Ọgbakọ Zuru ọha
Bienụ Ndụ Kwesịrị Ohere Unu
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


11:45

Bienụ Ndụ Kwesịrị Ohere Unu

Mụta otu emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na nkwa ọgbụgba ndụ niile ga-esi kwe ka ike Chineke sọbata niime ndụ unu.

Na nso nso a di m, Greg, natara nchọpụta nke ga-achọ ọwụwa ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ na chemoterapy ga-ewe ọtụtụ ọnwa. Dị ka ọtụtụ niime unu ndị na-ezutewo ọnọdụ yiri nke a, anyị malitere ozugbo ikpe ekpere maka enyem aka nke eluigwe na ike Chineke. Na Sọnde na-esote ọwụwa ahụ nke Greg, ewetaara ya oriri nsọ niime ọnụ ụlọ anyị n’ụlọ ọgwụ.

N’oge nke a, ọ bụ naanị m naara eri oriri nsọ. Otu iberibe achịcha. Otu iko mmiri. Na Nzukọ nsọ, uche m ọtụtụ mgbe na-elekwasị anya n’usoro inye oriri nsọ—ịkwado, ịgọzi, na ibugharị ya. Mana na-ehihe ahụ, atụgharịrị m uche na onyinye nke ike Chineke m nwere site na emume nsọ ahụ dị nsọ n’onwe ya na nkwa ọgbụgba ndụ m naara eme ka m weere iberibe achịcha ahụ na iko nke mmiri ahụ. Nke a bụ oge mgbe m chọrọ ike sitere n’eluigwe. N’etiti oke obi mgbu, ike ọgwụgwụ, na ejighị n’aka, e chere m echiche gbasara ike nke a ga-ekwe ka m nweta ike ahụ sitere na Ya nke m chọsịrị ike nke ukwuu. Iri oriri nsọ ga-abawanye mkpakọrịta mụ na Mmụọ nke Onyenwe anyị, na-enyem ohere inweta onyinye nke ike Chineke, tinyere ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi na ike nke Onye Nzọpụta na-enye aka inwe mmeri.

Echeghị m na o nwetụwo mgbe anya doro otu a mbụ na ọ bụghị naanị onye nọ n’isi na-emume nsọ bụ ihe dị mkpa—ihe emume nsọ ahụ na nkwa ọgbụgba ndụ na-atụghekwa kwesịrị ihe anyị ga-atụnyere uche. Emume nsọ ọkwa nchụaja niile na nkwa ọgbụgba ndụ niile na-ekwe Chineke ido anyị nsọ ma mesịa rụọ ọrụ dị ịtụnaanya niime ndụ anyị. Mana kedu otu nke a si eme?.

Nke mbụ, iji hụ na emume nsọ gosiputara ike Chineke niime ndụ anyị, ọ haghị ịbụ ihe emere n’ikike sitere n’aka Ọkpara nke Chineke. Usoro nnyeru dị mkpa. Nna nyefere n’aka Jizọs Kraịst ntụghe niile na ikikere iji na-ahụ maka nnyeru nke emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja Ya. N’okpuru ntuziaka Ya, niime usoro nke ọkwa nchụaja Ya, ụmụ ndị nwoke nke Chineke abụworịị ndị echiri echichi iguzo na nnọchite anya nke Ọkpara nke Chineke.

Nke abụọ, anyị anaghị nnọọ ekwe nkwa ọgbụgba ndụ niile—anyị ahaghị idobe ha. N’ọtụtụ emume nsọ ozi ọma niile, anyị na-eme ọgbụgba ndụ dị nsọ anyị na Chineke; Ọ na-ekwe nkwa ịgọzi anyị dị ka anyị na-edobe ọgbụgba ndụ ndị ahụ. Anyị ma na ọ bụ ntụgwa nke emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja tinyekwara idobe nkwa ọgbụgba ndụ niile bụ ihe na-enye anyị ohere ịdọta ike nke Chineke.

