Idozi Uche Anyị ka o Kwekọọ na nke Ya
Isoro uche nke Onyenwe anyị na ndụ anyị ga-enye anyi ike ịchọta pel ahụ kachasị dị oke ọnụ ahịa n’ụwa— alaeze nke eluigwe.
N’otu oge, Onye Nzọpụta kwuru maka otu nwoke onye azụmahịa onye nọ na-achọ maka “pel ndị dị mma.” N’oge ahụ nwoke azụmahịa ahụ nọ na-achọ ya, ọ chọtara otu “nke oke ọnụ ahịa.” Kosiladị, nihi ọ chọrọ ịnweta pel ahụ magburu onwe ya, nwoke ahụ rere ihe onwunwe ya niile, nke ọ mere ọsịsọ ma n’obi ọṅụ.
Site na ụkabụilu nke a dị nke nke ma dị ezi uche, Onye Nzọpụta jiri ụzọ dị mma kuzie na alaeze nke Eluigwe dị ka ihe eji atụnyere otu pel enweghị ọnụ ahịa, n’ezie ọ bụ akụ ahụ kachasị dị oke ọnụ ahịa nke mmadụ kwesịrị ịchọ karịsịa ihe niile. Nke bụ eziokwu bụ na, nihi onye azụmahịa ahụ resịrị ihe onwunwe ya niile ozugbo iji nweta pel ahụ bara uru na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị kwesịrị ime ka uche anyị na ọchịchọ anyị kwekọọ n’uche Onyenwe anyị ma jiri obi anyị niile mee ihe niile anyị nwere ike ịme n’oge njem ndụ anụ ahụ anyị iji rute ngọzị ebighi ebi niile nke alaeze Chineke.
Iji tozuo oke maka ụgwọ ọrụ nke a dị nnukwu, anyị kwesịrịrị n’ezie, tinyere ihe ndị ọzọ, itinye mbọ anyị nke kachasị mma iji wezuga ọchịchọ niile nke nanị onwe ma hapụ ihe nkedo ndị na-adọla anyị azụ site na-itinye obi anyị niile n’ebe Onyenwe anyị nọ ma n’ebe ụzọ Ya ndị kachasị dị elu ma dịrị nsọ. Onye Ozi Pọl kpọrọ ịhe ọchịchọ niile ndị ahụ a na-edo nsọ dị ka “inwe uche nke Kraịst.” Dị ka Jizọs Kraịst gosiri n’ọmụma atụ, nke a pụtara “[ị na-eme] mgbe niile ihe ndị ahụ na-atọ [Onyenwe anyị] ụtọ” nime ndụ anyị, ma ọ bụ dị ka otu ụfọdụ na-ekwu n’oge ugbua, nke a bụ “ị na-eme ihe na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ.”
N’uche nke ozi ọma, “[ị na-eme] mgbe niile ihe ndị ahụ na-atọ [Onyenwe anyị] ụtọ” gbasakwara inyefe uche anyị n’okpuru uche Ya. Onye Nzọpụta jiri ezi uche kuzie mkpa nke ụkpụrụ nke a dị oge Ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ Ya ihe:
“Niihi na agbadatara m site n’eluigwe, ọ bụghị ime uche nke mụ onwe m, mana uche nke onye ahụ zitere m.”
“Ma nke a bụ uche nke Nna onye zitere mụ, na nime ihe niile nke o nyeworo m ekwesịghị m itufu ihe ọbụla, kama kwesịrị ịkpọlite ya elu ọzọ n’ụbọchị ikpeazụ ahụ.
“Ma nke a bụ uche nke ya onye zitere mụ, na onye ọbụla nke hụworo Ọkpara ahụ, ma kwenye na ya, ga enwe ndụ ebighị ebi: ma aga m akpọlite ya elu n’ụbọchị ikpeazụ ahụ.”
Onye Nzọpụta nwetere onwe ya n’okpuru Nna n’ụzọ zuru oke na ọkwa dị nsọ site na-ikwe ka e loba uche Ya n’ime uche nke Nna. Enwere mgbe o kwuru, “Ma onye ahụ zitere m nọnyere m: Nna ahụ ahapụghị m naanị m; niihi ana m eme mgbe niile ihe ndị ahụ na-atọ ya ụtọ.” Oge ọ na-akụziri Onye Amụma Josef Smith ihe banyere nhụjuanya na ihe mgbu niile nka Aja mgbaghara mmehie, Onye Nzọpụta kwuru:
“N’ihi na lee, Mụ, Chineke, tara ahụhụ ihe ndia n’ihi mmadụ nile, ka ha ghara ịta ahụhụ ma ọ bụrụ na ha ga-echegharị; …
“Ahụhụ nke mere ka mụ onwe m, ọbụna Chineke, onye kachasị elu, maa jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma na ahụ ma na mmụọ—ma chọọ ka m ghara ịn̄ụ iko ilu ahụ, ma kpọnwụọ—
“N’agbanyeghị nke ahụ, otuto dịrị Nna, ma eso m keta ma mesịa nkwadobe m niile nye ụmụ nke mmadụ.”
