Ọgbakọ Zuru ọha
Niime Oghere nke N’erughị Ọtụtụ Afọ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Niime Oghere nke N’erughị Ọtụtụ Afọ

Ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ntụkwasị obi ma dị nrube isi, anyị nwere ike gbanwee ngọzi nke Chineke nyere nke ime nke ọma baa niime abụmọnụ nke mpako nke na-atụgharị uche ma na-adọpụ uche anyị.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na nwanyị, ịnọdụ nelu ebe a taa, elekiriwo m Ogige Ọgbakọ nke a juputa n’ọnụ ugboro atọ, oge mbụ kemgbe COVID. Unu bụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst raara onwe nye ndị dị ọ na-anụ ọkụ n’obi ịmụ ihe. Ana m ekele gị maka ikwesị ntụkwasị gị. Ma a hụrụ m gị naanya.

Ezra Taft Benson jere ozi dị ka Onyeisi Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a site na Nọvemba 1985 tutu ruo Me 1994. A gbara m afọ 33 mgbe Onyeisi Benson bụrụzịrị Onyeisi nke Nzukọ nsọ ma gbaa 42 mgbe ọ nwụrụ. Ma nkuzi na ama ya niile metụtara m n’ụzọ ndị mịrị emi na ndị dị ike.

Otu niime akara ngosi nke ije ozi Onyeisi Benson bụ nlekwasị anya ya n’elu ebumnuche na ịdị mkpa nke Akwụkwọ nke Mọmọn. O kwusiri ike ugboro ugboro na “Akwụkwọ nke Mọmọn bụ isi nkume nke okpukperechi anyị—isi nkume nke ama anyị, isi nkume nke ozizi anyị, na isi nkume na akaebe nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị.” O kwusikwara ike ugboro ugboro nkuzi niile na ịdọ aka na ntị niile gbasara mmehie nke mpako a hụrụ niime ama ụbọchị ikpeazụ nke Jizọs Kraịst.

Otu nkuzi kpọmkwem sitere n’aka Onyeisi Benson metụtara m nke ukwuu ma na-aganiihu imetụta ọmụmụ ihe m nke Akwụkwọ nke Mọmọn. O kwuru:

“Akwụkwọ nke Mọmọn … ka edere maka ụbọchị anyị. Ndị Nifaị adịghị mgbe ha nwere akwụkwọ ahụ; ọbụghị ma ndị Laman nke mgbe ochie. Ọ bụ maka anyị. Mọmọn dere n’oge njedebe mmepeanya ndị Nifaị. N’okpuru mkpate mmụọ nke Chineke, onye na-ahụ ihe niile site na mmalite, [Mọmọn] dere na nkenke ndekọihe niile nke narị afọ niile, na-ahọrọ akụkọ niile, ekwumekwu niile, na ihe omume niile nke ga-akacha enyere anyị aka.”

Onyeisi Benson garaniihu: “Isi odee nke ọbụla nke Akwụkwọ nke Mọmọn gbara ama na o dere maka ndudugandu ndị dịniihu. … Ọ bụrụ na ha hụrụ ụbọchị anyị, ma họrọ ihe ndị ahụ ndị ga-akacha abara anyị uru, ọ bụ na nke ahụ abụghị otu anyị kwesịrị i si amụ Akwụkwọ nke Mọmọn? Anyị kwesịrị ịdị na ajụ onwe anyị ajụjụ mgbe niile, ‘Gịnị kpatara Onyenwe anyị jiri kpatee mmụọ Mọmọn … ịgụnye [nkọwapụta nke a] niime ndekọihe ya? Kedụ mmụta m pụrụ ịmụ site na [ịdọ aka na ntị nke a] iji nyere m aka bie ndụ nụbọchị na afọ nke a?’”

Okwu niile nke Onyeisi Benson na-enyere anyị aka ghọta na Akwụkwọ nke Mọmọn abụghị niihi ndekọihe agụgụala nke na-akọ maka mgbe gara aga. Kama, ukwu akwụkwọ nsọ nke a na-akọ maka ọdịniihu ma nwere niime ya ụkpụrụ niile, ịdọ aka na ntị niile, na ihe ọmụmụ niile dị mkpa e bu nuuche maka ọnọdụ niile na aka mgba niile nke ụbọchị anyị. Niihi ya, Akwụkwọ nke Mọmọn bụ akwụkwọ gbasara ọdịniihu anyị na oge niile nke anyị na-ebi ugbua ma ka ga-ebi.

Ana m ekpe ekpere maka enyemaka nke Mmụọ Nsọ dị ka anyị na-atụle ihe mmụta niile dị mkpa maka anyị taa site na akwụkwọ nke Helaman dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn.