Na ehihe ahụ echere m echiche ma ọ bụ na mụ, nwada nke Chineke gbara ndụ, ghọtara nke ọma otu esi enwete onyinye ike nke Chineke site n’emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ma ọ bụ na ghọtara n’ezie otu ike Chineke si na-arụ ọrụ niime m.

Na 2019 ọkpụkpọ oku nke onye amụma rutere ndịinyom nke Nzukọ nsọ, na-akuziri anyị otu esi adọbata ike nke Onye Nzọpụta na ndụ anyị. Onyeisi Russell M. Nelson kpọkuru anyị ịmụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25, mkpughe enyere Emma Smith na Harmony, Pennsylvania. Ịnabata ọkpụkpọ oku ahụ agbanwewo ndụ m.

Ọnwa gara aga e nwere m ohere na-atụghị anya ya ịga nleta na Harmony. Ebe ahụ, n’okpuru osisi maple, eweghachitere ọkwa nchụaja nye Joseph Smith na Oliver Cowdery. Na nso nso osisi ndị ahụ ka ihu ọnụ ụzọ nke Joseph na Emma nọ. N’ofe ebe a na-akwanye ọkụ n’ebe obibi ahụ ka enwere ọnụ mpio. E guzooro m n’ebe ọnụ mpio ahụ ma chee ihe Emma nabuuru eche mgbe o lepụrụ anya ebe osisi niile ahụ nọ.

Na Julai 1830, Emma gbara afọ 26; ọ dịịrị nnọọ oke nta. Ọ nọọrọ afọ atọ na ọkara na alụmdi ya. Nwa ya nwoke ọ mụrụ ọhụrụ anwụọla—nke mbụ ya. Obere ili ya dị nnọọ na mgbada ụzọ sitere n’ebe obibi ya. Dị ka m guzooro n’ebe ọnụ mpio ahụ, ọ raghị m ahụ iche n’obi m ihe nweburu ike ijuputa na-echiche ya. N’ezie o nwere nchekasị gbasara ego ha, gbasara mbawanye mkpagbu nke yiri nchekwa ha egwu, gbasara ọdịniihu ha. Ma otu ọ dị ọrụ nke Chineke nọ ebe niile gbara ya gburugburu. O chekwara echiche banyere ọnọdụ ya niime atụmatụ ahụ, ebumnuuche ya niime Alaeze Ya, na ike o nwere naanya Chineke?

Eche m na o nwere ike chee.

Naanị n’ofe ụzọ ahụ, onyinye nke ikikere ọkwa nchụaja na ntụghe niile abụrụwo ihe eweghachitere n’elu ụwa. Nke a bụ oge mgbe Emma n’ezie chọburu ike sitere n’igwe. N’etiti oke obi mgbu, ike ọgwụgwụ, na ejighị n’aka, e chere m na Emma chere echiche gbasara ike ọkwa nchụaja nke Chineke nke a nwere ike ịtụghe ike ahụ si na Ya nke o nwere mkpa ya nke ukwuu.

Mana Emma eguzoghị nnọọ n’ọnụ mpio ahụ ma na-eche.

Ebe Onye amụma Joseph bụ onye a nọọrọ na-akuziri ihe banyere ntụghe niile, ọkwa ọrụ niile, emume nsọ niile, na otu esi enye aka n’ozi nke ọkwa nchụaja, Onyenwe anyị n’Onwe Ya, site n’onye amụma Ya, nyere Emma mkpughe. Ọ bụghị Emma-onyeisi-Otu Enyem Aka Nauvoo—mkpughe nke a bụ ihe enyere Emma gbara afọ 26 na Harmony. Site na mkpughe, Emma ga-amụta gbasara ido nsọ nke ime ahụ na njikọ ọgbụgba ndụ nke ga-amụba ike nke emume nsọ ọkwa nchụaja ndị ahụ ịrụ ọrụ niime ndụ ya.

Nke mbụ, Onyenwe anyị chetaara Emma banyere ọnọdụ ya niime atụmatụ Ya, tinyere onye ọ bụ na onye ọ bụ nke ya—nwada niime alaeze Ya. A kpọkuru ya “ije ije n’okporo niile nke omume ọma,” okporo nke gụnyere emume nsọ niile ga-atụghe ike nke Chineke ma ọ bụrụ na Emma anọgidesie ike na ọgbụgba ndụ ya niile.

Nke abụọ, n’oge iru uju ya dị omimi, Onyenwe anyị nyere ya ebumnuuche. Emma abụghị naanị na ọ nọ n’ihu oche ihu nke Mweghachite ahụ; ọ bụụrụ onye so n’ọrụ dị oke mkpa na-aganiihu. Aga edopụ ya iche “ịkọwa akwụkwọ nsọ nke ọma, na ịgba nzukọ nsọ ume.“ Oge ya ga-abụ maka “ide ihe odide, na ịmụ ọtụtụ ihe.” Enyere Emma oke na ọrụ dị nsọ iji nye aka kwadoo Ndị nsọ ife ofufe; ukwe ha niile nye Onyenwe anyị ka aga anabata dị ka ekpere ma “aga aza ya jiri ngọzi n’elu isi ha.”

Nke ikpeazụ, Onyenwe anyị depụtara usoro nke ido nsọ ime mmụọ nke ga-akwado Emma maka mbuli elu. “Ewezuga ma i mere nke a,“ Onyenwe anyị kọwaara ya, ebe M nọ i nweghị ike ịbịa.”

Ọ bụrụ na anyị akpachara anya gụọ nkeji nke 25, anyị na-achọpụta ịganiihu dị mkpa na-ewere ọnọdụ. Emma ga-esi na ịbụ nwada n’alaeze ruo “n’ezi nwanyị a họọrọ ahọrọ” ruo n’eze nwanyị. Emume nsọ niile nke Ọkwa nchụaja Erọn na Melkizedek, ejikọtara ọnụ ya na idobe nkwa ọgbụgba ndụ ya niile, ga-abawanye mkpakọrịta ya na Mmụọ ahụ na ya na ndị mmụọ ozi, na-enye ya ike ịnyagharị ndụ ya site na nduzi sinachi. Site n’ike Ya dị nsọ, Chineke ga-agwọ obi ya, mee ike ya asaa mbara, ma nwogharịa ya ịbụ ụdị ọhụrụ nke onwe ya Ọ maara o nwere ike ịghọ. Ma site na emume nsọ niile nke Ọkwa nchụaja Melkizedek, “ike nke ịdị ka chi [ka aga eme] ịpụta ihe” niime ndụ ya, ma Onyenwe anyị ga-ekpughe akwa mgbochi nke ga-eme ka ọ nata nghọta sitere na Ya. Nke a bụ ihe ọ dị ka ya maka ike nke Chineke ịrụ ọrụ niime anyị.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri:

Ihe niile nke mere na [Harmony] nwere ihe nsonazụ dị ịrịba ama maka ndụ unu niile. Mweghachite nke ọkwa nchụaja, ya na ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nye Emma, nwere ike idu ma gọzie onye ọbụla niime unu. …

“… Inweta ike nke Chineke niime ndụ gị na-achọ otu ụdị ihe ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Emma na onye ọbụla niime [anyị] ime.”

Enwere ihe ndị dị mkpa na-eme na-akụkụ abụọ nke ọnụ mpio ahụ dị na Harmony, tinyere mkpughe ahụ enyere ezi nwanyị a họọrọ ahọrọ onye nke Onyenwe anyị kpọworo—mkpughe nke ga-akwado, agba ume, ma kuziere Emma Smith, nwa ada nke Chineke ihe.

Mgbe enyere nwa nwa anyị nke nwanyị Isabelle aha na ngọzi, nna ya gọziri ya inwe nghọta banyere ọkwa nchụaja; nke ga-eme ka ọ na-aganiihu ito eto niime ma mụta gbasara ngọzi ọ ga-eweta na ndụ ya; ma na okwukwe ya niime ọkwa nchụaja ga-eto dị ka ọ nọgidere na-eto na nghọta ihe.

Ọ bụghị mgbe niile ka ana agọzi nwata nwanyị ịghọta ọkwa nchụaja na ịmụta otu emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na nkwa ọgbụgba ndụ niile ga-esi nyere ya aka inwete ike nke Chineke. Mana echetara m Emma ma chee nye onwe m, Gịnị mere ọgaghị eme? Nwada ntịị nke a nwere ike dị niime ịghọ ezi nwanyị a họọrọ ahọrọ niime alaeze Ya ma mesịa n’ikpeazụ bụrụ eze nwanyị. Site na emume nsọ ọkwa nchụaja Ya niile na idobe nkwa ọgbụgba ndụ ya niile, ike Chineke ga-arụ ọrụ niime na site n’aka ya iji nyere ya aka merie ihe ọbụla ndụ na-eweta ma ghọọ onyeinyom Chineke ma na o nwere ike ịghọ. Nke a bụ ihe m chọrọ ka nwata nwanyị ọbụla nọ na alaeze ahụ ghọta.

“Bienụ ndụ ruru ogo ohere niile enyere unu.”

Mụta otu emume nsọ niile na nkwa ọgbụgba ndụ niile ga-esi ekwe ike nke Chineke ịsọba na ndụ gị site na nnukwu ịdị ire, na-arụ ọrụ niime ma site na gị, na-enye ike ma na-akwado gị irute ebunuuche na ike ọrụ dị niime gị n’uju.

Kpachara anya mụọ ma tụgharịa uche na emume nsọ niile nke Ọkwa nchụaja nke Erọn na nke Melkizedek, nkwa ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme na nke ọbụla niime ha, na ike nke Chineke anyị na-enweta site na-emume nsọ ndị ahụ.

Cheta, ọ bụghị naanị onye nọ n’isi na emume nsọ ahụ bụ ihe dị mkpa; ihe emume nsọ ahụ na nkwa ọgbụgba ndụ na-atụghe kwesịkwara nlebara anya nke ntụnye uche gị.

Iketa achịcha na mmiri bụ ihe ncheta kwa izu ụka banyere ike Ya na-arụ ọrụ niime gị iji nyere gị aka merie. Iyi gamentị nke ọkwa nchụaja dị nsọ bụ ihe na-echetara anyị ụbọchị niile banyere ike Ya na-arụ ọrụ niime gị iji nyere gị aka ịbụ.

Anyị niile nwere ohere inwete onyinye nke ike Chineke.

Oge niile anyị na-anata oriri nsọ.

Oge niile anyị kufere ọnụ ụzọ esi aba na tempụl.

Nke a bụ ihe ngosịpụta nke Ụbọchị izu ike m. Nke a bụ ihe mere tempụl rekọmendị m ji amasị m.

“N’emume nsọ niile si na ya, ike nke ndụ iyi Chineke na-apụta ìhè.”

Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:20.

  2. Okenye D. Todd Christofferson kuziri: “Niime emume nsọ niile, nke ka nke ndị ahụ si na tempụl, anyị na-anata onyinye dị nsọ nwere ike si n’elu. Ike nke a si na chi na-abịa niime onye ahụ ma site na mmetụta nke Mmụọ Nsọ. … Ana m agba ama na Chineke ga-edobe nkwa Ya niile O nyere gị dị ka ị na-akwanyere ọgbụgba ndụ gị na Ya ugwu. … Ọ ga, site na Mmụọ Nsọ Ya, emejuputa gị n’ike nke ịdị ka chi” (”Ike nke Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Me 2009, 22, 23).

  3. Lee Dallin H. Oaks, “Ike nke Ọkwa nchụ aja nke Erọn na Oriri nsọ,” Liahona, Jen. 1999, 45.

  4. “Onyeikom ọbụla na onyeinyom ọbụla nke na-eso na emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ma na-edebe ọgbụgba ndụ niile nke ha na Chineke nwere ohere kwụ ọtọ inwete ike nke Chineke” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Ebighị ebi Ahụ,” Liahona, Ọkt. 2022, 10).

  5. Lee Joshua 3:5, nkọwada a. Okenye Dale G. Renlund kọwara: “Site n’ọgbụgba ndụ ndị a, anyị na-enwete nnukwu ohere ịnwete ike [nke Onyenwe anyị]. Ka o doo anya, ọgbụgba ndụ niile nke baptizim na nke tempụl abụghị, nime ma n’onwe ha, isi iyi nke ike. Isi iyi nke ike bụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe. Ime na idobe ọgbụgba ndụ niile na-arọpụta okporo ike Ha si abata niime ndụ anyị. (“Okirikiri nke Ozizi nke Kraịst nke Dị ike, nwere Omume ọma,” Liahona, Me 2024, 82.)

  6. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:1–3; Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Ndị Hibru 7:3 (niihe agbakwunyere na Baịbụlụ); Alma 13:2,16. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Site n’akwụkwọ nsọ anyị makwaara na ndị ahụ na-anọ n’isi na-emume ọkwa nchụaja na-eme ihe n’ọnọdụ Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:38; 36:2). Aga m atụnye uche ugbua n’otu ndị nkuzi na ndị nchụaja na ndị dikọn ga-esi na-arụ oke na ọrụ ha niile dị nsọ ime ihe n’ọnọdụ Onyenwe anyị na-ime nkwado, inye, na-ibugharị oriri nsọ,” (“Ọkwa nchụaja nke Erọn na Oriri nsọ,” Liahona, Jen. 1999, 45).

  7. Lee Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a,, 3.5.1-2, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  8. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 107:18–20; Ndị Filipi 1:6.

  9. Lee Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nọv. 2019, 77.

  10. Lee “Ebe obibi nke Joseph na Emma Smith” (history.ChurchofJesusChrist.org) maka nkọwada kacha gbasara nrụgharị nke ebe obibi Smith n’ebe agụgụala Nzukọ nsọ na Harmony, Pennsylvania.

  11. Ikikere na ntụghe niile nke ọkwa nchụaja na-enye ike Chineke ohere ịsọba niime ndụ nke ndị ahụ natara emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja ma mee ma dobe ọgbụgba ndụ niile so ya (lee Akwụkwọ ntuzi aka Izugbe, 3.5, Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

  12. Lee Joseph Smith—Agụgụala 1:71, nootu.

  13. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25.

  14. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:1.

  15. Ozizi na Ọgbụgbandụ nile 25:2.

  16. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:13. “Mkpụrụokwu ahụ Ọgbụgba ndụ si na Latịn pụta, convenire, ma n’ụzọ nkịtị pụtara ‘ịbịakọta ọnụ.’ Niime ọnọdụ nke ọkwa nchụaja, ‘ọgbụgba ndụ’ bụ ịbịakọta ọnụ ma ọ bụ nkwekọrịta dị n’etiti Chineke na mmadụ. Ọ na-eche na Chineke na mmadụ na-abịakọta ọnụ isukọlata, ikwenye na nkwa niile, iwu niile, ohere niile, na oke na ọrụ niile.

    “Ọgbụgba ndụ e mere n’ụdị dị otua enweghị nhicha ma nweghị ike ịgbanwe agbanwe. Ọ na-arịlịka mkpụrụ obi; na-ekewapụta ntọala kwụsiri ike ma zie ezie maka atụmaanya ọdịniihu” (Dale G. Renlund na Ruth Lybbert Renlund, Ọkwa Nchụaja Melkizedek Ahụ: Ịghọta Ozizi ahụ, Ibi ndụ Ụkpụrụ niile [2018], 60).

  17. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:7.

  18. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:8.

  19. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:12.

  20. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 25:15.

  21. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niiile 25:15. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Emume nsọ nke baptizim na ọgbụgba ndụ niile na-eso ya bụcha ihe ndị a chọrọ maka ịbanye n’alaeze selestịal. Emume nsọ niile ahụ na ọgbụgba ndụ tempụl niile na-eso ya bụ ihe ndị a chọrọ maka mbuli elu niime alaeze selestịal, nke bụ ndụ ebighị ebi, ‘nke kachasị ukwuu na onyinye niile nke Chineke’ [Ọgbụgba ndụ niile 14:7]” (“Ọgbụgba ndụ niile na Oke na ọrụ niile,” Liahona, Me 2024, 96).

  22. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:1.

  23. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:3.

  24. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 25:15.

  25. Lee Dallin H. Oaks, “Ọkwa nchụaja nke Erọn na Oriri nsọ,” Liahona, Jen. 1999, 44–45. Onyeisi Oaks kuziri:

    “N’ụzọ kacha yie ibe ya, emume nsọ ndị a nke Ọkwa nchụaja nke Erọn dịkwa oke mkpa n’ije ozi nke ndị mmụọ ozi. …

    “… Ozi niile nke ndị mmụọ ozi ka enwere ike inyeru site n’olu ma ọ bụ naanị site na-echiche ma ọ bụ mmetụta eziri na-echiche” (“Ọkwa nchụ aja nke Erọn na Oriri nsọ,” Liahona, Jen. 1999, 44, 45).

    Na mgbakwunye, Onye amụma Joseph Smith kwere nkwa nke ọ na-agwa ụmụnne nwanyị ndị Otù Enyemaka okwu: Ọ bụrụ na unu ebie ndụ kwesịrị ohere unu, agaghị enwe ike igbochi ndị mmụọ ozi site na ịbụ ndị unu na ha na-akpa” (Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph Smith [2011], 454).

  26. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 84:19-20.

  27. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 107:18–19.

  28. Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime mmụọ,” 77. “Willard Richards rịpọọtụrụ: ‘Onyeisi Joseph Smith gụrụ mkpughe ahụ [enyere] Emma Smith… ma kwuo na … ọ bụghị naanị ya, mana ndị ọzọ, nwere ike nweta otu ụdị ngọzi ndị ahụ’” (Nkuzi niile: Joseph Smith, 453–54). Leekwa Akwụkwọ Miniti Otu Enyem Aka Nauvoo, Maachị 17, 1842, niime Iri Afọ Ise Mbụ nke Otu Enyem Aka: Isi Dọkumentị niile nọ niime Agụgụala nke Ndịinyom Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a (2016), 1. 2. 1, churchhistorianspress.org.

  29. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24, isi nkeji. Nke a kwuru na “mkpụghe atọ ndị a na-eso bụ ndị e nyere n’oge ndị a iji kwadoo, gbaa ume, ma nye nkuzi.”

  30. Nkuzi niile: Joseph Smith, 454.

  31. Lee Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime mmụọ,” 77. Ana m arịọsi unu ike ịmụta site n’ekpere eziokwu niile unu nwere ike ịchọta gbasara ike ọkwa nchụaja. I nwere ike jiri Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nkeji nke 84 na 107bido. Nkeji ndia ga-eduba gị banye na nkeji ndi ọzọ. Akwụkwọ nsọ na nkuzi niile sitere n’aka ndi amụma, ndi ọhụ-ụzọ, na ndi mkpughe nke ugbua jupụtara n’eziokwu ndia. Dị ka nghọta gị na-abawanye na dị ka ị na-enwe okwukwe niime Onyenwe anyị na ike ọkwa nchụaja Ya, ike gị iwebata akụ ime mmụọ nke a nke Onyenwe anyị meworo ka ọ dị ga-amụba” (Russell M. Nelson, “Akụ niile nke Ime mmụọ,” 79).

  32. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:22.

  33. Ozizi na ọgbụgba ndụ niile 84:20.