N’oge njem anyị nke ndụ anụ ahụ, mgbe ụfọdụ anyị na-agba mgba anyị na ihe anyị chere n’anyị maara , ihe anyị chere kacha mma, ma ihe anyị chere ga-arụrụ anyị ọrụ, ma hapụ ịghọta ihe ahụ Nna nke Eluigwe mara n’ezie, ihe ahụ kacha dị mma ebighi ebi, ma ihe ahụ ga-arụrịrị ụmụaka ọrụ nime atụmatụ Ya. Nnukwu mgba nke a nwere ike dị oke mgbagwoju anya, tụmadị mgbe atụlere amụma niile dị nime akwụkwọ nsọ maka ụbọchị anyị: “Nke a mara kwa, na n’ụbọchị ndị ikpeazụ … ụmụ mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha naanya, … ndị hụrụ obi ụtọ naanya karịa ndị hụrụ Chineke naanya.”
Otu ihe iriba ama nke na-egosi mmezu nke amụma ahụ bụ ihe nke a na-abawanye n’ụwa, nke ọtụtụ nabataworo, nke banyere otu ndị mmadụ si na-arukpunye onwe ha ma mgbe niile na-ekwupụta, “Nagbanyeghi ihe ọbụla, A na m ebi dị ka otu eziokwu m siri dị ma ọ bụ a na m eme ihe na-arụrụ m ọrụ.” Dị ka otu Onye Ozi Pọl kwuru, ha “na-achọ ihe nke onwe ha, nabụghị ihe ndị nke Jizọs Kraịst.”Ụdị echiche nke a ọtụtụ mgbe ka a na-achọ ịkpọ aha ọma ma were dị ka nke bụ“ezigbo ya” site n’aka ndị ahụ na-akpa agwa nke ọchịchọ nanị maka onwe, lekwasị anya na mmasị nke onwe, ma ọ bụ kpọọ aha ọma ụfọdụ omume ndị mgbe na mgbe na-adabaghị n’uche dị ịhụnaanya nke Chineke na uche Ya maka ha. Ọ bụrụ n’anyị kwe ka obi na uche anyị nabata ụdị echiche nke a, anyị nwere ike ịrọpụta ezigbote ihe mgbochi nye onwe anyị ịnwete pel ahụ dịkasị ezigbo ọnụ ahịa nke Chineke jiri ịhụnaanya kwadoro ụmụ Ya—ndụ ebighị ebi.
Ebe ọ bụ eziokwu na onye ọbụla niime anyị na-eje njem iso ụzọ nke ya n’okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ, na-agbalisịke idebe obi anyị na uche anyị ịdị niime Kraịst Jizọs, anyị kwesịrị ịkpachara anya na mụrụ anya mgbe niile ka aghara ịnwa anyị ọnwụnwa ịnabata ụdị nkuzi nke ụwa nke a nime ndụ anyị. Okenye Quentin L. Cook kwuru na “iji obi dị ọcha dịrị ka Kraịst bụ ebumnobi kacha dị mkpa karịa ị bụ nke ezigbo ya.”
Ezi ndị enyi m, mgbe anyị họọrọ ịkwe ka Chineke bụrụ ike mmetụta kachasị nime ndụ anyị wee megide ịhe ọchịchọ niile nke maka naanị onwe anyị, anyị nwere ike gaanihu na-ịbụ ndị na-eso ụzọ ma mụbaa ikikere anyị iji jikọta uche na obi anyị ha na nke Onye Nzọpụta. N’aka nke ọzọ, mgbe anyị ekweghi ka ụzọ Chineke merie na ndụ anyị, a na-ahapụ anyị n’onwe anyị, ma na-enweghi odudu nke Onyenwe anyị nke mmụọ kpatere, anyị nwere ike kpọọ ihe niile anyị na-eme ma ọ bụ k’anyị na-emeghị ihe ọma Anyị nwere ike mee ngụpụ maka onwe anyị site na-ịme ihe niile n’ụzọ nke onwe anyị, wee na-ekwu, “Anọ m nnọọ na-eme ihe n’ụzọ nke m.”
N’otu oge, mgbe Onye Nzọpụta na-ekwupụta ozizi Ya, ụfọdụ mmadụ, tụmadị ndị Farisii kpọrọ onwe ha ndị ezi omume, jụrụ ozi Ya ma na-atụghị egwu kwupụta na ha bụ ụmụ nke Ebreham, iji kwuo na agbụrụ ha ga-enye ha ohere ndị pụrụiche n’ebe Chineke nọ. Ụdị echiche ahụ duuru ha idabere na nghọta nke onwe ha ma iji ghara ikwere ihe ahụ nke Onye Nzọpụta na-akụzi. Omume nke ndị Farisii ahụ gosiri Jizọs bụ ihe aka ebe doro anya na agwa ha dị ka ha chere enyeghi ohere ọbụla n’obi ha maka okwu niile nke Onye Nzọpụta na ụzọ nke Chineke. Na azịza, Jizọs jiri akọnuche na obisike kwupụta na ọ bụrụ na ha bụ n’ezie ụmụ ọgbụgba ndụ nke Ebreham, ha ga-arụ ọrụ niile nke Ebreham, tụmadị mgbe atụlere na Chineke nke Ebraham guzoro nihu ha ma na-akụziri ha eziokwu ahụ n’oge ahụ nnọọ.
Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, dị ka ị na-ahụ, ime ihe na-uche na-agba ghara ghara banyere “ihe ahụ na-arụrụ mụ ọrụ” ya na ị na-eme “ịhe ndị ahụ na-atọ Onyenwe anyị ụtọ mgbe niile” abụghị ọmụme ọhụrụ nke nanị maka ụbọchị anyị. Ọ bụ echiche mgbe gboo nke gafere narị kwuru narị afọ ma ọtụtụ mgbe na-eme ka ndị nwere akọnuche kpuo isi na anya nke onwe ha ma gbagwojuo anya ma mee ka ọtụtụ ụmụ Chineke daa mba. Ụdị echiche nke a bụ, n’ezie, aghụghọ nke ochie nke onye iro; ọ bụ ụzọ aghụghọ nke na-eji wayọọ duhie ụmụ nke Chineke pụọ n’uzọ ọgbụgba ndụ ahụ ziri ezi ma kwesị ntụkwasị obi. Ebe ọnọdụ nke onwe ndị dị ka ịma aka niile nke agbụrụ, ebe ebi, na nke anụ ahụ na uche nwere ike ịmetụta njem anyị, niime ihe ndị dị mkpa n’ezie, enwere oghere dị niime ime ebe anyị nwere ohere ịhọrọ ma ọ bụ ma ọ bụghị na anyị ga-ekpebi ị họrọ isoro usoro ahụ nke Onyenwe anyị kwadoro maka ndụ anyị. N’ezie, “Ọ mere ntọala ma bute ụzọ, ma [kọwaa] isi ihe ọ bụla”
Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị nwere mmasị ije n’ụzọ ahụ nke ọ gosiri anyị n’oge ije ozi Ya n’ụwa. Anyị anaghị naanị enwe mmasị ịme uche Ya ma ihe niile ga-atọ Ya ụtọ mana ịchọkwa iṅomi Ya. Dị ka anyị na-agbalịsike ikwudesi ike n’elu ọgbụgba ndụ ọbụla nke anyị bara nime ya na bie ndụ “site n’okwu niile nke si n’ọnụ Chineke pụta,“ a ga-echekwa anyị site na idanye nime mmehie niile na njehie niile nke ụwa—mperi niile nke nkuzi na ozizi nke ga-eduhie anyị pụọ site n’ebe pel ndị ahụ kachasị dị oke ọnụ ahịa.
Mụ onwe m enwetewo mkpate mmụọ maka otu irubere Chineke isi n’ụzọ ime mmụọ dị otú ahụ si metụta ndụ nke ndị na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka ha na-ahọọrọ ime ihe ndị ahụ na-arụ ọrụ ma na-atọ ụtọ n’ihu Onyenwe anyị. Ama m otu nwa okorobịa onye obi na-erughi ala banyere ije ozi mgbasa ozi ọma mana nwete mkpali ijere Onyenwe anyị ozi mgbe ọ gere otu onye isi Nzukọ nsọ nwere ọkwa elu ntị dị ka ọ na-ekesa ịgba ama nke onwe ya na nhụmihe dị nsọ nke ije ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma.