Ndị Nifaị na ndị Laman

Ndekọihe nke Helaman na ụmụ ya ndị nwoke na-akọwa ndị mmadụ ndị naara atụanya ọmụmụ nke Jizọs Kraịst. Ọkara narị afọ akọrọ niime ndekọihe nke akwụkwọ nsọ na-ekwuputa mgbanwe na ịdị ezi omume nke ndị Laman na ịdị ajọọ omume, ngọnarị okwukwe, na ihe arụ niile nke ndị Nifaị.

Nsoro nsoro nke ntụnyere niile na ndịiche niile dị n’etiti ndị Nifaị na ndị Laman sitere na ndekọihe mgbe ochie nke a kacha enye ndụmọdụ maka anyị taa.

“Ndị Laman abụrụworịị, ndị kacha niime ha, ndị ezi omume, nke mere na ndị ezi omume ha bịara gafee nke ndị Nifaị, niihi nkwusi ike ha na nnọgidesike ha niime okwukwe.

“[Ma] e nwere ọtụtụ ndị nke Nifaị ndị bịara nwee obi ha ike na enweghị nchegharị na ajọọ omume karịrị akarị, nke mere na ha jụrụ okwu nke Chineke na nkwusa ozi ọma niile na ibu amụma nke bịara nʼetiti ha.”

“Ma site otu a anyị hụrụ na ndị Nifaị malitere ịla azụ nʼekweghị ekwe, ma na-eto nʼajọọ omume na ihe arụ niile, ebe ndị Laman malitere ito eto nke ukwuu nʼọmụma nke Chineke ha; ee, ha malitere idebe usoro iwu niile na iwu nsọ ya niile, na ịga ije nʼezi okwu na nguzozi nʼihu ya.

“Ma site otu a anyị hụrụ na Mmụọ nke Onyenwe anyị malitere isepụ aka site nʼahụ ndị Nifaị, niihi ajọọ omume ahụ na mkpọchi nke obi ha.

“Ma site otu a anyị hụrụ na Onyenwe anyị malitere ịwụpụta Mmụọ ya n’isi ndị Laman, niihi obi umeala na ịdị njikere ha ikwere okwu ya niile.”

Elemanya akụkụ kachasị maa mma ma kachasị atụnuche nke mkpọda nke a baa niime ngọnarị okwukwe site n’aka Ndị Nifaị bụ isiokwu na “ajọọ omume niile ndị a bịara ha n’oghere nke na-abụghị ọtụtụ afọ.”

Ndị Nifaị Tụgharịrị Pụọ site na Chineke

Kedụ otu ndị mmadụ bụbụụrụ ndị ezi omume si bịa bụrụ ndị kpọchiri obi na ndị ajọọ omume n’ụdị nwa oge dị otu a? Kedụ otu ndị mmadụ si ngwa ngwa echefu Chineke ahụ onye gọziworo ha nke ukwuu?

N’ụzọ dị ike na nke dị ịtụnaanya, ọmụmaatụ ọjọọ nke ndị Nifaị na-akuziri anyị ihe taa.

“Mpako … malitere ịbanye … niime obi nke ndị mmadụ ndị kwuputara isonye na nzukọ nsọ nke Chineke … niihi oke nnukwu akụ na ụba ha na ime nke ọma ha nala ahụ.”

[Ha] tụkwasịrị obi [ha] n’elu akụ na ụba na ihe efu niile nke ụwa nke a” “niihi mpako ahụ nke [ha] … kwere ịbanye [niime] obi [ha], nke … buliri [ha] elu gafee nke ahụ dị mma niihi oke nnukwu akụ na ụba [ha]!”

Olu mgbe ochie ndị sitere na ụzụzụ na-arịọ anyị taa ịmụ ihe mmụta nke a dị ebighị ebi: ime nke ọma, nnwere ihe niile, na ịdị mfe mejuputara ngwakọta dị mma nke pụrụ idu ọbụna ndị ezi omume ịńụ nsi ime mmụọ nke mpako.

Ịna ekwe mpako ịbanye niime obi anyị nwere ike mee anyị ịkwa ihe nke ahụ dị nsọ emu, ghara ikwere niime mmụọ nke ibu amụma na mkpughe, zọọ n’okpuru ụkwụ anyị iwu nsọ niile nke Chineke, gọnarịa okwu Chineke, kwapụ, kwaa emu, ma katọọ ndị amụma, ma chefuo Onyenwe anyị Chineke anyị, ma “achọghị ka Onyenwe anyị Chineke [anyị], onye keworo [anyị], chịa ma chịa dị ka eze n’isi [anyị].”

