Ọgbakọ Zuru ọha
Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’Ụbọchị Ndụ niile
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’Ụbọchị Ndụ niile

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị na-eme ibi ndụ kwa ụbọchị adị nsọ. Ọ na-akpọkete anyị nso ma nye ọńụ karịa n’ebe Onyenwe anyị na onye ọbụla na ibe ya nọ.

Nzukọtagharị nke ezi na ụlọ Gong anyị mere na nso nso a gụnyere mkpori ndụ igosị akaraka, zuru oke na mgbakwunye ịsọ mpi ihe ịtọ ọchị niile nke papa.

Mana ịsọmpi nke a abụghị ihe ana enwekarị. N’otu otu ka Nna nna (mụ) nọ na ụmụ ụmụ abụọ, ndị gbara afọ 12 na 11. N’otu nke ọzọ ka enwere usoro artificial intelligence (AI) nke Cousin Peter kpalitere ka ọ gwa papa ihe ndị na-atọ ọchị n’ụkpụrụ nke Gerrit W. Gong. Nna nna Gerrit Gong megidere AI Gerrit Gong.

Ụmụ ụmụ ahụ na mụ buru ụzọ gaa.

Kedụ ihe ị ga-akpọ daịnosoo nke kụkasịrị ụgbọala ya? Tyrannosaurus Wrecks.

AI Gerrit Gong ka agwara—chee echiche ka Gerrit W. Gong. Kwuo okwu dị ka ya.

AI Gerrit Gong—“Nke a bụ okwu ịtọ ọchị onye nna dị nnọọ ka ọ bụ Gerrit W. Gong kwuru ya, na-anabata ụkpụrụ ya na-atọ obi ụtọ, ana echebara echiche, ma na-ebugo elu: Gịnị mere osisi ahụ dị umeala ji eme ndị mmadụ ịchị ọchị? Niihi na ọ gbakwasịrị ụkwụ na ịhụnaanya ma rute ndị ọzọ site na alaka niile nke obi ọma. Dị ka osisi ahụ, anyị onwe anyị kwa nwere ike chọta ume niime mgbọrọgwụ anyị na ọńụ na-ime ka obi ọma rute ndị ọzọ.”

Ọ dị mma, gịnị ka i chere? Ọ bụ ihe mere ejiri kpọọ ha okwu ịtọ ọchị niile nke papa.

Na gburugburu anyị niile ka e nwere ọtụtụ ohere ịchị ọchị, inwe ańụrị, iji anya obi ekele hụ ihe. Nke anyị bụ ozi ọma nke ańụrị na ịdị nsọ n’ụbọchị ndụ niile. Ịdị nsọ na-edokwa ihe niile iche site na ebumnuuche dị nsọ. Mana ịdị nsọ nakwa akpọku anyị itinye ibi ndụ kwa ụbọchị site n’ịdị nsọ—ịńụrị ọńụ na nri nke ụbọchị n’etiti uke na ogwu nke ụwa nke a. Isoro Onyenwe anyị jee ije, anyị ahaghị ịghọ ndị dị nsọ, niihi na Ọ dị nsọ, ma iji nyere anyị aka dịrị nsọ, Onyenwe anyị na-akpọku anyị iso Ya jee ije.

Onye ọbụla niime anyị nwere otu akụkọ. Dị ka Mụ na Nwanne nwanyị Gong na-ezute unu—ndị otu Nzukọ nsọ na ndị enyi n’ọtụtụ ebe na ọnọdụ dị iche iche—akụkọ unu banyere ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile na-akpatemmụọ anyị. Unu na-ebi ndụ asụsụ bekee kpọrọ C asaa: mmekọrịta unu na Chineke, ogige ebe ebi na mịiko n’etiti onye na ibe ya, mkpebi na gbụgba ndụ unu na Chineke, ezi na ụlọ na ndị enyi—hiwere isi na Jizọs Kraịst.

Aka ebe na-aganiihu wepụtara ihe eziokwu nke a bụ ịgba: ndị kwenyere na-okpukperechi n’ụzọ dị mma na-akacha enwe ańụrị, enwe ahụ ike karịa, ma akacha enwe afọ ojuju karịa ndị ahụ na-enweghị mkpebi nke ime mmụọ ma ọ bụ njikọta. Ańụrị na ndụ ojuju afọ, ahuike nke uche na nke anụ ahụ, mpụtara na ebumnuuche, agwa na omume ọma, ogo mmekọrịta dị nso, ọbụna nkwụsị ike nke ihe banyere ego na akụrụngwa—n’ụzọ ọbụla, ndị omenaala okpukperechi na-eme nke ọma.

Ha na-enwekarị ahụike nke anụ ahụ na nke uche kacha mma na ndụ ojuju afọ kacha ukwuu n’ofe ogo afọ niile na otu dị iche iche nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’obodo.

Ihe ndị nnyocha kpọrọ “usoro nkwụsi ike okpukperechi“ na-enye ido anya, ebumnuuche, na mkpatemmụọ n’etiti ntụgharị niile na mgbanwe ọnọdụ niile nke ndụ. Ndị otu ezi na ụlọ nwere okwukwe na Ndị nsọ bi otu ebe na-ebuso mwezuga onwe na igwe mmadụ nọpụrụ iche agha. Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị na-asị mba nye nkwutọ Chineke, “mba” nye ikwu okwu mkparị imegide ndị ọzọ, “mba” nye algọridim nke na-eme iwe a bụrụ ego ma bute nkewa. Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị na-asị “ee” nye ihe dị nsọ ma ana enye nsọpụrụ, “ee” nye anyị ịghọ ndị kachasị nwere onwe ha, ndị kachasị nwee obi ụtọ, ndị kachasị zie ezie, ndị kachasị mma n’onwe anyị dị ka anyị na-eso Ya n’okwukwe.

Gịnị ka ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile dị ka ya?

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile yiri ka ndị dimkpa nta abụọ kwesịrị ntụkwasị obi, mere alụmdi otu afọ, na-akọ site n’ịbụ eziokwu na adịghị ike ọgbụgba ndụ niile nke ozi oma, aja, na ozi niime ndụ ha na-amalite amalite.

Ọ malitere, “N’ụlọ akwụkwọ dị elu, a nọọrọ m n’ebe gbara itiri. O metụrụ m dị ka Chineke anọnyereghị m ebe ahụ. Otu abalị, otu edereede sitere n’aka otu enyi sịrị, ‘Hei ị gụọla Alma 36 mgbe ọbụla?’

“Dị ka m malitere ịgụ,” ọ sịrị, “ejuputara m na udo na ịhụnaanya. O metụrụ m ka amakụrụ nke ukwuu. Mgbe m gụrụ Alma 36:12, a maara m na Nna nke Eluigwe hụrụ m ma matara kpọm kwem otu o si na-emetụta m.”

Ọ gara niihu, “Tupu anyị alụọ, anara m akwụwa aka ọtọ n’ihe onye chọrọ ịlụ m nke mere na enweghị m nnukwu ama gbasara ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. Gịnị mere Chineke ji chọọ anyị inye Ya ego ebe ndị ọzọ nwere nnukwu ihe inye? Onye chọrọ ịlụ m nyere aka kọwaa na ọ bụghị ihe gbasara ego mana isoro iwu nsọ nke enyere anyị. Ọ mara m aka ịmalite ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri.

“N’ezie a hụrụ m ka ama m na-eto,” ka o kwuru. “Mgbe ụfọdụ ego na-esi ike, mana anyị hụrụ ọtụtụ ngọzi dị ukwuu, ma mgbe ụfọdụ ego ndị a kwụrụ n’ụgwọ ọnwa na-ezu.”

Ọzọkwa, “niime klaasị ndị nọọsụ m,” ọ sịrị, “a bụụrụ m naanị onye otu Nzukọ nsọ ahụ na naanị onye mere alụmdi. Ọtụtụ mgbe ana m ahapụ klaasị n’iwe ma ọ bụ na-akwa niihi na m chere na ndị otu klaasị m họpụtara naanị m ma na-ekwu okwu ọjọọ banyere nkwenye m niile, mụ iyi gamentị m ha, ma ọ bụ mụ ịlụ di mgbe m ka dị oke nta.

Otu ọ dị ọ garaniihu, “N’ọkara afọ agụmakwụkwọ nke a gara aga a mụtara m otu kacha mma iji kwupụta nkwenyem niile ma bụrụ ezigbo onye eji amaatụ ozi ọma. Mmata ihe na ama m toro niihi na-anwalere m na ịdị ike m iguzoro naanị m ma sie ike niihe m kwenyere.”

Di ahụ dị nta gbakwunyere, “Tupu mishọn m e nwere ọtụtụ ohere enyere m ịkụ kọleji baseball. Ime mkpebi ahụ siri ike, ewezugara m ohere ndị ahụ enyere m ma gaa ijere Onyenwe anyị ozi. Enweghị m ike iji ihe ọbụla ọzọ gbanwee afọ abụọ ndị ahụ.

“Ịlọta n’ebe obibi,” ọ sịrị, a tụrụ m anya mgbanwe tara akpụ mana hụta onwe m isi ike karịa, ime ihe ọsịsọ karịa, ma nwee ahụ ike karịa. Anaara m atụsi ike karịa ka m naara eme mgbe m pụrụ. Enwetere m ohere karịrị akarị iji kụọ bọl karịa mgbe m hapụrụ, tinyere ụlọ akwụkwọ uche m nọ na ya. Ma, nke kachasị dị mkpa,” ọ sịrị, “a dabeere m n’aka Onyenwe anyị karịa ka ọ dị na mbụ.”

O mechiri, “Dị ka onye mgbasa ozi ọma a kuziri m na Nna nke Eluigwe kwere anyị nkwa ike n’ekpere anyị, mana mgbe ụfọdụ ana m echefu nke ahụ maka onwe m.”

Akụ anyị nke ngọzi niile nke ịdị nsọ ndị mgbasa ozi ọma nye Onyenwe anyị bara ụba ma ju eju. Ego niile, itinye oge, na ọnọdụ ndị ọzọ ọtụtụ mgbe anaghị adịcha mfe. Mana mgbe ndị mgbasa ozi ọma gbara afọ niile na ihe niile eji mara mmadụ na-edo ịdị nsọ nye Onyenwe anyị nsọ, ihe niile pụrụ imezu n’oge na n’ụzọ nke Onyenwe anyị.

Ugbua site na nhụnuuche nke afọ 48, otu nnukwu onye mgbasa ozi ọma kọwara, “Papa m chọburu ka m nweta agụmakwụkwọ kọleji, ọ bụghị ịga mishọn. Obere oge nke ahụ mechara, o nwere obi nkuchi ma nwụọ ka ọ gbara afọ 47. E nwere m ikpe ọmụma. Olee otu m ga-esi emezi ihe niile mụ na nna m?

“Ka emesịrị,” ọ garaniihu, mgbe m kpebichara ije ozi mishọn, a hụrụ m nna m na nrọ. Nwee udo na afọ ojuju, obi tọrọ ya ụtọ na m ga-eje ozi.”

Onye nnukwu mgbasa ozi ọma nke a garaniihu, “Dị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nkeji nke 138 na-akuzi, e kwere m na nna m nwere ike ije ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma n’ụwa mmụọ. Ahụtara m nna m ka ọ na-enyere nna nna m ochie aka, onye hapụrụ Germany mgbe ọ gbara afọ 17 ma funarị ezi na ụlọ ahụ, ahụkwa ya ọzọ.”

Nwunye ya gbakwunyere, “N’etiti ụmụnne ndị nwoke ise nọ na ezi na ụlọ di m ha, anọ ndị jere ozi mishọn bụ ndị nwere digrii kọleji.“

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile yiri ka nwata onye mgbasa ozi ọma na-alọta alọta onye mụtara ikwe ka Chineke merie n’ime ndụ ya. N’isi mbụ, mgbe a gwara ya ka ọ gọzie mmadụ onye ahụ na-esighị ike nke ukwuu, onye mgbasa ozi ọma nke a sịrị, “Enwere m okwukwe; aga m agọzi ya ịgbake. Otu ọ dị, ”onye mgbasa ozi ọma ahụ na-alọta alọta na-asị, “Amụtawo m n’oge ahụ ikpe ekpere na-abụghị maka ihe m chọburu mana maka ihe Onyenwe anyị maara n’onye ahụ chọrọ. Agọziri m nwanne nwoke ahụ ka o nwee udo na nkasi obi. O mechara nwụọ n’udo.”

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile na-emetụta dị ka ire ọkụ na-erefe n’akwa mgbochi ijikọta, inye nkasi obi, na ịgba ume. Onye nlekọta anya nọ n’otu mahadum a maara nke ọma sịrị na ọ na-eme ya ka ndị ya ma naanị site n’aha ọma na-ekpere ya ekpere. Ndị mmadụ ndị ahụ nyefere ndụ ha kpam kpam na mahadum ahụ ma gaaniihu na-eleba anya niihe gbasara ozi ya na ụmụ akwụkwọ.

Otu nwanne nwanyị na-eme ihe kachasị mma o nwere ike ime ụbọchị ọbụla, mgbe di ya na-ekwesịghị ntụkwasị obi hapụrụ ya na ụmụ ya gachara. Ọ na-amasị m nke ukwuu ma ndị ọzọ dị ka ya. Otu ụbọchị mgbe ọ na-apịalisi akwa ọ sara asa, aka ya nọ n’elu ukwu akwa ya, ọ maara onwe ya ọsụ, “Olee dị ihe bụ isi ya?” O metụrụ ya ka olu dị nro na-enye ya mmasi obi ike, “Ọgbụgba ndụ gị niile nọnyeere m.”

Ihe ha ka afọ 50, nwanne nwanyị ọzọ nwere oke agụụ maka mmekọrịta ya na nna ya. “Mgbe ọ na-etolite,” ọ sịrị, “e nwere ụmụnne m ndị nwoke na nna m, ma emesịa e nwee mụ—naanị nwa nwanyị. Ihe niile m chọburu kemgbe niile bụ ‘ịdị mma nke ọma’ maka papa m.

“Emesịa, nne m nwụrụ! Ọ bụụrụ naanị ya nwere njikọ n’etiti mụ na nna m.

“Otu ụbọchị,” a nụrụ m olu na-asị, ‘kpọkuo papa gị ma kpọrọ ya ka gị na ya gaa tempụl.’ Nke ahụ bụ mmalite nke ugboro abụọ n’ọnwa ụbọchị nke mụ na papa m ije n’ụlọ nke Onyenwe anyị. A gwara m papa m na m hụrụ ya naanya. Ọ gwara m na ya hụkwara m naanya.

“Itinye oge n’ụlọ nke Onyenwe anyị agwọwo anyị. Mama m enweghị ike nyere anyị aka n’ụwa. O were ya ị nọ n’akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ iji nye aka mezie ihe tiwara etiwa. Tempụl mejupụtara njem anyị n’izuoke gburugburu dị ka ezi na ụlọ dị ebighị ebi.”

Nna ahụ sịrị, “Nraranye nke tempụl ahụ bụụrụ nnukwu nhụmiihe nke ime mmụọ n’ebe m nọ na naanị otu nwa m nwanyị. Ugbua anyị na-agakọta ọnụ ma na-enweta mgbam ume n’ịhụnaanya anyị.”

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile gụnyere oge ndị dị nro mgbe ndị anyị hụrụ naanya gafere. Na mmalite nke afọ nke a, ezigbo nne m, Jean Gong, nwụrụ ụbọchị ụbọchị ole ma ole tupu ncheta ọmụmụ nke afọ 98 ya.

Ọ bụrụ na ị jụọ nne m, “Ụzọ nkume, chọkọlet jinja ọcha, ma ọ bụ strawberry ice cream ọ ga-amasị gị?” Mama ga-asị, “Ee, biko, m nwere ike detụ nke ọbụla ire?” Onye pụrụ ị sị nne gị mba, nke ka nke mgbe ihe ụtọ niile nke ndụ na-amasị ya?

A jụrụ m mama otu mgbe olee mkpebi ndị kachasị dozie ndụ ya.

Ọ sịrị, “Ị bụ onye otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a e mere baptizim na ịpụwa site na Hawaịị ruo n’ala ala, ebe m zutere nna gị.”

Onye e mere baptizim dị ka onye gbara afọ 15, naanị onye otu nke ezi na ụlọ ya buru ibu isonye Nzukọ nsọ anyị, nne m nwere okwukwe ọgbụgba ndụ na ntụkwasị obi niime Onyenwe anyị nke gọziri ndụ ya na ndị ndudugandu ezi na ụlọ anyị niile. Ana m atụ uche nne m, dị ka unu na-atụ uche ndị otu nọ na ezi na ụlọ unu. Mana a ma m na nne m alaala. Ọ nọghị nnọọ ebe a ugbua. Ana m asọpụrụ ya na ndị niile gafere dị ka ndị dị ike eji amaatụ banyere ịdị nsọ ụbọchị niile nye Onyenwe anyị.

Ọ bụ eziokwu, ịdị nsọ nye Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ niile gụnyere ị na-abịakwute Onyenwe anyị ọtụtụ mgbe n’ụlọ nsọ Ya. Nke a bụ eziokwu, ma ọ bụ na anyị bụ ndị otu Nzukọ nsọ ma ọ bụ ndị enyị.

Ndị enyi atọ bịara mmepe ụlọ Tempụl nke Bangkok Thailand.

“Nke a bụ ebe a na-enweta ọgwụgwọ dị egwu,” ka otu onye kwuru.

Niime ebe ana eme baptizim, onye ọzọ sịrị, “Mgbe m nọ ebe a, a chọrọ m ka asachaa m ma hapụ imekwa mmehie ọzọ.“

Onye nke atọ sịrị, “I nwere ike inwe mmetụta ike nke ime mmụọ?”

Site na mkpụrụokwu iteghete dị nsọ, tempụl anyị niile na-akpọku ma na-ama ọkwa:

“Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị.

“Ụlọ nke Onyenwe anyị.”

Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị na-eme ibi ndụ kwa ụbọchị adị nsọ. Ọ na-akpọkete anyị nso ma nye ọńụ karịa n’ebe Onyenwe anyị na onye ọbụla na ibe ya nọ ma kwadoo anyị ibinyere Chineke Nna anyị, Jizọs Kraịst, na dị anyị hụrụ naanya.

Dị ka enyi m mere, i nwere ike inwe ịtụnaanya ma ọ bụ na Nna gị nke Eluigwe ọ hụrụ gị naanya. Ọsịsa ya bụ eeh, na-ehi ụda! Anyị nwere ike inwe mmetụta ịhụnaanya Ya dị ka anyị na-eme ịdị nsọ nye Onyenwe nke anyị ụbọchị ọbụla, nwee obi ụtọ ma ruo mgbe ebighị ebi. Ka anyị mee otu a, ka m na-arịọ n’aha nsọ nke Jisọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Site n’oge Agba Ochie, akuziiri anyị, “Ya mere unu ga-edo onwe unu nsọ, ma unu ga-adị nsọ; niihi na-adị m nsọ” (Levitikọs 11:44). Anyị ga-eje ije n’ịdị nsọ niihu Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:69), guzoro n’ebe niile dị nsọ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 45:32), dobe Ụbọchị izu ike nsọ (lee Ọpụpụ 20:8), yie gamentị niile dị nsọ (lee Ọpụpụ 29:29), jiri otite mmanụ dị nsọ mee ihe (lee Ọpụpụ 30:25), bụrụ ndị a gọziri agọzi site n’aka ndị amụma dị nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:46), ma dabere n’elu akwụkwọ nsọ dị nsọ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:11), iwu niile dị nsọ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:20), na ndị mmụọ ozi dị nsọ (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 20:6). Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị bụ ihe emere iji gọzie ihe niile gbasara ndụ anyị kwa ụbọchị.

  2. Lee Moses 6:34.

  3. Lee “Okpukperechi na Ndụ nke Ime mmụọ: Nkwa ọrụ niile maka Ọdịmma Kacha mma?,” Gallup Blog, Oct. 10, 2023, news.gallup.com. “Gburugburu ụwa, ndị kacha nwee mkpebi nye ndụ nke ime mmụọ ma ọ bụ okpukperechi nwere ọdịmma kacha mma n’ọtụtụ ụzọ”—gụnyere mmetụta uche bara uru, ezi ebumnuuche, isonye niihe omume n’obodo, na njikọ niihe ọha na eze niile (Okwukwe na Ọdịmma: Njikọ Zuru ụwa niile dị n’etiti Ndụ nke ime mmụọ na Ọdịmma [2023], 4, faithandmedia.com/research/gallup).

  4. Nhụmiihe ọbụla eńomiri bụ ihe akọwara—site na mmasị m na inye ekele m—na mkpụrụokwu nke ndị mmadụ so na ya na site na ikikere ha.

  5. Taa niime Nzukọ nsọ, ndị dimkpa nta gbara afọ n’agbata 18-35 (gụnyere ma ndị dimkpa nta na-emebeghị ọlụlụ na ndị dimkpa nta mere ọlụlụ) na ndị dimkpa na-emebeghị ọlụlụ (gbara afọ n’agbata 36-45) mejuputara otu ụzọ n’ụzọ atọ (32.5 pasent) nke ozugbo ndị otu Nzukọ nsọ. Niime nde 5.623 nke ndị otu Nzukọ nsọ ndị ahụ, ndị dimkpa nta gbara n’etiti afọ 18-35 ozugbo ọnụ ọgụgụ nde 3.625 (nke 694,000 niime ha mere ọlụlụ), na ndị dimkpa na-emebeghị ọlụlụ gbara afọ 36-45 ozugbo ọnụ ọgụgụ dị nde 1.998. Ndị dimkpa nta na ndị dimkpa na-emebeghị ọlụlụ pụrụ iche; nke ọbụla niime ha dị oke ọnụ ahịa. Nke ọbụla niime ha nwere akụkọ nke onwe onye banyere okwukwe, ime ọchịchọ, ịdị uchu, na ọmịiko. Ọmụmaatụ ndị a kọrọ ebe a bụ ihe nnọchi anya nke usoro akụkọ na nhụmiihe ndị dị ịrịba ama nke ndị dimkpa nta na ndị nke na-emebeghị ọlụlụ kọrọ dị ka m na-ezute unu n’ọtụtụ ntọ na ọnọdụ niile n’ofe Nzukọ nsọ.

  6. Nke na-eme ugbua, ihe ruru 77,500 ndị mgbasa ozi mgbasa ozi ọma na-eje ozi na mishọn dị 450 na gburugburu ụwa. Nke a gụnyere ndị mgbasa ozi ọma nta na-enye nkuzi, mana ọbụghị 27,800ndị ozi mgbasa ozi ọma agadi na ndị ji aka ha wepụta onwe ha ogologo oge, Akụkọ onye mgbasa ozi ọma ọbụla, site na nkwadobe ruo na-ije ozi ma lọta, bụ onye na onye ma juputa n’ịdị nsọ nye Onyenwe anyị niime nhụmiihe nke onwe onye.

    Ọtụtụ nhụmiihe onye mgbasa ozi ọma na-egosịpụta nsoro nke ime mmụọ. Nke a gụnyere ama nke onye ahụ banyere echeghị maka onwe n’ịkpọku na inyere ndị ọzọ aka bịakwute Jizọs Kraịst na banyere onye mgbasa ozi ọma ahụ ịghọ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na onye mgbasa ozi ọma Kwusaa Ozi ọma M. Ndị mgbasa ozi ọmaKwusaa Ozi ọma M ka agbanwere, ọbụna nwogharịa, site na nhụmiihe ama ha niile. Ha na-amụta ịhụ ndị ọbụla, ebe niile, asụsụ niile, na omenaala niile naanya. Ha na-eweta na mmezu amụma e buru site na-iwete ozi ọma nke ańụrị banyere uju nke ozi ọma nke Jisus Kraịst eweghachitere nye mba niile, ala ụmụnna niile, na ndị mmadụ. Ha na-ahụta ihe dị mma niime na na-amụ ibikọta ha na onye nsiso ọbụla. Ha na-arụ ọrụ ha na ndị otu, ndị ndu, na ndị enyi niime ọtụtụ ọnọdụ na ebe onye siri pụta, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Kwusaa Ozi ọma M, ndị mgbasa ozi ọma na-azụlite okwukwe na ntụkwasị obi. Ha na-ehiwe ịbụ onye nsiso dị nsọ. Ha na-amụta na nrube isi na-ewete ngọzi niile na ọrụ ebube niile. N’igwe ụzọ nke onwe ndị ọzọ, n’ezie ha na-aghọ ma na-amata site n’ọgbụgba ndụ na: “Abụ m onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke” (3 Nefi 5:13).

  7. Ụfọdụ niime ndị otu Nzukọ nsọ anyị kachasị kwesị ntụkwasị obi ma nwee mgbam ume, ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke na-ahụta onwe ha izute ọnọdụ niile ha na-enweghị ike tụọ anya ma garaghị enwe ike ịhọrọ. Ezigbo Ndị nsọ ndị a na-aganiihu, ụtụtụ na abalị, ọtụtụ mgbe na-echere Onyenwe anyị. Onyenwe anyị maara banyere onye ọbụla, ma dị ka ọmụmaata nke a ji nwayọọ na-akọwa, na-achọ inye mgbam ume ma kwadoo onye ọbụla niime anyị n’oge Ya na n’ụzọ Ya.

  8. E nwere oke agụụ maka mmekọrịta n’etiti ndị nne na nna na ụmụntakịrị. Obi juru m n’ekele nke ukwuu maka ọnọdụ ọbụla niime nke, ọbụna ka ọtụtụ afọ gasịrị, mkpezi, mgbaghara, na ịnọ na ọgbụgba ndụ bụ ihe ndị ekewapụtara ma ọ bụ weghachite. Ezigbo nwanne nwanyị nke a achọghị ka onye ọbụla chee echiche na-erujighi afọ maka nna ya. Ọ sịrị, “Ọ bụ ezigbo onye ndu ma kwesị ntụkwasị obi na ezigbo nna.”

  9. Otu igbuduokwu banyere ịzụ ụmụaka ka ahaziri n’ụzọ dị omimi site na otu esi zụọ ha, otu ọ dị ha na-echetakarị ntakịrị ihe banyere oge ha dị nta mgbe nne ha na-ezughị ike, na-echeghị maka onwe na-enye ọzụzụ. Mkpụrụokwu niile ezughị ịkọwa eziokwu na nghọta, ịhụnaanya, na obi ekele m maka nna na nne m gbasara agbasa ma mikpuo niime mgbe bịara bụrụ di, onye nna, na nna nna. Na ntụgharị uche na ọdịdị nke ndudugandu banyere atụmatụ nke atụmatụ nke ańụrị, anyị nwere ike, n’enyo tempụl niile nke ebighị ebi, hụ onwe anyị dị ka onye nne, nne nne, nne nnenne, oke nwa nwa n’ụzọ nke ọzọ.

  10. Taa, were ya na ihe ruru pasent 60 nke ndị otu Nzukọ nsọ na gburugburu ụwa bi ihe ruru maịlụ 50 (80 km ma ọ bụ ihe ruru ịga njem otu awa n’ọtụtụ ebe) nke ụlọ nke Onyenwe anyị. N’afọ ndị na-abịa abịa, dị ka arụchara tempụl ndị a mara ọkwa ha, were ya na ọkara atọ n’ụzọ anọ nke ndị otu Nzukọ nsọ ga-ebi niihe ga-ewe otu awa rute ụlọ nke Onyenwe anyị. Site na ndabere ọnọdụ niile, nke ahụ bụ ihe atụrụanya dị nso nke ọma ịgakwuru Onyenwe anyị niime ụlọ nsọ Ya ọtụtụ mgbe, site otu ahụ na-agọzi ndudugandu niile nke ndị otu ezi na ụlọ dị oke ọnụ ahịa, nakwa onwe anyị na ndị agbụrụ anyị.

  11. N’elu tempụl niile anyị, atụ ihe akanyere bụ “ịdị nsọ nye Onyenwe anyị, Ụlọ nke Onyenwe anyị.” Tempụl ole ma ole gụnyere ihe karịrị nkanye nke a, ụdị dị ka ịgbakwunye aha nke Nzukọ nsọ ahụ. Tempụl ole ma ole nwere nkanye ahụ akpọdere isi n’ala: “Ụlọ nke Onyenwe anyị, Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị” (na Atlanta, Los Angeles, na San Diego na United States). Nkanye nke Logan tempụl n’ụzọ dị mfe kwuru, “Ịdị nsọ nye Onyenwe anyị.”