Ọgbakọ Zuru ọha
Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


14:50

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst Ga-abịa Ọzọ

Ugbua bụ oge nke unu na maka mụ, iji kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye-nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne nwanyị nọ m n’obi, enwerem obi ekele na Onyenwe anyị agọziwom ikwuuru unu.

Na ọgbakọ nke a, Onyenwe anyị agwa anyị okwu site n’ọnụ ụmụ odibo Ya. A na m arịọ unu ka unu mụọ ozi ha. Jirinụ ha tụlee ihe bụ eziokwu na nke na-abụghị n’oge ọnwa isii ndị na-abịa.

Nchekwa na nrụgharị nke Tempụl ahụ nke Salt Lake, na ebe mpaghara ndị ọzọ N’ogige Tempụl, ka aka na-arụ ruo ihe ruturu afọ ise. Dị ka esi chee ọrụ ndịa ka a ga-arụcha na ngwụcha nke 2026. Obi juru anyị n’ekele maka ndị nile na-arụ nnukwu ọrụ nke a.

N’ọnwa isii gara aga, anyị edowo nsọ na dogharịa nsọ tempụl itolu na mba ise. Site ugbua ruo na ngwụcha afọ, anyị ga-edo ise ndị ọzọ nsọ.

Taa, obi dị anyị mma ịkwupụta atụmatụ ịrụ tempụl 17 ọhụrụ ndị ọzọ. Biko gee ntị na nkwanye ugwu dị ka m na-ama ọkwa ebe a ga-arụ ha.

  • Juchitán de Zaragoza, Mexico

  • Santa Ana, El Salvador

  • Medellín, Colombia

  • Santiago, Dominican Republic

  • Puerto Montt, Chile

  • Dublin, Ireland

  • Milan, Italy

  • Abuja, Nigeria

  • Kampala, Uganda

  • Maputo, Mozambique

  • Coeur d’Alene, Idaho

  • Queen Creek, Arizona

  • El Paso, Texas

  • Huntsville, Alabama

  • Milwaukee, Wisconsin

  • Summit, New Jersey

  • Price, Utah

Ụmụnne m ọma ndị nwoke na ndị nwanyị, unu ọ na-ahụ ihe na-eme anyị naanya? Ana m ekpe ekpere na anyị agaghị eji oge a dị ebube kpọrọ ihe efu! N’ezie Onyenwe anyị na-eme ka ọrụ Ya na-aga ọsịsọ.

Gịnị kpatara anyị jị arụ tempụl n’ọnụọgụgụ a na-ahụtụbeghi mbụ? Gịnị mere? Nihi Onyenwe anyị asiwo ka anyị mee otu ahụ. Ngọzị niile nke tempụl na-enye aka kpọkọta Izrel na ala ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ. Ngọzị ndịa na enyekwa aka iji kwadoo ndị ga-enye aka kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị!

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta.

Dị ka onye amụma Aịzaya buru n’amụma, ma dị ka abụrụ na abụ Handel kpọrọ Mezaya, mgbe Jizọs Kraịst ga-alọghachi, “ebube nke Onyenwe anyị ka a ga-ekpughe, ma anụ ahụ niile ga-ahụkọta ya ọnụ.”

N’ụbọchị ahụ, “ọchịchị ga-adị n’elu ubu ya; ma a ga-akpọ aha ya, Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke bụ Dike, Nna nke Mgbe nile na-adigide, Ọkpara Eze nke Udo.”

Jizọs Kraịst ga-achị site Jerusalem ochie na Jerusalem Ọhụrụ “nke ewuru n’elu ala Amerịka.” Site n’ebe abụọ ndịa, Ọ ga-aduzi emume niile nke Nzukọ nsọ Ya.

N’ụbọchị ahụ, a ga-ama Onyenwe anyị dị ka “Eze ndị Eze, ma Onyenwe nke Ndịnwe anyị.” Ndị ahụ ha na Ya nọ ka a ga “akpọ, ma họrọ, ma kwesịa ntụkwasị obi.”

Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, ugbua bụ oge nke unu na maka mụ iji kwado maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ugbua bụ oge maka anyị ijiri ịbụ onye na-eso ụzọ kpọrọ ihe. N’ụwa nke a jupụtara na ọtụtụ ndọpụ uche, kedụ otu aga-esi eme nke a?

Tempụl Ahụ Nke Rome Italy

Ife ofufe nime tempụl ga-enyere anyị aka. Nime ụlọ nke Onyenwe anyị, anyị na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst. Anyị na-amụta ihe banyere Ya. Anyị na-agba ọgbụgba ndụ isoro Ya. Anyị na-abịa ịmata Ya. Dị ka anyị na-edobe ọgbụgba ndụ anyị niile nke tempụl, anyị na-enwete nnukwu ohere ịnwete ike Onyenwe anyị nke na-agba ume. Nime tempụl, anyị na-anata nchekwa megide ọpịpịa ihe nke ụwa. Anyị na-enweta nhụmiihe ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ nke Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe n’ụzọ bakwuru ụba. Anyị na-enwete udo na nkasị obi nke ime mmụọ, na-abụghị ụdị ọgbaghara nke ụwa.

Nke a bụ nkwa m na-ekwe unu: Onye ọbụla ji obi ọcha achọ Jizọs Kraịst ga-achọta Ya nime tempụl. Ị ga-enweta mmetụta ebere Ya. Ị ga-achọta azịza nye ajụjụ ndị ahụ na-echekasị anyị. Ị ga aka aghọta ọńụ nke ozi ọma Ya.

A mụtawo m otu ajụjụ dị mkpa nke onye ọbụla niime anyị kwesịrị ịza bụ nke a: Nihi onye ma ọ bụ nihi gịnị ka m ga-enye ndụ m?

Onyeisi Nelson dị ka onye surgeon.

Mkpebi obi m isoro Jizọs Kraịst bụ otu mkpebi kacha dị mkpa nke m meworo. N’oge ọzụzụ ịbụ dọkịnta enweterem ọgbụgba ama ịdị nsọ nke Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Kemgbe ahụ, Onye Nzọpụta anyị abụrụwo oke nkume nke m hiwere ndụ m. Nhọrọ nke ahụ emewo ka ihe niile dị iche! Nhọrọ nke ahụ emewo ka ọtụtụ mkpebi ndị ọzọ adị mfe. Nhọrọ ahụ enyewo ndụ m ebumnobi na odudu. Onyewo kwa m aka izute ma merie ebili mmiri nke ndụ. Ka m kọọ maka ọmụmatụ abụọ:

Nke mbụ, mgbe nwunye m Dantzel nwụrụ na mberede, enweghi m ike irute ụmụ m ebe ha nọ. Ebe ahụ ka nanị m nọ, nwe obi mgbawa, na ebe akwa maka enyemaka. Ekele dịrị na site na Mmụọ Ya, Onyenwe anyị kuziri m ihe kpatara ejiri kpọla Dantzel ọma m ebe obibi. Nihi nghọta ahụ, enweterem nkasị obi. Ka oge gara, ọ dịịrịm mfe idi iru uju m nke ọma. Ma emesịa, a lụrụ m nwunye ọma m Wendy. Ọ nọ n’etiti ọmụmatụ nke abụọ m.

Mgbe Wendy na mụ n’ọrụ nala dị anya, ndị oji egbe ezu atụwa m egbe n’isi ma gbaa m egbe. Mana egbe ahụ ahụ ekwughị. Ogologo oge nhụmihe ahụ dum, e tinyere ndụ anyị abụọ n’ihe ize ndụ. Nagbanyeghi nke a, Wendu na mụ nwetere udo na-apụghị ịgbagha agbagha. Ọ bụ udo “nke gafere nghọta niile.”