Ya mere, ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ntụkwasị obi ma dị nrube isi, anyị nwere ike gbanwee ngọzi nke Chineke nyere nke ime nke ọma baa niime abụmọnụ nke mpako nke na-atụgharị uche ma na-adọpụ uche anyị site neziokwu ebighị ebi niile na ihe ime mmụọ ndị kacha dị mkpa. Anyị ga-anọrịrị na nche mgbe niile megide mmụọ nke ịdị mkpa onwe mpako kpaliri na nke gafere oke, ntule na-ezighị ezi maka ozuzu nke onwe, na ịchọ maka onwe kama ijere ndị ọzọ ozi.

Dị ka anyị jiri mpako na-elekwasị anya n’isi onwe anyị, anyị nwakwa ka ikpu isi nke ime mmụọ na-akpagbu ma ghara inwete karịa, kachasị, ma ọ bụ elemanya ihe niile nke na-eme etiti na gburugburu anyị. Anyị enweghị ike ele anya ma lekwasị anya na Jizọs Kraịst dị ka “oke” ahụ ọ bụrụ ma anyị na-ahụ onwe anyị naanị.

Ụdị ikpu isi ime mmụọ nke a nakwa akpata anyị ịtụgharị pụọ n’ụzọ nke ezi omume, dapụ dabanye n’ụzọ niile amachibidoro, ma ghọọ ndị furu efu. Dị ka anyị “na-abanye n’ụzọ nke onwe anyị” na-echeghị echiche ma soro njem ndị na-ebibi ihe, anyị nwere mmasị ịdabere na nghọta nke onwe anyị, tuo ọnụ n’ike nke onwe anyị, ma dabere na amamiihe nke onwe anyị.

Samuel Onye Laman chịkọtara na nkenke ntụgharị pụọ nke Ndị Nifaị site n’ebe Chineke: “Unu achọwo ụbọchị ndụ unu niile maka ihe ahụ nke unu enweghị ike enwete; ma unu achọwo maka obi ụtọ na-ime ajọọ omume, ihe nke megidere odidi nke ezi omume ahụ nke dị niime Isi Ebighị ebi anyị dị ukwuu.”

Onye amụma Mọmọm matara, “Ndị kacha niime ndị ahụ [nọgidere] na mpako na ajọọ omume ha, ma ndị kacha dị nta niime ha [jere ije] mkpachapụ anya karịa niihu Chineke.”

Ndị Laman Tụgharịrị nye Chineke

Niime Akwụkwọ nke Helaman, ezi omume nke ndị Laman na-abawanye abawanye na-ewete ndịiche ahụrụ anya nye nnukwu mkpọda ime mmụọ nke ndị Nifaị.

Ndị Laman tụgharịrị nye Chineke ma akpọtara ha na mmata ihe nke eziokwu site na-ikwere nkuzi niile dị niime akwụkwọ nsọ niile dị nsọ na nke ndị amụma, na-enwe okwukwe niime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-echegharị site na mmehie ha, ma na-enwete nhụmiihe nnukwu mgbanwe nke obi.

“Ya mere, ka ha ra bụ ndị bịaworo ruo na nke a, unu matara nʼonwe unu na ha kwụsịrị ike ma guzogidesie ike nʼokwukwe ahụ, na niime ihe ahụ e jiworo mee ka ha nwere onwe ha.”

“Unu ga-ahụ na ndị karịrị niime [ndị Laman] nọ nʼụzọ nke ọrụ ha, ma ha na-aga na ihi aka nʼanya nʼihu Chineke, ma ha na-eleru anya nʼidebe iwu nsọ ya niile na usoro iwu ya na ikpe ikpe ya niile. …

“… Ha na-agba mbọ na nrụsi ọrụ ike nke ukwuu na ha ga-akpọta ndị fọdụrụ nke ụmụnne ha ruo na mmata ihe nke eziokwu.”

Dị ka ihe nsonazụ, “ndị ezi omume [nke ndị Laman] gafere nke Ndị Nifaị, niihi nkwudesi ike ha na nnọgidesi ike ha nokwukwe.”

Ịdọ aka na ntị na Nkwa

Moronaị mara ọkwa: “Lee, Onyenwe anyị egosiwo m nnukwu na ihe ịtụnaanya niile gbasara ihe nke ga-abịarịrị na nso nso, nʼụbọchị ahụ mgbe ihe ndị a ga-apụta nʼetiti unu.

“Lee, ana m agwa unu dị ka a ga-asị na unu nọ nʼebe a, ma unu anọghị ya. Mana lee, Jizọs Kraịst egosiwo m unu, ma a matara m ihe unu na-eme.”

