Ọgbakọ Zuru ọha
Isoro Kraịst
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


13:30

Isoro Kraịst

Dịka ndị na-eso Kraịst, anyị na-akụzi ma gbaa ama maka Jizọs Kraịst, Onye Nlereanya Zuru oke anyị, Ya mere ka anyị soro Ya site na-ịhapụ esemokwu.

Afọ nke a akpalitela ọtụtụ mmụọ site na atụmatụ ịmụ ozi ọma amaara site na ịkpọku nke Onye Nzọpụta “Bịa Soro M.” Isoro Kraịst abụghị ihe dị mfe ma ọ bụ a na-eme na ngụnye. Ọ bụ ihe a ga na-eme ma bụrụ ụzọ nke ndụ nke kwesịrị idu anyị mgbe ọbụla ma na ebe ọbụla niile. Nkuzi Ya niile na ịma-atụ Ya gosịrị ụzọ maka onye na-eso ụzọ ọ bụla nke Jizọs Kraịst. Ma a na-akpọku mmadụ niile n’ụzọ a, maka Ọ na-akpọku ndị niile ịbịakwute Ya, “ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị; … ma ha niile dị otu ụdị n’anya Chineke.”

I.

Ije ụkwụ mbụ n’isoro Kraịst bụ irube isi nye ihe Ọ kọwara dịka “iwu-nsọ kachasị n’ime iwu”:

“Ị ga-ewere obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na uche gị nile hụ Onye nwe gị Chineke gi n’anya.

“Nke a bụ ịhe ukwu na ịhe mbụ enyere n’iwu-nsọ.

“Ma nke abụọ dịkwa ka ya, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị naanya dị ka onwe gị.

“N’elu iwu nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị amụma niile bekwasịrị.”

Nna na nwa nwoke na-efe egbe.

Iwu nsọ niile nke Chineke na-enye ike odudu na nchekwa n’ime ndụ anyị niile. Nhụmihe anyị niile na ọnwụ dị ka obere nwa nwoke na nna ya na-efe egbe n’ụbọchị ifufe. Ka egbe ahụ na-ebili elu, ifufe mere ka ọ dọba eriri njikọ dị n’aka nwantakịrị nwoke ahụ. Na-enweghị nhụmihe ikike nke ofufe niile, ọ tụrụ aro ka egbubie eriri ahụ ka egbe ahụ nwere ike rịkwuo elu. Nna ya maara ihe sịrị mba, na-akọwa na eriri ahụ bụ ihe na-ejide egbe ahụ ị megide ifufe ndị ahụ na-anwụ anwụ. Ọ bụrụ na anyị tufuo njide anyị na eriri, egbe ahụ agaghị ebili elu. A ga-ebugharị ya site na ifufe ndị a ma ọ ga-emecha daa n’ụwa.

Eriri ahụ dị mkpa nọchiri anya ọgbụgba ndụ niile ahụ nke jikọtara anyị na Chineke, Nna anyị nke Eluigwe, na Ọkpara Ya Jizọs Kraịst. Dịka anyị na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ niile ndị ahụ site na idobe iwu nsọ Ha niile na ịgbaso atụmatụ mgbapụta Ha, ngọzi niile Ha kwere na nkwa na-enyere anyị aka ịgbago n’elu igwe.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwupụtakarị na Kraịst bụ “ihé nke ụwa.” N’oge ọ pụtara n’ihu ndị Nifaị, Onyenwe anyị bilitere n’ọnwụ kọwara na nkuzi site na-ịgwa ha, “E doziwo m ihe ịma-atụ nye unu.” “A bụ m ìhè ahụ nke unu ga-ewelite elu—ihe ahụ unu hụworo m na-eme.” Ọ bụ ihe nlereanya anyị Anyị na-amụta ihe O kwuworo na omeworo site n’ịmụ ihe site na akwụkwọ nsọ niile na ịgbaso nkuzi amụma niile dịka Onyeisi Russell M. Nelson gbara anyị ume ime. N’ime emume nsọ nke sacrament, anyị na-agba ndụ ụbọchị ezumiike ọbụla na anyị “na-echeta ya oge niile ma na-edobe iwu-nsọ ya niile.”

II.

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn Onyenwe anyị nyere anyị ntụala niile ndị ahụ na ihe Ọ kpọrọ “ozizi nke Kraịst.” Ndị a bụ okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nchegharị, baptizim, ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ, ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, na ịbụ nwata, nke pụtara ịtụkwasị Onyenwe anyị obi na idobe onwe n’okpuru ihe niile Ọ chọrọ n’aka anyị.

Iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị dị ụdị abụọ; na-adịgide adịgide dịka ozizi nke Kraịst, na nwa oge. Iwu nsọ nwa oge niile bụ ndị dị mkpa maka mkpa niile nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị ma ọ bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnọdụ nwa oge, mana ka ewepụrụ ya iche mgbe mkpa ahụ gafeworo. Ọmụmaatụ nke iwu nsọ niile nwa oge bụ ntụzi-aka nke Onyenwe anyị nyere ndị ndu mbụ nke Nzukọ nsọ iji bugharị Ndị-nsọ site na New York gaa Ohio, ruo Missouri, ruo Illinois, na n’ikpeazụ ka ha duga ọpụpụ ndị ọsụ ụzọ gaa na Intermountain West. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwa oge, mgbe ọ k dị ire, e nyere iwu nsọ ndị a ka e debe ha.

Ụfọdụ iwu nsọ na-adịgide adịgide ewerewo oge dị ukwuu ka e debe ha n’ozuzu ha. N’ịma-atụ, okwuchukwu a ma ama nke Onyeisi Lorenzo Snow gbasara iwu nke otu ụzọ n’ụzọ iri kwusiri ike n’iwu e nyere na mbụ mana ndị otu Nzukọ nsọ anatabechaghị ya. Ọ chọrọ nleba anya n’ọnọdụ ndị Nzukọ nsọ na ndị otu ya chere mgbe ahụ. Ọmụmaatụ nke nkwudosi ike ka achọrọ n’ihi ọnọdụ dị ugbu a nke Ndị-nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ma ọ bụ Nzukọ-nsọ chere ihu. Ndị a gụnyere nkwupụta gbasara ezinaụlọ, nke Onyeisi Gordon B. Hinckley wepụtara n’ọgbọ gara aga, na ọkpụkpọ oku nke Onyeisi Russell M. Nelson n’oge na-adịbeghị anya ka a mara Nzukọ nsọ site n’aha mkpughe, Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazu a ahụ.

III.

Nkuzi ọzọ nke Onye Nzọpụta anyị nke yiri ka ọ chọrọ nleba anya n’ọnọdụ niile nke ụbọchị anyị.

Nke a bụ oge ọtụtụ okwu ọjọọ na mkparị na nzikọrịta ozi ọha na mgbe ụfọdụ ọbụna n’ezinaụlọ anyị niile. Esemokwu dị nkọ n’okwu gbasara amuma ọha na eze na-ebutekarị omume iro—ọbụna ịkpọasị—na mmekọrịta ọha na eze na nke onwe. Ọnọdụ iro a mgbe ụfọdụ na-akụda ikike ime iwu n’ihe ndị dị mkpa ebe ọtụtụ ụmụ amaala na-ahụ mkpa ngwa ngwa maka ihe ụfọdụ maka ọdịmma ọha.

Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ịkụzi ma na-eme n’oge mkparịta ụka nsi a? Gịnị bụ nkuzi na ihe ịmaatụ Ya?

Onye Nzọpụta na-akuziri Ndị Nifaị ihe.

Ọ dị ịrịba ama na n’ime ụkpụrụ niile mbu Jizọs kuziri mgbe Ọ pụtara n’ihu ndị Nifaị bụ izere esemokwu. Ka Ọ kụzrii nke a n’ihe gbasara esemokwu gbasara ozizi okpukpe, ihe ndị O nyere n’ụzọ doro anya metụtara nzikọrịta ozi na mmekọrịta nime ndọrọ ndọrọ ọchịchị, amụma ọha na eze, na mmekọrịta niile ezinaụlọ. Jizọs kuziri:

“Onye nke nwere mmụọ nke esemokwu abụghị onye nke m, kama ọ bụ nke ekwensu, onye bụ nna nke esemokwu, ma ọ na-akpalite obi ndị mmadụ iji iwe see okwu, otu onye na ibe ya.

“Lee, nke a abụghị ozizi m, iji iwe kpalite obi niile nke ndị mmadụ, otu onye megide ibe ya; mana nke a bụ ozizi m, na a ga-akwụsị ụdị ihe ndị ahụ.”

N’ime ozi Ya fọdụrụ n’etiti ndị Nifaị, Jizọs kuziri iwu nsọ ndị ọzọ metụtara mmachibido iwu Ya nke esemokwu. Anyị maara site na Baịbụl na Ọ kụziworị onye ọbụla n’ime ndị a n’oke okwuchukwu Ya n’elu ugwu ahụ, na-abụkarị n’otu asụsụ ahụ O mechara sụọrọ ndị Nifaị. A ga m ehọta asụsụ Baịbụl ahụ a maara nke ọma.

Onye Nzọpụta na-akuzi ihe n’ime Jerusalem.

“Hụ ndị iro gị n’anya,gọzie ha bụ ndị na-akọcha gị, na-emere ndị kpọrọ gị asị ihe ọma, ma na-ekpere ndị na-eji gị eme ihe nleda-anya ma na-esogbu gị ekpere.”

Nke a bụ otu n’ime iwu nsọ Kraịst kachasị mma—kachasị mgbanwe na nke kachasị ike ịgbaso. Nagbanyeghị nke ahụ ọ bụ akụkụ kachasị mkpa nke ọkpụkpọ oku Ya ka mmadụ niile soro Ya. Dịka Onyeisi Devid O. McKay kuziri, “Ọ dịghị ụzọ ka mma isi gosipụta ịhụnaanya n’ebe Chineke nọ karịa igosi ịhụnaanya nke achọghị ọdịmma onwe naani n’ebe mmadụ ibe anyị nọ.”

Ndị otu na-emegide onwe ha n’ekpezi.

Nke a bụ nkuzi bụ isi ọzọ site n’aka Ya onye bụ onye nlereanya anyị: “Ngọzi na-adịrị nke omee udo: n’ihi na ha ka a ga-akpọ ụmụ Chineke.”

Ndị omeudo! Otu ọ ga-esi gbanwee mmekọrịta niile onwe ma ọbụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-ahapụ okwu ọjọọ niile na nzikọrịta ozi ha niile.

N’ime nzukọ zuruọha afọ gara aga, Onyeisi Russell M. Nelson nyere anyị aka mgba ndị a:

“Otu niime ụzọ ndị kachasị mfe iji chọpụta ezigbo onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ si na-eji ọmịiko emeso ndị ọzọ omume.

“… Ezigbo ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraist bụ ndị ome udo.

“… Otu niime ụzọ kachasị mma anyị nwere ike iji kwanyere Onye Nzọpụta ugwu bụ ịghọ onye ome udo.”

N’ịmechi nkuzi ya niile: “Esemokwu bụ otu nhọrọ. Ime udo bụ otu nhọrọ. I nwere ohere nhọrọ gị ịhọrọ esemokwu ma ọ bụ mkpezi. A na m arịọsi unu ike ịhọrọ ịbụ onye ome udo, ugbua na mgbe niile.”

Ndị nwere ike ịlụ ọgụ kwesịrị ịmalite site n’ịchọpụta ihe jikọrọ ha niile na-ekwenye na ya.

Isoro Onye Nlereanya anyị Zuru oke na Onye amụma Ya, ọ dị mkpa anyị ime ihe a maara nke ọma dị ka Ụkpụrụ Ọma: “Ihe nile ọbụla unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, meere nu ha ọbụna otu ahụ: n’ihi na nke a bụ iwu ahụ na ndị-amụma ahụ.” Anyị kwesịrị ịhụ n’aanya na imere mmadụ niile ihe ọma. Anyị kwesịrị izere esemokwu ma bụrụ ndị na-eme udo na nzikọrịta ozi anyị niile. Nke a apụtaghị imebi ụkpụrụ anyị na ihe ndị anyị na-ebute ụzọ kama ịkwụsị ịlụsị ndị ọzọ ogụ maka nke ha. Nke ahụ bụ ihe Onyenlereanya Zuru oke anyị mere na ozi Ya. Nke a bụ ihe ịmaatụ ahụ O setịpụụrụ anyị dị ka Ọ kpọrọ anyị isoro Ya.

N’ime ọgbakọ a afọ anọ gara aga, Onyeisi Nelson nyere anyị ihe ịma-aka amụma maka ụbọchị nke anyị.

“Ị dị njikere ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị? dị njikere ị kwe ka Chineke bụrụ mmetụ kachasị mkpa n’ime ndụ gị? Ị ga ekwe ka okwu Ya niile, iwu nsọ Ya niile, na ọgbụgba ndụ Ya niile metụta ihe i na-eme kwa ụbọchị? Ị ga-ekwe ka olu Ya dịrị mkpa karịa nke ọbụla?”

Onye-nwe anyị Jisus Kraịst.

Dịka ndị na-eso Kraịst, anyị na-akụzi ma gbaa ama maka Jizọs Kraịst, Onye Nlereanya Zuru oke anyị, Ya mere ka anyị soro Ya site na-ịhapụ esemokwu. Ka anyị na-agbaso iwu masịrị anyị na omume ọha, ka anyị tozuo maka ngọzi Ya site n’iji asụsụ na ụzọ niile ndị na-eme udo. N’ime ezinaụlọ anyị niile na mmekọrịta onwe niile ndị ọzọ, ka anyị zere ihe ọjọọ na ịkpọasị. Ka anyị chọọ ịdị nsọ, dịka Onye Nzọpụta anyị, onye aha nsọ ya ka M na-agba ama ma n’akpọku ngọzi Ya iji nyere anyị aka ịbụ Ndị nsọ. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.