Ọgbakọ Zuru ọha
Nwoke ahụ Onye ya na Jehova Kwuru
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


11:8

Nwoke ahụ Onye ya na Jehova Kwuru

Josef Smith ka a “gọziri ya imeghe ọgbọ nke ikpeazụ a,” ma a gọziri anyị na ọ mere otu a.

Ebumnuche m taa na mgbe niile bụ ịgba ama nke Jizọs Kraịst, na Ọ bụ Ọkpara nke Chineke, Onye Okike na Onye Nzọpụta nke ụwa, Onye Nnapụta na Onye Mgbapụta anyị. Nihi “Isi ukpuru nile nke okpukperechi anyị bụ ama nke Ndị Ozi na Ndị Amụma gbasara Jizọs Kraịst,” taa ana m ekesara unu mmata ihe m na ọgbụgba ama m banyere Onye Nzọpụta dị ka esi gbaa ha ume ma mee ka o mie emie site na ndụ na nkuzi niile nke otu onye ozi na onye amụma pụrụiche.

Mmalite nke Amamiihe

N’ụtụtụ ọmalịcha otu ụbọchị na mbido oge spring nke afọ 1820, Joseph Smith gbara afọ 14 banyere niime ọdọ osisi nọ n’akụkụ ebe obibi ezi na ụlọ ya ikpe ekpere banyere mmehie ya ma ka ọ jụọ nzukọ nsọ nke ọ ga-abanye. Ekpere obi ọcha ya, nke ejiri okwukwe dị ike kpee, dọtara anya nke otu niime ike ndị ahụ kachasị sie ike na mbara niile nke eluigwe, gụnye Nna na Ọkpara ahụ. Ma Ekwensu. Nke ọbụla niime ndịa nwere ebumnobi dị ike banyere ekpere ahụ ma banyere nwa nwoke ahụ.

Ihe anyị na-akpọ ugbua Ọhụ nke Mbụ hiwere mmalite nke Mweghachite nke ihe niile n’oge ọgbọ ikpeazu nke a. Mana maka Joseph, nhụmiihe ahụ bụụrụ nke onwe ma bụrụ ihe nkwadobe. Naanị ihe ọ chọrọ bụ mgbaghara na odudu. Onyenwe anyị nyere ya ha abụọ. Okwu ahụ “esonyekwala [nzukọ nsọ] ọbụla” bụ ntuziaka enyere. Okwu ahụ, “Agbagharawo gị mmehie gị niile” gosiri mgbapụta.

Maka eziokwu ọma niile nke anyị nwere ike ị mụta site na Ọhụ Mbụ ahụ, ikekwe ihe Joseph ji n’aka bụ, “Ahụtawo m na akaebe nke Jemis bụ eziokwu—na mmadụ ọbụla na-enweghi amamiihe nwere ike ịrịọ Chineke, ma nwete ya.”

Dị ka otu ọka akwụkwọ dere: “Ihe mmụta di irè nke Ọhụ Mbụ ahụ taa bụ ịmata na ọ bụ ọdịdị Chineke inye ndị ahụ na-enweghi amamiihe. … Chineke ahụ kpụgheere Onwe Ya nye Joseph Smith n’ebe ọdọ osisi dị nsọ ahụ bụ Chineke na-aza ndị ntoroọbịa nta n’oge niile nke nsogbu.”

Nhụmiihe nke Joseph n’ebe ọdọ osisi ahụ nyere ya obisike iji rịọ maka mgbaghara na odudu ruo oge ndụ ya nke fọdụrụ. Nhụmiihe ya nyekwara mụ obisike iji rịọ maka mgbaghara na odudu n’oge ndụ m niile.”

Nchegharị Mgbe na mgbe

Na Septemba 21, 1823, Joseph jiri obi ọkụ ọkụ kpee ekpere maka mgbaghara, nwee obisiike na nihi nhụmiihe ya n’ebe ọdọ osisi afọ atọ gara aga, eluigwe ga-azaghachi ọzọ. Ma ọ mere otu a. Onyenwe anyị zitere otu mmụọ ozi, Moronaị, ịkuziri Joseph ma gwa ya maka otu ndekọihe mgbe ochie nke ọ ga-emesị tụgharịa site n’onyinye na n’ike nke Chineke—Akwụkwọ nke Mọmọn.

Mgbe ihe fọrọ ntakịrị ka afọ 13 gafee nke a mere, Joseph na Oliver Cowdery sekpuuru ala n’obi dị nro, kpee ekpere agbara nkịtị niime Tempụl Kirtland nke ewuru ma doo nsọ ọhụrụ. Anyị amaghị ihe ha ji maka ya kpee ekpere, mana ekpere ha dị nnọọ ka ọ gụnyere arịrịọ maka mgbaghara, niihi, dị ka ha biliri, Onye Nzọpụta pụtara ma kwuo, “Lee, agbagharawo unu mmehie niile unu; unu dị ọcha n’ihu m.“

Nime ọnwa na afọ ndị ahụ gafere mgbe nhụmiihe nke a mesịrị, Joseph na Oliver mere njọ ọzọ. Ma ọzọ. Mana nime oge nke ahụ, maka oge nke ahụ, na nzaghachi arịrịọ ha ma niihi nkwadobe maka mweghachite ntụghe ọkwa nchụaja niile nke dị ebube nke ga-eme na nso nso a, Jizọs mere ha enweghị mmehie.

Omume Joseph nke ịchegharị mgbe na mgbe na-enye m obisike iji “bịaruo oche eze nke amara jiri obisike, ka [m] wee nwee ike nwete obi ebere.” Amụtawo m na Jizọs Kraịst n’ezie nwere “agwa mgbaghara.” Ọ bụghị ozi Ya ma ọ bụ ọdịdị Ya ima ikpe. Ọ bịara ịzọpụta.

Rio n’aka Onyenwe anyị!

Dị ka otu akụkụ nke nkwa “ikwụghachi ihe niile,” Onyenwe anyị, site n’aka Joseph Smith, weghachitere Akwụkwọ nke Mọmọn na mkpughe ndị ọzọ nke jupụtara na uju nke ozi ọma Ya. Eziokwu niile dị mkpa ka emere ka ọ doo anya ma zuo oke dị ka Joseph ugboro ugboro rịọrịọ site n’aka Onyenwe anyị maka odudu. Tulee ndịa na-esote:

  1. Nna na Ọkpara ahụ nwere anụ ahụ “a pụrụ ịmetụ aka dị ka nke mmadụ.”

  2. Jizọs wekwasịrị Onwe Ya na-abụghị naanị mmehie anyị niile mana gụnyekwa nrịa nrịa niile, mkpagbu niile, na adịghị ike niile nke anyị.

  3. Aja mgbaghara mmehie Ya bụ nke na-egbu oke mgbu nke mere Ya agba ọbara site n’ọghere ọbụla.

  4. A na-azọpụta anyị site na amara Ya “mgbe anyị mesioworo ihe niile nke anyị nwere ike ime.”

  5. Enwere ọnọdụ a ga-etozu maka inwete ebere Kraịst.

  6. Dị ka anyị na-abịakwute Kraịst, Ọ gaghị naanị agbaghara mmehie anyị, mana Ọ ga-agbanwe ọdịdị anyị kpam kpam, “nke mere na anyị enwekwaghị ọchịchọ ime ihe ọjọọ.”

  7. Kraịst mgbe niile na-enye ndị Ya iwu iwu tempụl, ebe Ọ ga-egosi Onwe Ya nye ha ma nye ha onyinye nsọ nke ike si n’elu.

Ana m agba ama na ihe ndị a niile bụ eziokwu ma dịkwa mkpa. Ha nọchitere naanị otu akụkụ nke uju ahụ nke eweghachitere site na Jizọs Kraịst site n’aka Joseph Smith na nzaghachi arịrịọ ugboro ugboro maka odudu.

