Ọgbakọ Zuru ọha
Ozizi nke Jizọs Kraịst Dị mfe.
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Ozizi nke Jizọs Kraịst Dị mfe.

Ana m agba aka ebe banyere ọrụ dị nsọ nke ikuziri ụmụ Nna nke Eluigwe ozizi dị mfe nke Jizọs Kraịst.

Anyị niile nwere ndị otu ezi na ụlọ anyị hụrụ naanya ndị na-enwe ọnwụnwa ma anwalere site niihe yiri ike niile nke Setan na-adịgide adịgide, onye mbibi, onye ga-eme ụmụ Chineke niile ahapụ inwe ańụrị. N’ebe ọtụtụ niime anyị nọ, enwewo ọtụtụ abalị ụra churu mmadụ naanya. Anyị anwawo iji ike ihe ọbụla dị mma gbaa ndị nọ na nsogbu gburugburu. Anyị ekpewo ekpere maka ha. Anyị ahụwo ha naanya. Anyị ehiwewo ọmụmaatụ kachasị mma anyị nwere ike.

Alma, onye amụma sitere oge ochie nwere ọgụgụ isi, zutere nnwale ndị yiri nke a. Ndị o duru ma hụ naanya mgbe na mgbe nọọrọ na mbuso agha site n’aka ndị iro dị egwu, otu ọ dị ha nọgidekwara na-anwa ịzụ ụmụ ezi omume n’ụwa nke ụjọọ omume. Alma chere na naanị olileanya o nwere iji nwete mmeri bụ ike nke anyị nwere ike mgbe ụfọdụ leda anya ma ọtụtụ mgbe ejitụ ya ntakịrị eme ihe. Ọ rịọrọ maka enyemaka nke Chineke.

Alma maara na maka Chineke inye aka, nchegharị bụ ihe a chọrọ site n’aka ndị ahụ ọ na-edu, tinyekwara ndị iro ya. Site otu a, ọ họọrọ usoro dị iche iji lụọ ọgụ.

Akwụkwọ nke Mọmọn kọwara ya n’ụzọ dị otu a: “Ma ugbua, dị ka nkwusa nke okwu ahụ nwere nnukwu ike iji duo ndị mmadụ ime ihe ahụ bụ nke ziri ezi—ee, o nweworịị … nsonazụ kara sie ike n’uche ndị ahụ karịa mma agha, ma ọ bụ ihe ọbụla ọzọ, nke meworo ha—ya mere Alma chere na ọ dị mkpa na ha ga-anwale omume ọma banyere okwu Chineke.”

Okwu Chineke bụ ozizi nke Jizọs Kraịst kuziri ma site n’aka ndị amụma Ya. Alma maara na okwu niile nke ozizi nwererịị ike dị ukwuu.

Na nkeji nke 18 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onyenwe anyị kpughere ntọala nke ozizi Ya:

“Niihi na, lee, enye M ụmụ mmadụ niile iwu ebe niile ka ha chegharịa. …

Niihi na, lee, Onyenwe anyị Onye Mgbapụta gị tara ahụhụ ọnwụ n’anụ ahụ; ya mere ọ tara ahụhụ mgbu nke ụmụ mmadụ niile, ka ụmụ mmadụ niile wee chegharịa ma bịakwute ya.

“Ma o siwo na ndị nwụrụ anwụ bilite ọzọ, ka o wee kpọtara onwe ya ụmụ mmadụ niile, site n’ọnọdụ nke nchegharị.”

“Ma unu ga-ada n’ala ma kpọọ isiala nye Nna n’aha m.

“… Unu garịrị echegharị ma mee baptizim, n’aha nke Jizọs Kraịst.”

“Rịọ Nna n’aha m n’okwukwe, na-ekwere na unu ga-anata, ma unu ga-enwe Mmụọ Nsọ.”

“Ma ugbu a, mgbe … unu natasiworo nke a, unu garịrị edebe iwu nsọ m niile niime ihe niile.”

“Wekwasịnụ onwe unu aha nke Kraịst, ma kwuo eziokwu na-anya udo.

“Ma ka ha ra bụ ndị chegharịrị ma mee baptizim n’aha m, nke bụ Jizọs Kraịst, ma nagide ruo ọgwụgwụ, ndị ahụkwa ka a ga-azọpụta.”

Niime edereede ole ma ole ndị ahụ, Onye Nzọpụta na-enye anyị ọmụmaatụ zuru oke banyere otu anyị ga-esi na-akuzi ozizi Ya. Ozizi nke a bụ na okwukwe niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, nchegharị, baptizim, ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ, ma nagide ruo ọgwụgwụ na-agọzi ụmụ Chineke niile.

Dị ka anyị na-akuzi ụkpụrụ ndị a nye ndị ahụ anyị hụrụ naanya, Mmụọ Nsọ ga-enyere anyị aka ịmata eziokwu ahụ. Niihi na anyị chọrọ mkpake niile nke Mmụọ Nsọ, anyị ahaghị izere ịma amụma ma ọ bụ ntapịa nke onwe na-agafe karịa ikuzi ezigbo ozizi.

Nke ahụ nwere ike ịra ahụ omume mgbe ị hụrụ onye ahụ ị na-agbalị imetụta omume ya naanya. Ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nwere ike jụwo ozizi ahụ nke akuziworo. Ọ na-eto akpịrị ịnwa ime ihe dị ọhụụ ma ọ bụ nke ịkpachara anya kpakee mmụọ. Mana Mmụọ Nsọ ga-ekpughe mmụọ nke eziokwu naanị dị ka anyị na-akpachara anya ma na-eleru anya ka ahapụ ịgafe karịa ikuzi ezigbo ozizi. Otu niime ụzọ ndị kachasị mma iji gbochie ọbụna ịgaru nso ozizi ụgha bụ ị họrọ ịdị mfe n’ikuzi nkuzi anyị. Ana enweta nchekwa site na ịdị mfe ahụ, ma ntakịrị ihe na-efu.

Ikuzi nkuzi bụ ihe na-enye anyị ohere n’ụzọ dị mfe ikwusa ozizi ahụ na-azọpụta na mbido, ebe ụmụ ntakịrị na-anọgide na-enweghị mmetụ aka site na ọnwụnwa niile nke onye nduhie nke ga-emecha n’ikpeazụ zute ha, ogologo oge tupu eziokwu niile ha kwesịrị ịmụ ịmụta a bụrụ ihe kwofere site na mkpọtụ nke soshal midịa, ndị ebiri ha, na ihe ịra ahụ niile nke onwe ha. Anyị ga-ewere ohere ọbụla iji kọrịta nkuzi niile nke Jizọs Kraịst anyị na ụmụ ntakịrị. Oge nkuzi ndị a bara uru nke ukwuu ma karịchaa ma atụnyere ya na oke mbọ ndị nke ike mmegide niile. Na awa niile etinyere na-ịkụnye ozizi niime ndụ nke otu nwata, e nwere awa ndị apụghị ịgụta ọnụ nke mmegide juputara na ozi niile na oyiyi niile nke na-eche aka mgba ma ọ bụ jụ eziokwu ndị ahụ na-enye nzọpụta.

Ụfọdụ niime unu nwere ike ị na-eche ma ọ bụ na ọ ga-aka mma ịkpọkete ụmụ gị nso n’ebe ị nọ site na-ikpori ndụ, ma ọ bụ i nwere ike jụọ ma ọ bụ na nwa ahụ nwere ike bido inwe ike ọgwụgwụ site na nkuzi gị niile. Kama, anyị kwesịrị itule, “Site n’obere oge ha otu a na ohere ole ma ole ndị dị otu a, olee mkpụrụokwu ndị nke ozizi m nwere ike ịkọ nke ga-agba ha ume megide ihe aka mgba niile na-ahaghị ịdị nye okwukwe ha?” Mkpụrụokwu ndị ị kọrọ taa nwere ike bụrụ ndị nke ga-adị niime ha, ma taa ga-agafe mgbe na-adịghị anya.

Anọ m mgbe niile enwe afọ ojuju na ịhụnaanya nke nne nnenne m Mary Bommeli na-ikwusa ozizi nke Jizọs Kraịst. Ndị mgbasa ozi ọma kuziiri ndị ezi na ụlọ ya ihe na Switzerland mgbe ọ gbara afọ 24.

Mgbe o mechara baptizim, Mary nwere mmasị isonye Ndị nsọ nọ na Amerika, ya mere o mere njem si na Switzerland ruo Berlin ma chọta ọrụ n’ebe otu nwanyị nke nyere ya ọrụ ikwe akwa maka uwe nke ndị ezi na ụlọ ahụ. Mary biiri n’ọnụ ụlọ nke nwa odibo ma kwanye ihe o ji ekwe akwa na mpaghara ebe obibi ebi ebi.

N’oge ahụ, ikuzi ozizi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu ka iwu machibidoro na Berlin. Mana Mary hụtara na ya enweghị ike ịkwụsị ikwusa ihe ndị ọ mụtaworo. Nwanyị nwe ụlọ ahụ na ndị enyi ya ga-agbakọ gburugburu n’ebe ahụ a na-ekwe akwa ịnụ ka Mary na-akuzi ihe. O kwuru banyere mpụta nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nye Joseph Smith, nleta nke ndị mmụọ ozi, na Akwụkwọ nke Mọmọn. Icheta nkọwapụta niile nke Alma, ọ kuziri gbasara ozizi nke Mbilite n’ọnwụ. Ọ gbara ama na ezi na ụlọ niile nwere ike ijikọtagharị ọnụ niime alaeze selestịal.

Ọnụnụ ọkụ n’obi nke Mary ikwusa ozizi nke ozi ọma eweghachitere kpalitere nsogbu mgbe na-adịghị anya. Ọ dịghị anya tupu ndị uwe ojii akpọga Mary n’ụlọ nga. N’ụzọ, ọ jụrụ nwoke onye uwe ojii ahụ aha ọka ikpe ọ ga-apụta n’ihu ya n’ụtụtụ na-abịa abịa. Ọ jụkwara gbasara ezi na ụlọ ya na ma ọ bụ ezigbo nna na ezigbo di. Nwoke onye uwe ojii ahụ kọwara ọka ikpe ahụ dị ka nwoke nke ndị ụwa.

Niime ụlọ nga ahụ, Mary rịọrọ maka pensụl na akwụkwọ. O jiri abalị ahụ degara ọka ikpe ahụ akwụkwọ ozi, na-agba aka ebe nye Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst dị ka akọwara niime Akwụkwọ nke Mọmọn, na-ekwu maka ụwa mmụọ, ma na-akọwa nchegharị. Ọ tụrụ ero na ọka ikpe ahụ ga-enwe oge ịtụgharị uche banyere ndụ ya tupu izute ikpe ikpeazụ. O dere na ya maara na o nwere ọtụtụ ihe ime nchegharị banyere ha, ọtụtụ nke ga-eme ndị ezi na ụlọ ya obi ọjọọ nke ukwuu ma wetere ya oke mwute. N’ụtụtụ ahụ, mgbe o dechara akwụkwọ ozi ya, o nyere ya nwoke onye uwe ojii ahụ ma rịọ ka ọ ga nyedu ya onye ọka ikpe ahụ, ma o kwere ime otu ahụ.

Emesịa, onye ọka ikpe ahụ kpọrọ nwoke onye uwe ojii ahụ ka ọ bịa n’ụlọ ọrụ ya. Akwụkwọ ozi nke Mary dere bụ aka ebe na-enweghị mgbagha na ọ na-akuzi ozizi nke ozi ọma eweghachitere ma, site na-ime otu ahụ, na-emebi iwu ahụ. Ka osila dị, o teghị anya tupu nwoke onye uwe ojii ahụ alọghachite niime ụlọ ebe a kpọchiri Mary. Ọ gwara ya na a kachapụwo ebubo niile e boro ya na o nwere ohere ịla. Ya ikuzi ozizi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere akpatawo ka akwaba ya niime ụlọ mkpọrọ. Ma ya ịma ọkwa ozizi nke nchegharị nye onye ọka ikpe ahụ mere ka akpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ.

Nkuzi nke Mary Bommeli ebighị na ntọghapụ ya. Ndekọihe nke okwu ya niile nyedatara ezigbo ozizi site na ndudugandu ruo ndudugandu ndị a ka amụbeghị. Nkwenye ya na ọbụna onye atọghatara ọhụrụ nwere ike ikuzi ozizi nke Jizọs Kraịst emewo ka ndị si na agbụrụ ya ga-enwe mgbam ume n’agha niile nke onwe ha.

Dị ka anyị na-eme ihe ndị kachasị mma iji kuziere ndị ahụ anyị hụrụ naanya ihe gbasara ozizi nke Jizọs Kraịst, ụfọdụ ka nwekwara ike gaghị ekwenye. Obi abụọ nwere ike ịbata n’uche gị. I nwere ike jụọ ajụjụ ma ọ bụ na ị maara ozizi nke Onye Nzọpụta nke ọma nnọọ iji kuzie ya n’ụzọ dị mma. Ma ọ bụrụ na i buworịị ụzọ nwaa anwaa ikuzi ya, i nwere ike ị na-eche ihe kpatara nsọnaazụ ndị dị ire abụkarịghị ndị a na-ahụ anya. Anabatakwala obi abụọ ndị ahụ. Chigharịkwute Chineke maka enyemaka.

“Ee, ma tikuo Chineke maka nkwado gị niile; … kwe ka ịhụnaanya niile nke obi gị bụrụ ihe atụkwasịrị n’Onyenwe anyị ruo ebighị ebi.”

Ma ugbua aga m achọ ka unu dị umeala, ma nwee nrube isi ma dị obi ọma; esighị ike mmeta mma; juputa na ndidi na ogologo ntachi obi; na-eme ihe niile n’oke; na-agbalịsi ike n’idebe iwu nsọ niile nke Chineke oge niile; na-arịọ ụdị ihe ọbụla ọ bụ na-akpa unu, ma nke ime mmụọ na nke anụ ahụ; oge niile na-enyeghachi Chineke ekele maka ihe ọbụla ọ bụ unu na-anata.”

Ọ bụrụ na i kpee ekpere, ọ bụrụ na ịgwa Chineke okwu, ma ọ bụrụ ma ị rịọ maka enyem aka Ya maka onye ịhụrụ naanya, ma ọ bụrụ ma inye Ya ekele na-abụghị naanị maka enyem aka mana maka ndidi na ịdị obi ọma nke na-abịa site na-anataghị ihe niile ị chọrọ ozugbo ozugbo ma ọ bụ ikekwe enwetaghị ma ọlị, emesịa ana m ekwe gị nkwa na ị ga-abịakwute Ya nsọ. Ị ga-abịa dị ike n’ọrụ ma nwee ogologo ntachi obi. Ma emesịa ị ga-enwe ike mata na imewo ihe niile i nwere ike ime iji nyere ndị ahụ ị hụrụ naanya aka ma ndị ahụ ị na-ekpere ekpere ka ha merie mbọ nke ekwensu ịkwatu ha.

“Mana ha ndị na-eche oge Onyenwe anyị ga-agbanwe ume ha; ha ga-eji nku felie dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ma ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mba.”

Anyị nwere ike chọta olileanya niime ndekọihe banyere akwụkwọ nsọ nke ndị ezi na ụlọ. Anyị na-agụ banyere ndị ahụ ndị dapụrụ site niihe akuziiri ha ma ọ bụ ndị na-arịọsi Chineke ike maka mgbaghara, ụdị dị ka Alma nke Nta, ụmụ Mozaya ndị nwoke, na Enọs. N’oge nke ọgbaaghara ha, ha chetara okwu niile nke ndị nne na nna ha, okwu niile banyere ozizi nke Jizọs Kraịst. Icheta zọpụtara ha. Nkuzi gị banyere ozizi ahụ dị nsọ bụ ihe a ga-echeta.

Ana m agba aka ebe banyere ọrụ dị nsọ nke ikuziri ụmụ Nna nke Eluigwe ozizi dị mfe nke Jizọs Kraịst, nke na-enye anyị ohere inwe nsacha nke ime mmụọ ma n’ikpeazụ bụrụ ndị anabatara n’ihu Chineke, ibinyere Ya na Ọkpara Ya n’ebube ruo ebighị ebi niime ezi na ụlọ niile. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.