O Ntoroọbịa nke Oke ọmụmụ nwere Ugwu
Chineke tụkwasịrị obi na gị, ụmụ nke ọgbụgba ndụ, iji nyee aka n’ọrụ Ya nke ịkpọta ụmụ Ya niile lọghachi ebe obibi na nchekwa.
Okenye Stevenson, nke a bụ ọgbakọ agaghị echefu ma ọlị.
Ezi na ụlọ anyị na-enwe obi ụtọ mgbe niile n’obere akwụkwọ akpọrọ Akwụkwọ ozi niile nke Ụmụntakịrị nye Chineke. Ndịa bụ naanị ole ma ole:
“Ezi Chineke, kama ikwe ndị mmadụ nwụọ ma bịa ime ndị ọhụrụ, gịnị mere ị gaghị edebe ndị nke i nwere ugbu a?”
“Ole ihe mere i jiri nwee naanị iwu iri, mana ụlọakwụkwọ anyị nwere nde kwuru nde?”
“Gịnị mere i jiri tinye tonsil ndị ahụ niime ọ bụrụ na gị ga-ewepụ ha ọzọ?”
Taa enweghị ohere iji zaa ajụjụ ndị a niile, mana enwere ajụjụ ọzọ m na-anụkarị site n’aka ụmụ okoroọbịa na ụmụ agbọghọbịa nta nke ga-amasị m ikwu maka ya. Site na Ulaanbaatar, Mongolia, ruo Thomas, Idaho, ajụjụ ahụ bụkwa otu ụdị: “Gịnị mere? Gịnị mere Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a si ebi ndụ n’ụzọ dị iche site na ndị ọzọ?”
A ma m na ọ na-ara ahụ ịdị iche—kacha nke mgbe ị dị obere ma na-achọsiike nke ukwuu maka ndị ọzọ ịhụ gị naanya. Onye ọbụla chọrọ isoro ihe a na-eme, ma ọchịchọ ahụ bawanyere ruo na oke na-adịghị mma niime ụwa dijitaalụ nke taa juputara na social midia na cyberbullying.
Ya mere, jiri mkwagide ahụ niile, gịnị mere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a si ebi ndụ n’ụzọ dị iche? Enwere ọtụtụ azịza ndị dị mma: Niihi na ị bụ nwa nke Chineke. Niihi na echekwawo gị maka ụbọchị ikpeazụ ndị a. Niihi ị bụ onye n’eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.
Mana azịza ndị ahụ anaghị edopu gị iche mgbe niile. Onye ọbụla bụ nwa nke Chineke. Onye ọbụla n’elu ụwa oge ugbua ka ezitere ebe a n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ma otu ọ dị ọbụghị onye ọbụla na-edebe Okwu nke Amamiihe ma ọ bụ iwu nke ịdị ọcha mmekọrịta otu i si agbalị ime. Enwere ọtụtụ ndị dike na-eso ụzọ nke Kraịst ndị na-abụghị ndị otu nke Nzukọ nsọ nke a. Mana ha anaghị eje ozi mgbasa ozi ọma na ime emume nsọ niile niime ụlọ niile nke Onyenwe anyị n’aha nke ndị nna nna dị ka i si eme. Ahaghị inwe ihe ọzọ na ya—ma enwere.
Taa ọ ga-amasị m ilekwasị anya na nzube agbakwunyere nke baworo uru niime ndụ m. Na 1988 otu Onye Ozi nta ana-akpọ Russell M. Nelson kwuru okwu na Mahadum Brigham Young akpọrọ “Imeela maka Ọgbụgba ndụ ahụ.” Niime ya, Okenye Nelson mgbe ahụ kọwara na mgbe anyị na-eji ezi ohere nhọrọ anyị iji gbaa ma debe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke niile, anyị na-abụrụzi ndị nketa nke ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke Chineke meworo ya na ndị bu anyị ụzọ niime ọgbọ niile. Ekwuo ya n’ụzọ ọzọ, anyị na-abụrụzi “ụmụ nke ọgbụgba ndụ ahụ.” Nke ahụ na-edopu anyị iche. Nke ahụ na-enye anyị ohere ruo otu ụdị ngọzi niile ndị nna nna anyị ha na ndị nne nne anyị ha natara, gụnyere oke ọmụmụ.
Oke ọmụmụ! I nwere ike i nwụwo mkpụrụokwu ahụ. Anyị nakwa abụ abụ banyere ya: “O Ndị ntoroọbịa nke oke ọmụmụ nwere ugwu, gaaniihu, gaaniihu, gaaniihu!” Ọ bụ okwu mmanye. Mana kedụ ihe ọ pụtara?