Ụmụnne ndi nwoke na nwanyị, Onyenwe anyị ga-akasikwa unu obi! Ọ ga-agba gị ume. Ọ ga ejiri udo gọzie unu, ọbụnadị n’etiti ọgbaghara ahụ.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Biko gee ntị nye nkwa nke Jizọs Kraịst kwere unu: “Aga m anọ n’aka nri unu ma n’aka ekpe unu, ma Mmụọ m ga-anọ n’obi unu, ma ndị mmụọ ozi m ga-agba unu gburugburu ịkwalite unu.”

Ọdịghị ihe ga-egbochi ikike Onye Nzọpụta ịnye unu aka. Ntaram ahụhụ ya na-enweghi atụ n’ebe Getsemani na n’elu Kalvarị bụ maka unu! Aja mgbaghara mmehie Ya na-adịghị agwụ agwụ bụ maka unu!

A na m arịọ unu ka unu wepụta oge izuụka ọbụla—ruo oge ndụ unu niile—iji mụbaa nghọta unu nke Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Obi na-ewute m maka ndị ahụ mmehie ji aka ma na-amaghị otu ha ga-esi apụta. A na m ebe akwa maka ndị na-adọlị ime mmụọ ma ọ bụ buru ibu arọ nanị ha nihi ha aghọtaghị ihe Jizọs Kraịst meere ha.

Jizọs Kraịst wekwasịrị Onwe Ya mmehie unu niile, mgbu unu niile, obi mgbu unu niile, na adịghị ike unu niile. Unu ekwesịghị ibu ha nanị unu! Ọ ga-agbaghara unu mgbe unu chegharịrị. Ọ ga ejiri ihe dịrị unu mkpa gọzie unu. Ọ ga-agwọ mkpụrụ obi unu nke merụrụ ahụ. Dị ka ị na-ekedo onwe unu na Ya, ibu arọ unu gaadị mfe. Ọ bụrụ na ịgbaa ma debe ọgbụgba ndụ isọrọ Jizọs Kraịst, ị ga-ahụta na oge ndị ahụ dị mnwute na ndụ gị bụ nke nwa oge. Mkpagbu unu niile ka a “ga-eloba niime ọńụ nke Kraịst.”

Ọ dịghị oke ọsịsọ ma ọ bụ kwanụ ma oge agafewo maka gị ịbụ ọnye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ahụ ị ga enwete ngọzi niile nke Aja Mgbaghara mmehie Ya n’uju. Ị ga aka aba uru na-ịnye aka kpọkọta Izrel.

Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, n’ụbọchị ndị na-abịa abịa, Jizọs Kraịst ga-alọghachi n’ụwa dị ka Mezaya nke milenia. Nihi ya taa a na m akpọ unu idogharị ndụ unu nsọ na Jizọs Kraịst. A na m akpọ unu ịnye aka iji kpọkọta izrel ma kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị. A nam akpọku unu ka unu kwuo maka Kraịst, gba akaebe maka Kraịst, nwe okwukwe na Kraịst, ma n̄ụrịa na Kraịst!

Bịakwute Kraịst ma “nye [mkpụrụ obi] unu nye Ya. Nke a bụ ihe nzuzo eji enweta ndụ nke ọn̄ụ!

Nke kachasị mma na-abịa niihu, nihi Onye Nzọpụta na-abịa ọzọ! Nke kachasị mma na-abịa niihu, nihi Onye Nzọpụta na-eme ka ọrụ Ya gaa ọsịsọ. Nke kachasị mma na-abịa niihu, dị ka anyị na-echigharị obi anyị na ndụ anyị niile n’ebe Jizọs Kraịst nọ.

Ana m agba akaebe dị nro na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke. A bụ m onye na-eso ụzọ Ya. Ọ bụụrụm ihe ugwu ị bụ odibo Ya. Na Ọbịbịa Ya nke Ugboro Abụọ, “ebube nke Onyenwe anyị ka a ga-ekpughe, ma anụ ahụ niile ga-ahụkọta ya ọnụ.” Ụbọchị ahụ ga-ejuputa na ọn̄ụ maka ndị ezi omume!

Site n’ike niile nke ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ nke m ji, a na m ekwupụta eziokwu nke a nye unu ma nye ụwa niile! Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen