na-agbanyeghị Ọ nọ na-agwa m okwu n’onwe m kpọmkwem mgbe Ọ sịrị, “Ngọzi dịrị ha ndị agụrụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka ezi omume: niihi na afọ ga-eju ha.”
Okwu ya niile juputara obi m, ọbụna agbanyeghị enweghị m ike ịkọwa mmetụta m niile nke ọma n’oge ahụ. Na-agbanyeghị Jizọs Kraịst biri ndụ ọtụtụ narị afọ gara aga n’ala ebe m na-amaghị nke ọma, e chere m na m nwere ike iji obi m niile tụkwasị obi n’okwu Ya niile. Enwere m olile anya na otu ụbọchị n’ọdịniihu e nwere m ike mụtakwuo banyere Jizọs Kraịst.
Mmụọ Nsọ Ga-egosi Unu Ihe Niile Unu Kwesịrị Ime
Na otu ụbọchị bịara naanị mgbe afọ ole ma ole gasịrị. E zutere m ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge raara onwe nye, na-eto eto nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ma n’oge na-adịghị anya e zutere m otu dị nta nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a dị obi ọma ma nwere ọńụ. Na-agbanyeghị ya ịra m ahụ ịtụkwasị obi na ha kpamkpam, a bịara m hụta n’ozi ọma eweghachitere ihe naara agụ m agụụ maka mgbe m mụrụ Testament Ọhụrụ—okwu niile nke Jizọs Kraịst na olile anya na udo nke na-abịa site na ha.
Otu nhụmiihe dị nsọ karịsịa bụ mgbe ndị mgbasa ozi ọma kuziiri m ikpe ekpere. A mụtara m na anyị kwesịrị ịkpọ Chineke na aha. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị kwesịrị isite n’obi anyị niile ekwu okwu, gosipụta obi ekele anyị, ma kesaa olile anya na ọchịchọ anyị niile. Ozugbo anyị kwuworo ihe niile anyị na-achọ ikwu, anyị na-emechi ekpere anyị site n’ikwu, “N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.” Anyị na-eme nke a niihi na Jizọs nyere anyị iwu ikpe ekpere n’aha Ya. Ikpe ekpere nye Nna nke Eluigwe nyeere m aka mara onye ọ bụ na mmekọrịta mụ na Ya—na m bụ nwa ya nwoke na mmụọ ọ hụrụ naanya. A mụtara m na niihi na Nna nke Eluigwe maara m ma hụrụ m naanya, Ọ ga-agwa m okwu n’onwe m, n’ụzọ pụrụ iche, na n’ụzọ ndị m ga-esi aghọta site n’aka Mmụọ Nsọ.
E nwere oge mgbe m na-enweghị ike n’ezie amata Mmụọ Nsọ. A ghọtahiere m, na-eche na ihe niile m ga-eme bụ isoro nzọụkwụ niile nke ekpere ma ihe dị egwu ga-eme. Otu ụbọchị, mgbe mụ na ndị mgbasa ozi ọma na-amụ ihe, a pụrụ m n’ihe ọmụmụ ahụ izu ike. A ka nwere m mgbagwoju anya banyere ihe m kwesịrị iji ndụ m ime ọ bụrụ na ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere bụ eziokwu n’ezie.
Dị ka m na-achọ ịlaghachị n’ọnụ ụlọ ebe ndị mgbasa ozi ọma nọ na-eche, a nụrụ m olu nke otu niime ndị mgbasa ozi ọma. A nụrụ m aha m. Kama imepe ụzọ ahụ, e gere m ntị n’olu ahụ nọ ofe ọnụ ụzọ ahụ. Egwu tụrụ m. Ha naara nnọọ ekpe ekpere nye Nna nke Eluigwe. Onye nke na-ekpe ekpere nọ na-arịọ Chineke ka Ọ nụ ekpere m. Agbanyeghị asụsụ Japan ya adịchaghị mma, ịnụrụ ekpere ya si n’obi mere obi m adị nro. A tụgharịrị m uche ihe mere o ji dị ha oke mkpa otu ahụ. Mgbe ahụ a matara m na ekpere ha maka m bụ ngosipụta nke ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta nwere maka m. Ịhụnaanya ahụ nyere m olile anya, ma emesịa a rịọrọ m Chineke n’okwukwe na ezi ebumnuuche. Mgbe m mere, e nwetere mmetụta ọńụ na udo na m bụ n’ezie nwa Chineke ma na e nwere ike mmepụta na akaraka sinachi. Atụmatụ nzọpụta mikpuru ime niime obi m.
Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo, “Otu i si eche echiche banyere onye ị bụ … na-emetụta … mkpebi niile i ga-eme.” Ọ bụ nnọọ eziokwu nye m. Mkpebi isoro Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst site na-ime baptizim na ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ gọzitụbọrọ ndụ m karịa ka m si wee chee. Dị ka anyị banyere niime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, anyị na-ekwe nkwa na anyụ dị njikere iwekwasị n’onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, debe iwu nsọ niile nke Chineke, ma jeere Ya ozi n’oge ndụ anyị niile fọdụrụ. Nna anyị nke Eluigwe, n’onwe ya, na-ekwe anyị nkwa na anyị pụrụ mgbe niile inwe Mmụọ Ya ịnọnyere anyị—odudu garaniihu esepụghị aka sitere n’aka Mmụọ Nsọ.
Ana m akpọku unu inwe okwukwe nozi Nifaị kuziiri anyị—na okwu niile nke Kraịst na Mmụọ Nsọ ga-edu gị ruo “ihe niile ndị [ị] ga-eme.” Ihe niile! Nke a bụ onyinye ịrịba ama sitere na Chineke.
Ụmụnne nwoke na nwayị, obi dị m ekele maka atụmatụ nke nzọpụta nke Nna anyị nke Eluigwe Niihi na Ọ hụrụ anyị naanya, Ọ kwadoro ụzọ iji laghachi n’ihu Ya site na Ọkpara Ya A Mụrụ Naanị Ya, Jizọs Kraịst. Ịmara atụmatụ ịrịba ama nke a ga-enyere anyị aka mara anyị bụ ụmụ Chineke ma anyị nwere ike ịdịrịzi ka Ya. Obi dị m ekele maka eziokwu nke a dị mkpa. Ana m agba akaebe m na okwu niile nke Jizọs Kraịst na Mmụọ Nsọ ga-eduga anyị ịnata ndụ ebighị ebi. A maara m na ihe ndị a bụ eziokwu. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.