Ọgbakọ Zuru ọha
Nabata Onyinye Onyenwe anyị nke Nchegharị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


11:35

Nabata Onyinye Onyenwe anyị nke Nchegharị

Ka anyị ghara ichere ka ihe sie ike tupu anyị atụgharịkwuru Chineke. Ka anyị hara ichere ruo ọgwụgwụ nke ndụ anyị niile iji chegharịa.

Ana m agba ama nke Nna nke Eluigwe anyị hụrụ n’anya. N’ime ọgbakọ zuru ọha Eprel 2019, obere oge a akwadochara m na oke na ọrụ ọhụrụ m dịka onye Ji Ikike Zuru ọha Iri Asaa, kwaya gụrụ abụ nke “E Guzoro m N’ịtụn’anya” nke rikpuru obi na mkpụrụ obi m.

O juru m n’anya na ọ ga-agbadata site na ocheeze ya dị nsọ

Ị napụta mkpụrụ obi dị nnupu isi na mpako dị ka mụ,

Na ọ ga-esetipụ ịhụnaanya ya dị ukwuu nye onye dị ka M,

Zuru oke inwe, ịgbapụta, na izi ezi.

Dị ka M nụrụ okwu niile ndị ahụ, ọ tụrụ m n’anya. E nwere m mmetụta na n’agbanyeghị erughị eru na mmejọ m niile, Onyenwe anyị gọziri m ka m mara na “n’ike ya enwere m ike ime ihe nile.”

Mmetụta nkịtị nke erughị eru, adịghị ike ma ọ bụ ọbụna ezughị oke bụ ihe ọtụtụ n’ime anyị na-agba ya mbọ mgbe ụfọdụ. A ka m na-adọga na nke a; E nwere m mmetụta a n’ụbọchị a kpọrọ m. E nwere m mmetụta ya ọtụtụ oge ma a ka m na-enwe kwa ya ugbu a m n’agwa unu okwu. Agbanyeghị, a mụtala m na ọ bụghị naanị m nwere mmetụta ndị a. N’ezie, e nwere ọtụtụ akụkọ n’ime akwụkwọ nsọ niile banyere ndị yiri ka ha nwere mmetụta niile yiri nke ahụ. Nịmaatụ, anyị na-echeta Nefi dị ka onye odibo nke Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na dị ike. Mgbe ụfọdụ, ọbụna ya onwe ya gbakwara mgba ya na mmetụta niile nke erughị eru, adịghị ike, na ezughị oke.

Ọ sịrị: “na-agbanyeghị nnukwu ịdị mma nke Onye-nwe anyị, n’igosi m nnukwu ọrụ ịtụnaanya ya niile, obi m tiri mkpu: O ogbenye ọnụ ntụ ka m bụ! Ee, obi m na-eru uju n’ihi anụ arụ m; mkpụrụ obi m nwere mwute n’ihi ajọọ omume m niile.”

Onye amụma Josef Smith kwuru nke mmetụta mgbe niile “na-amakarị ya ikpe”, mgbe ọ bụ ntoroọbịa, “n’ihi adịghị ike na ezughị oke [ya] niile.” Kama mmetụta Josef niile nke erughị eru na nchegbu bụ akụkụ nke ihe dugara ya na-ịtụgharị uche, ịmụ ihe, ịmụta ihe, na ikpe ekpere. Dị ka ị nwere ike icheta, ọ gara ikpe ekpere n’ime ọdọ osisi dị nso n’ụlọ ya ka ọ chọta eziokwu, udo, na mgbaghara. Ọ nụrụ ka Onyenwe anyị n’asị: “Josef, nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị niile. Gaa n’ụzọ gị, je ije n’ụkpụrụ m niile, ma dobe iwu-nsọ m niile. Lee, A bụ m Onyenwe anyị ahụ nke Ebube. A kpọgidere m n’obe maka ụwa ka ndị niile kwere n’aha m wee nwee ndụ ebighị ebi.”

Ezi ọchịchọ nke Josef ichegharị na ịchọ nzọpụta nke mkpụrụ obi ya nyere ya aka ịbịakwute Jizọs Kraịst ma nweta mgbaghara nke mmehie ya niile. Mgbalị a na-aga n’ihu meghere ụzọ ahụ maka Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-aga n’ihu.

Nhụmihe nke a dị ịrịba ama nke Onye amụma Josef Smith na-egosi otu mmetụta niile nke adịghị ike na erụghj eru ga-esi nyere anyị aka ịmata ọdịdị anyị dara ada. Ọ bụrụ na anyị nwee obi umeala, nke a ga-enyere anyị aka ịmata na anyị dabere na Jizọs Kraịst ma kpalite n’ime obi anyị niile ezi ọchịchọ ịtụgharị nye Onye Nzọpụta ma chegharịa na mmehie anyị niile.

Ndị enyi m, nchegharị bụ ọńụ! Nchegharị dị ụtọ bụ akụkụ nke usoro a na-eme kwa ụbọchị nke, “ahịrị n’elu ahịrị, ụkpuru n’elu ụkpụrụ,” Onyenwe anyị na-akuziri anyị ibi ndụ gbadoro ụkwụ na nkuzi Ya niile. Dị ka Josef na Nefi, anyị nwere ike “bekuoru [Chineke] maka ebere; n’ihi na ọ bụ dike na-nzọpụta.” O nwere ike imezu ọchịchọ ma ọ bụ agụụ ezi omume ọ bụla ma nwee ike ịgwọ ọnya ọ bụla na ndụ anyị niile.

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst, mụ na gị nwere ike ịchọta ọtụtụ akụkọ gbasara ndị mmadụ ndị mụtara ka ha ga-esi bịakwute Kraịst site na nchegharị n’ezi obi.

Ọ masịrị m ịkọrọ unu ihe ịmaatụ nke obi ebere nke Onyenwe anyị site n’ahụmihe nke mere n’agwaetịtị ebe obibi m nke Puerto Rico.

Ọ bụ n’ime obodo amụrụ m bụ Ponce ka otu nwanne nwanyị n’ime Nzukọ nsọ, Celia Cruz Ayale, kpebiri na ya ga-enye otu enyi ya otu Akwụkwọ nke Mọmọn. O kechiri ya wee gaa ibunye onyinye a, nke dị ya oke ọnụ ahịa karịa diamond ma ọ bụ ruby niile, o kwuru. Ka ọ na-aga, otu onye ohi bịakwutere ya, dọrọ obere akpa ya, ma gbafuo buru onyinye ahụ pụrụ iche dị n’ime ya.

Mgbe ọ kọro akụkụ a na nzukọ nsọ, enyi ya sịrị, “Onye maara? Ikekwa nke a bụ ohere gị ikwusa ozi ọma ahụ!”

Ka osi mee, mgbe ụbọchị ole na ole gachara, unu maara ihe mere? Célia natara akwụkwọ ozi. E ji m akwụkwọ ozi ahụ Célia gosịrị m, n’aka m taa. O kwuru:

“Oriakụ. Cruz:

“Gbaghara m, gbaghara m. Ị gaghị amata mwute dị m n’obi maka ịlụso gị ọgụ. Kama n’ihi ya, ndụ m agbanweela ma ga na agbanwe.

“Akwụkwọ ahụ [Akwụkwọ nke Mọmọn] e nyeworo m aka n’ime ndụ m. Nrọ nke nwoke nke Chineke ahụ emewo ka m maa jijiji. … A na m eweghachi [dollar] ise gị, n’ihi na enweghị m ike imefu ha. A chọrọ m ka ị mata na ọ dị ka e nwere ihe na-egbuke egbuke gbasara gị. Ihè ahụ yiri ka ọ kwụsịrị m [imerụ gị ahụ kama ya mere] m ji gbaa ọsọ.

“A chọrọ m ka ị mata na ị ga-ahụ m ọzọ, mana mgbe ị ga-ahụ m, ị gaghị amata m, n’ihi a ga m abụ nwanne gị nwoke. … Ebe a, ebe m bi, m ga-achọ Onyenwe anyị wee gaa na nzukọ nsọ ị na-aga.

“Ozi i dere n’ime akwụkwọ ahụ mere ka anya mmiri gbaa m. Kemgbe abalị Wenezde enweghị m ike ịkwụsị ịgụ ya. E kpeela m ekpere ma rịọ Chineke ka ọ gbaghara m [ma] A na m arịọkwa gị ka ị gbaghara m. … E chere m na onyinye gị ekechiri ekechi bụ ihe m nwere ike ire. [Kama,] o meela ka m chọọ [ịgbanwe] ndụ m. … Gbaghara , gbaghara m, A rịọ m gị.

“Enyị gị na-anọghị.”

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ihè nke Onye Nzọpụta nwere ike irute anyị niile n’agbanyeghị ọnọdụ anyị niile. “Ọ gaghị ekwe omume na ị ga-agbada ala ruo ebe ihè nke Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst anaghị egbuke,” Onyeisi Jeffrey R. Holland kwuru.

Maka onye nke ebughị n’uche nnatara onyinye nke Célia, Akwụkwọ nke Mọmọn, nwanne nwoke a gara n’ihu ịgba ama karịa nke ebere nke Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na o were nwanne nwoke a oge ịgbaghara onwe ya, o chọtara ọńụ na nchegharị. Gịnị bụ ọrụ ebube a! Otu nwanne nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi, otu Akwụkwọ nke Mọmọn, nchegharị ziri ezi, ma ike nke Onye Nzọpụta dugara nye nrịta nke ngọzi niile nke ozi ọma na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ n’ime ụlọ nke Onyenwe anyị. Ndị otu ezinaụlọ ndị ọzọ soro ma nabata oke na ọrụ niile dị nsọ n’ime ubi vaịn nke Onyenwe anyị, tinyere ozi mgbasa ozi ọma.

Dị ka anyị na-abịakwute Jizọs Kraịst, ụzọ nchegharị anyị nke eziokwu ga-emecha duga anyị na tempụl nsọ nke Onye Nzọpụta.

O lee ụdị ezi ebumnobi ịgbalịsike ịdị ọcha—ịtozu oke maka ịnata n’uju ngọzi niile nke Nna anyị nke Eluigwe na Ọkpara Ya site na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ nke tempụl! Ije ozi oge niile n’ime ụlọ nke Onyenwe anyị na ịgbalị idobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ anyị na-eme n’ebe ahụ ga-abawanye ma ọchịchọ anyị na ike anyị ịhụ mgbanwe nke obi, ike, uche, na mkpụrụ obi dị mkpa ka anyị wee dị ka Onye Nzọpụta anyị karịa. Onyeisi Russel M. Nelson agbawo akaebe: “Ọ dịghị ihe ga-emepe eluigwe niile karịa [ife ofufe n’ime tempụl]. Ọ dịghị ihe!”

Ezigbo ndị enyi m, i chere na ị na-ada mba? Ichere na ịtozughị oke? Ị nwere obi abụọ gbasara onwe gị? Ikekwa ị nwere ike ichegbu onwe gị ma jụọ: E zuru m oke? Oge ọgala maka m? Gịnị mere m ji na-ada mgbe m na-agbalị ike m?

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, n’ezie anyị ga-emehie ihe n’ime ndụ anyị n’ụzọ. Mana biko cheta na, dịka Okenye Gerrit Gong kuziri: “Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị enweghị ngwụcha na ọ dị ebighị ebi. Onye ọbụla n’ime anyị na-akpafu ma daa. Anyị nwere ike, n’oge nta, hapụ ụzọ anyị. Chineke ji ịhụnanya mesie anyị obi ike na n’agbanyeghị ebe anyị nọ ma ọ bụ ihe anyị mere, ọ dịghị ebe nke n’agaghị alọghachi. Ọ na-echee ka ọ makụọ anyị.”

Ezigbo nwunye m, Cari Lu, akuziekwarala m, na anyị niile kwesịrị ichegharị, laghachi azụ, ma tụgharịa oge ka ọ bụrụ “elekere 0” kwa ụbọchị.

Ihe mgbochi niile ga-abịa. Ka anyị ghara ichere ka ihe siere anyị ike tupu anyị atụgharịkwuru Chineke. Ka anyị hara ichere ruo ọgwụgwụ nke ndụ anyị niile iji chegharịa. Kama, ka anyị ugbu a, n’agbanyeghị akụkụ nke ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ anyị nọ, gbado anya na ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst na n’ọchịchọ nke Nna nke Eluigwe ka anyị laghachikwute Ya.

Ụlọ nke Onyenwe anyị, akwụkwọ nsọ Ya dị nsọ, ndị amụma na ndị ozi Ya dị nsọ na-akpaiị anyị ịgbalịsi ike maka ịdị nsọ nke onwe site na ozizi nke Kraịst.

Ma Nefi sịrị: “Ma ugbua, lee, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, nke a bụ ụzọ ahụ; ma ọdịghị ụzọ ọzọ ma-ọbụ aha enyere n’okpuru elu-igwe nke mmadụ ga-esi nwe nzọpụta n’ala-eze nke Chineke. Ma ugbua, lee, nke a bụ ozizi nke Kraịst, ma bụrụkwa naanị ozizi nke ezi-okwu nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mụọ Nsọ.”

Usoro anyị nke “mkpuchi-mmehie-anyị” na Chineke nwere ike na-eche ihe ịmaaka. Mana mụ na gị nwere ike kwụsịtụ, nọrọ jụụ, lekwasị Onye Nzọpụta anya, ma chọọ ka anyị chọta ihe Ọ ga-achọ ka anyị gbanwe. Ọ bụrụ na anyị emee ya n’ebumnobi zuru oke, anyị ga-ahụ ọgwụgwọ Ya. Ma chee echiche ka a ga-esi gọzie ụmụ ụmụ anyị ka anyị na-anabata onyinye nke Onyenwe anyị nke nchegharị!

Nna ukwu Ọkpụite ahụ, nna m kuziri ga-akpụzi ma nụchaa anyị, nke nwere ike sie ike. Ka o sina dị, Nna ukwu Ọgwọ ọrịa ga-asachakwa ma anyị. E nwetawo m ma na-aga n’ihu na-enweta ike ọgwụgwọ ahụ. A na m agba ama na ọ na-abịa site na okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na nchegharị kwa ụbọchị.

Oo, ọ dị ebube na o kwesịrị ilekọta m

Ezuo oke ịnwụchitere m!

A na m agba ama maka ịhụnaanya nke Chineke na ike enweghị ngwụcha nke Aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara Ya. Anyị nwere ike inwe mmetụta nke ukwuu ka anyị ji ezi obi na-echegharị.

Ndị enyi m, A bụ m onye aka ebe nke Mweghachite nke ozi ọma ahụ dị ebube site n’aka Onye amụma Josef Smith na ntụziaka dị ugbu a nke Onye Nzọpụta site n’aka onye amụma Ya, Onyeisi Russell M. Nelson A mara m na Jizọs Kraịst dị ndụ ma na Ọ bụ Nna ukwu Ọgwọ ọrịa nke mkpụrụ obi anyị niile. A ma m ma na-agba ama na ihe ndị a bụ eziokwu, n’aha dị nsọ nke Jisọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “E guzoro m na Ịtụnanya,” Abụ, no. 193.

  2. Alma 26:12.

  3. 2 Nefi 4:17; leekwa amaokwu 18-19.

  4. Joseph Smith—Agụgụala 1:29.

  5. Joseph Smith, “Agụgụala, circa summer 1832,” 3,josephsmithpapers.org; spelling and punctuation standardized.

  6. Lee Mosaịa 4:11–12.

  7. Onye-isi Nelson kuziri: “Mgbe anyị họrọ nchegharị, anyị họọrọ ị gbanwe! Anyị n’ahapụ ka Onye Nzọpụta gbanwee anyị, k’anyị bụrụ mmadụ kachasị nma nke anyị kwesịrị ị bụ. Anyị na-ahọrọ ito-eto nime mmụọ ma nata ọñụ—ọñụ nke mgbapụta enwetara nihi Ya. Mgbe anyị họrọ ị chegharị, anyị họrọ ị dị ka Jizọs Kraịst karịa!” (“Anyị nwere ike ime karịa,” Liahona, Me 2019, 67).

  8. 2 Nifaị 28:30.

  9. Alma 34:18.

  10. “Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, o lee ka Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ si dị oke ọnụ ahịa nye gị? Ọ bụrụ na enye gị diamọnd ma ọ bụ rubi niile ma ọ bụ Akwụkwọ nke Mọmọn, o lee nke ị ga-ahọrọ? N’eziokwu, o lee nke bara gị uru karịa? (Russell M. Nelson, “Akwụkwọ nke Mọmọn: Gịnị Ka Ndụ Gị Ga-adị ka ya Ma Ewezuga Ya?,” Liahona, Nov. 2017, 61).

  11. Na F. Burton Howard, “Missionary Moments: ’Ndụ M Agbanwela,’” Church News, Jan. 6, 1996, thechurchnews.com; lee kwa Ndị-nsọ: Akụkọ ahụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nime Ụbọchi ikpeazụ ndị a, vol. 4,Na-ada ụda na Ntị Ọbụla, 1955–2020 (2024), 472–74, 477–79.

  12. Jeffrey R. Holland, “Ndị ọrụ nọ niime Ubi vaịn, Liahona, Me 2012, 33.

  13. Ka anyị kwụsị otu sekọnd ma chee echiche gbasara ụmụ anyị. N’ihi echiche myopic anyị, anyị enweghị ike ịhụ ya ugbu a, mana njikere anyị ichigharịkwuru Onyenwe anyị na ebumnobi zuru oke nke obi—ịgbanwe, chegharịa, ma makụọ ozi ọma nke Jizọs Kraịst— nwere ike ịmetụta ọgbọ niile! Chee echiche banyere ngọzi ndị ọzọ pụrụ ịpụta site n’ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọ, na okwukwe n’ime Jizọs Kraịst n’okpuru ọbụna ọnọdụ ndị na-adịghị mma!

  14. Nkọwa niile ndị a ka Nwanne nwanyị Celia Cruz kọpụtara na mkparịta ụka nkeonwe ya na Okenye Jorge Alvarado na Septemba 10,2024.

  15. Russell M. Nelson, “Nụrịa ọńụ niime Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” Liahona, Me 2024, 122.

  16. Mgbe anyị hụrụ onwe anyị na-ajụ ajụjụ ndị dị ka ndị a, ọ dị mkpa icheta mkpụrụ okwu niile nke Onye Ozi Pọl:

    “Onye ga-ekewapụ anyị site n’ịhụnaanya nke Kraịst? ọ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oke mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oke ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha? …

    “Mba, niime ihe ndị a nilleanyị karịrị ndị nwe mmeri site na ya nke hụrụ anyị naanya.

    “N’ihi na emewo ka m kwenye, na ọnwụ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ ndi mụọ-ozi, ma ọ bụ ibu-isi dị iche iche, ma ọ bụ ike niile, ma ọ bụ ihe dị ugbua, ma ọ bụ ihe na-abia n’ihu,

    “Ma ọ bụ ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọzọ ekere eke, ga-enwe ike ikewapụ anyị site na ịhụnaanya nke Chineke, nke dị nime Kraịst bụ Jisọs Onye-nwe-anyị” (Ndi Rom 8:35, 38-39).

  17. Gerrit W. Gong, “Our Campfire of Faith,” Liahona, Nov. 2018, 41.

  18. Nefi bu ezigbo ọmụma-atu nye nke a. Ọ kọwara:

    “Teta, mkpụrụ obi m! Akwụsịla ịdaba n’ime mmehie. N̄ụrịa ọn̄ụ, O obi m, ma enyekwala ebe obibi ọzọ maka onye-iro nke mkpụrụ obi m. …

    “O Onyenwe anyị, ị ga-anapụta mkpụrụ obi m? Ị ga-azọpụta m n’aka ndị iro m? Ị ga-eme m ka m ma jijiji na mpụta-ìhè nke mmehie? (2 Nifaị 4:28,-31).

  19. Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Mgbe mmadụ gafeworo usoro [nchegharị] … , Onye Nzọpụta na-eme ihe karịrị ịsachapụ onye ahụ na mmehie. Ọ na-enyekwa ya ume ọhụrụ. Nkwalite ahụ dị anyị mkpa iji mata ebumnobi e ji mee ka a dị ọcha, nke bụ ịlaghachikwuru Nna anyị nke Elu-igwe. Ka e kweta ịnọ n’iru Ya, anyị aghaghị ịdị ọcha karịa. Anyị kwesịkwara ịgbanwe site na onye na-adịghị ike omume nke mehiela ghọọ onye siri ike dị elu nke ime mmụọ ibiri n’iru Chineke” (“Aja mgbaghara mmehie na Okwukwe,” Ensign, Apr. 2010, 33–34).

  20. 2 Nifaị 31:21.

  21. Anyị na-asọpụrụ ezinaụlọ anyị na Nna nke Eluigwe site na ịnakwere nchegharị na ịgbalị ibi ndụ dị mma.

  22. Abụ niileno. 193.