Ọgbakọ Zuru ọha
Ifufe Ahụ Akwụsịghị Ife
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2024


9:45

Ifufe Ahụ Akwụsịghị Ife

Anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịga n’ihu n’ime njem ha nke ịnata ngọzi niile nke Chineke.

N’afọ 2015, na steeti nke Pernambuco, Brazil, ndị otu J. Reuben Clark Law Society jikọrọ aka ha na ụlọ ọrụ Onye ọka iwu steeti n’ịchọpụta ihe ịmaaka niile iwu nke ndị bi n’ụlọ anọ dị iche iche ebe a na-elekọta ndị agadi. Ruo awa ise n’otu Satọde, ndị ọkaiwu a gbara ihe karịrị mmadụ 200 bi n’ebe ahụ ajụjụ ọnụ n’otu n’otu, nke ọbụla na ndị ọha mmadụ na-echefuola n’ime ihe omume.

N’oge a gbara ha ajụjụ ọnụ, ha chọpụtara ọtụtụ mpụ e mesoro ndị agadi bi n’ebe ahụ dị ka ịgbahapụ, mmeso ọjọọ, na iri ego n’ụzọ na-ezighị ezi. Otu isi ogidi nke otu iwu obodo nke a bụ ilekọta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Naani ọnwa abụọ ka e mesịrị, ọkaiwu ahụ gbara akwụkwọ n’ụzọ gara nke ọma megide ndị ahụ mere omume ọjọọ.

Enyemaka ha bụ ezigbo ihe ịma-atụ nke nkuzi Eze Benjamin “na mgbe unu nọ n’ijere mmadụ ibe unu ozi unu nọ nanị n’ije ozi nke Chineke unu.”

Otu onye obibi m gbara ajụjụ ọnụ n’onwe m n’oge ọrụ pro bono bụ nwanyị dị afọ 93 nwere obi ọma a na-akpọ Lucia. Ebe o nwere obi ekele maka ozi anyị, o ji egwuregwu tie, “Lụrụ m!”

N’ịtụnaanya, A zara m: “Lee n’ebe ahụ na ọmarịcha nwa agbọghọ ahụ! Ọ bụ nwunye m na onye ọka iwu steeti.”

Ọ zaara ọsọsọ: “Gịnị ji mee? Ọ bụ nwata, mara mma, ma nwere ike ịlụ di ọzọ n’ụzọ dị mfe. Naanị ihe m nwere bụ gị!”

Ndị ọmarịcha ndị bi ebe ahụ edozibeghị nsogbu ha niile n’ụbọchị ahụ. Na-arụghị ụka ha gara n’ihu na-enweta ihe isi ike mgbe na mgbe dịka ndị Jared n’ime ụgbọ mmiri ha na njem ịma-aka ruo n’ala ahụ e kwere na nkwa, “nke e liri n’ogbu nke oke osimiri, n’ihi oke mmiri nke ugwu ahụ dakwasịrị ha.”

Mana Satọde ahụ, ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi maara na n’agbanyeghị amaghị aha ha n’ụwa, Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya maara ha n’onwe ya, Onye na-aza ọbụna ekpere ndị kasị mfe.

Nna-ukwu nke ndị nna ukwu mere ka “oke ifufe dị egwu” fee buga ndị Jared n’ebe ngọzi niile e kwere na nkwa. N’otu aka ahụ, anyị nwere ike ikpebi ije ozi dị ka ikuku dị umeala n’obi n’aka nke Onyenwe anyị. Dịka “ifufe ahụ na-akwụsịghị ife” buga ndị Jared n’ala ahụ e kwere na nkwa, anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịga n’ihu n’ime njem ha inweta ngọzi niile nke Chineke.

Ọtụtụ afọ gara aga , mgbe a gbara Chris, ezigbo nwunye m, na mụ ajụjụ ọnụ maka ọkpụkpọ oku m dị ka bishọp, onyeisi stek anyị gwara m ka m jiri ekpere tulee aha m ga-akwado dị ka ndị ndụmọdụ. Mgbe ọ nụchara aha m tụrụ ero, o kwuru na m kwesịrị ịma ihe ole na ole gbasara otu n’ime ụmụnna ahụ.

Nke mbụ, nwanna a apụghị ịgụ ihe. Nka abụọ, o nweghị ụgbọ ala o nwere ike iji eleta ndị otu. Nke atọ, ọ na mgbe niile—mgbe niile—eyikarị ugogbe anya na nzukọ nsọ. Agbanyeghị ezi nchegbu niile nke onyeisi ahụ, e nwere m mmetụta siri ike na m ka kwesịrị ịkwado ya dịka onye ndụmọdụ m, ma onyeisi stek ahụ kwadoro m.

Ụbọchị Sọnde a kwadoro ndị ndụmọdụ m na mụ n’ime nzukọ oriri nsọ, ihe ịtụnanya dị n’ihu ndị otu pụtara ihe. Ezi nwanne nwoke a ji nwayọ nwayọ gbagoo n’ebe nkwago, bụ ebe ọkụ ndị dị nelu na-egbuke egbuke n’enyo anya anwụ ya.

Ka ọ nọdụrụ ala n’akụkụ m, A jụrụ m ya, “Nwanne nwoke, ị nwere nsogbu na ịhụ ụzọ gị?”

“Mba,” O kwuru.

“Mgbe ahụ gịnị kpatara iji na-eyi ugogbe anya na nzukọ nsọ?” A jụru m. “Enyi m, ndị otu kwesịrị ịhụ anya gị, ma ị ga-enwerịrị ike ịhụ ha nke ọma kwa.”

Na oge ahụ, o yipụrụ ugegbe anya ya ma ọ dịghịkwa eyi ha na nzukọ nsọ ọzọ.

Nwanna a m hụrụ n’anya jere ozi n’akụkụ m ruo mgbe a tọghapụrụ m dị ka bishọp. Taa, ọ gara n’ihu na-eje ozi nịkwesị ntụkwasị obi n’ime Nzukọ nsọ ma bụrụ ihe ịmaatụ nke nraranye na ntinye onwe ya nye Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ma agbanyeghị, afọ ole gara aga, ọ bụ onye na-amaghị n’eyi ugegbe anya na-anọdụ ala echefuru echefu nke ọma n’oche nke ụlọ ekpere. A na m echekarị ọtụtụ mgbe, “ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị ole kwesịrị ntụkwasị obi nọdụrụ ala echefuru n’etiti anyị taa?

Ma a mara anyị nke ọma ma ọ bụ na-echefuru anyị, ọnwụnwa ga-abịarịrị nye onye ọbụla nime anyị. Dị ka anyị na-atụgharị n’ebe Onye Nzọpụta nọ, O nwere ike “idobe mkpagbu [anyị] niile nsọ maka uru [anyị] ma nyere anyị aka ịzaghachi n’ọnwụnwa anyị n’ụzọ ga-eme ka anyị nwee ọganihu ime mmụọ. Ma ọ bụ maka ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi, onye otu Nzukọ nsọ e kpejọrọ ikpe, ma ọ bụ onye ọbụla ọzọ, anyị nwere ike ịbụ “ikuku ahụ [nke] ọdịghị mgbe ọbụla ọ kwụsịrị ife,” na-eweta olile anya na idu ndị ọzọ n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ.

Onye amụma anyị hụru n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, kpọrọ ndị ntoroọbịa oku na-akpali ma na-akpake mụọ: “A na m ekwusigharị ya ike na Onyenwe anyị agwawo onye ikom nta ọbụla tozuru oke ma dị ike ịkwado maka ma ije ozi mgbasa ozi ọma. Maka ndị ikom nta nke Ndị nsọ Ubọchi ikpeazụ a, ije ozi mgbasa ozi ọma bụ oke n’ọrụ nke ọkwa nchụaja. … Maka unu bụ ndị iyom nta dị ike, mgbasa ozi ọma bụkwa ọhere dị ike, mana dị nhọrọ.“

Kwa ụbọchị, ọtụtụ puku ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ na-aza oku amụma nke Onyenwe anyị site n’ije ozi dị ka ndị mgbasa ozi ọma. Unu maara ihe, ma dịka Onyeisi Nelson kwurula, unu nwere ike “inwe mmetụta karịrị akarị n’ụwa karịa ndudugandu nke ọbụla gara aga!” N’ezie, nke ahụ apụtaghị na unu ga-abụ ndị kacha mma nke onwe unu ozugbo unu kpara ụkwụ na ebe ọzụzụ ndị mgbasa oziọma.

Kama, unu nwere ike inwe mmetụta dị ka Nefi, “onye Mmụọ na-edu, na-amaghị ihe ndị [unu] ga-eme na mbụ. N’agbanyeghị [unu] gara n’ihu.”

Ikekwa ọ na-adị gị ka obi erughị gị ala dị ka Jeremaya mere ma chọọ ikwu, “E nweghị m ike ikwu okwu: n’ihi a bụ m nwata.”

I nwere ike ịhụ adịghị ike gị ma chọọ ịkwa akwa ka Mozis mere: “O Onyenwe m, A bụghị m onye na-ekwu okwu ọsịsọ … : kama a bụ m onye anaghị ekwu okwu ngwa ngwa, na nke ire dị nwayọ.”

Ọ bụrụ na onye ọbụla n’ime unu ndịikom nta na ndị iyom nta m hụrụ n’anya na-enwe echiche dị otu a ugbu a, cheta na Onyenwe anyị azawo, “E kwula, a bụ M nwata: n’ihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m ga-eziga gị.” Ma O kwere nkwa, “Ya mere gaa, ma Mụ ga-abụ ọnụ gị, ma kuziere gị ihe ị ga-ekwu.”

Mnwogharị gị site n’eke gị gaa na nke ime mmụọ ga-eme “ahịrị n’elu ahịrị, ukpụrụ n’elu ukpụrụ” dị ka ị na agbasi mbọ ike ijere Jizọs Kraịst ozi n’ime ogige mishọn site na nchegharị kwa ụbọchị, okwukwe, nrube isi kpọm kwem, na ịrụsi ọrụ ike ịchọta mgbe niile, kuzie nchegharị, ma mee ndị a tọghatara baptizim.”

N’agbanyeghị na ị na-eyi mkpado aha, mgbe ụfọdụ ị nwere ike ịnwe mmetụta na amataghị kwa gị ma ọ bụ echefuwo gị. Ka o sila dị, ị ga-amarịrị na inwere Nna nke Eluigwe zuru oke, onye maara gị n’onwe gị, na Onye Nzọpụta onye hụrụ gị n’anya. Ị ga-enwe ndị ndu mishọn ndị, n’agbanyeghị ezughị oke ha, ga-ejere gị ozi dịka “ikuku [nke] na-agaghị akwụsị ife” na-ịdu gị na njem gị n’okporo ụzọ ntọgharị nke onwe.

N’ime “ala ahụ nke miri-ara-ehi na manu-ańụ neru n’ime ya” ị ga-eje ozi mishọn gị, a ga-amụgharị gị ọzọ niime mmụọ ma wee bụrụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst oge ndụ gị niile ka ị na-abịaru Ya nso. Ị ga-amata na ọ dịghị mgbe echefuru gị.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere ike chere “ogologo oge” maka enyemaka, n’ihi “ha enweghị mmadụ” nwere ike nye aka, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst akuziworo anyị na o nweghị onye Ya na-echefu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ bụụrụ ihe ịmaatụ zuru oke nke ịchọ onye ahụ n’oge ọ bụla nke ozi Ya n’ụwa.

Onye ọbụla n’ime anyị—ma ndị gbara anyị gburu gburu—na-ezute oke ifufe nke mmegide anyị na ebili mmiri nke ọnwụnwa ndị na-emikpu anyị kwa ụbọchị. Kama “ikuku ahụ [agaghị] akwụsị ife chee iru n’ala ahụ e kwere na nkwa … ; ma site otu a ka a ga-esi chụpụ anyị n’iru ikuku ahụ.”

Onye ọbụla n’ime anyị nwere ike ị bụ otu akụkụ nke ikuku a—otu ikuku ahụ nke gọziri ndị Jared n’ime njem ha ma otu ikuku ahụkwa nke, n’inye aka anyị, ga-agọzi ndị na-amataghị na ndị echefuru echefu iru ala nke e kwere ha na nkwa.

A na m agba ama na Jịsọs kraist bụ Onye Nkwuchite anyị ebe Nna nọ. Ọ bụ Chineke dị ndụ ma na-eme ihe dịka ikuku siri ike nke ga-eduzi anyị mgbe niile n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. J. Reuben Clark Law Society bụ ọgbakọ anaghị akwụ ụgwọ nke ndị ọka iwu na ụmụ akwụkwọ iwu hibere wee hazie ihe karịrị isi 100 n’ụwa niile. A kpọrọ ya aha maka nsọpụrụ Joshua Reuben Clark Jr., onye jere ozi ọtụtụ afọ dịka onye ndụmọdụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraist nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

  2. Mozaya 2:17.

  3. Pro bono bụ mbelata nkebi ahịrịokwu n’asụsụ Latin pro bono publico, nke a pụtara “maka ọdịmma ọha” ma ọ bụ “maka nrita nke ọha.” Nke a bụ ụdị ọrụ afọ ofufo nke, n’adịghị ka ọrụ afọ ofufo ọdịnala chọrọ ntozu ọkachamara, n’agbanyeghị na akwụghị ya ụgwọ.

  4. Ita 6:6.

  5. Ita 6:5.

  6. Lee 2 Nifaị 2:14, 16.

  7. Ita 6:8.

  8. See Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:106.

  9. Lee Abraham 3:25.

  10. 2 Nefi 2:2; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:7.

  11. Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Me 2022, 6.

  12. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  13. 1 Nefi 4:6–7.

  14. Jeremaịa 1:6.

  15. Ọpụpụ 4:10.

  16. Jeremaịa 1:7.

  17. Ọpụpụ 4:12.

  18. Lee Mosaia 3:19.

  19. 2 Nifaị 28:30.

  20. Lee Alma 26:22.

  21. Neil L. Andersen, “Okwukwe ahụ Ịchọta na Ime Ndị tụgharịrị Baptizim” (address given at the seminar for new mission presidents, June 25, 2016), 6.

  22. Lee Ditronomị 11:8–9.

  23. Lee “Ị bụ Ndị Na-Eso Ụzọ nke Jizọs Kraịst na Ndụ Niile,” Kwusaa Ozi ọma M: Odudu iji Kwusaa Ozi ọma nke Jizọs Kraịst (2023), 76–100.

  24. Jọn5:6-7.

  25. Lee Luk 10:29.

  26. Ita 6:8.

  27. Onyeisi Dallin H. Oaks kwuru gbasara ihe osise Maynard Dixon dere aha Nwoke Echefuru Echefu, nke ekowere n’ụlọ ọrụ ya n’ime Church Administration Building in Salt Lake City: “Ị na-ahụ anyanwụ na-acha na isi ya. Nna ya nke Elu-igwe maara na ọ nọ ebe ahụ. A na-echefu ya site na igwe mmadụ na-agafe, mana n’ime ịgba mbọ ya, Nna ya nke Elu-igwe maara na ọ nọ ebe ahụ. E nwela m ihe eserese ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40, ma ọ na-agwa m okwu ma na-echetara m ihe ndị m kwesịrị ị na-echeta”(n’ime Sarah Jane Weaver, “Ihe m mụtara site n’aka Onyeisi Oaks banyere ‘Nwoke Echefuru echefu,’” Church News, Sept. 18, 2022,).thechurchnews.com).