Ọgbakọ Zuru ọha
Ọńụ nke Mgbapụta Anyị
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Ọńụ nke Mgbapụta Anyị

Ịhụnaanya na ike nke Jizọs Kraịst pụrụ ịzọpụta onye ọbụla niime anyị site na njehie anyị niile, adịghị ike niile, na mmehie ma nyere anyị aka ịbụrụ ihe karịa.

Ihe dị ka afọ 10 gara aga ọ metụtara m ite agba ihe osise nke Onye Nzọpụta. Na-agbanyeghị na-abụ m omenka, nke a dịịrị ka o juru m anya. Olee otu m ga-esi ete agba ihe osise nke Jizọs Kraịst ga-adọta Mmụọ. Olee ebe m ga-esi ebido? Ma olee ebe m ga-achọta oge nke ahụ?

Ọbụna site n’ajụjụ m niile, e kpebiri m ịganiihu ma tụkwasị obi na Onyenwe anyị ga-enyere m aka. Mana ahaghị m ịnọ na-aganiihu ma hapụ ihe ndị nwere ike ime n’aka Ya. E kpere m ekpere, tụgharịa uche, chọgharịa, ma kịkaa, ma ngọzi dịịrị m ịchọta enyemaka niile na akụrụngwa niile. Ma ihe bụ kanvas ọcha malitere ịghọ ihe ọzọ karịa.

Ite agba nke Onye Nzọpụta na-aganiihu.

Usoro ahụ adịrịghị mfe. Mgbe ụfọdụ o yighị dị ka m tụrụ anya. Mgbe ụfọdụ enwere oge nke nkanye na echiche mmụọ kpatere. Ma ọtụtụ mgbe, ihe m nwere bụ ịnwa ọzọ na ọzọ na ọzọ.

Mgbe m chere na agba mmanụ mmanụ ahụ ezuwo ma gbakọwo, a malitere m itinye vanish iji chekwaa ya site na unyi na uzuzu. Dị ka m mere, a hụtara m na agịrị isi dị na agba ahụ malitere ịgbanwe, ịnya anya, na ịgbaze. A matara ngwa ngwa na m etewo vanish ahụ mgbe na-adịghị anya, akụkụ ihe osise ahụ ka dị mmiri mmiri!

E jiriwo m vanish hichapụ n’ezie akụkụ ihe osise m ahụ. O, otu obi si mafuo m. Ọ dịịrị m nnọọ ka m mebiri ihe Chineke nyewooro m aka mee. E bere m akwa ma daa ọrịa niime. Na obi nkoropụ, e mere m ihe onye ọbụla gaara eme nọnọdụ dị ka nke a: a kpọrọ m nne m. Jiri amamiihe na obi nwayọọ o kwuru, “Ị gaghị enwetaghachi ihe i nweburu, mana mee ihe nke i nwere ike ime jiri ihe nke i nwere.”

Eserese agba nke Onye Nzọpụta zuru ezu.

Ma e riri m, site n’aka Kristin M. Yee

Ya mere e kpere m ekpere ma rịọ maka enyemaka ma see ihe osise site na-abalị ahụ imezi ihe niile. Ma echetere m ile ihe osise ahụ anya n’ụtụtụ—ọ dịrị mma karịa otu ọ dị mbụ. Olee otu nke ahụ si mee? Ihe m chere bụ njehie na-enweghị mmetazi bụ ohere maka aka ebere ịpụta ihe. O mesibeghị nihe osise ahụ, ma O mesibeghị ihe o ji m eme. Ụdị ọńụ na enyemaka juputara niime obi. E toro m Onyenwe anyị maka ebere Ya, niihi ọrụ ebube nke a nke na-abụghị naanị na ọ zọpụtara ihe osise ahụ mana ọ kuzitụbọọrọ m banyere ịhụnaanya na ike Ya iji zọpụta onye ọbụla niime anyị site na njehie, adịghị ike, na mmehie anyị niile na iji nyere anyị aka bụrụzie ihe katụ mma.

Dị nnọọ ka omimi obi ekele m maka Onye Nzọpụta si tolite dị ka n’obi ebere O siri nyeere m aka imezi ihe osise “na-enweghị mmezi”, otu ahụ ka ịhụnaanya na obi ekele nke onwe m maka Onye Nzọpụta m meliteworo dị ka m chọworo ịrụrụ Ya ọrụ n’elu adịghị ike m niile na inwete mgbaghara nke njehie m niile. Obi m ga na-eju n’ekele mgbe niile nye Onye Nzọpụta na m pụrụ ịgbanwe ma asachaa m. O ji obi m, ma e nwere m olile anya ime ihe ọbụla Ọ ga-achọ ka m mee ma bụrụ.

Ichegharị na-ekwe anyị inwete ịhụnaanya nke Chineke na ịmara na ịhụ Ya naanya n’ụzọ ndị anyị na-enweghị ike ịmata ma ọ bụghị ya. Maka nwanyị ahụ onye tere ikere ụkwụ nke Onye Nzọpụta mmanụ, “Mmehie ya niile, nke dị ọtụtụ, ka agbaghaara ya; niihi na ọ nwere nnukwu ịhụnaanya: mana nye ya onye agbaghaara obere, onye ahụkwa na-enwe obere ịhụnaanya.” Ọ hụrụ Jizọs naanya nke ukwuu, niihi na Ọ gbaghaworo ya nke ukwuu.

E nwere nnukwu enyemaka na olile anya n’ịmara na anyị pụrụ ịnwa ọzọ—nke ahụ bụ dị ka Okenye David A. Bednar kuziri, anyị pụrụ ịnata mgbaghara mmehie na-aganiihu nke mmehie anyị niile site n’ike nke Mmụọ Nsọ n’edo nsọ dị ka anyị na-atụgharị obi anyị nye Ya ma chegharịa n’eziokwu.

Ike mgbapụta nke Jizọs Kraịst bụ otu niime ngọzi ekwere na nkwa kachasị nke ọgbụgba ndụ anyị niile. Tulee nke a dị ka ị na-esonye n’emume nsọ niile dị nsọ. Ewezuga ya, anyị enweghị ike ịlaghachi ebe obibi niihu nke Nna bi N’eluigwe na ndị anyị hụrụ naanya.

Ama m na Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, dị ike ịzọpụta. Dị ka Ọkpara nke Chineke, onye chụrụ aja mgbaghara mmehie maka mmehie niile nke ụwa ma tọgbọ ndụ nke onwe Ya ala ma welitekwa ya ọzọ, O ji ike nke mgbapụta na mbilite n’ọnwụ. O mewo anwụghị anwụ ekwe omume nye ndị niile na ndụ ebighị ebi maka ndị ahụ họọrọ Ya. Ama m na site na aja mgbaghara mmehie Ya, anyị pụrụ ichegharị ma asachaa anyị n’ezie ma agbapụta anyị. Ọ bụ ọrụ ebube na Ọ hụrụ mụ na gị naanya n’ụzọ dị otu a.

O kwuwo, “Ọ bụ na unu agaghị alaghachikwute m ugbu a, ma chegharịa na mmehie unu, ma gbanwee, ka m nwee ike gwọọ unu?” Ọ pụrụ ịgwọ “mkpọ mkpọ ebe niile” nke mkpụrụ obi unu—ebe ndị e mere ka ọ taa mmiri, sie ike, ma tọgbọrọ n’efu site na mmehie na mwute—ma “mee alaịkpa [unu] dị ka Iden.”

Dị nnọ ka anyị enweghị ike ịghọta ihe mgbu na ogbu ntaram ahụhụ nke Kraịst niime Getsemani ma n’elu obe, otu ahụ anyị “enweghị ike ịtụ agbụ niile ọ bụghị ma ịghọta ogbu nke mgbaghara [Ya] dị nsọ,” ebere, na ịhụnaanya.

I nwere ike mgbe ụfọdụ na-eche na o kweghị omume inwete mgbapụta, na eleghị anya i soghị n’ịhụnaanya nke Chineke na ike aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta niihi ihe nke ị na-agba mbọ na ya ma ọ bụ niihi ihe i meworo. Mana ana m agba ama na ị gafeghị ebe aka Nna ukwu ga-erute. Onye Nzọpụta “gbadara n’okpuru ihe niile” ma nọ n’ọnọdụ dị nsọ ibuli gị elu ma kpọrọ gị site na ndagwurunyụm kachasị gbaa ọchịchịrị ma kpọbata gị niime “ìhè ya dị ịtụnaanya.” Site na ntaram ahụhụ Ya niile, O mewo ụzọ maka onye ọbụla niime anyị imeri adịghị ike niile na mmehie niile nke onwe anyị. “O nwere ike niile iji zọpụta mmadụ niile nke kwere n’aha ya ma na-amịpụta mkpụrụ ruru nchegharị.”

Dị nnọọ ka ọ chọrọ ịrụ ọrụ na ịrịọ maka enyemaka nke eluigwe imezi ihe osise ahụ etere agba, ọ na-ewe ọrụ, izi ezi nke obi, ịdị umeala n’obi iji “mịpụta mkpụrụ nke ruru nchegharị.” Mkpụrụ ndị a gụnyere inwe okwukwe na ịtụkwasị obi niime Jizọs Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya, na-enye Chineke obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị, na-ekwuputa ma na-ahapụ mmehie, na-eweghachite nke ahụ emebiri ruo ike anyị kachasị mma, na ịnọ na-agbalị ibi ndụ ezi omume.

Ichegharị nezie ma gbanwee, anyị ahaghị ibu ụzọ “nwete nkwenye siri ike nke mmehie anyị.” Mmadụ anaghị amata mkpa ịńụ ọgwụ ọbụghị ma ha ghọtara na ha na-arịa ọrịa. E nwere ike inwe oge ndị anyị adịghị njikere ịleba anya niime onwe anyị ma hụ nke ahụ dị mkpa n’eziokwu maka ọgwụgwọ na mmezi.

Niime edide niile nke C. S. Lewis, Aslan kwuru okwu ndị a nye otu nwoke onye nke hịkọrọ onwe ya na ngwa nke onwe ya: “O [ụmụ mmadụ], otu unu si eji ọgụgụ isi agbachitere onwe unu [site n’ihe] niile nwere ike ime unu mma.”

Olee ebe mụ na gị nwere ike ịgbachitere onwe anyị site n’ihe ndị ahụ nwere ike ime anyị mma?

Ka anyị ghara ịgbachitere onwe anyị site n’ihe ahụ nke Chineke chọrọ iji gọzie anyị. Site n’ịhụnaanya na ebere nke Ọ chọrọ ka anyị nwete mmetụta. Site n’ọgwụgwọ nke Ọ maara na anyị nwere mkpa ya n’ezie. Site na mmekọrịta ọgbụgba ndụ miri emi karịa O bu n’obi maka ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị.

Ana m ekpe ekpere ka anyị tọgbọ “ngwa ọgụ agha niile” nke anyị kpachapụrụ anya ma ọ bụna nke anyị akpachapụghị anya welie iji gbachitere onwe anyị site na ngọzi niile nke ịhụnaanya nke Chineke. Ngwa agha niile nke mpako, ịchọ ọdịmma onwe onye, ịtụ egwu, mkpọrọm asị, mmejọ, afọ ojuju, ikpe ikpe n’ezighị ezi, ekworo niile—ihe ọbụla nke ga-edebe anyị site n’ịhụ Chineke naanya jiri obi anyị niile na idebe ọgbụgba ndụ anyị na Ya niile.

Dị ka anyị na-edebe ọgbụgba ndụ anyị niile, Onyenwe anyị pụrụ inye anyị enyemaka anyị chọrọ ma iji mata ma iji gabiga adịghị ike anyị niile, gụnyere parasite ime mmụọ nke mpako. Onye amụma anyị ekwuwo:

“Nchegharị bụ ụzọ ahụ eji enweta idị ọcha, ma ịdị ọcha na-enweta ike”

“Ma o, otu anyị ga-esi achọ ike Ya niime ụbọchị ndị dị niihu.”

Dị ka ihe osise m, Onyenwe anyị emesibeghị ihe o ji anyị eme mgbe anyị jehiere, ọ bụghị ma Ọ na-agbafu mgbe anyị dara mba. Mkpa anyị nwere maka ọgwụgwọ na enyemaka abụghị ibu arọ nye Ya, mana ebumnuuche kpọmkwem mere O ji wee bịa. Onye Nzọpụta n’Onwe Ya kwuru:

“Lee, abịawo m n’ụwa iwetara ndị ụwa mgbapụta, ịzọpụta ndị ụwa site na mmehie.”

“Ogweaka nke ebere m ka e setịpụrụ niihu unu, ma onye ọbụla ọ bụ ga-abịa, ya ka m ga-anabata; ma ngọzi na-adịrị ndị na abịakwute m.”

Ya mere bịa—bịanụ unu ndị ike gwụrụ, dara mba, nwere mwute; bịanụ ma hapụ ọrụ unu niile ma chọta ezumiike niime Ya onye hụrụ gị naanya karịsịa. Wekwasị onwe gị yok Ya, niihi na Ọ dị nwayọọ ma dịrị umeala n’obi.

Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta na-ahụ gị. Ha maara obi gị. Ihe na-amasị gị na-amasị Ha, gụnyere ndị ahụ ị hụrụ naanya.

Onye Nzọpụta pụrụ ịgbapụta nke ahụ furu efu, gụnyere mmekọrịta tiwara ma gbajie. O mewo ụzọ iji gbapụta ndị niile dara ada—ime ka nke ahụ yiri ihe nwụrụ anwụ na ihe na-enweghị olile anya kute ume nke ndụ.

Ọ bụrụ na gị na-agba lịka lịka n’ọnọdụ nke i kwesiworo imerị tupu ugbu a, adakwala mba. Nweere onwe gị ndidi, debe ọgbụgba ndụ gị niile, chegharịa mgbe niile, chọọ enyemaka nke ndị ndu ma ọ dị mkpa, ma gaa n’ụlọ nke Onyenwe anyị mgbe niile i nwere ike. Gee ntị maka ma ńaa ntị na mkpọtụ niile Ọ na-ezitere gị. Ọ gaghị ahapụ mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Ya.

E nweworịị mmekọrịta ndị rara ahụ ma dị mgbagwoju anya niime ndụ m nke m gbara mgba ma chọsie ike n’ezie imetazi. Mgbe ụfọdụ ọ dịịrị ka m na-ada karịa ka m na-adịghị. E chere, “Ọ bụ na m emezighị ihe niile oge gara aga? Ọ bụ na m emerighị adịghị ike m n’ezie?” Amụtawo m ka oge gara na m enweghịcha ntụpọ; kama, ana enwekarị ọrụ ndị ọzọ na ọgwụgwọ ndị ọzọ ndị a chọrọ.

Okenye D. Todd Christofferson kuziri: “N’ezie Onyenwe anyị na-enwe obi ụtọ nye onye ọbụla chọsịrị ike ịbịa n’ikpe ikpe na ntozu oke, onye kpebiri ịrụ ọrụ kwa ụbọchị idoghachi adịghị ike jiri ume. Ezi nchegharị, ezi mgbanwe nwere ike na-achọ mbọ ndị agbara ugboro ugboro, mana e nwere ihe na-ańụcha ma dị nsọ niime ụdị mgbalị ahụ. Mgbaghara na ọgwụgwọ sinachi na-abịa na nkịtị nye ụdị mkpụrụ obi ahụ.”

Ụbọchị ọbụla bụ ụbọchị ọhụrụ juputara nolile anya na ikwe omume niile niihi Jizọs Kraịst. Ụbọchị ọbụla mụ na gị na-abịa mata, dị ka Nne Eve mara ọkwa, “ọńụ nke mgbapụta anyị,” ọńụ nke ime ezuo oke, ọńụ nke inwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke na-adịghị ada ada maka gị.

Ama m na Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta hụrụ gị naanya. Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nye ụmụ mmadụ niile. Ọ dị ndụ. Site n’aja mgbaghara mmehie Ya, agbụ niile nke mmehie na ọnwụ ka etiwara ruo ebighị ebi ka anyị wee nwee ike nwere onwe ịhọrọ ọgwụgwọ, mgbapụta, na ndụ ebighị ebi anyị na ndị anyị hụrụ naanya. Ma ana m agba ama ihe ndị a n’aha Ya, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Lee Matiu 19:26.

  2. “Ozugbo anyị na Chineke mere ọgbụgba ndụ, anyị na-ahapụ ọnọdụ nkiti ruo mgbe ebighị ebi. Chineke agaghị ajụ mmekọrịta Ya na ndị ahụ meworo ụdị njikọta ahụ ha na Ya. N’ezie, ndị ahụ niile ha na Chineke meworo ọgbụgba ndc nwere ohere inwete ụdị ịhụnaanya na ebere pụrụ iche. Niime asụsụ ndị Hibru, na ịhụnaanya ọgbụgba ndụ ka akpọrọ hesed (חֶסֶד)” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 5).

  3. “Mgbe mụ na gị banyekwara n’ụzọ ahụ, anyị nwere ụzọ ndụ ọhụrụ. Site otu ahụ anyị na-ekewapụta mmekọrịta anyị na Chineke nke na-enye Ya ohere ịgọzi ma gbanwee anyị. Ụzọ ọgbụgba ndụ na-edughachi anyị ruo na Ya. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Chineke merie na ndụ anyị, ọgbụgba ndụ ahụ ga-edu anyị ruo nso nso na Ya. Ọgbụgba ndụ niile ka echekubere ịdị na-ejikọta. Ha na-emepụta mmekọrịta a dị na mma nwere njikọ ebighị ebi” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 5).

  4. Lee Alma 26:35–36.

  5. Lee Alma 22:18: “Aga m ahapụ njọ m niile iji mara gị.”

  6. Luk 7:47; leekwa amaokwu 37–50.

  7. Ị na-ekwu maka oriri nsọ, Okenye David A. Bednar kwuru:

    “Dị ka anyị ji mkpachapụ anya na-akwado ma na-esonye niime emume nsọ nke a dị nsọ jiri obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị, mgbe ahụ nkwa ahụ bụ ka na-enwe Mmụọ nke Onyenwe anyị mgbe niile ịnọnyere anyị. Ma site n’ike ido nsọ nke Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso anyị mgbe niile, anyị nwere ike debe mgbe niile mgbaghara nke mmehie anyị” (“Na-edebe Mgbe niile Mgbaghara nke Mmehie Unu,” Liahona, Me 2016, 61–62).

    “N’usoro nke ịbịakwute Onye Nzọpụta na mmụgharị ime mmụọ, ịnata ike ido nsọ nke Mmụọ Nsọ niime ndụ anyị na-arọpụta ịdị ire nke nsacha na-aganiihu nke mkpụrụ obi anyị site na mmehie. Ngọzi obi ụtọ dị ezigbo mkpa niihi na ‘ọ dịghị ihe ọbụla rere unyi pụrụ ịnọgide Chineke’ [1 Nifaị 10:21]” (“Na-edebe Mgbe niile Mgbaghara nke Mmehie Gị,” 61).

    Okenye Bednar, kuziri ihe na semina ndị ndu mishọn 2023: “Ma site n’ike ido nsọ nke Mmụọ Nsọ dị ka onye nsiso anyị mgbe niile, anyị nwere ike debe mgbe niile mgbaghara nke mmehie anyị. Site otu a, ozi ọma nke Jizọs Kraịst na-ewete ohere nke abụọ, na nke atọ, na nke anọ, na nke na-adịghị agwụ agwụ iji dote mgbaghara nke mmehie anyị” (niime Rachel Sterzer Gibson, “Kuzie iji Wulite Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst, ka Okenye Bednar Na-akuzi,” Church News, Jun 23, 2023, thechurchnews.com).

  8. “Onye amụma Joseph Smith chịkọtara nke ọma ọrụ dị mkpa nke emume nsọ ọkwa nchụaja niile dị niime ozi ọma nke Jizọs Kraịst: ‘Ịmụgharị ọzọ, na-abịa site na Mmụọ nke Chineke site na emume nsọ niile’ [Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Joseph Smith (2007), 95]. Okwu nke a na-ada ime mmụọ na-ekwusi ike ọrụ niile nke ma Mmụọ Nsọ na emume nsọ niile dị nsọna nsọrọ nke mmụgharị ime mmụọ. …

    Emume nsọ niile dị nsọ dị n’etiti ozi ọma nke Onye Nzọpụta na niime usoro nke ịbịakwute Ya ma chọta mmụgharị nke ime mmụọ. …

    Emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu a na-enye niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere ndị nnukwu karịa kentọaja ma ọ bụ arụmọrụ ihe atụ niile. Kama, ha mejuputara ọwa ji ikikere site na ngọzi niile na ike niile nke eluigwe nwere ike isi asọbanye niime ndụ anyị n’otu n’otu. …

    “Emume nsọ niile anatara ma sọpụrụ site n’iguzosi ike n’ezi ihe dị mkpa maka inwete ike nke iyi chineke ma ngọzi niile nke e mere ya adị adị site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta” (David A. Bednar, “Na-edebe Mgbe Niile Mgbaghara nke Mmehie Gị niile,” 59–60).

  9. Lee Jọn 10:17–18; 3 Nifaị 9:22.

  10. Lee Ntụgharị asụsụ Joseph Smith, Jọn 1:16; Jekọb 6:9; Moses 1:39.

  11. Lee Alma 12:33–34.

  12. Lee Jọn 3:16.

  13. 3 Nifaị 9:13.

  14. “Ana m arịọ unu ịbịakwute Ya ka o wee nwee ike … gwọọ unu site na mmehie dị ka unu na-echegharị. Ọ ga-agwọ unu site na mwute na ụjọ. Ọ ga-agwọ unu site na mmerụ ahụ niile nke ụwa nke a” (Russell M. Nelson, “Azịza Ahụ Na-abụkarị Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 127).

  15. Aịzaya 51:3; lee kwa Aịzaya 58:10–12; Izikiel 36:33–36.

  16. James E. Talmage, Jizọs Kraịst ahụ (1916), 265.

  17. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị,” 5–7; lee kwa nkọwada niile 2, 3, 43.

  18. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:6; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:7–9.

  19. 1 Pita 2:9; lee kwa Alma 26:16-17.

  20. Alma 5:26; ihe niile agbakwunyere.

  21. Lee Alma 34:17.

  22. Lee 2 Ndị Kọrịnt 7:10; 3 Nifaị 9:15–22.

  23. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:43; 64:7.

  24. Lee Mozaya 27:32–37; Alma 26:30.

  25. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:32.

  26. Lee Alma 24:8-10.

  27. Lee Robert L. Millet, Becoming New: A Doctrinal Commentary on the Writings of Paul (2022), 26.

  28. C. S. Lewis, The Magician’s Nephew (1955), 185.

  29. Lee Mozaya 4:6-9.

  30. Lee Alma 12:9–10; 26:22; 3 Nifaị 26:9.

  31. “Ụzọ ọgbụgba ndụ bụ ihe niile banyere mmekọrịta anyị na Chineke” (Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 11; lee kwa nkọwada niile 2 na the atọ 3 niime ozi nke a).

  32. Lee Alma 24:17–19.

  33. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 67:10.

  34. Lee Jekọb 4:13. “Ndị ahụ na-adịghị ahụ adịghị ike ha anaghị aganiihu. Mmata ihe nke adịghị ike gị bụ ngọzi maka na ọ na-enyere gị aka nọgide obi umeala ma na-eme gị ị na-atụgharị ruo Onye Nzọpụta. Mmụọ ahụ adịghị naanị akasị gị obi, mana Ọ bụkwa onye nnọchite anya site n’ebe Aja mgbaghara mmehie si arụ ọrụ niime ọdịdị gị. Mgbe ahụ ihe ndị na-adịghị ike adịrịzie ike” (Henry B. Eyring, “Udo M Ka M Hapụụrụ Gị,” Liahona, Me 2017, 16).

  35. Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Kacha dị mma ma Dị Mma karịa,” Liahona, Me 2019, 68.

  36. “Ihe niile a na-akuzi niime tempụl, site na nkuzi ma site na mmụọ, na-eme ka nghọta anyị maka Jịzọs Kraịst bawanye. Emume nsọ Ya niile nke dị mkpa n’ekekọta anyị na ya site na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụ aja dị nsọ. Mgbe ahụ,dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, Ọ n’enye anyị onyinye ike ọgwụgwọ Ya nke na-agba ume. Ma o, otu anyị chọsịrị ike nke Ya nime ụbọchị niile nke n’abịa n’ihu” (Russell M. Nelson, “Tempụl Ahụ na Ntọala nke Ime Mmụọ Gị,” Liahona, Nov. 2021, 93–94).

  37. 3 Nifaị 9:21.

  38. 3 Nifaị 9:14.

  39. lee Erik Dewar, “Bịanụ Chọta Ezumiike Ya” (song, 2024); lee kwa Matiu 11:28-30.

  40. Lee Ditronomị 30:20; Jọn 11:25; Ita 3:14; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:6, 13.

  41. “Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nke a bụ nkwa m. Enweghi ihe ga-aka enyere unu aka ijigidesi okporo igwe ahụ aka karịa ife ofufe niime tempụl kwa mgbe dị ka ọnọdụ niile unu si ekwe unu. Enweghị ihe ga-aka echekwa unu dị ka unu na-ezute ijiriji ọchịchịrị nke ụwa. Enweghi ihe ga-ebuli ịgba ama unu nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya ma ọ bụ nyere unu aka ghọta atụmatụ magburu nwe ya nke Chineke karịa. Enweghị ihe ga-akacha eme ka mmụọ unu dajụọ n’oge niile nke mgbu. Enweghi ihe ga-akaemepe eluigwe niile. Enweghi! (Russell M. Nelson, “Ńụrịa n’Onyinye nke Ntụghe niile nke Ọkwa nchụaja,” Liahona, Mee 2024, 122).

  42. Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Dị Ebighị ebi,” 5.

  43. Lee Russell M. Nelson, “Azịza Ahụ Na-abụkarị Jizọs Kraịst,” 127; lee kwa nkọwada14 niime ozi nke a niile 14.

  44. D. Todd Christofferson, “Onyinye nke Nchegharị sinachi,” Liahona, Nov. 2011, 39.

  45. Moses 5:11.

  46. Lee 2 Nifaị 2:26–28.