Biko cheta na Akwụkwọ nke Mọmọn na-akọ maka ọdịniihu ma nwere niime ya ụkpụrụ niile, ịdọ aka na ntị niile, na ihe ọmụmụ niile dị mkpa e bu nuuche maka mụ na gị n’ọnọdụ niile na aka mgba niile nke ụbọchị anyị taa.

Ngọnarị okwukwe nwere ike mee n’ọkwa abụọ bụ isi—nke nhazi n’igwè ma ọ bụ nke otu onye. N’ọkwa nke nhazi n’igwè, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a agaghị efu site na ngọnarị okwukwe ma ọ bụ ewepụ site n’ụwa.

Onye amụma Joseph Smith mara ọkwa: “Ọkọlọtọ nke Eziokwu ka ewuliteworo; enweghi aka rụrụ arụ ga-akwụsị ọrụ nke a iga niihu … ; eziokwu ahụ nke Chineke ga-aganiihu atụghị ụjọọ, jidesie ezi ụkpụrụ ya aka, ma nọrọ n’onwe ya tutu ruo mgbe ọ rikpụru mpaghara mba niile, gaa leta clime niile, zachaa obodo niile, daa na ntị niile ruo mgbe ebumnuche niile nke Chineke mezuworo ma Nnukwu Jehova ahụ ekwuo na emezuwo ọrụ ahụ.”

N’ọkwa nke otu onye, onye ọbụla niime anyị ahaghị “ịkpachara anya maka mpako, n’ụjọ [anyị] aghọọ dị ka Ndị Nifaị mgbe ochie.”

Ka m tụpụta na ọ bụrụ na gị ma ọ bụ mụ onwe m kwere na anyị siri ike nke ọma kwesị ntụkwasị obi izere agwa ọjọọ nke mpako, mgbe ahụ ikekwe anyị amalitewo ịta ahụhụ site na ọrịa ime mmụọ ọjọọ nke a. Ikwu ya nke ọma, ọ bụrụ na gị ma ọ bụ mụ onwe m ekwereghị na mpako nwere ike ịkpagbu anyị, mgbe ahụ anyị enweghị nchekwa ma anyị nọ na ize ndụ ime mmụọ. N’oghere nke na-abụghị ọtụtụ ụbọchị, izu ụka, ọnwa, ma ọ bụ afọ, anyị nwere ike chefuo oke ime mmụọ ruuru anyị maka ihe dị nta karịa ngwọngwọ nke agwọragwọ nrị.

Ọ bụrụ na, kosiladị, gị ma ọ bụ mụ onwe m ekwere na-enwere ike kpagbuo anyị jiri ma site na mpako, mgbe ahụ anyị ga-anọgide na-eme ihe ndị dị nta ma dị mfe nke ga-echekwa ma nyere anyị aka bụrụzie “dị ka nwa ntakịrị, na-arapara, dịrị nwayọ, dị umeala, juputa n’ịhụnaanya, dịrị njikere ịnabata ihe niile nke Onyenwe anyị hụrụ dabara adaba ịtụkwasị [anyị] n’isi.” “Ngọzi na-adịrị ha ndị dị umeala n’obi na-abụghị na amagidere ha ịdị umeala n’obi.”

Dị ka anyị na esoro ndụmọdụ nke Onyeisi Benson ma jụọ onwe anyị ihe kpatara Onyenwe anyị si kpatee mmụọ nke Mọmọn ịgụnye niime nkenke odide ya nke akwụkwọ nke Helaman nkọwapụta niile, ndụmọdụ niile, na ịdọ aka na ntị niile nke o dere, ana m ekwe nkwa na anyị ga-amata ntinye n’ọrụ nke nkuzi ndị a niile nye ọnọdụ kpọmkwem niile nke ndụ anyị na ezi na ụlọ niile taa. Dị ka anyị na-amụ ihe ma na-atule ndekọihe nke a na-akpate mmụọ, a ga-agọzi anyị jiri anya eji ahụ ụzọ, ntị eji anụ ihe, uche eji aghọta ihe, na obi eji aghọta ihe ọmụmụ niile anyị kwesịrị ịmụ iji “kpachara anya maka mpako, n’ụjọ [anyị ama] abanye niime ọnwụnwa.”

A na m agba akaebe n’obi ụtọ na Chineke Nna nke Ebighị ebi bụ Nna anyị. Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Ya A Mụrụ Naanị na Onye A Hụrụ Naanya. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị. Ma ana m agba ama na dị ka anyị na-eje ije na-ịdị nwayọ nke Mmụọ nke Onyenwe anyị, anyị ga-ezere ma merie mpako ma nwee udo na Ya. E si m otu a agba akaebe n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.