N’oge Testament Ochie ọ bụrụ ma onye nna nwụọ, nwa ọkpara ya nwere oke na ọrụ maka ilekọta nne ya na ụmụ nne ya nwanyị. Ụmụnne ya ndị nwoke natara ihe nketa ha ma pụọ ịchọta aka ha niime ụwa, mana nwa ọkpara ahụ agaghị ebe ọbụla. Ọ ga-alụ nwunye ma nwee ezi na ụlọ nke onwe ya, mana ọ ga-anọ tutu ruo ngwụcha ụbọchị ya ịchị ihe niile banyere ala nke nna ya. Niihi oke na ọrụ nke a agbakwunyere, enyere ya atụ ihe nketa agbakwunyere. Ọ bụ na idu na ilekọta ndị ọzọ karịrị akarị ịrịọ? Ọ bụghị mgbe itulere ihe nketa enyere ya agbakwunyere.
Taa anyị anaghị ekwu banyere usoro esi mụọ niime ezi na ụlọ elu ụwa niile ma ọ bụ ọrụ niile okike ọmụmụ nke Testament Ochie. Anyị na-ekwu banyere ihe nketa nke ị natara dị ka ndị sokọtara Kraịst eketa oke niihi mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke ị họrọworo ịbanye gị na Ya na Nna gị bi N’eluigwe. Ọ karịrị akarị maka Chineke ịtụanya gị ibi ndụ dị iche karịa ụmụ Ya ndị ọzọ ka gị wee nwee ike duo ma jeere ha ozi? Ọ bụghị mgbe i tulere ngọzi niile—ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ—nke enyeworo gị.
Ọ bụ na oke ọmụmụ gị pụtara na gị ka mma karịa ndị ọzọ? Mba, mana ọ pụtara na atụrụ anya na gị ga-enyere ndị ọzọ aka dị mma karịa. Ọ bụ na oke ọmụmụ gị pụtara na a họọrọ gị? Ee, mana ọ bụghị ịhọrọ ịchị ndị ọzọ; a họọrọ gị ijere ha ozi. Oke ọmụmụ gị ọ bụ ihe akaebe nke ịhụnaanya nke Chineke? Ee, mana dị mkpa karịa, ọ bụ ihe akaebe na Ọ tụkwasịrị gị obi.
Ọ bụ otu ihe ịhụ gị naanya na ihe ọzọ kpamkpam ịtụkwasị gị obi. Niime ihe ndu Ume nke Ndị Ntoroọbịa, anyị na-agụ: “Nna gị bi n’Eluigwe tụkwasịrị obi na Gị. O nyewo gị nnukwu ngọzi niile, gụnyekọta uju nke ozi ọma na emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile dị nsọ na-arachikọta gị na Ya ma wete ike Ya niime ndụ gị. Na ngọzi ndị ahụ na-abịa oke na ọrụ agbakwunyere. Ọ maara na ị pụrụ imepụta ihe dị iche niime ụwa, ma nke ahụ na-achọ, n’ọtụtụ ọnọdụ, ịdị iche site n’ụwa.”
Nhụmiihe nke ndụ anụ ahụ anyị ka enwere ike ịtụnyere ụgbọ mmiri cruise nke Chineke ziteworo ụmụ Ya niile dị ka ha na-eme njem ha site n’otu ọnụ mmiri ruo na ọzọ. Njem ahụ juputara n’ohere niile iji mụta ihe, tolite, nwee obi ụtọ, ma gaaniihu, mana o juputakwara na ihe ize ndụ niile. Chineke hụrụ ụmụ Ya niile naanya ma nwere nchegbu banyere ọdịmma ha. Ọ chọghị ka onye ọbụla niime ha fụnahụ Ya, ya mere Ọ na-akpọku ndị ahụ dị njikere ịbụrụzi ndị otu ndị ọrụ Ya—nke bụ gị. Niihi nhọrọ gị ime ma debe ọgbụgba ndụ niile, Ọ na-enye gị ntụkwasị obi Ya. Ọ tụkwasịrị obi na gị ịdị iche, gbaa iche, ma n’ọpụ iche niihi ọrụ dị mkpa Ọ tụkwasịrị obi na gị ime.
Chee maka ya! Chineke tụkwasịrị obi na gị—onye ọbụla nọ n’ụwa, ụmụ nke ọgbụgba ndụ, ndị otu ọrụ Ya—iji nyee aka n’ọrụ Ya nke ịkpọta ụmụ Ya niile lọghachi ebe obibi na nchekwa. Ka a sịkwa ihe mere Onyeisi Brigham Young si kwuo otu mgbe, “Ndị mmụọ ozi niile dị n’eluigwe nọ n’ekiri ndị mmadụ ole ma ole nke a juru aka.”
Mgbe i legharịrị anya na ụgbọ mmiri cruise nke a akpọrọ ụwa, i nwere ike ịhụ ndị ọzọ nọdụrụ ọdụ n’oche ezumiike na-ańụ mmanya, n’eti okwe eri okwe niime casino, na-eyi uwe na-egosi ahụ ha niile, na-apị n’ekwe ntị enweghị nkwụsị, ma na-egbu nnukwu oge ịgba egwuregwu elecktronik. Mana kama ịdị na-eche, “Gịnị mere enweghị m ike ime nke ahụ?,” i nwere ike icheta na ịbụghị onye njem nkịtị. Ị bụ onye otu ndị ọrụ. I nwere oke na ọrụ nke ndị njem na-enweghị. Dị ka Nwanne nwanyị Ardeth Kapp kwuru otu mgbe, “Ị gaghị eyi onye [nchekwa] ndụ ọ bụrụ ma gị yie dị ka ndị ọzọ niile na-egwu mmiri na osimiri.”
Ma tupu gị enwee nkụda mmụọ site na ọrụ niile ndị ọzọ agbakwunyere, biko cheta na ndị otu ọrụ na-anata ihe ndị njem ndị ọzọ anaghị anata: ụgwọ ọrụ. Okenye Neil L. Andersen ekwuwo, “E nwere ike ime mmụọ a na-akwụ ụgwọ maka ndị ezi omume,” gụnyere “nkwenye dị ukwuu karịa, nnabata dị ukwuu karịa, na obisike dị ukwuu karịa.” Dị ka Abraham nke mgbe ochie, ị na-anata obi ụtọ na udo dị ukwuu karịa, ezi omume dị ukwuu karịa, na mmata ihe dị ukwuu karịa. Ụgwọ ọrụ gị abụghị naanị nnukwu ụlọ n’eluigwe na okporo ama ejiri ọlaedo chọọ mma. Ọ ga-adịrị Nna nke Eluigwe mfe ị nye gị nnọọ ihe niile O nwere. Ọchịchọ Ya bụ inyere gị aka bụrụzie ihe niile nke Ọ bụ. Site otu a, nkwa gị niile na-achọ karịa n’aka gị niihi na otu ahụ bụ otu Chineke si emepụta gị karịa.
Ọ bụ ihe “karịrị akarị ịrịọ mmadụ, mana unu bụghị nnọọ onye ọbụla”! Unu bụ ntoroọbịa nke oke ọmụmụ nwere ugwu. Mmekọrịta ọgbụgba ndụ gị na Chineke na Jizọs Kraịst bụ mmekọrịta nke ịhụnaanya na ntụkwasị obi nke na i nwere ohere ruo atụ karịrị akarị nke amara Ha—enyemaka Ha dị nsọ, onyinye dị nsọ nke mgbam ume, na ike nke na-enye ike. Ike ahụ abụghị nnọọ echiche ọchịchọ, amara nke chi ọma, amụma na-emezu onwe ya. Ọ dị irè.
Dị ka ị na-emejuputa oke na ọrụ oke ọmụmụ gị niile, ị nọghị naanị gị. Onyenwe anyị nke ubi vaịn so gị na-arụ ọrụ. Gị na Jizọs Kraịst so aka na aka na-arụ ọrụ. Na ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke ọbụla—na dị ka mmekọrịta gị na Ya na-emikpukwu—unu na-ejide onwe unu nke ọma nke ọma tutu ruo unu ejikọta ọnụ nke ọma. Niime ihe atụ dị nsọ nke amara Ya, ị ga-achọta ma ọchịchọ ma ume ibi ndụ kpọmkwem otu Onye Nzọpụta siri bie—dị iche site n’ụwa. Ị ga-emeli nke a niihi na Jizọs Kraịst nọnyeere gị!
Niime 2 Nifaị 2:6 anyị na-agụ, “Ya mere, mgbapụta na-abịa niime na site na Mezaya Dị Nsọ; niihi na o juputara na amara na eziokwu.” Niihi O juputara n’eziokwu, Ọ na-ahụ gị dị ka ị dị nezie—ntụpọ niile, adịghị ike niile, mmakwaara niile, na ihe niile. Niihi na O juputara na amara, Ọ na-ahụ gị dị ka i nwere ike ịdị n’ezie. Ọ na-ezute gị ebe ị nọ ma na-enyere gị aka ichegharị ma melite, merie ma bụrụzie.
“O Ndị ntoroọbịa nke oke ọmụmụ nwere ugwu, gaaniihu, gaaniihu, gaaniihu!” Ana m agba ama na ahụrụ gị naanya—ma atụkwasịrị obi na gị—taa, na afọ 20, na mgbe ebighị ebi niile. Erekwala oke ọmụmụ gị maka ngwọngwọ nri agwọrọ agwọ. Erekwala ihe niile maka ihe efu. Ekwekwala ka ụwa gbanwee gị mgbe a mụrụ gị ịgbanwe ụwa. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen