Ọgbakọ Zuru ọha
Chineke Hụrụ Ụmụ Ya Niile n’Anya
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


9:36

Chineke Hụrụ Ụmụ Ya Niile n’Anya

Jizọs Kraịst na-akpọku anyị mgbe niile, ma Ọ na-eji anyị, ndị odibo Ya, n’enye aka ịkpọta ụmụ Ya nye Ya.

Gịnị ka Nna anyị nke Eluigwe chọrọ n’aka anyị? Ị ghọtara na mgbe ị nọ n’ịdị adị tupu ndụ anụ ahụ, Nna nke Eluigwe na-akwado gị maka ndụ gị n’ụwa? Mgbe ọ na-ekwuru ndị ntorobịa okwu, Ọnyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Nna anyị nke Eluigwe edokwawo ọtụtụ ndị mmụọ Ya kacha mma—enwere ike … ndị ọrụ Ya ndị kachasị mma—maka oge nke ikpeazụ nke a.” N’ihi na e debewo anyị maka ụbọchi ikpeazụ ndị a, ọ dị oke mkpa ka anyị mụta ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ Ezigbo Onye ọzụzụ atụrụ, ma Ọ mara igwe atụrụ Ya, ma igwe atụrụ maara Onye ọzụzụ atụrụ ha n’ihi na “ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha.” Ọ na-akpọku anyị mgbe niile, ma Ọ na-eji anyị, ndị odibo Ya, n’enye aka ịkpọta ụmụ Ya.

Oge adịghị anya, otu onyeisi stek na mụ nọ na-eleta ndị otu nke Nzukọ nsọ n’otu mpaghara obodo. Mgbe anyị mechara nleta anyị niile, onyeisi stek ahụ jụrụ m ma anyị nwere ike ịga hụ otu ezinaụlọ ọzọ. O masịrị ya na anyị kwesịrị ịgwa ha okwu.

Anyị kụrụ aka n’ụzọ ahụ, ma otu nwanne nwanyị meghere ya. O lere m anya, kama ọ maghị onye m bụ, ya mere onweghị oke ihe o gosiri nihu ya. A tụrụ m aka ebe onyeisi stek nọ, onye kelere ya n’aha. Ozugbo ọ nụrụ ma hụ ya, ọ ńụrịrị ọńụ. Ka ha guzoro na ọnụ-ụzọ ahụ, ha makụrụ onwe ha ma beekọta akwaa. Nke a setịpụrụ isiokwu maka nleta anyị. Anyị amaghị na nwanne nwanyị ahụ natara chemotherapy ụbọchị gara aga. Ike gwụrụ ya nke ukwuu ilekọta nwa ya nwoke toro eto. Ya mere e nyere m onyeisi stek aka yiwe nwa ya nwoke uwe, ma anyị tinyere ya n’oche nkwagharị ya. Anyị nyere ya nri nke ezigbo nwanne nwanyị ọzọ si na ngalaba ukwu ahụ butere na mbụ, ma nyekwa aka n’ọrụ ndị ọzọ niile. Tupu anyị ahapụ ebe obibi ha, anyị gọzie ha.

Ihe niile na-abata m n’obi n’oge nleta a bụ ihe ngosi na Jizọs Kraịst hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Ọ ghọtara ha ma mara n’onwe ya ihe mgbu nke ọnọdụ ha pụrụ iche. Ọ fọrọ nke nta ka ọbụrụ na nleta ahụ niile mere na jụụ. N’oge a anyị enyeghị nnukwu okwuchukwu ma ọbụ kesaa akwụkwọ nsọ kacha amasị anyị, mana Onyenwe anyị jiri mmụọ Ya gọzie anyị nke ukwuu.

Otu nime nnukwu ihe mere Nna gị nke Eluigwe ji zite gị n’oge a bụ ka ị wee mezuo ike mmepụta gị niile. Kwusaa Ozi ọma M na-akuziri anyị na dị ka ndị na-eso ụzọ nke Kraịst, anyị kwesịrị izere iji onwe anyị atụnyere ibe anyị. Ikike niile ime mmụọ gị pụrụ iche, bụrụ nke onwe, na nke ebumpụta ụwa, ma Nna gị nke Eluigwe chọrọ inyere gị aka ịzụlite ha. A ga-enwerịrị onye ị ga-enyere aka ịnweta ịhụnaanya nke Nna gị nke Eluigwe. Ike mmepụta gị si na Chineke. Ka ọ dị mkpa n’ezie ịkwado onwe gị iji nwee mmeri n’ụwa nke a na-asọmpi, otu n’ime ọrụ gị dị mkpa na ndụ gị niile bụ ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na ịgbaso echiche niile nke Mmụọ nsọ. Dịka ị na-eme nke a, Chineke ga-agọzi ndụ gị, Ọ ga-agọzi ezinaụlọ gị nke ugbua ma ọ bụ nke ọdịnihu, ma Ọ ga-agọzi ndụ niile nke ụmụ Ya ndị ị ga-ezute.

Anyị na-ebi n’oge nnukwu ohere. N’agbenyeghị na anyị na-ahụ ọtụtụ ihe isi ike, ama m na otu ihe kpatara ha jiri nọrọ bụ ka anyị nyere ndị ọzọ aka ịnweta ịhụnaanya nke Nna anyị nke Eluigwe. Onyeisi Nelson akụziwo, “N’ụbọchị ndị na-abịa abịa, anyị ga-ahụ ngosịpụta ike nke Onye Nzọpụta kachasị ihe niile nke ndị ụwa na-ahụtụbeghị mbụ.” Anyị nwere ihe ugwu ilekọta ndị chọrọ enyem aka, mmakụ, mmetụta nke nkasi obi, ma ọ bụ maka naanị ka anyị na ha nọrọ na nkịtị. Ọ bụrụ na anyị nwere ike inye aka mee ka ibu ha dị mfe, ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị nwa oge, mgbe ahụ anyị ga-enwe ike ịhụ nnukwu ngosipụta nke ike nke Onye Nzọpụta na ndụ ha.

Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a nwere ike ime mgbanwe dị mma n’ime ụwa. Anyị nwere ike inye mmetụta nke ọńụ nke na-egosipụta n’ihu anyị—ọńụ nke anyị ji okwu niile nke ịhụnaanya na omume obiọma na-ekerịta. Ka anyị bụrụ ndị ezigbo agbata obi, ezigbo ndị onye ọrụ, ezigbo ndị ọrụ. Ka anyị na-agbalịsi ike ịbụ ezi Ndị Kraịst mgbe niile.

Onyenwe anyị eweghachila ozi ọma Ya site na emume-nsọ niile dị mkpa ka ụmụ Nna nke Eluigwe nwee ike nweta nkwa niile nke jikọtara anyị na Ya. Site inyere ndị ụmụnne anyị nwanyị na nwoke aka n’ime aka mgba ha niile kwa ụbọchị, ka anyị chetakwa inyere ha aka ime na idobe nkwa niile dị nsọ ha na Nna nke Eluigwe emesịa ka O nwee ike kwee ha nkwa ngọzi niile kachasị ọnụ maka ndụ a na mgbe ebighị ebi. E kwere nkwa ndị a naanị site na Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na ọtụghe niile ọkwa nchụ-aja Ya.

Na-ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịnọrọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ. Ụfọdụ niime anyị na-esi n’ụzọ ahụ pụọ site n’oge ruo n’oge, ma ya mere anyị ga-echetarịrị na maka Nna anyị nke Eluigwe anyị na-enwe ohere ịlaghachi mgbe niile. Ọ bụnagodi na ụzọ anyị abụghị nke kachasị mma, Onye Nzọpụta na-echetara anyị mgbe niile “Ka ugbọrọ ole ọbụla nke [anyị chegharịrị] ma [chọọ] mgbaghara mmehie, jiri ezigbote ebumnobi, [anyị ga-enwe] mgbaghara.”

Otu n’ime ihe onye iro na-arụ taa bụ ime ka anyị chee echiche ma kwere na ọ dịghị ụzọ anyị ga-esi gbanwee ma ọ bụ na anyị enwekwaghị olile anya. Echiche a na-ebibi ihe na-eme ka ọtụtụ nime anyị kwụsị ịgbalị. Ma ọ bụ n’oge a mgbe ịhụnaanya anyị, okwu agbamume na nkwado anyị, oge anyị na enyem aka anyị nwere ike inye mmadụ olile anya zuru ezu ịnwale ọzọ.

Ma eleghị anya ị na-eche, “Ngwanụ, mana onye ga-ejere m ozi nlekọta?” Site na-ịga na igọzi ndụ niile ụmụnne anyị nwoke na nwanyị, anyị ga-anakọta ịgba-ama niile nke ga-emeju ndụ anyị n’okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ịgba-ama ndị a ga-eme ka anyị nwee ume ịnwale ọzọ n’onwe anyị. Mmụọ Nsọ ahụ ga-eme ka anyị dị ndụ ma nyere anyị aka jiri ịgba-ama niile ọhụrụ ga-aga n’ihu na ihe isi ike nke onwe anyị na ọnwụnwa niile nke onwe anyị. Mgbe ọbụla anyị na-achọ ịgọzi ndụ ndị ọzọ, Onyenwe anyị na-emere anyị ebere karịa; Ọ na-agba anyị ume ma nyere anyị aka niime ndụ anyị niile.

Biko cheta na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta gị ma na-aghọta gị n’onwe gị. Ọ maara ihe ọ bụ inwe imezu ọkpụkpọ oku ma wee hapụ ihe n’azụ iji nyere ụmụ nke Chineke aka. O nwere ike ahụ ịgọzi gị na ihe ọbụla, ma ọbụrụ na ikwere na Ya n’enweghị obi abụọ.

Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị m hụrụ nanya, n’ụbọchị ahụ mgbe otu onye ndu nchụaja nwere mmetụta maka anyị ileta nne na nwa anyị na-enweghị na uche anyị, a na m ama ọkwa na Chineke maara na ha chọrọ anyị. Ma n’ikpeazụ, ọ bụ m bụ onye e jere ozi nleta. Na ụbọchị ahụ, e nwetara m otu nime nkuzi kachasị ukwuu nke ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta nwere n’ebe anyị nọ.

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta nke ụwa, na Ọ dị ndụ, na O biri ndụ wee nwụọ n’ihi mụ na gị, n’akwa na a kpọlitere Ya n’ọnwụ n’ihi mụ na gị ka anyị wee nwee ike inwe ọchịchọ nke nnọkọ eluigwe jupụtara n’ọńụ n’ebe ndị ahụ n’ọwororịị n’akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ. A ma m na Ọ na-aghọta mụ na gị nke ọma. Ọ na-aghọta oge ọ bụla ihe sịrị anyị ike, ma O nwere ike inyere anyị aka n’oge ndị ahụ niile mgbe anyị na-eche na ọ dịghị mfe. A maara m na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe pụtara ihè n’ihu Josef Smit iji weghachi ozi ọma ahụ n’ụbọchị ndị a. A ma m na ezigbo onye amụma anyị, Russell M. Nelson, bụ onye amụma nke Onyenwe anyị, ma a na m agba ama maka ihe ndị a n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Gospel Library.

  2. Lee Jọn 10:2–4.

  3. “Zere iji onwe gị atụnyere ndị mgbasa ozi ọma ọzọ na ịtụle ihe pụtara na ọrụ gị niile na nke ha” (Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst [2023], 13).

  4. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 95.

  5. Moroni 6:8.

  6. Lee Alma 56:47; 57:26.