Na-atụgharị Alaeze Nke a

N’afọ 1842, Joseph dere maka ihe ndị dị ịtụnaanya nke ga-abịa na mmezu na ọgbọ nke ikpeazu a. Ọ dere na n’oge ụbọchị nke anyị , “Ọkwa nchụaja nke eluigwe ga ejikọta ya na nke ụwa, iji weta ebunmuche ndị ahụ dị nnukwu; ma dị ka anyị dị n’otu nime otu ọrụ, iji tụgharịa alaeze nke Chineke, ọkwa nchụaja nke eluigwe anọghị na-ele sọọsọ anya anya.”

Maka enyi ya Benjamin Johnson, Joseph kwuru, “Benjamin, [ọ bụrụ na m nwụọ] a gaghị m anọ n’ebe dị anya site n’ebe ị nọ, ma ọbụrụ n’ofe ọzọ nke akwa mgbochi, A gakwa m arụkọ ọrụ mụ na gị, ma jiri nnukwu ike nke bawanyere, iji mee ka alaeze nke a na-atụgharị.”

Na June 27, 1844, egburu Josph Smit na nwanne ya nwoke Hyrum. Eliri ahụ Josef ka o zuo ike, mana ama ya garaniihu na-akpọtụ gburugburu ụwa na niime mkpụrụ obi m:

“Ahụwọ m ọ́hụ̀; a maara m ya, ma a maara m na Chineke maara ya, ma enweghị m ike ịgọnarị ya.”

“Agwaghị m gị na ezuru m oke; mana enweghị mperi dị na mkpughe niile nke m kuziworo.”

“Isi ukpuru niile nke okpukperechi anyị bụ ama nke Ndị Ozi na Ndị amụma gbasara Jizọs Kraịst, na Ọ nwụrụ, elie ya, ma bilite ọzọ n’ụbọchị nke atọ, ma rigooro n’eluigwe; ma ihe ndị ọzọ niile nke metụtara okpukperechi anyị bụ naanị ihe ndị agbakwụnyere niime ya”

Ihe ekwuru maka Jọn Omee Baptizm ka enwekwara ike ikwuru maka Joseph Smith: “Enwere otu nwoke ezitere site naka Chineke, onye aha ya bụ [Josef]. … Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, kama ọ bịara ka ọ gbaara ihè ahụ aka-ebe,” “ka mmadụ niile wee site na ya nwee ike ikwere.”

E kwere m E kwenyere ma mara n’ezi ya na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ. Ana m agba ama na Chineke ahụ dị ndụ bụ Nna anyị dị ịhụnaanya. A maara m nke a niihi olu nke Onyenwe anyị ekwuworo m ya, ma otu a ka olu ndị odibo Ya kwukwara, ndị ozi na ndị amụma, gunyekwara ma malite n’aka Joseph Smith.

Ana m agba ama na Joseph Smith bụbụụrụ ma bụrụ onye amụma nke Chineke, onye aka ebe na odibo nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. A “gọziri ya imeghe ọgbọ nke ikpeazụ a,” ma a gọziri anyị na ọ mere otu a.

Onyenwe anyị nyere Oliver na anyị niile iwu, “Nyere nwa odibo m Joseph aka, na-ikwesi ntụkwasị-obi.” A na m agba ama na Onyenwe anyị na-enyere odibo Ya Josef aka ma Mweghachite ahụ si n’aka ya bịa.

Joseph Smith ugbua sonyere niime akụkụ nke ọkwa nchụaja nke eluigwe ahụ nke ọ kwuru maka ya. Dị ka ọ kwere enyi ya nkwa, ọ nọghị n’ebe dị anya site n’ebe anyị nọ, ma n’ofe ọzọ nke akwa mgbochi ahụ, ọ ka na-arụkọ ọrụ anyị na ya, ma jiri nnukwu ike nke bawanyeworo, na-eme ka alaeze nke a na-atụgharị. Jiri ọńụ na ekele, ana m eweli olu m “n’otito nye nwoke ahụ onye ya na Jehova kwuru.” Nke kachasị nke, otuto dịrị Jehova, onye kwuru ya na nwoke ahụ! Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen