Ọgbakọ Zuru ọha
Anabata unu na Nzukọ nsọ nke Ọńụ
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


13:1

Anabata unu na Nzukọ nsọ nke Ọńụ

Niihi ndụ na ozi mgbapụta nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, anyị pụrụ—ma kwesịrị—ịbụ ndị kachasị enwe ọńụ n’elu ụwa!

E mere m baptizim niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a kemgbe Abalị Ekeresimesi nke 1987, ihe ruru afọ 37. Nke ahụ bụ n’ezie ụbọchị dị ịtụnaanya niime ndụ m, ma niime njem ebighị ebi m, ma obi juputara m n’ekele nke ukwuu maka ndị enyi kwadoro ụzọ ahụ ma kpọta m na mmiri ahụ nke ọmụmụ ọhụrụ.

Ma baptizim gị ọ bụ echi gara aga ma ọ bụ afọ ndị gara aga, ma ị na-ezukọ na ụlọ ụka ọtụtụ ngalaba ukwu ma ọ bụ n’okpuru kanopi akpara akpa, ma ị na-anata oriri nsọ na ncheta nke Onye Nzọpụta na Thai ma ọ bụ Swahili, ọ ga-amasị m ị gwa gị, anabata unu na nzukọ nsọ nke ọńụ! Anabata unu na nzukọ nsọ nke ọńụ!

Nzukọ nsọ nke Ọńụ

Niihi atụmatụ ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe maka onye ọbụla niime ụmụ Ya, na niihi ndụ mgbapụta na ozi nke Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, anyị nwere ike—ma kwesịrị—ịbụ ndị kachasị enwe ọńụ n’elu ụwa! Ọbụna dị ka ifufe niile nke ndụ dị niime ụwa na-enwekarị nsogbu na-efe anyị n’isi, anyị nwere ike zulite uche nke ọńụ na-eto eto ma na-anọgide ya na udo nke ime mmụọ niihi olile anya anyị niime Kraịst na nghọta anyị nke ọnọdụ nke anyị niime ọmarịcha atụmatụ nke obi ụtọ.

Onye Ozi ukwu nke Onyenwe anyị, Onyeisi Russell M. Nelson, ekwuwo maka ọńụ nke na-abịa site na ndụ dabeere na Jizọs Kraịst n’okwu niile o nyeworo kemgbe ịbụrụ Onyeisi Nzukọ nsọ. Ọ chịkọtara ya n’ụzọ dị nke nke: “Ọńụ na-abịa site na ma niihi Ya. … Maka Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, Jizọs Kraịst bụ ọńụ!”

Anyị bụ ndị otu nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Anyị bụ ndị otu nke nzukọ nsọ nke ọńụ! Ma ọdịghị ebe ọńụ anyị dị ka ndị mmadụ si edo anya karịa karịa mgbe anyị gbakọtara ọnụ Ụbọchị Ezumiike nke ọbụla niime nzukọ oriri nsọ anyị niile ife ofufe nye nsipụta nke ọńụ niile! N’ebe a anyị na-achịkọta anyị na ezi na ụlọ niile nke ngalaba ukwu na ngalaba nta anyị iji nakwere oriri nsọ nke Nri Abalị nke Onyenwe anyị, nnapụta anyị site na mmehie na ọnwụ, na amara nke Onye Nzọpụta dị ike! N’ebe a anyị na-abịa nwee nhụmiihe ọńụ, mgbaba, mgbaghara, inye ekele, na nsonye a na-ahụ site na Jizọs Kraịst!

Ọ bụ mmụọ nke ịńụrị ọńụ niime Kraịst n’igwe ihe ị na-achọ? Nke a ọ bụ ihe ị na-eweta? E nwere ike i na-eche na gị na nke a enweghị oke ihe unu nwere ime, ma ọ bụ elemanya o doro gị anya nnọọ otu esi emekarị ọtụtụ ihe. Mana anyị niile nwere ike itinye ọnụ, na-agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ ọkpụkpọ oku anyị, ịdị na-eme nzukọ oriri nsọ anyị nke juputara n’ọńụ, lekwasịrị anya na Kraịst, awa ndị dị nnabata ha nwere ike ịbụ, juputa na mmụọ nke nsọpụrụ ọńụ.

Nsọpụrụ Ọńụ

Nsọpụrụ juputara n’ọńụ? “Nke ahụ enwere ihe ọ bụ?” i nwere ike ịjụ. N’ezie, Ee, ọ bụ! Anyị nwere ịhụnaanya, nsọpụrụ, na nkwanye ugwu miri emi n’ebe Chineke anyị nọ, ma nsọpụrụ anyị na-apụta site na mkpụrụ obi nke na-ańụrị ọńụ niime nnukwu ịhụnaanya, ebere, na nzọpụta nke Kraịst. Nsọpụrụ ọńụ nke a nye Onyenwe anyị kwesịrị ịkọwa nzukọ oriri nsọ anyị niile dị nsọ.

Kosiladị, nye ọtụtụ, nsọpụrụ naanị pụtara nke a: ịfụkọta ogweaka anyị niile nke ọma gburugburu obi anyị, ihudata isi anyị, imechi anya anyị, na ịnọ nwayọ—ruo mgbe ngwụcha! Nke a nwere ike bụrụ otu ụzọ na-enye aka iji kuziere obere ụmụntakịrị nwere nnukwu ume, mana dị ka anyị na-etolite ma na-amụ ihe, ka anyị hụ na nsọpụrụ karịrị akarị karịa nke a. Ọ bụ otu anyị ga-adị ọbụrụ na anyị na Onye Nzọpụta nọọrọ? Mba, niihi “n’ihu [Ya] ka ọńụ dị nuju”!

N’ezie, nye ọtụtụ niime anyị mgbanwe nke a niime nzukọ oriri nsọ ga-eme omume.

Ịga aga megide Ife ofufe

Anyị anaghị agbakọta n’ụbọchị Ezumike naanị ịga nzukọ oriri nsọ ma kapụ ya na ndekọpụta ahụ. Anyị na-abịakọta ife ofufe. Enwere nnukwu ndịiche n’etiti ha abụọ. Ịga aga pụtara ịnọ n’ebe ahụ. Mana ife ofufue bụ ịkpachapụ anya n’eto ma na na-ahụ Chineke anyị naanya n’ụzọ nke ga-agbanwe anyị!

N’elu Ikpo okwu ma niime Ọgbakọ

Ọ bụrụ na anyị na-agbakọta na ncheta nke Onye Nzọpụta na mgbapụta ahụ O meworo ka o kwe omume, ihu anyị kwesịrị igosipụta ọńụ na obi ekele anyị! Okenye F. Enzio Bushe otu mgbe kọrọ akụkọ nke mgbe ọ bụ onyeisi ngalaba nta ma otu nwata nwoke nta elee ya anya n’ebe ikpo okwu ma jụọ ajụjụ n’olu dara nnukwu ụda, “Kedụ ihe nwoke ahụ nwere ihu onye iwe na-eme ele ebe ahụ?” Ndị ahụ nọdụrụ nelu ebe ikpo okwu—ndị na-ekwu okwu, ndị ndu, ndị kwaya—na ndị ahụ na-agbakọta niime ọgbakọ n’ekwuru ibe ha okwu nke a “anabata unu na nzukọ nsọ nke ọńụ” site otu ha si edebe ihu ha!

Ịbụ Abụ

Dị ka anyị na-abụ abụ, ọ bụ na anyị na-esonyekọta ọnụ ito Chineke na Eze anyị otuto, na-agbanyeghị otu olu anyị si dịrị, ma ọ bụ anyị nọ na-atanwigharị ma ọ bụ agụghị egwu ma ọlị? Akwụkwọ nsọ dekọtara na “abụ nke ndị ezi omume bụ ekpere nye [Chineke]” niime nke mkpụrụ obi Ya na-enwe mmasị. Ya mere ka anyị bụọ abụ! Ma too Ya!

Okwu niile na Ama niile

Anyị na-eme ka okwu anyị niile na ama anyị niile dabere na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst na mkpụrụ niile nke ibi ndụ ozi ọma Ha, mkpụrụ niile nke “dị ụtọ karịa ihe niile nke dị ụtọ.” Mgbe ahụ anyị n’ezie “n’eri oriri … ọbụna tutu ruo afọ eju [anyị], na agụụ agaghị agụ [anyị], ọ bụghị … akpịrị ịkpọ anyị nkụ,” ma ibu arọ anyị adịrịzie mfe, site n’ọńụ nke Ọkpara ahụ.

Oriri nsọ

Ebe nlekwasị anya anyị dị ebube nke ofufe anyị bụ ngọzi na nnata nke oriri nsọ n’onwe ya, achịcha ahụ na mmiri ahụ na-anọchite anya onyinye mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị na nzube dum nke mkpokọta anyị. Nke a bụ “oge dị nsọ nke mmegharị ọhụrụ ime mmụọ” mgbe anyị gbara akaebe ọhụrụ na anyị dị njikere iwekwasị onwe anyị aha nke Jizọs Kraịst ma gbaa ndụ ọzọ iji na-echeta Onye Nzọpụta mgbe niile ma debe iwu nsọ Ya niile.

N’ụfọdụ oge nke ndụ, anyị na-ezute oriri nsọ jiri obi dị arọ na ibu ndị karịrị akarị nke ukwuu. N’oge ndị ọzọ, anyị na-abịa n’efu na enweghị ibu arọ site na mkpa niile na nsogbu niile. Dị ka anyị na-egezi ntị nke ọma nye ngọzi nke achịcha na mmiri ma rie site na ihe akaebe ndị ahụ dị nsọ, anyị na-enwe mmetụta ịtụgharị uche na aja nke Onye Nzọpụta, mgbu Ya niile niime Getsemani, nhụjuanya Ya n’elu obe, na mwute niile na ihe ụfụ niile Ọ nagidere maka anyị. Nke ahụ ga-abụ ihe ga-enyere mkpụrụ obi anyị aka dị ka anyị na-ejikọ ntaram ahụhụ anyị nye nke Ya. N’oge ndị ọzọ, ọ na-emetụ anyị inwe ịtụnaanya jiri obi ekele juruanya n’ọńụ ahụ “dị mma ma dị ụtọ” nke ihe onyinye nke Jizọs dị ebube meworo ka o kwe omume niime ndụ anyị na niime ebighị ebi niile! Anyị ga-ańụrị ọńụ niihi ihe nke ka ga-abịa—nnọkọ anyị jiri kpọrọ ihe anyị na Nna anyị hụrụ naanya na Onye Nzọpụta bilitere.

Enwere ike edebewo anyị n’ọnọdụ nke iche na ebumnuche nke oriri nsọ bụ ịnọdụ ọdụ n’oche ogologo na-eche naanị banyere ụzọ niile anyị si mehie niime izu ụka gara aga. Mana ka anyị tụgharịa omume ahụ n’isi ya. N’oge ahụ dị jụụ, anyị nwere ike tụgharịa uche n’ọtụtụ ụzọ ndị anyị hụworo Onyenwe anyị na-achuso anyị mgbe niile jiri ịhụnaanya Ya dị ịtụnaanya izu ụka ahụ! Anyị nwere ike tụgharịa uche n’ihe ọ pụtara “ịchọpụta ọńụ nke nchegharị kwa ụbọchị.” Anyị nwere ike nye ekele maka oge niile Onye Nzọpụta bara niime ndọlị anyị niile na mmeri anyị niile na oge mgbe ndị anyị nwere mmetụta amara Ya, mgbaghara, na ike na-enye anyị ume iji merie ihe isi ike anyị niile ma jiri ndidi na ọbụna ihu ọchị dị mma buru ibu arọ anyị niile.

Ee, anyị na-atụgharị uche na ntaram ahụhụ niile na ikpe n’ezighị ezi niile atụkwasịrị n’isi Onye Mgbapụta anyị maka mmehie anyị, ma nke ahụ na-akpata ntụgharị uche na-emetụ n’obi. Mana anyị mgbe ụfọdụ na-atọkịrị ebe ahụ—niime ubi nta, n’obe ahụ, niime ili. Anyị na-ada mba ịganiihu ruo ọńụ nke ili ahụ ịgbawa, mmeri nke ọnwụ, na mmeri nke Kraịst megide ihe niile nke nwere ike igbochi anyị site n’irite udo na ịlaghachi n’ebe obibi anyị dị n’eluigwe. Ma anyị nagba anya mmiri mwute ma ọ bụ anya mmiri nke obi ekele n’oge oriri nsọ, ka ọ bụrụ na ịtụnaanya mara mma n’ozi dị mma nke onyinye nke Nna nke Ọkpara Ya!

Ndị nne na nna nwere Ụmụ Ndị Na-eto eto ma ọ bụ Nwere Mkpa ndị Pụrụ iche

Ugbu a, maka ndị nne na nna ụmụntakịrị ndị na-eto eto ma ọ bụ nwere mkpa ndị pụrụ iche, anaghị enwekarị ụdị ihe ọbụla dị ka oge dị jụụ na ntụgharị uche dị nwayọ n’oge oriri nsọ. Mana n’obere oge gburugburu izu ụka ahụ, i nwere ike kuzie ihe site n’ịma atụ ịhụnaanya, obi ekele, na ọńụ i na-enwete maka na site n’aka Onye Nzọpụta dị ka ị na-elekọta obere ụmụ atụrụ Ya. Enweghị mbọ niime ọchịchọ nke furu efu. Chineke maara maka gị.

Kansụl niile nke Ezi na ụlọ, Ngalaba ukwu, na Ngalaba nta

N’otu aka ahụ n’ebe obibi, anyị nwere ike malite imelite olile anya anyị niile na atụmanya niile maka oge anyị na nzukọ nsọ. Na kansụl ezi na ụlọ niile, anyị na-akpa nkata otu onye ọbụla n’otu n’otu nwere ike inyeaka n’ụzọ niile bara uru iji nabata onye niile na nzukọ nsọ nke ọńụ! Anyị nwere ike tụọ atụmatụ ma tụọ anya inwe nhụmiihe obi ụtọ na nzukọ nsọ.

Kansụl ngalaba ukwu na ngalaba nta niile nwere ike na-ahụta ma na-azulite omenaala nke nsọpụrụ ọńụ maka awa oriri nsọ anyị, na-achọpụta nzọụkwụ ndị kwere omume na arọ ndị a na-ahụ anya iji nyee aka.

Ọn̄ụ

Ọńụ na-adị iche maka ndị mmadụ dị iche iche. Nye ụfọdụ, o nwere ike bụrụ ekele obi ụtọ n’ọnụ ụzọ. Nye ndị ọzọ, o nwere ike bụrụ iji nwayọọ enyere ndị mmadụ aka nwete mmetụta ahụ iru ala site n’inwe ihu ọchị na ịnọdụ n’akụkụ ha jiri obi ọma na nke dị ịhụnaanya. Maka ndị ahụ ọ dịrị ka agụpụrụ ha ma ọ bụ nọ noke niile, mkpom ọkụ nke nnabata nke a ga-adị mkpa. N’ikpeazụ, anyị nwere ike jụọ onwe anyị otu Onye Nzọpụta ga-esi achọ ka awa oriri nsọ anyị dịrị. Kedụ otu Ọ ga-esi achọ ka anabata onye ọbụla niime ụmụ Ya, elekọta, zulite, ma hụ naanya? Kedụ otu Ọ ga-esi achọ ka anyị nwete mmetụta mgbe anyị bịara imegharị ọhụrụ site na icheta na ife Ya ofufe?

Na mmechi

Na mmalite njem okwukwe m, ọńụ niime Jizọs Kraịst bụ nchọpụta m mbụ dị ukwuu, ma ọ gbanwere ndụ m. Ọ bụrụ na ị ka ga-achọpụta ọńụ nke a, malite na njem ya. Nke a bụ ịkpọ oku ịnata onyinye udo, ìhè, na ọńụ nke Onye Nzọpụta—ńụrịa niime ya, iji nwee ịtụnaaya na ya, na ịńụrị ọńụ na ya Ụbọchị Ezumiike niile.

Amọn niime Akwụkwọ nke Mọmọn kọwara mmetụta niile nke obi m mgbe o kwuru:

“Ugbu a ọ bụ na anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji n̄urịa ọn̄ụ? Ee, asị m unu, ọdịghị mgbe enwere [ndị mmadụ] ndị nwere nnukwu ihe mere ha ga-eji n̄ụrịa ọn̄ụ dị ka anyị, site na mgbe ụwa malitere, ee, ma ebupụwo ọn̄ụ m, ọbụna ruo n’itu ọnụ niime Chineke m; niihi na o nwere ike niile, amamiihe niile, na nghọta niile; ọ na-aghọta ihe niile, ma ọ bụ Onye ebere, ọbụna ruo nzọpụta, nye ndị ga-echegharị ma kwere n’aha ya.

“Ugbu a ọ bụrụ na nke a bụ itu ọnụ, ọbụna otu ahụ ka m ga-etu ọnụ; niihi na nke a bụ ndụ m na ìhè m, … ọn̄ụ m, na nnukwu obi ekele.”

Anabata unu na nzukọ nsọ nke ọńụ! Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba ama

  1. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Ọńụ di ike, ma ịlekwasị anya n’ọńụ na-ewete ike nke Chineke niime ndụ anyị. Dị ka niime ihe niile, Jizọs Kraịst bụ onye ọmụmaatụ anyị kachasị, ‘onye niihi ọńụ nke edebere n’ihu ya nagidere obe ahụ’ [Ndị Hibru 12:2]. Chee maka nke ahụ! Iji hụ na O diri nhụmiihe kachasị egbu mgbu ediworo n’elu ụwa, Onye Nzọpụta anyị lekwasịrị anya n’ọńụ! “Ma gịnị bụ ọńụ ahụ edebere niihu Ya? N’ezie ọ gụnyere ọńụ nke nsacha, ọgwụgwọ, na ịgba anyị ume; ọńụ nke ịkwụ ụgwọ maka mmehie nke ndị niile ga-echegharị; ọńụ nke ga-ekwe ka okwe omume maka mụ na gị ịlọghachi n’ebe obibi—dị ọcha ma tozuo oke—ibi anyị na Nne na Nna anyị nke Eluigwe na ndị ezi na ụlọ. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị uche n’elu ọńụ ahụ nke ga-abịakwute anyị, ma ọ bụ na ndị ahụ anyị hụrụ naanya, gịnị ka anyị pụrụ ịnagide nke yiri ugbu a ka ọ na-anyịgbu anyị, egbu oke mgbu, atụ oke egwu, na-ezighị ezi, ma ọ bụ dị nnọọ ka ihe na-ekweghị omume?” (“Ọńụ na Nlanarị nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82–83).

  2. Abụ ọma 16:11.

  3. F. Enzio Busche, “Ihe ọmụmụ niile sitere n’aka Nwa atụrụ nke Chineke,” Religious Educator, vol. 9, no. 2 (2008), 3.

  4. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:12.

  5. Lee Abụ ọma 100:1.

  6. Alma 32:42.

  7. Lee Alma 33:23.

  8. Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 29.2.1.1, Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  9. Lee Russell M. Nelson, comment made at the mission leadership seminar, June 2019; quoted in Dale G. Renlund, “Nkwa Na-enweghị atụ nye Jizọs Kraịst,” Liahona, Nov. 2019, 25.

  10. Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziri: “Mgbe gị, dị ka onye nchụaja, sekpuuru na tebulu oriri nsọ ma kpee ekpere, nke bịara site na mkpughe, ị na-edebe ndị ọgbakọ niile n’okpuru ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị. Nke a ọ bụ obere ihe? Ọ bụ ihe kachasị mkpa ma dị ịrịba ama” (“Ọkwa nchụaja nke Erọn—Onyinye sitere n’aka Chineke,” Ensign, Me 1988, 46).

    “Ndị ahụ na-akwado, agọzi, ma ọ bụ na-enyefe oriri nsọ na-enye emume nsọ nke a nye ndị ọzọ n’aha nke Onyenwe anyị. Onye ọbụla nke ji ọkwa nchụaja kwesịrị irute ọrụ nke a jiri agwa dị mma, dị nsọpụrụ. O kwesịrị ịsapụ ahụ nke ọma, dị ọcha, ma yiri uwe dị mma. Ngosipụta nke onwe kwesịrị igosi ịdị nsọ nke emume nsọ ahụ” (“Emume nsọ niile na Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja,” Akwụkwọ Ntuziaka nke Ezi na ụlọ [2006], 22).

  11. Alma 36:21.

  12. Russell M. Nelson, “Ike Ime mmụọ ahụ N’abịa abịa,” Liahona, Me 2022, 98.

  13. Lee Mozaya 24:13–15.

  14. Lee Jọn 3:16–17.

  15. Alma 26:35-37.