N’okwu ọnụ nke onwe ya, nwa okorobịa nke a, onye buzi onye mgbasa ozi ọma lọghachiri, kwuru: “Dị ka m na-ege ịgba ama nke Onye Ozi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, enwetere m mmetụta nke ịhụnaanya Chineke nwere maka m, ma enwere m ọchịchọ ikesara ndị ọzọ ịhụnaanya ahụ. N’oge ahụ nnọọ a matara m na ekwesịrị m ije mishọn nagbanyeghi ụjọ, obi abụọ na nchegbu m niile. Enweterem mmetụta obisike maka ngọzi na nkwa niile nke Chineke nwere maka ụmụ Ya. Taa, abụ m mmadụ ọhụrụ; enwere m ọgbụgba ama na ozi ọma nke a bụ eziokwu ma na-eweghachiwo Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst n’elu ụwa.” Nwa okorobịa nke a họọrọ ụzọ nke Onyenwe anyị ma bụrụ ọmụmatụ nke ezi onye na-eso ụzọ n’ụdị ọbụla.
Otu nwa agbọghọ kwesịrị ntụkwasị obi kpebiri na ya agaghị emebi ụkpụrụ ya niile mgbe a gwara ya ka ọ na-eji ejiji na-ekwesịghị ekwesị iji dabara na ngalaba azụmahịa nke ụlọ ọrụ ejiji ebe ọ na-arụ ọrụ. Niihi nghọta na anụ ahụ ya bụ onyinye dị nsọ sitere n’aka Nna anyị nke Eluigwe ma bụrụ ebe Mmụọ nwere ike ibi, a kpaliri ya ibi ndụ nke ụkpụrụ dị elu karịa nke ụwa. Ọ nwetaghị naanị ntụkwasị obi nke ndị ahụ hụrụ ya ka ọ na-ebi ndụ nke eziokwu ozi ọma nke Jizọs Kraịst, kama chekwakwa ọrụ ya, bụ nke dị nnọ nwa obere oge ka a ga-achụ ya. Njikere ya ime ihe dị mma n’anya Onyenwe anyị, karịa ihe na-arụrụ ụwa ọrụ, mere ka ọgbụgba ndụ ya sikwuo ike n’etiti nhọrọ ndị siri ike.
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, ọtụtụ mgbe ka ụdị mkpebi dị otu a na ezute anyị nime njem anyị nke kwa ụbọchị. Ọ na-ewe obi dị ike na nke dị njikere ịkwụsịtụ ma nwee nnyocha obi dị eziokwu na nke dị umeala iji kwere ọnụnọ adịghị ike nke anụ ahụ nime ndụ anyị nke nwere ike igbochi ike anyị na-inyefe onwe anyị n’aka Chineke, ma n’ikpeazụ kpebie ịnakwere ụzọ Ya karịa nke anyị onwe anyị. Nnwale kachasi elu eji amata ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ ka a na-ahụ na njikere anyị ịhapụ ma jụ onwe anyị nke ochie ma nyefee obi anyị na mkpụrụ obi anyị dum n’aka Chineke ka uche Ya bụrụ nke anyị.
Otu niime oge kachasị dị ebube na ndụ anụ ahụ na-emekarị mgbe anyị chọpụtara ọṅụ ahụ nke na-abịa mgbe ịme mgbe niile ihe ndị ahụ “na-arụ ọrụ ma na-amasị Onyenwe anyị” na “ihe dị na-arụrụ anyị ọrụ” abụrụ otu ụdị ihe! Iji kpachapụ anya na n’enweghị mgbagha na ime uche Onyenwe anyị nke anyị ga-ewe ịbụ onye na-eso ụzọ dị ebube na dike! N’oge ahụ dị oke mma, anyị abụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ma anyị enyefee Ya uche anyị kpamkpam. Ụdị nrubeisi nke ime mmụọ dị otu ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, mara mma, dị ike, ma nwee ike ibute mgbanwe.
Ana m agbara unu ama na isoro uche nke Onyenwe anyị na ndụ anyị ga-enye anyi ike ịchọta pel ahụ kachasị dị oke ọnụ ahịa n’ụwa— alaeze nke eluigwe. Ọ bụ ekpere m na onye ọbụla niime anyị, n’oge ma n’ohere anyị, ga-enwe ike kwupụta, jiri ọgbụgba ndụ dị ike, nye Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst na “ihe ọbụla na-arụrụ Ya ọrụ, na-arụrụ m ọrụ.” Ana m ekwu ihe ndị a n’aha nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, amen.