“Lee Abụ M Ihè ahụ Nke Unu Ga-Akwado”
Anyị na-eweli elu ihe nke Onyenwe anyị mgbe anyị na-ejidesi ike ọgbụgba ndụ anyị niile na mgbe anyị na-akwado onye amụma anyị dị ndụ taa.
Nye ọtụtụ ama dị na ọgbakọ nke a, ana m agbakwunye aka ebe nke onyeozi m na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke, Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta nke ụmụ Nna anyị niile. Site na Aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst mere ka okwe omume maka anyị, ọ bụrụ ma anyị tozuo oke, ịlọghachi niihu Nna anyị nke Eluigwe ma binyere ndị ezi na ụlọ anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Onye Nzọpụta anọghị ebe dị anya site na njem anụ ahụ anyị niile. Kemgbe mkpụrụ ụbọchị abụọ gara aga anyị anụwo Ya ikwu okwu site na ndị ndu a họọrọ ahọrọ nke ga-eme ka anyị bịakete Ya nso karịa. Ọtụtụ mgbe, site n’ịhụnaanya Ya na-enweghị ntụpọ na ebere Ya, Ọ na-akwado anyị dị ka anyị na-ezute ihe egwuregwu nke ndụ. Nefi kọwara: “ Chineke m abụwo onye na-akwado m; o duwo m na-agbanyeghị mkpagbu m niile. … O mejuputawo m na ịhụnaanya ya.”
Ana ahụ ịhụnaanya ahụ mgbe anyị kwadoro onye na ibe ya n’ọrụ Ya.
Anyị na-akwado ndị amụma dị ndụ taa n’ọgbakọ zuru ọha, ma Otu Ndịisi Mbụ, Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ, Ndị Ji Ikikere Zuru ọha, na Ndịisi ọrụ nke Nzukọ nsọ. Ịkwado pụtara ịkwado onye ọzọ, ige ha ntị, ikwesị ntụkwasị obi nye ọrụ ha, ime iji okwu ha mee ihe. Ha na-ekwu okwu site na mkpatemmụọ nke Onyenwe anyị; ha na-aghọta ihe ndị na-eme ugbua, ịla azụ nke omume ọma nke ọha, na mbawanye mbọ nke onye iro imebi atụmatụ nke Nna. Na iwelite aka anyị elu, anyị na-enyefe nkwado anyị, ọ bụghị naanị nnọọ maka oge ahụ mana na ndụ anyị kwa ụbọchị.
Inye nkwado gụnyere ịkwado ndịisi stek na ndị bishọp, kworum na otu ndị ndu, ndị nkuzi anyị, na ọbụna ndị nduzi kampụ nọ na ngalaba ukwu na stek anyị. Na nso nso ebe obibi, anyị na-akwado ndị nwunye na ndị di anyị, ụmụntakịrị, ndị nne na nna, ọha ezi na ụlọ anyị ndị ọzọ, na ndị agbata obi anyị. Mgbe anyị kwadoro onye na ibe ya anyị na-asị, “Anọ m ebe a maka gị, ọ bụghị nnọọ naanị iwelite ogweaka gị na aka gị mgbe ha ‘lọrọ ala’ mana ịbụ onye nkasi obi na ume n’akụkụ gị.”
Echiche inye nkwado gbara mgbọrọgwụ niime akwụkwọ nsọ. Ma Mmiri niile nke Mọmọn, ndị otu Nzukọ nsọ ahụ emere baptizim ọhụrụ mere mkpebi “iburita ibu arụ nke onye na ibe ya, ka ha wee dị mfe; … [ị] kasi ndị ahụ obi bụ ndị chọrọ nkasi obi, na iguzo dị ka ndị aka ebe nke Chineke n’oge niile na niihe niile, na n’ebe niile.”
Nye ndị Nefi, Jizọs kwuru: “Welitenụ ìhè unu elu ka ọ na-enwu nye ụwa. Lee abụ m ihe ahụ nke unu ga-akwado.” Anyị na-eweli elu ihe nke Onyenwe anyị mgbe anyị na-ejidesi ike ọgbụgba ndụ anyị niile na mgbe anyị na-akwado onye amụma anyị dị ndụ taa dị ka ọ na-ekwu okwu niile nke Chineke
Onyeisi Russell M. Nelson sịrị, mgbe ọ na-eje ozi na kworum nke Ndị ozi Iri na Abụọ, “Nkwado anyị nye ndị amụma bụ mkpebi nke onwe onye na anyị ga-eme ihe niile anyị kachasị eme iji kwadoo ihe ndị kachasị mkpa eburu na-amụma.”
Ị kwado onye amụma anyị bụ ọrụ dị nsọ. Anyị anaghị anọdụ na nkịtị mana dị nkọ na-ịgbachitere ya, gbasoro ndụmọdụ ya, kuzie okwu ya niile, ma kpee ekpere maka ya.
Eze Benjamin, niime Akwụkwọ nke Mọmọn, gwara ndị ahụ, Adị m ka unu onwe unu, nọrọ n’okpuru ụdị adịghị ike niile nke ahụ na echiche; otu ọ dị ahọpụtawo m … ma e dobere m site n’aka nke Onyenwe anyị … ma e debewo ma chekwaa m site n’ike ya na-enweghị atụ, ijere unu ozi site n’ike niile, echiche na ume nke Onyenwe anyị nyeworo m.”
N’otu aka ahụkwa, na-igba afọ 100, Onyeisi Nelson ka edebeworo ma chekwaa site n’aka Onyenwe anyị. Onyeisi Harold B. Lee, n’oge ahụ onye otu nke Otu Ndịisi Mbụ, ka akpọrọ aha dị ka ihe eji ama atụ nke Moses iguzoro n’elu ugwu nta na Refidim. “Aka nke [Onyeisi Nzukọ nsọ] nwere ike ịda mba,” ka o kwuru. “Ha nwere ike yie ka ihe kpọnyere ọnụ n’ala mgbe ụfọdụ niihi oke na ọrụ ndị dị arọ ya, mana dị ka anyị na-ewelite aka ya elu, na dị ka anyị na-edu n’okpuru ntuziaka ya, n’akụkụ ya, ọnụ ụzọ ama niile nke ala mmụọ agaghị emeri unu ma agaghị emegide Isreal. Nchekwa unu na nke anyị dabeere na ma anyị ga ma ọ bụ na anyị agaghị esoro ndị nke Onyenwe anyị tinyere ịnọ n’isi Nzukọ nsọ ya. Ọ mara onye ọ chọrọ ị nọrọ n’isi nzukọ nsọ nke a, ma ọ gaghị eme mmejọ ọbụla.”
Onyeisi Nelson na-anata site n’afọ ndị nke ijere Onyenwe anyị ozi. Ntozu oke ya, ogologo nhụmiihe dị iche iche, amamiihe, na nnọgide na-ịnata mkpughe bụ ihe dabara kpọm kwem maka ụbọchị anyị taa. O kwuwo: “Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-akwado ndị ụwa maka ụbọchị ahụ mgbe ‘elu ụwa ga-ejuputa na mmata ihe nke Onyenwe anyị’ (Aịzaya 11:9). … Ọrụ nke a ka enyere ikike ya site na ọkwa dị nsọ amara 200 gara aga. Ọ gụnyere naanị mkpụrụokwu asaa: ‘Onye a bụ Ọkpara M Hụrụ Naanya. Nụrụ olu Ya!’(Lee Joseph Smith—Agụgụala 1:17).”
Onyeisi Nelson ekwuwo kwa: “Enwetụbeghị n’agụgụala nke ụwa mgbe mmata ihe nke onwe onye banyere Onye Nzọpụta anyị dị mkpa karịa ma gbasatara mkpụrụ obi nke mmadụ niile. Chegodu echiche otu ngwa ngwa ọgbaghara ndị na-emebi ihe na gburugburu ụwa—na ndị nke ahụ dị niime ndụ nke onwe anyị—ga-eji nwee mmezi ma ọ bụrụ na anyị niile ahọrọ isoro Jizọs Kraịst ma ńaa ntị na nkuzi Ya niile.”
Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị kwesịrị ibuli elu karịa ma mee ntakịrị ntamu, ikwado karịa okwu Onyenwe anyị, Ụzọ Ya niile, na ndị amụma Ya, ndị na-ekwuwo: “Otu niime ihe aka mgba anyị na-akachasị enwe taa bụ ịma ndịiche dị n’etiti eziokwu niile nke Chineke na adịgboloja nke Setan. Ọ bụ ya mere Onyenwe anyị ji dọọ anyị aka na ntị ‘ikpe ekpere oge niile, … ka [anyị] nwee ike merie Setan, ma … gbanarị aka nke ndị odibo Setan ndị na-akwado ọrụ [nke onye iro]’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5; nkwusi ike agbakwunyere].”
Na Eprel gara aga, Mụ na Nwanne nwanyị nwere ugwu isonye onye amụma anyị hụrụ naanya na Nwanne nwanyị Nelson maka ndogharị nsọ nke Manti Utah Tempụl.
Onyeisi Nelson tụrụ onye ọbụla naanya mgbe ọ batara niime ụlọ ahụ. Naanị mmadụ ole ma ole niime anyị maara na ọ na-abịa. Niihu ya, ozugbo ihe na ọrụ nke onye amụma o bu metụrụ m n’ahụ. Ọńụ dị niihu nke ndị mmadụ banyere ịhụ onye amụma n’onwe ha ga-anọgide niime m ruo ebighị ebi.
Na-ekpere nke nranyegharị ahụ, Onyeisi Nelson rịọrọ Onyenwe anyị ka ụlọ nsọ Ya n’ụzọ dị oke mkpa ga-akwado ndị niile ga-abata tempụl ahụ “ka ha wee nata ngọzi niile dị nsọ ma nọgịde na ntozu oke ma kwesị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ha niile … ka nke a wee bụrụ ụlọ nke mkpughe nke onwe onye maka ndị niile ga-abata n’ọnụ ụzọ ndị a na ntozu oke.”
Anyị niile chọrọ mbuli elu site n’aka Onyenwe anyị jiri udo, nkasi obi, ma kachasị ihe niile mkpughe nke onwe onye iji na-emegide ụjọ, ọchịchịrị, na esemookwu na-erute ụwa niile.
Tupu ofufe ahụ, anyị guzooro na mpụta na-anwụ anyị na Onyeisi na Nwanne nwanyị Nelson ilere ọmarịcha ntọ ahụ. Njikọ nke ndị nna nna ochie nke Onyeisi Nelson ruo mpaghara ebe ahụ dịịrị omimi. Ndị nna nna ochie ya nke asatọ biiri niime gburugburu ndagwurugwu tempụl ahụ, dị ka kwa ụfọdụ ndị nke m. Nna nnanna ochie m Andrew Anderson rụrụ ọrụ na ndị otu ọrụ ụlọ nke ndị ogbughere ụzọ mbụ ndị rụrụ ọrụ ike afọ 11 iji rụchaa Manti tempụl ahụ, nke atọ n’ebe Rocky Mountains ahụ.
Dị ka anyị na Onyeisi Nelson guzooro, anyị nwere ohere ijigidesi ike ma kwadoo onye amụma nke Chineke na mmemme nke ndogharị nsọ nke ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ ụbọchị nke m na-agaghị enwe ike echefu.
“Anyị na-ewu tempụl niile iji kwanyere Onyenwe anyị ugwu,” Onyeisi Nelson kwuru n’ụbọchị ahụ dị nsọ. “Ana ewu ha maka ofufe na-abụghị maka ngosi. Anyị na-eme ọgbụgba ndụ niile dị nsọ nke bara uru dị ebighị ebi niime mgbidi ndị a dị nsọ.” Anyị na-ekpokọta Isreal.
Onyeisi Nelson na ndị amụma bu ya ụzọ abakụwo tempụl niile dị nsọ n’ogweaka ha. Taa, na gburugburu ụwa, anyị nwere ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị dị 350 na-arụ ọrụ, amara ọkwa, ma ọ bụ ndị ana ewu ewu. Dị ka onye amụma, kemgbe 2018, Onyeisi Nelson amawo ọkwa tempụl dị 168.
“N’oge anyị“ ọ sịwo, “njikọ ọnụ dum, zuru oke, ma nweghị ntụpọ nke ndudugandu niile, ntụghe niile, na ike niile ka aga agbagidekọta ọnụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:18). Maka ebumnuuche ndị a dị nsọ, tempụl niile dị nsọ juputara elu ụwa. Ana m ekwusi ya ike ọzọ na owuwu nke tempụl ndị a nwere ike gaghị agbanwe ndụ unu, mana ozi unu na tempụl ahụ na-ezie ga eme ya.”
“Onye Nzọpụta na ozizi Ya bụcha isi ihe ahụ eji nwee tempụl,” Onyeisi ahụ kwuru. “Ihe niile a na-akuzi niime tempụl, site na nkuzi ma site na mmụọ, na-eme ka nghọta anyị maka Jịzọs Kraịst bawanye. Emume nsọ Ya niile dị oke mkpa n’ekekọta anyị na Ya site na ọgbụgba ndụ niile nke ọkwa nchụaja dị nsọ. Mgbe ahụ, dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ niile anyị, Ọ na-enye anyị onyinye ọgwụgwọ Ya, nke na-enye ike.”
”Ndị niile na-efe ofufe niime tempụl,” Onyeisi Nelson ekwuwo, “ga-enwe ike nke Chineke ma ndị mmụọ ozi ka enyere iwu ‘ịbụ ndị na-eche ha nche’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:22]. Kedụ otu o si abawanye obisi ike gị ịmata na, dị ka nwoke ma ọ bụ nwanyị nataworo onyinye dị nsọ ya [ma ọ bụ onye ntoroọbịa na-eje tempụl] ejikwara na ike nke Chineke, ịkwesịghị izute ndụ a naanị gị? Kedụ mgbam ume ọ na-enye gị ị mata na ndị mmụọ ozi n’ezie n’ezie ga-enyere gị aka?”
Ndị mmụọ ozi na-apụta ịkwado anyị ka akọwara niime akwụkwọ nsọ mgbe Jizọs Kraịst gbisara n’obi umeala niime Ogige nke Getsemane. Site na ntaram ahụhụ Ya O wetere Aja mgbaghara mmehie na-enweghị ọgwụgwụ. “N’ebe ahụ,” Onyeisi Nelson kwuru, otu ihe omume nke ịhụnaanya kachasị ukwuu ededatara n’agụgụala niile mere. … N’ebe ahụ na Getsemani, Onyenwe anyị ‘tara ahụhụ mgbu nke ụmụ mmadụ niile, ka onye niile … nwee ike chegharịa ma bịakwute ya’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:11].”
“Wezuga iko nke a site n’aka m:” Jizọs Kraịst rịọrọ, “na-agbanyeghị ọ bụghị uche nke m, mana nke gị, ga-eme.
“Ma otu mmụọ ozi bịakwutere ya site n’eluigwe, na-agba ya ume.”
Anyị nwere ndị mmụọ ozi na gburugburu anyị taa. Onyeisi Nelson ekwuwo, “[Niime tempụl,] ị ga-amụta otu esi emeghetụ akwa mgbochi dị n’etiti eluigwe na ụwa, otu esi arịọ Chineke maka ndị mmụọ ozi ị nọnyere gị.”
Ndị mmụọ ozi na-enwete ihe. Ihe nke Chineke. Nye ndị Nefi Ndị ozi, Jizọs kwuru, “Lee abụ m ihe ahụ nke unu ga-akwado.” Dị ka anyị na-akwado onye amụma anyị, anyị na-agba ama a kpọrọ ya site n’aka Onye Nzọpụta anyị, onye bụ “ihe ahụ … nke ụwa.”
Onyeisi Nelson m hụrụ naanya, n’aha ndị otu na ndị enyi nke Nzukọ nsọ Onyenwe anyị na gburugburu ụwa, anyị bụ ndị a gọziri agọzi ịkwado nkuzi gị niile, ịkwado ọmụmaatụ gị nke ibi ndụ dị ka Kraịst, na ịkwado ama gị kpụ ọkụ n’ọnụ banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Onye Mgbapụta nke anyị niile.
Ana m agbakwu ama nke onye ozi na Jizọs Kraịst bụ “ihe ahụ … nke ụwa.” Ka anyị niile, dị ka ndị na-eso ụzọ Ya, “kwadoo” ihe Ya. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.